Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be p. 52-p. 54 para. 4
  • Ịkwadebe Okwu A Ga-ekwu n’Ihu Ọha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịkwadebe Okwu A Ga-ekwu n’Ihu Ọha
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mụọ Ihe Ndepụta Ahụ
  • Iji Akwụkwọ Nsọ Eme Ihe
  • Mkpebi Dị Iche Iche Ọkà Okwu Ga-eme
  • Ịkwadebe Ihe Ndepụta
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Iji Ihe Ndepụta Eme Ihe
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Mee Ka Ihe Ndị Gbara Ọkpụrụkpụ n’Okwu Gị Doo Anya
    Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe
  • E Mere Ka Ihe Ndị Bụ́ Isi Ihe Pụta Ìhè
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be p. 52-p. 54 para. 4

Ịkwadebe Okwu A Ga-ekwu n’Ihu Ọha

KWA izu, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-eme ndokwa maka okwu ihu ọha n’otu isiokwu sitere n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụrụ na ị bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, ị̀ na-enye ihe àmà na ị bụ ọkà okwu ihu ọha dị irè, ya bụ, onye ozizi? Ọ bụrụ otú ahụ, a pụrụ ịgwa gị ka i kwuo okwu ihu ọha. Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke enyeworo ọtụtụ iri puku ụmụnna ndị nwoke aka iru eru maka ihe ùgwù ije ozi nke a. Ọ bụrụ na e kenye gị ikwu okwu ihu ọha, olee ebe i kwesịrị ịmalite?

Mụọ Ihe Ndepụta Ahụ

Tupu i mee nnyocha ọ bụla, gụọ ihe ndepụta ahụ ma na-atụgharị uche na ya ruo mgbe ị ghọtara ya. Buru ihe ị ga-ekwu okwu na ya n’uche, nke bụ́ isiokwu nke okwu ihu ọha ahụ. Gịnị ka ị gaje ịkụziri ndị ga-ege gị ntị? Gịnị bụ ebumnobi gị?

Mata isiokwu ndị bụ́ isi nke ọma. Tụlee ihe ndị ahụ bụ́ isi ihe. Olee otú nke ọ bụla si kwekọọ n’isiokwu ahụ? E depụtara ọtụtụ ụmụ obere isi ihe n’okpuru nke ọ bụla n’ime ihe ndị bụ́ isi ihe. E depụtara n’okpuru ụmụ obere isi ihe ndị a ihe ndị na-akwado ha. Tụlee otú nkebi nke ọ bụla nke ihe ndepụta ahụ si adabere na nke bu ya ụzọ, na-eduga na nke na-eso ya, ma na-enye aka n’imezu ebumnobi nke okwu ahụ. Ozugbo ị ghọtara isiokwu ahụ, ebumnobi nke okwu ahụ, na otú ihe ndị bụ́ isi ihe si emezu nzube ahụ, mgbe ahụ ị dịla njikere iwulite ihe ọmụma ahụ.

Ná mmalite, ị pụrụ ịhụ na ọ na-enye aka iwere okwu gị dị ka okwu anọ ma ọ bụ ise dị mkpirikpi, nke nke ọ bụla n’ime ya nwere otu ihe bụ́ isi ihe. Kwadebe ha otu otu.

Ihe ndepụta e nyere bụ ihe e ji eme nkwadebe. E zubeghị ka ọ bụrụ ihe odide nke ị ga-esi na ya kwuo okwu gị. O yiri ụlọ a ka na-ewu ewu. Ọ ga-adị mkpa ka o nwee mgbidi, elu ụlọ, ibo ụzọ, nakwa ka a kwanyejuo ya ihe ndị dị mkpa tupu ọ ghọọ ụlọ dị mma ibi ebi.

Iji Akwụkwọ Nsọ Eme Ihe

Jizọs Kraịst na ndị na-eso ụzọ ya mere ka izi ihe ha dabere n’Akwụkwọ Nsọ. (Luk 4:16-21; 24:27; Ọrụ 17:2, 3) Ị pụrụ ime otu ihe ahụ. Akwụkwọ Nsọ kwesịrị ịbụ ebe okwu gị dabeere. Kama nanị ịkọwawa na igosiwa otú a pụrụ isi tinye ihe ndị e kwuru n’ihe ndepụta e nyere n’ọrụ, chọpụta otú Akwụkwọ Nsọ si kwadoo ihe ndị ahụ e kwuru, mgbe ahụkwa si n’Akwụkwọ Nsọ zie ihe.

Ka ị na-akwadebe okwu gị, nyochaa amaokwu nke ọ bụla e zoro aka na ya n’ihe ndepụta ahụ. Rịba okwu ndị gbara ya gburugburu ama. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ pụrụ nanị inye ihe ọmụma na-enye aka banyere ọnọdụ gbara ihe gburugburu. Ọ bụghị ha nile ka ọ dị mkpa ka a gụọ ma ọ bụ kwuo okwu na ha mgbe ị na-ekwu okwu gị. Họrọ ndị kasị kwesị ekwesị maka ndị na-ege gị ntị. Ọ bụrụ na i lekwasị anya n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha n’ihe ndepụta ahụ e biri ebi, ikekwe ọ gaghị adị gị mkpa iji akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ mee ihe.

Inwe ihe ịga nke ọma nke okwu gị na-adabere, ọ bụghị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ole i ji mee ihe, kama n’otú i si zie ihe nke ọma. Mgbe ị na-akpọpụta otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ, gosi ihe mere e ji jiri ha na-eme ihe. Wepụta oge iji gosi otú a pụrụ isi jiri ha mee ihe. Mgbe ị gụsịrị otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ, ghewe Bible gị oghe ka ị na-atụle ebe ahụ. O yikarịrị ka ndị na-ege gị ntị hà ga-eme otu ihe ahụ. Olee otú ị pụrụ isi kpalie mmasị ndị na-ege gị ntị ma nyere ha aka irite uru n’Okwu Chineke n’ụzọ zuru ezu karị? (Neh. 8:8, 12) Ị pụrụ ime nke ahụ site n’inye nkọwa, ihe atụ, na igosi otú a pụrụ isi jiri ya mee ihe.

Nkọwa. Mgbe ị na-akwadebe ịkọwa otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ gbara ọkpụrụkpụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe ọ pụtara? Gịnị mere m ji jiri ya na-eme ihe n’okwu m? Gịnị ka ndị na-ege ntị nwere ike ịnọ na-ajụ onwe ha banyere amaokwu a?’ Ọ pụrụ ịdị gị mkpa ịtụle okwu ndị gbara ya gburugburu, ebe o mere, mmetụta nke ihe e kwuru nwere, ebumnobi nke onye ahụ dere ya site n’ike mmụọ nsọ. Nke a na-achọ ime nnyocha. Ị ga-achọta ụbara ihe ọmụma bara uru ná mbipụta dị iche iche nke “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-ewepụta. (Mat. 24:45-47) Anwala ịkọwa ihe nile banyere amaokwu ahụ, kama kọwaa ihe mere i ji gwa ndị na-ege gị ntị ka ha gụọ ya n’ihe banyere isi ihe a na-atụle.

Ihe atụ. Nzube e ji eme ihe atụ bụ iji mee ka ndị na-ege gị ntị nwee nghọta miri emi karị ma ọ bụ inyere ha aka icheta isi ihe ma ọ bụ ụkpụrụ ị tụleworo. Ihe atụ na-enyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe ị gwaworo ha ma jikọta ya n’ihe ha mabu ama. Nke a bụ ihe Jizọs mere mgbe o ziri Ozizi Elu Ugwu ya ahụ a ma ama. “Anụ ufe nke eluigwe,” “okooko lili nke ọhịa,” “ọnụ ụzọ ámá dị warara,” ‘ụlọ dị n’elu oké nkume,’ na ọtụtụ okwu ndị dị otú ahụ mesiri izi ihe ya ike, mee ka o doo anya, ma bụrụ nke a na-apụghị ichefu echefu.—Mat., isi 5-7.

Igosi Otú A Pụrụ Isi Jiri Ya Mee Ihe. Ịkọwa otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ na iji ya mee ihe atụ ga-eme ka a mụta ihe na ya, ma ọ bụ igosi otú a pụrụ isi jiri ihe ọmụma ahụ mee ihe na-arụpụta ihe. N’ezie, ọ bụ ọrụ ndị na-ege gị ntị iji ozi Bible mee ihe, ma ị pụrụ inyere ha aka ịghọta ihe ọ dị mkpa ka e mee. Ozugbo obi siri gị ike na ndị na-ege gị ntị ghọtara amaokwu ị na-atụle ma hụ otú o si kwekọọ n’isi ihe ị na-akọwa, wepụta oge gosi ha mmetụta ọ na-enwe na nkwenkwe na n’àgwà anyị. Kọwapụta abamuru nke ịhapụ echiche na-ezighị ezi ma ọ bụ àgwà ndị na-ekwekọghị n’eziokwu ahụ ị na-atụle.

Ka ị na-eche otú ị ga-esi jiri akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche mee ihe, cheta na ndị na-ege gị ntị si n’ọnọdụ dị iche iche, ha na-echekwa ọnọdụ dịgasị nnọọ iche iche ihu. E nwere ike inwe ndị ọhụrụ ka na-enwe mmasị, ndị ntorobịa, ndị metụworo okenye, na ndị na-agbaso ọtụtụ nsogbu onwe onye mgba. Mee ka okwu gị dị irè ma kwekọọ n’ihe ndị na-eme eme ná ndụ. Zere inye ndụmọdụ ga-eyi ka ọ bụ nanị mmadụ ole na ole ka i bu n’uche.

Mkpebi Dị Iche Iche Ọkà Okwu Ga-eme

E meworo gị mkpebi ụfọdụ banyere okwu gị. E gosiri n’ụzọ doro anya ihe ndị bụ́ isi ihe, gosikwa n’ụzọ doro anya oge i kwesịrị itinye n’ịtụle isiokwu nke ọ bụla bụ́ isi. Ọ bụ gị ga-eme mkpebi ndị ọzọ. I nwere ike ikpebi itinye oge ka ukwuu n’ụmụ obere isi ihe ụfọdụ na itinye oge ka nta ná ndị ọzọ. Ewerela ya na ị ghaghị ikwu okwu n’ụzọ hà nhata n’obere isi ihe nke ọ bụla. Nke ahụ pụrụ ime ka i mee ihe omume gị ọkụ ọkụ ma kwunye ndị na-ege gị ntị ike ọgwụgwụ. Olee otú ị pụrụ isi mata nke ị ga-akọwapụta nke ọma karị na nke ị ga-akọwapụta nanị ná mkpirikpi, ma ọ bụ ghara imesi ya ike? Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee isi ihe ndị ga-enyere m aka iwepụta echiche bụ́ isi dị n’okwu a? Olee ndị o yiri ka ndị na-ege m ntị hà ga-akasị rite uru na ha? Ịhapụ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ e zoro aka na ya na isi ihe e jikọtara ya na ya ọ̀ ga-eme ka ihe àmà ndị m na-ewepụta ghara inwe mmetụta dị ike?’

Gbalịsie ike izere iwebata ihe a na-ejighị n’aka ma ọ bụ echiche onwe onye. Ọbụna Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst, zeere ikwu ihe sitere ‘n’echiche nke ya.’ (Jọn 14:10) Ghọta na ihe mere ndị mmadụ ji abịa nzukọ Ndịàmà Jehova bụ iji nụrụ ka a na-atụle Bible. Ọ bụrụ na e werela gị dị ka ezi onye ọkà okwu, o yikarịrị ka ọ bụ n’ihi na i mere ka ọ bụrụ omume gị ịdọrọ uche gaa n’ebe Okwu Chineke dị, ọ bụghị gaa n’ebe gị onwe gị nọ. N’ihi nke a, a na-enwe mmasị n’okwu gị.—Fil. 1:10, 11.

Ebe i meworo ka ihe bụ́ nanị ihe ndepụta nkịtị ghọọ nkọwa nke Akwụkwọ Nsọ nke jupụtara n’ihe ọmụma, ọ dị gị mkpa ugbu a ịmụgharị okwu gị. Ọ bara uru ime ya n’olu dapụtara adapụta. Ihe dị mkpa bụ ijide n’aka na i bu isi ihe nile n’obi nke ọma. Ị ghaghị iji nkwenye siri ike kwuo okwu, mee ka okwu ahụ bụrụ nke na-akpali akpali, ma kọwapụta eziokwu ahụ n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Tupu ị malite okwu gị, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka m bu n’obi ịrụzu?’ Jụọkwa, sị: ‘Ihe ndị bụ́ isi ihe hà guzopụrụ iche? Èmewo m n’ezie ka Akwụkwọ Nsọ bụrụ ebe okwu m dabeere? Ihe nke ọ bụla bụ́ isi ihe ọ̀ na-eduga n’ọzọ n’ụzọ dabara adaba? Okwu a ọ̀ na-eme ka e nwee ekele n’ebe Jehova nọ na n’ebe ndokwa ya dị? Okwu mmechi m ò kwekọrọ kpọmkwem n’isiokwu, na-egosi ndị na-ege ntị ihe ha ga-eme, na-akpalikwa ha ime ya?’ Ọ bụrụ na ị pụrụ ịza ee n’ajụjụ ndị a, mgbe ahụ ị pụrụ ‘ime ka ihe ọmụma dị mma,’ maka abamuru nke ọgbakọ na iji wetara Jehova otuto!—Ilu 15:2.

MGBE Ị GA-EKWU OKWU GỊ SITE N’ỌNỤ ONYE NTỤGHARỊ OKWU

Ọtụtụ mgbe, a na-enwe ọtụtụ ìgwè na-asụ asụsụ dị iche iche n’ime otu mba, ya mere a pụrụ ịkpọ ndị ọkà okwu ihu ọha ka ha kwuo okwu dabeere na Bible site n’ọnụ onye ntụgharị okwu. Ọ bụrụ na a kpọọ gị ikwu okwu n’ọnọdụ dị otú ahụ, ntụziaka ndị na-esonụ ga-enyere ma gị ma onye ga-atụgharịrị gị okwu aka.

  • Ịdị irè nke okwu gị ga-adabere, ruo n’ókè dị ukwuu, n’ọrụ onye ntụgharị okwu. Ọbụna onye nwere ahụmahụ n’ịtụgharị okwu ga-eme nke ọma karị ma ọ bụrụ na i nyere ya aka ịkwadebe.

  • Dị ka ọ na-adịkarị, ị ghaghị ibelata okwu gị ruo ihe dị ka ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ ma ọ dịkarịa ala iji nye ohere maka ntụgharị okwu. (Nke a emetụtaghị asụsụ ndị ogbi, ebe ọ bụ na ya na okwu nkịtị ga-afọ nke nta ka ha na-aga ụkwụ na ụkwụ.)

  • Tupu ị malite ikwu okwu, gị na onye ga-atụgharị okwu gị tụlee ihe ndepụta okwu gị na ihe bụ́ ebumnobi nke okwu ahụ. Ọ bụrụ na ihe omume gị bụ okwu a na-agụ agụ ná mgbakọ, mee ka onye ntụgharị okwu hụ ya tupu oge eruo.

  • Soro onye ntụgharị tụlee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ị ga-eji mee ihe. Jide n’aka na Bible dị n’asụsụ ahụ na-enye otu echiche ahụ Bible gị na-enye. Gosi onye ntụgharị ahụ okwu ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị a ga-emesi ike ma ọ bụ kọwaa.

  • Kpebie ma à ga-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ n’asụsụ abụọ ahụ ka ọ̀ bụ nanị n’otu. Ọ pụrụ izu ịgụ ya nanị n’asụsụ onye ntụgharị okwu.

  • Ịkpọ ụbọchị, ọnụ ọgụgụ, na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha oké ọsọ ọsọ pụrụ ịkpata ihe isi ike. Na-akwụsịtụ n’ụzọ na-enye aka, họrọkwa ịdị na-akpọ ọnụ ọgụgụ ndị na-enweghị ihe mara ha n’elu.

  • Tụleenụ ihe atụ, akpaala okwu, na okwu ọ bụla a na-adịghị ejikebe eme ihe bụ́ ndị ị na-eme atụmatụ iji mee ihe. Jide n’aka na onye na-atụgharịrị gị okwu ghọtara ha nakwa na ọ ga-ekwe ya omume ikwupụta ihe ndị ahụ n’asụsụ ọ ga-atụgharị okwu gaa na ya.

  • Mgbe ị na-ekwu okwu, jiri ahịrịokwu ndị dị nkenke mee ihe. Kwupụta echiche zuru ezu tupu ị kwụsịtụrụ onye ntụgharị okwu. (Ọ bụ echiche dị n’okwu ka ọ na-atụgharị, ọ bụchaghị mkpụrụ okwu nile e kwuru.) Maka ntụgharị okwu a na-eme ozugbo e kwupụrụ okwu, nye onye ahụ na-atụgharị okwu ohere ka o kwuchaa ihe ọ na-ekwu tupu ị gaa n’ihu.

  • Onye ntụgharị okwu na-adabere na gị ịkpọpụta okwu nke ọma na iji ụda olu dị mma na-eme ihe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya