IHE ỌMỤMỤ NKE 19
A Gbara Ume Iji Bible Eme Ihe
ỌCHỊCHỌ anyị bụ ịdọrọ uche mmadụ nile gaa n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Akwụkwọ ahụ dị nsọ bụ ebe ozi anyị na-ekwusa dabeere, anyị chọkwara ka ndị mmadụ mata na ihe anyị na-ekwu esighị n’echiche nke anyị kama na o si n’aka Chineke. Ọ dị ndị mmadụ mkpa inwe obi ike na Bible.
N’ozi Ubi. Mgbe ọ bụla ị na-akwadebe maka ozi ubi, họrọ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ karịa ndị ị ga-eso ndị dị njikere ige ntị tụlee. Ọ bụrụgodị na ị na-eme atụmatụ iche akwụkwọ e ji amụ Bible n’ihu mmadụ n’ụzọ dị nkenke, ọ na-abakarị uru ịgụ akụkụ Bible kwesịrị ekwesị. Bible nwere ikike iduzi ndị yiri atụrụ karịa ihe ọ bụla anyị pụrụ ikwu n’onwe anyị. N’ebe ọ na-agaghị ekwe omume n’ezie ịgụ Bible, ị pụrụ ikpebi ihota ihe e kwuru n’ime ya. Na narị afọ mbụ, ọtụtụ ndị enweghị mpịakọta Akwụkwọ Nsọ. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs na ndịozi ya hotara ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ ọtụtụ ugboro. Anyị onwe anyị kwa kwesịrị ịgbalị iburu akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche n’isi ma jiri ha na-eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ozi anyị, mgbe ụfọdụ nanị na-ehota ihe e kwuru na ha.
Mgbe ị pụrụ ịgụ Bible, jide ya otú onye nwe ụlọ ga-enwe ike isonyere gị mgbe ị na-agụ ya. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ ji Bible nke ya na-esonyere gị, mmeghachi omume ya banyere ihe ọ na-agụ pụrụ ịdị mma ọbụna karị.
Otú ọ dị, ị ghaghị ịmata na ụfọdụ ndi nsụgharị Bible ejiriwo aka ha gbanwee ihe ụfọdụ n’Okwu Chineke. Nsụgharị ha nwere ike ọ gaghị ekwekọcha n’ihe dị n’asụsụ mbụ e ji dee Bible. Ọtụtụ nsụgharị ọgbara ọhụrụ ewepụwo aha aka Chineke, mee ka ihe asụsụ mbụ e ji dee ya na-ekwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ ghara ido anya, kpuchiekwa ihe Bible na-ekwu banyere nzube Chineke maka ụwa. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka i gosi mmadụ otú e si dee amaokwu ndị bụ́ isi na Bible dị iche iche ma ọ bụ ná nsụgharị ndị dị ochie karị e nwere n’asụsụ ahụ iji gosi ya ihe e mere. N’ọtụtụ isiokwu, Reasoning From the Scriptures gosiri otú nsụgharị dị iche iche si sụgharịa okwu ndị gbara ọkpụrụkpụ dị n’amaokwu dị iche iche a na-ejikarị eme ihe. Onye ọ bụla nke hụrụ eziokwu n’anya ga-enwe ekele maka ịmata ihe ndị bụ́ eziokwu.
Ná Nzukọ Ọgbakọ. E kwesịrị ịgba mmadụ nile ume iji Bible ha na-eme ihe ná nzukọ ọgbakọ. Nke a na-arụpụta ihe dị mma n’ọtụtụ ụzọ. Ọ na-enye aka eme ka uche ndị na-ege ntị dịgịde n’ihe a na-ekwu. Ọ na-eme ka ntụziaka ọkà okwu ji ọnụ na-enye nwekwuo mmetụta n’ihi na ha ji anya ha na-ahụ ya. Ọ na-emesikwa ya ike n’uche ndị ọhụrụ nwere mmasị na Bible bụ n’ezie ebe ihe ndị anyị kwenyere sitere.
Ma ndị na-ege gị ntị hà ga-eji Bible nke ha na-esonye n’ezie mgbe ị na-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche ga-adabere ruo n’ókè dị ukwuu n’agbamume i nyere. Ịgwa ha kpọmkwem ka ha sonyere gị bụ otu n’ime ụzọ ndị kasị mma isi mee ya.
Ọ dịịrị gị, bụ́ onye ọkà okwu, ikpebi akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ị chọrọ imesi ike site n’ịgwa ndị na-ege ntị ka ha sapeta ha. Ọ kasị mma ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ga-enyere gị aka iwepụta isi ihe ndị dị n’okwu gị. Mgbe ahụ, dị ka oge si dị, gụkwuo ole na ole ndị ọzọ bụ́ ndị na-akwado ihe ndị i kwuru.
N’ezie, nanị ịkpọtụ uche n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ ma ọ bụ ịgwa ndị na-ege ntị ka ha sapeta otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ adịkebeghị ezu. Ọ bụrụ na ị gụọ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma gafere n’ọzọ tupu ndị na-ege gị ntị enwee ike ịchọtadị nke mbụ, n’oge na-adịghị anya ha ga-enwe nkụda mmụọ, ha ga-akwụsịkwa ịdị na-agbalị iji Bible ha na-esonyere gị. Na-eleru anya. Mgbe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ chọtaworo akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ, gụọ ya.
Na-eche echiche tupu oge eruo. Kpọtụ uche n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị chọrọ ịgụ n’oge tupu ị gụọ ya. Nke a ga-ebelata oge a na-egbu n’ihi ichere ka ndị na-ege ntị chọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ. Ọ bụ ezie na ihe ndị a ga-atụle pụrụ ịdị nta karị ma ọ bụrụ na ị na-enye ndị na-ege ntị oge iji chọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche, uru ndị dị na ya ga-eme ka ọ bụrụ ihe kwesịrị ekwesị.