Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be ihe ọmụmụ 25 p. 166-p. 169 para. 6
  • Iji Ihe Ndepụta Eme Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iji Ihe Ndepụta Eme Ihe
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịkwadebe Ihe Ndepụta
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Ikwu Okwu n’Agụghị Ya Agụ
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Ịkwadebe Okwu A Ga-ekwu n’Ihu Ọha
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Ịkwadebe Okwu A Ga-agwa Ọgbakọ
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be ihe ọmụmụ 25 p. 166-p. 169 para. 6

IHE ỌMỤMỤ NKE 25

Iji Ihe Ndepụta Eme Ihe

Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

Jiri ihe ndepụta kwuo okwu, ma e dere ya ede ma e bu isi ihe ndị a chọrọ ikwu n’isi, kama idepụta ihe nile ma gụọ ya agụọ.

Gịnị mere o ji dị mkpa?

Ịkwadebe ihe ndepụta na-enyere gị aka ịhazi echiche gị ahazi. Iji ya kwuo okwu na-eme ka ọ dịrị gị mfe karị ikwu okwu n’ụzọ mkparịta ụka na ikwu okwu site n’obi gị.

ECHICHE nke iji ihe ndepụta kwuo okwu na-eme ka ahụ́ na-ama ọtụtụ ndị jijiji. Obi na-esi ha ike karị ma ọ bụrụ na e deturu ihe nile ha gaje ikwu edetu ma ọ bụ na ha bu ha n’isi.

Ma, n’ezie, anyị nile na-ekwu okwu kwa ụbọchị n’agụpụtaghị ya agụpụta. Anyị na-eme ya mgbe anyị na ndị ezinụlọ anyị nakwa ndị enyi anyị na-enwe mkparịta ụka. Anyị na-eme ya mgbe anyị na-ekere òkè n’ozi ubi. Anyị na-emekwa ya mgbe anyị na-ekpe ekpere site n’obi anyị, ma ọ̀ bụ nanị anyị ma ànyị na-anọchite anya otu ìgwè.

Mgbe ị na-ekwu okwu, ọ̀ dị ihe o mere ma ì ji ihe ndepụta na-eme ihe ma ì depụtara ihe nile gụọ ya agụọ? Ọ bụ ezie na ịgụpụta okwu e depụtara edepụta na-enye aka ịhụ na e mehieghị ihe nakwa na e ji okwu ndị e ji nlezianya họrọ na-eme ihe, o nwere nsogbu nke ya n’iru n’obi ndị mmadụ. Mgbe ị gụpụtara ihe gafere ahịrịokwu ole na ole, ị na-amalitekarị ikwu okwu ọsọ ọsọ ma na-agbanwe ụda olu gị n’ụzọ dị iche n’otú ị na-esi ekwu okwu ná mkparịta ụka ị na-ebughị ụzọ chepụta ihe ị ga-ekwu na ya. Ọ bụrụ na i tinye uche gị n’akwụkwọ gị karịa otú i tinyere n’ebe ndị na-ege gị ntị nọ, ọtụtụ ndị nwere ike ha agaghị egecha ntị nke ọma otú ha gaara esi ege ma a sị na ha chere na ị na-eche banyere ha n’ezie ma na-agbanwe okwu gị ikwekọ n’ọnọdụ ha. Iji kwuo okwu na-akpali akpali n’ezie, ọ na-akasị mma ikwu okwu n’agụpụtaghị ya agụpụta.

A haziri Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke iji nyere anyị aka ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị. Mgbe anyị zutere ndị enyi anyị, anyị adịghị ewepụta mpempe akwụkwọ wee gụpụtara ha ihe dị anyị n’obi iji jide n’aka na anyị kwuru ya otú kasị mma. N’ozi ubi, anyị adịghị edepụta ihe nile na-agụ ya n’ihi ịtụ ụjọ na anyị pụrụ ichefu isi ihe ụfọdụ anyị ga-achọ iso ndị mmadụ kwurịta. N’ụlọ akwụkwọ, mgbe ị na-eme ihe ngosi banyere ụzọ isi gbaa àmà n’ụdị ọnọdụ ndị ahụ, mụgharịa ikwu okwu otú i si ekwu okwu ruo ókè o kwere mee. Site n’ime ezi nkwadebe, ị ga-achọpụta na inwe ihe ndepụta, ma è bu isi ihe a chọrọ ikwu n’isi ma e dere ya ede, ọtụtụ mgbe ezuola iji chetara gị isi ihe ndị ị chọrọ ikwu. Ma olee otú ị pụrụ isi nweta obi ike dị gị mkpa iji jiri ya na-eme ihe?

Hazie Echiche Dị n’Okwu Gị Ahazi. Iji jiri ihe ndepụta na-eme ihe mgbe ị na-ekwu okwu, ọ dị gị mkpa ịhazi echiche dị n’okwu gị ahazi. Nke a apụtaghị ịhọrọ mkpụrụ okwu ndị ị chọrọ iji mee ihe. Ọ pụtara nanị iche echiche tupu i kwuwe okwu.

Ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị, onye na-eme ihe ọkụ ọkụ pụrụ ịhụ ka ọ na-ekwu ihe ndị ọ ga-emesịa kwaara ụta. Onye ọzọ pụrụ ịdị na-agba gburugburu, si n’otu ihe na-amafere n’ọzọ. A pụrụ imeri omume abụọ a nke ọma site n’ịkwụsịtụ iji chepụta ụzọ dị mfe ị ga-esi kwuo okwu tupu ị malite ikwu okwu. Buru ụzọ mee ka ebumnobi gị doo gị anya, họrọzie ihe ndị ọ ga-adị mkpa ka i mee iji mezuo ya, mgbe ahụkwa malite ikwu okwu.

Ị̀ na-akwadebe maka ozi ubi? Wepụta oge hazie ọ bụghị nanị akpa ozi ọma gị kamakwa echiche gị. Ọ bụrụ na i kpebie iji otu n’ime ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị dị n’Ozi Alaeze Anyị mee ihe, gụọ ya ugboro ugboro iji ghọta isi ihe ndị dị na ya nke ọma. Kwuo isi ihe dị na ya n’otu ahịrịokwu dị nkenke ma ọ bụ abụọ. Mee ka okwu ndị ị ga-eji mee ihe kwekọọ n’ụdị onye ị bụ nakwa n’ọnọdụ ndị dị n’ókèala unu. Ị ga-ahụ na ọ na-enye aka iburu isi ihe ndị ị chọrọ ikwu n’isi. Gịnị ka ọ pụrụ ịgụnye? (1) Iji malite, ị pụrụ ikwu ihe na-echegbu ọtụtụ ndị nọ n’ógbè unu. Gbaa onye ahụ ume ka o tinye ọnụ. (2) Buru n’uche otu ihe kpọmkwem ị pụrụ iso ya kwurịta n’isiokwu ahụ, tinyere otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ abụọ ndị na-egosi ihe Chineke kwere nkwa ime iji weta nnwere onwe. Ọ bụrụ na e nyere gị ohere, mesie ya ike na Jehova ga-eme nke a site n’Alaeze ya, bụ́ ọchịchị eluigwe ya. (3) Gbaa onye ahụ ume ime ihe banyere ihe ndị unu kwurịtaworo. Ị pụrụ inyefe akwụkwọ/ma ọ bụ kwuo ka i duziere ya ọmụmụ Bible ma mee ndokwa doro anya iji gaa n’ihu ná nkwurịta okwu ahụ.

Nanị ihe ndepụta nke nwere ike ịdị gị mkpa maka ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ dị otú ahụ bụ nke i bu n’isi. Ọ bụrụ na ị chọrọ ile anya n’ihe ndepụta e dere ede tupu i mee nleta mbụ gị, ihe ndepụta ahụ nwere ike inwe nanị okwu ole na ole ị ga-eji mee ihe n’okwu mmeghe gị, otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ abụọ e deturu edetu, na ntakịrị ihe e deturu ị ga-achọ iwebata ná mmechi gị. Ime nkwadebe na iji ihe ndepụta dị otú ahụ eme ihe na-eme ka anyị ghara ịdị na-agba gburugburu, na-enyere anyị aka izi onye ahụ ozi doro anya, nke dị mfe icheta.

Ọ bụrụ na ọ dị ajụjụ ma ọ bụ okwu mgbagha na-ebilitekarị n’ókèala unu, ị pụrụ ịhụ na ọ na-enye aka ime nnyocha banyere okwu ahụ. Ọtụtụ mgbe, nanị ihe dị gị mkpa bụ isi ihe abụọ ma ọ bụ atọ tinyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-akwado ha. “Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu” ma ọ bụ isiokwu nta ndị e dere ná mkpụrụ akwụkwọ gbara okpotokpo na Reasoning From the Scriptures pụrụ inye gị ihe ndepụta dị gị mkpa kpọmkwem. Ị pụrụ ịhụ ihe dabara adaba e kwuru n’akwụkwọ ọzọ, bụ́ nke ị chọrọ iwebata. Kwadebe ihe ndepụta dị mkpirikpi e dere ede, jikọta ya na ebe i depụtara ihe ahụ e kwuru, tinyekọta ha n’ihe ndị i ji aga ozi ubi. Mgbe onye nwe ụlọ welitere ajụjụ ma ọ bụ okwu mgbochi ahụ, gwa ya na i nwere obi ụtọ n’ohere ahụ o nyere gị ikwu ihe mere i ji kwenye n’ihe i kwenyere. (1 Pita 3:15) Zaghachi ya na-adabere n’ihe ndepụta ahụ.

Mgbe ị gaje ịnọchite anya ezinụlọ gị, ìgwè ọmụmụ akwụkwọ, ma ọ bụ ọgbakọ n’ekpere, ọ bakwara uru ịhazi echiche gị ahazi. Dị ka Luk 11:2-4 si kwuo, Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ihe ndepụta dị mfe maka ekpere si n’obi. Mgbe a na-arara ụlọ nsọ dị na Jeruselem nye, Solomọn kpere ekpere dị ogologo. O doro anya na o chebaara okwu ahụ echiche tupu oge eruo. O buru ụzọ dọrọ uche gaa n’ebe Jehova nọ nakwa n’ebe nkwa O kwere Devid dị; e mesịa, n’ụlọ nsọ ahụ; mgbe ahụzi, o lekwasịrị anya n’otu n’otu n’ọnọdụ dịgasị iche iche kpọmkwem na n’ebe ìgwè mmadụ dị iche iche nọ. (1 Eze 8:22-53) Anyị pụrụ irite uru site n’ihe atụ ndị a.

Mee ka Ihe Ndepụta Okwu Gị Dị Mfe. Ì bu n’obi iji ihe ndepụta gị eme ihe mgbe ị na-ekwu okwu? Olee ihe ndị kwesịrị ịdị na ya?

Cheta na ihe ndepụta bụ iji nyere gị aka icheta echiche ndị dị n’okwu. I nwere ike iche na ọ ga-aba uru idetu ahịrịokwu ole na ole ndị ga-abụrụ gị okwu mmeghe. Ma mgbe nke ahụ gasịrị, lekwasị anya n’echiche dị n’okwu gị, ọ bụghị ná mkpụrụ okwu. Ọ bụrụ na i deturu echiche ndị ahụ dị n’okwu gị edetu n’ụdị ahịrịokwu, dee ha n’ahịrịokwu ndị dị nkenke. Isi ihe ole na ole ị na-eme atụmatụ ịkọwapụta kwesịrị ịpụta ìhè n’ihe ndepụta gị. A pụrụ imezu nke a site n’ide ha n’aka akwụkwọ ukwu, ịkanye akara n’okpuru isi ihe dị iche iche, ma ọ bụ iji ihe nwere àgwà dị iche kaa ha akara. N’okpuru isi ihe nke ọ bụla, depụta echiche okwu ndị ị chọrọ iji mee ihe mgbe ị na-akọwapụta ya. Zoo aka n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ị na-eme atụmatụ ịgụ. Ọ na-akakarịsị mma ịgụpụta ha site n’ime Bible. Detuo ihe atụ ndị ị chọrọ iji mee ihe. Ị pụkwara idetu ihe dị mkpa nke dabara adaba e kwuru n’akwụkwọ na-abụghị akwụkwọ okpukpe. Mee ka ihe i deturu buo ibu iji gụnye isi ihe ndị a kapịrị ọnụ ị ga-ewepụta. Ọ ga-aka mfe iji ihe ndepụta ahụ eme ihe ma ọ bụrụ na a haziri ya nke ọma.

Ndị ụfọdụ na-eji ihe ndepụta ndị nwere nanị ihe ndị bụ́ isi eme ihe. Ihe ndepụta pụrụ inwe okwu ole na ole bụ́ isi, akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e deturu bụ́ ndị ọkà okwu ga-ehota ihe ha kwuru n’isi, na ihe osise ndị ga-enyere ya aka icheta isi ihe dị iche iche. Site n’iji ihe ndị a dị mfe o deturu eme ihe, ọkà okwu ga-enwe ike ikwu okwu ya n’usoro ezi uche dị na ya na n’ụzọ mkparịta ụka. Ọ bụ ya bụ ebumnobi nke ihe ọmụmụ a.

Na peeji nke 39 ruo nke 42 n’akwụkwọ a, ị ga-ahụ ntụle bụ́ “Ịkwadebe Ihe Ndepụta.” Ọ ga-enye aka nke ukwuu ịgụ ihe ọmụma ahụ mgbe ị na-arụ ọrụ n’ihe ọmụmụ a, bụ́ “Iji Ihe Ndepụta Eme Ihe.”

Ụzọ Isi Jiri Ihe Ndepụta ahụ Mee Ihe. Otú ọ dị, ugbu a nzube gị abụghị nanị ịkwadebe okwu gị n’ụdị ihe ndepụta. Ọ bụ iji ihe ndepụta ahụ mee ihe n’ụzọ dị irè.

Nzọụkwụ mbụ n’iji ihe ndepụta gị eme ihe bụ ịkwadebe otú ị ga-esi kwuo okwu. Lee isiokwu ahụ anya, gụọ isi ihe nke ọ bụla, gwa onwe gị ihe jikọrọ nke ọ bụla n’ime isi ihe ndị ahụ na isiokwu ahụ. Detuo ogologo oge a pụrụ inye isi ihe nke ọ bụla. Ugbu a laghachi ma mụọ isi ihe nke mbụ. Tụleghachi arụmụka ndị dị na ya, akụkụ Akwụkwọ Nsọ, na ihe atụ dịgasị iche iche ndị ị na-eme atụmatụ iji kọwapụta isi ihe ahụ. Gụghachi ihe ahụ dum ugboro ugboro ruo mgbe akụkụ ahụ nke okwu gị doro gị anya. Mee otu ihe ahụ na nke ọ bụla n’isi ihe ndị nke ọzọ. Tụlee ihe ndị ị pụrụ ịhapụ, ma ọ dị mkpa, iji mechie n’oge. Mgbe ahụ tụleghachi okwu ahụ dum. Lekwasị anya n’echiche ndị dị n’okwu ahụ, ọ bụghị ná mkpụrụ okwu. Ebula okwu ahụ n’isi.

Mgbe ị na-ekwu okwu ahụ, i kwesịrị inwe ike ịnọgide na-ele ndị na-ege gị ntị anya n’anya. Mgbe ị gụsịrị otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ, dị ka ọ na-adịkarị i kwesịrị inwe ike ịtụgharị uche na ya site n’iji Bible gị eme ihe n’eleghị anya ọzọ n’ihe ndị i deturu. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na i mee ihe atụ, kọọ ya otú ị ga-esi kọọrọ ya ndị enyi gị kama ịgụpụta ya agụpụta site n’ihe i deturu. Mgbe ị na-ekwu okwu, elela anya n’ihe ndị i deturu maka ahịrịokwu nke ọ bụla. Kwuo okwu site n’obi gị, ị ga-erukwa n’obi nke ndị na-ege gị ntị.

Mgbe ị mụtara nkà nke iji ihe ndepụta na-ekwu okwu, i nweela ọganihu dị ukwuu n’ịghọ ọkà okwu dị irè n’ihu ọha.

ỤZỌ ISI MEE YA

  • Mesie uru ndị dị n’iji ihe ndepụta na-ekwu okwu ike n’uche gị.

  • Ná mkparịta ụka ị na-enwe kwa ụbọchị, hazie echiche gị ahazi tupu i kwuo okwu.

  • Iji nweta obi ike dị gị mkpa iji jiri ihe ndepụta na-ekwu okwu, kpegara Jehova ekpere, meekwa ka ọ mara gị ahụ́ ịdị na-ekere nnọọ òkè ná nzukọ ọgbakọ.

  • Mee ka ihe ndepụta gị dị mfe, mee ka ọ dị mfe ịgụ nanị site n’igwu ya anya.

  • Kwadebe otú ị ga-esi kwuo ya site n’ịtụleghachi echiche ndị dị n’okwu, ọ bụghị site n’iburu mkpụrụ okwu n’isi.

IHE OMUME: Tupu ị gawa ozi ubi n’izu a, kwadebe n’uche gị isi ihe ndị ị ga-achọ iji kwuo okwu banyere otu ihe a kapịrị ọnụ ị chọrọ ikwu. (Lee peeji nke 167, paragraf nke 3.) Mgbe ị nọ n’ozi ubi, rịba ama ugboro ole i nwere ike inwe mkparịta ụka i mere atụmatụ inwe ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ ikwu isi ihe dị n’ozi ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya