Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/00 p. 7
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Gbara Ume Iji Bible Eme Ihe
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Ndị Na-ege Gị Ntị Mụtara Ihe na Ya
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Ile Ndị Ị Na-agwa Okwu Anya
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Ịkwadebe Okwu A Ga-ekwu n’Ihu Ọha
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 9/00 p. 7

Igbe Ajụjụ

◼ N’ihi gịnị ka o ji baa uru ka ndị na-ege ntị sapeta akụkụ akwụkwọ nsọ mgbe ọkà okwu gwara ha mee otú ahụ ka ọ na-ekwu okwu?

Ihe ndị ga-ekpebi akụkụ akwụkwọ nsọ ole a ga-agwa ndị na-ege ntị ka ha sapeta bụ isiokwu ahụ a na-atụle na ma okwu ahụ ọ̀ gụnyere ịtụle otu akụkụ nke Okwu Chineke n’amaokwu n’amaokwu.

Ọ dị mkpa iburu n’uche na otu n’ime ihe mere e ji asapeta akụkụ akwụkwọ nsọ bụ iji gosipụta na ihe a na-ekwu sitere na Bible. (Ọrụ 17:11) Nzube ọzọ bụ iji nyochaa ihe àmà Akwụkwọ Nsọ iji kwadoo ihe a na-atụle ka e wee wusie okwukwe mmadụ nile ike. Ịhụ ihe Bible kwuru n’ezie mgbe a na-agụ akụkụ akwụkwọ nsọ bụ́ isi, ga-eme ka ọ gbanyesie mkpọrọgwụ ike n’uche ndị na-ege ntị. Tụkwasị n’ịsapeta akụkụ akwụkwọ nsọ, idetu ihe na itinye uche n’isi ihe ndị a na-atụle na-aba uru.

Ọ bụ ezie na ihe ndepụta Society pụrụ izo aka n’ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ n’ịkọwa otu isiokwu, e depụtara ha maka abamuru nke ọkà okwu, iji nyere ya aka n’ime nkwadebe ya. Ndị a pụrụ inye ihe ọmụma banyere ebe e si nweta isiokwu ahụ na n’aka nke ọzọ nyere ya aka iburu ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị bụ́ isi n’uche nke ọma na ịghọta isi ihe ndị dị n’isiokwu ahụ. Ọkà okwu ahụ na-ekpebi akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị mkpa maka iwepụta isi ihe ndị dị n’okwu ahụ ma gwa ndị na-ege ntị isonyere ya mgbe ọ na-agụ ma na-akọwa akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ. A pụrụ ịkpọtụ uche ma hotatụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ bụ́ ndị kwadoro isiokwu ahụ, ma n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ọ dịchaghị mkpa ka ndị na-ege ntị sapeta ha.

Mgbe ọkà okwu na-agụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọ họọrọ, ọ ga-eme otú ahụ site na Bible kpọmkwem, ọ bụghị site ná mpempe akwụkwọ e ji kọmputa bipụta. Mgbe ọkà okwu ahụ gwara ndị na-ege ntị ka ha sonye n’ịgụ ihe, o kwesịrị ịkpọpụta akwụkwọ Bible, isi ya, na amaokwu (ndị) ọ na-agụ n’ụzọ doro anya. Site n’ịkwụsịtụ iji jụọ ajụjụ ma ọ bụ ikwu okwu dị nkenke banyere ihe mere a ga-eji gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ, ọ na-enye ndị na-ege ntị ohere ịchọta akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ. Ịkpọtụghachi akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ uche ga-enyekwara ndị na-ege ntị aka icheta ebe ahụ e zoro aka na ya. Otú ọ dị, a tụghị aro ka a kpọọ nọmba peeji, ebe ọ bụ na ha pụrụ ịdị iche na-adabere n’ụdị mbipụta Bible nke ndị na-ege ntị n’otu n’otu ji eme ihe. Ịsapeta akụkụ akwụkwọ nsọ mgbe e kwuru ka e mee otú ahụ na-enyere ndị na-ege ntị aka irite uru site n’ike nke Okwu Chineke ka a na-akọwa ya mgbe a na-ekwu okwu ahụ.—Hib. 4:12.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya