Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be ihe ọmụmụ 31 p. 190-p. 193 para. 2
  • A Kwanyeere Ndị Ọzọ Ùgwù

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Kwanyeere Ndị Ọzọ Ùgwù
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Atụ Ndị Sitere n’Ọnọdụ Ndị A Maara nke Ọma
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Iji Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Eme Ihe n’Ụzọ Dị Irè
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Na-akwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Ị̀ Na-ebute Ụzọ n’Inye Ndị Ọzọ Nsọpụrụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be ihe ọmụmụ 31 p. 190-p. 193 para. 2

IHE ỌMỤMỤ NKE 31

A Kwanyeere Ndị Ọzọ Ùgwù

Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

Chebara ndị ọzọ echiche, na-egosi ha nsọpụrụ.

Gịnị mere o ji dị mkpa?

Igosi nkwanye ùgwù bụ ihe a chọrọ n’aka Ndị Kraịst, bụ́ nke na-eme ka e nwee ọnọdụ nke yikarịrị ka ọ ga-eme ka ndị ọzọ nakwere ihe ị na-agwa ha site na Bible.

AKWỤKWỌ Nsọ na-agwa anyị ka anyị ‘sọpụrụ ụdị mmadụ ọ bụla’ ma “ghara ikwu okwu ọjọọ banyere onye ọ bụla.” (1 Pita 2:17; Taị. 3:2) N’ezie, onye ọ bụla bụ́ mmadụ anyị zutere “dị adị ‘n’ọdịdị Chineke.’” (Jems 3:9) Onye nke ọ bụla bụ onye Kraịst nwụụrụ. (Jọn 3:16) Mmadụ nile kwesịkwara ịnụ ozi ọma ahụ iji mee ihe kwekọrọ na ya ma bụrụ ndị a zọpụtara. (2 Pita 3:9) Ụfọdụ ndị nwere àgwà ma ọ bụ ikike ndị kwesịrị ịkwanyere ùgwù pụrụ iche.

N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị pụrụ iji gbalịa ịgụpụ onwe ha n’igosi ụdị nkwanye ùgwù ahụ Bible na-agba ume ya? Omenala dị n’ógbè pụrụ ikwu onye e kwesịrị inye nsọpụrụ na-adabere n’ọkwá, ụcha akpụkpọ ahụ́, n’ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, ahụ́ ike, afọ ndụ, akụ̀ na ụba, ma ọ bụ n’ọkwá ya n’ọha na eze. Nrụrụ aka zuru ebe nile nke ndị ọrụ gọọmenti emewo ka a ghara ịdị na-akwanyere ndị nọ n’ike ọchịchị ùgwù. N’ala ụfọdụ, ndị mmadụ enweghị obi ụtọ ma ọlị banyere ọnọdụ ha ná ndụ, ikekwe ha na-arụ ọrụ ruo ogologo oge nanị iji nweta ihe ndị ha ga-eji gboo mkpa ndị bụ́ isi, ndị na-enweghị nkwanye ùgwù gbakwara ha gburugburu. Ndị ntorobịa na-enwe nrụgide site n’aka ndị ọgbọ ha ka ha sonyere ha n’inupụ isi megide ndị nkụzi nakwa ndị isi ndị ọzọ a na-enweghị mmasị n’ebe ha nọ. Ngosi a na-egosi ụmụaka ịghọgbu na ịchịkwa ndị mụrụ ha na telivishọn na-enwe mmetụta n’ahụ́ ọtụtụ n’ime ha. Ọ na-achọ mgbalị iji gbochie echiche ụwa ndị dị otú ahụ ịgbanwe otú anyị si ele ndị ọzọ anya. Ma, mgbe anyị kwanyeere ndị mmadụ ùgwù, nke a na-eme ka e nwee ọnọdụ nke na-eme ka o kwe omume karị ikwurịta okwu.

Ijekwuru Mmadụ n’Ụzọ Nkwanye Ùgwù. A na-atụ anya ka onye na-arụ ọrụ okpukpe gosi nkwanye ùgwù site n’iji ejiji na ịkpa àgwà otú kwesịrị ekwesị. Ihe a na-ewere dị ka àgwà kwesịrị ekwesị na-adị iche site n’otu ebe gaa n’ọzọ. Ụfọdụ ndị na-ewere mmadụ ikpu okpu ma ọ bụ itinye aka n’akpa mgbe ọ na-agakwuru onye ọzọ dị ka enweghị nkwanye ùgwù. N’ebe ndị ọzọ, ndị mmadụ pụrụ ịnabata ụdị omume ahụ. Buru n’uche otú e si ele ihe anya n’ógbè ka ị ghara imejọ ndị ọzọ. Ime otú ahụ pụrụ inyere gị aka izere ihe ndị ga-egbochi gị ikwusa ozi ọma ahụ n’ụzọ dị irè.

Otú ahụ ka ọ dịkwa banyere ụzọ anyị si agwa ndị ọzọ okwu, karịsịa ndị agadi. A na-ewerekarị ya dị ka enweghị nsọpụrụ bụ́ ndị ntorobịa ịkpọ ndị okenye aha ha ọ gwụla ma ha natara ikike ime otú ahụ. N’ebe ụfọdụ, a na-atụkwa anya ka ndị okenye ghara ịkpọ ndị ha na-amabughị aha ha. Ọzọkwa, ọtụtụ asụsụ na-eji “unu” ma ọ bụ okwu ndị ọzọ eme ihe iji kwanyere onye mere okenye karị ma ọ bụ onye nọ n’ọchịchị ùgwù.

Igosi n’Ụzọ Nkwanye Ùgwù na Ị hụrụ Mmadụ. N’ógbè ndị dị ntakịrị karị, a na-atụ anya ka i gosi onye ọ bụla i zutere, mgbe ị na-aga n’ụzọ ma ọ bụ na-abanye n’ọnụ ụlọ, na ị hụrụ ya. A na-eme nke a site n’ikele ekele nkịtị, ịmụmụ ọnụ ọchị, ikwe n’isi, ma ọ bụ ọbụna igbu iku anya. A na-ewere ileghara onye ọzọ anya dị ka enweghị nkwanye ùgwù.

Otú ọ dị, ụfọdụ ndị pụrụ iwere ya na i leghaara ha anya ọ bụrụgodị na i gosi na ị hụrụ ha. N’ụzọ dị aṅaa? N’ihi na ha nwere ike ịchọpụta na i kelere ha nanị ekele elu ọnụ. A na-agụnyekarị ndị mmadụ n’otu ìgwè n’ihi ọdịdị ha. A na-ezerekarị ndị nwere nkwarụ na nsogbu ahụ́ ike. N’agbanyeghị nke ahụ, Okwu Chineke na-egosi anyị ụzọ isi na-emeso ndị dị otú ahụ n’ịhụnanya na ná nkwanye ùgwù. (Mat. 8:2, 3) Mmehie anyị ketara site n’aka Adam na-emetụta anyị nile n’ụzọ ụfọdụ. Ị̀ ga-enwe mmetụta nke ịbụ onye a na-akwanyere ùgwù ma ọ bụrụ na ndị ọzọ na-eji ntụpọ i nwere akọwa gị mgbe nile? Ọ̀ bụ na ị gaghị enwe mmasị karị ka e jiri ọtụtụ àgwà ọma i nwere mara gị?

Nkwanye ùgwù na-agụnyekwa ịkwanyere ịbụisi ùgwù. N’ebe ụfọdụ, ọ na-adị mkpa ibu ụzọ gwa onyeisi ezinụlọ tupu a na-agbara ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ya àmà. Ọ bụ ezie na ọrụ ime nkwusa na izi ihe anyị sitere n’aka Jehova, anyị maara na ọ bụ ndị mụrụ ụmụ ka Chineke nyere ikike ịzụ, inye ịdọ aka ná ntị, na iduzi ụmụ ha. (Efe. 6:1-4) N’ihi ya, mgbe ị gara n’otu ebe obibi, ọ na-abụkarị ihe kwesịrị ekwesị ibu ụzọ gwa ndị mụrụ ụmụ tupu i soro ụmụaka nwee ogologo mkparịta ụka ọ bụla.

Ka mmadụ na-eme agadi otú ahụ ka ọ na-enwekwu ahụmahụ ná ndụ bụ́ nke a na-aghaghị ịkwanyere ùgwù. (Job 32:6, 7) Ịmata nke a nyeere otu nwanna nwanyị na-eto eto bụ́ onye ọsụ ụzọ nọ na Sri Lanka aka bụ́ onye kpọtụụrụ otu agadi nwoke. Na mbụ, ọ nabataghị nleta ya, na-asị: “Olee otú onye na-eto eto dị ka gị ga-esi kụziere m Bible?” Ma ọ zara ya, sị: “N’eziokwu, abịaghị m ịkụziri gị ihe kama iso gị kerịta ihe m mụtara nke nyere m obi ụtọ dị ukwuu nke na aghaghị m ịkọrọ ya ndị ọzọ.” Azịza ahụ ùgwù dị na ya nke onye ọsụ ụzọ ahụ nyere kpaliri mmasị nwoke ahụ. “Ngwa, gwa m, gịnị ka ị mụtara?” ka ọ jụrụ. “Amụtawo m ụzọ isi dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi,” ka ọ sịrị. Agadi nwoke ahụ malitere iso Ndịàmà Jehova mụọ Bible. Ọ bụghị ndị agadi nile ga-ekwupụta na ha chọrọ ka a kwanyere ha ùgwù otú ahụ, ma ọ ga-amasị ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha.

Otú ọ dị, a pụrụ igosi nkwanye ùgwù gabiga ókè. N’àgwàetiti ndị dị na Pacific na n’ebe ndị ọzọ, iji utu aha ndị a na-ejikarị eme ihe mee ihe n’ụzọ nkwanye ùgwù mgbe a na-abanye n’obodo ma ọ bụ na-agakwuru ndị isi obodo pụrụ inyere Ndịàmà aka inweta ndị ga-ege ntị nakwa ohere ịgwa ma ndị isi ma ndị ha na-achị okwu. Ma, ọ dịghị mkpa inye otuto ọnụ efu, o kwesịghịkwa ekwesị. (Ilu 29:5) N’otu aka ahụ, asụsụ pụrụ inwe utu aha nkwanye ùgwù dị ka ihe so n’ụtọ asụsụ ya, ma nkwanye ùgwù Ndị Kraịst adịghị achọ ka e jiri ọtụtụ utu aha gabigara ókè mee ihe.

Ikwu Okwu n’Ụzọ Nkwanye Ùgwù. Bible na-agba anyị ume iji “obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù miri emi” kọwaa ihe mere anyị ji nwee olileanya anyị nwere. (1 Pita 3:15) Ya mere, ọ bụ ezie na anyị pụrụ inwe ike ikpughe ihie ụzọ dị n’echiche onye ọzọ n’egbughị oge, ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya bụ́ ime ya n’ụzọ akwanyereghị ya ùgwù? Ọ̀ bụ na ọ gaghị aka mma iji ndidi gee ya ntị, ikekwe jụọ ya ihe mere o ji na-eche otú ahụ, ma buruzie mmetụta ya n’uche ka anyị so ya na-atụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ?

Ụdị ùgwù a na-akwanyere mmadụ mgbe ọ bụ nanị otu onye na ibe ya nọ kwesịkwara ịpụta ìhè mgbe a na-agwa ndị na-ege ntị okwu site n’elu ikpo okwu. Ọkà okwu nke na-akwanyere ndị na-ege ya ntị ùgwù agaghị eji obi ịta mmiri katọọ ha ma ọ bụ gosipụta àgwà na-egosi: “Unu ga-emeli ihe a ma unu chọọ ime ya n’ezie.” Nanị ihe ikwu okwu otú ahụ na-eme bụ ịkụda ndị ọzọ mmụọ. Lee ka ọ ga-esi ka mma ile ndị na-ege ntị anya dị ka ìgwè ndị hụrụ Jehova n’anya, chọọkwa ijere ya ozi! N’iṅomi Jizọs, anyị kwesịrị igosi nghọta mgbe anyị na-emeso ndị ọ pụrụ ịbụ na ha adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ ihe, na ha enwechaghị ahụmahụ, ma ọ bụ na ha na-egbutụ oge n’itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ.

Ndị na-ege ntị ga-achọpụta ùgwù ọkà okwu na-akwanyere ha ma ọ bụrụ na ọ gụnye onwe ya n’onye itinye Okwu Chineke n’ọrụ n’ụzọ zuru ezu karị dị mkpa. Ya mere, ọ bụ ihe amamihe dị na ya izere ịdị na-eji nnọchiaha onwe onye bụ́ “gị, i,” ma ọ bụ “ị” na-eme ihe mgbe nile mgbe ị na-akọwa akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, rịba ama ihe dị iche n’ajụjụ bụ́ “Ị̀ na-eme ihe nile i nwere ike ime?” na okwu bụ́ “Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Ana m eme ihe nile m nwere ike ime?’” Isi ihe dị n’ajụjụ abụọ ahụ bụ otu ihe ahụ, ma nke mbụ na-egosi na ọkà okwu edebeghị onwe ya na ndị na-ege ya ntị n’otu ọkwá. Nke abụọ na-agba onye ọ bụla ume, gụnyere ọkà okwu, inyocha ọnọdụ ya na ebumnobi ya.

Guzogide ọnwụnwa nke ikwu ihe ndị na-atọ ọchị nanị iji mee ka ndị na-ege ntị chịa ọchị. Nke a na-ewetulata ùgwù nke ozi Bible. N’eziokwu, anyị kwesịrị inwe obi ụtọ n’ozi anyị na-ejere Chineke. A pụrụ ọbụna inwe akụkụ ụfọdụ na-atọtụ ọchị n’ihe omume e kenyere anyị. Ma, ime ka okwu ndị siri ike ghọọ ihe na-atọ ọchị na-egosi enweghị nkwanye ùgwù maka ndị na-ege ntị nakwa maka Chineke.

Ka ụzọ anyị si agakwuru ndị ọzọ, omume anyị, na okwu anyị na-egosi mgbe nile na anyị amalitewo ile ndị ọzọ anya otú Jehova kụziiri anyị isi na-ele ha.

ỤZỌ ISI MEE YA

  • Mata otú Jehova si ele ndị mmadụ anya.

  • Kwanyere ịbụisi, afọ ndụ, na ikike ùgwù.

  • Nye ndị mmadụ ohere ikwu uche ha.

  • Ghọta ndị na-ege gị ntị.

IHE OMUME: Chee echiche banyere otu onye tọrọ gị nke ọma ma ọ bụ onye ị tọrọ nke ọma. Chee echiche otú ị ga-esi gakwuru onye ahụ, ihe ị pụrụ ikwu iji malite mkparịta ụka, na ihe ị ga-eme iji kwanyere onye ahụ na ihe ndị o kwuru ùgwù n’ezie. Gaa n’ihu n’ime ihe i mere atụmatụ ya.

Ụzọ ndị m pụrụ isi gosikwuo nkwanye ùgwù

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya