Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be ihe ọmụmụ 47 p. 247-p. 250 para. 1
  • Iji Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Eme Ihe n’Ụzọ Dị Irè

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iji Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Eme Ihe n’Ụzọ Dị Irè
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Atụ Ndị Sitere n’Ọnọdụ Ndị A Maara nke Ọma
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Iji Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Akụzi Ihe nke Ọma
    Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe
  • A Kwanyeere Ndị Ọzọ Ùgwù
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Jiri Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Na-akụzi Ihe
    Ozi Alaeze Anyi—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be ihe ọmụmụ 47 p. 247-p. 250 para. 1

IHE ỌMỤMỤ NKE 47

Iji Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Eme Ihe n’Ụzọ Dị Irè

Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

Jiri ihe osise, map, chaatị, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ mee ka isi ihe ndị dị mkpa ị na-akụzi dokwuo anya.

Gịnị mere o ji dị mkpa?

Ihe a na-ahụ anya na-emekarị ka ihe doo anya karị ma ọ bụ ka o nwee mmetụta na-adịte aka n’uche karịa okwu ọnụ.

GỊNỊ mere ị ga-eji jiri ihe ndị a na-ahụ anya mee ihe mgbe ị na-ezi ihe? N’ihi na ime otú ahụ pụrụ ime ka izi ihe gị dịkwuo irè. Jehova Chineke na Jizọs Kraịst jiri ihe ndị a na-ahụ anya mee ihe, anyị pụkwara ịmụta ihe site n’aka ha. Mgbe e jikọtara ihe ndị a na-ahụ anya na okwu ọnụ, a na-eji anya na ntị enweta ihe ọmụma. Nke a pụrụ inye aka mee ka ndị na-ege gị ntị nọgide na-ege ntị ma mee ka mmetụta o nwere dị ike karị. Olee otú ị pụrụ isi webata ihe ndị a na-ahụ anya mgbe ị na-ezi ozi ọma? Olee otú ị pụrụ isi jide n’aka na i ji ha eme ihe n’ụzọ dị irè?

Otú Ndị Ozizi Kasị Ukwuu Si Jiri Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Mee Ihe. Jehova ji ihe ndị a na-ahụ anya bụ́ ndị a na-echeta ngwa ngwa kụzie ihe ndị dị mkpa. Otu abalị, ọ kpọpụtara Ebreham n’èzí wee, sị: “Biko, legide anya n’ebe eluigwe dị, gụọ kpakpando, ọ bụrụ na ị pụrụ ịgụ ha. . . . Otú a ka mkpụrụ gị ga-adị.” (Jen. 15:5) Ọ bụ ezie na ihe o kwere nkwa ya yiri ihe na-agaghị ekwe omume dị ka mmadụ si ele ihe anya, o metụrụ Ebreham n’ahụ́ nke ukwuu, o tinyekwara okwukwe n’ebe Jehova nọ. N’oge ọzọ, Jehova zigara Jeremaịa n’ụlọ onye na-akpụ ite, meekwa ka ọ banye n’ebe ọkpụite ahụ na-anọ arụ ọrụ ma kirie mgbe nwoke ahụ na-akpụ ụrọ. Lee ihe mmụta a na-apụghị ichefu echefu ọ bụ banyere ikike Onye Okike nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ! (Jer. 18:1-6) Oleekwa otú Jona pụrụ isi chefuo ihe mmụta Jehova ji osisi ogiri ụgba ahụ kụziere ya banyere ebere? (Jona 4:6-11) Jehova ọbụna gwara ndị amụma ya ka ha jiri arịa ụfọdụ kwesịrị ekwesị mee ihe ngosi nke ozi amụma dị iche iche. (1 Eze 11:29-32; Jer. 27:1-8; Ezik. 4:1-17) Ụlọikwuu ahụ na akụkụ dị iche iche nke ụlọ nsọ ahụ bụcha n’onwe ha ihe nnọchiteanya ndị na-enyere anyị aka ịghọta ihe ndị dị n’eluigwe. (Hib. 9:9, 23, 24) Chineke jikwara ọhụụ mee ihe ọtụtụ ugboro iji zie ozi ndị dị mkpa.—Ezik. 1:4-28; 8:2-18; Ọrụ 10:9-16; 16:9, 10; Mkpu. 1:1.

Olee otú Jizọs si jiri ihe ndị a na-ahụ anya mee ihe? Mgbe ndị Farisii na ndị na-eso ụzọ Herọd nwara ijide ya n’okwu ọnụ ya, Jizọs kwuru ka e wetara ya otu dinarịọs, ọ dọkwaara uche gaa n’onyinyo Siza nke dị ná mkpụrụ ego ahụ. Ọ kọwaziri na e kwesịrị inyeghachi Siza ihe nke Siza ma nyeghachi Chineke ihe nke Chineke. (Mat. 22:19-21) Iji kụzie ihe banyere iji ihe nile anyị nwere na-asọpụrụ Chineke, Jizọs zoro aka n’otu nwanyị di ya nwụrụ, onye dara ogbenye, nke nọ n’ụlọ nsọ ahụ bụ́ onye onyinye o nyere—obere mkpụrụ ego abụọ—bụ ihe nile o ji biri. (Luk 21:1-4) N’oge ọzọ, o jiri otu nwatakịrị mee ihe atụ nke ịdị umeala n’obi, enweghị oké ọchịchọ. (Mat. 18:2-6) Ya onwe ya gosiri ihe ịdị umeala n’obi pụtara site n’ịsa ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya.—Jọn 13:14.

Ụzọ Isi Jiri Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Mee Ihe. N’adịghị ka Jehova, anyị apụghị isite n’ọhụụ zie ozi. Ma, a na-enwe ná mbipụta dị iche iche nke Ndịàmà Jehova ọtụtụ ihe osise ndị na-akpali iche echiche. Jiri ha nyere ndị nwere mmasị aka iji anya nke uche ha hụ Paradaịs elu ala ahụ, bụ́ nke e kwere nkwa ya n’ime Okwu Chineke. N’ọmụmụ Bible ebe obibi, ị pụrụ ịdọrọ uche onye a na-amụrụ ihe gaa n’otu ihe osise nke metụtara ihe unu na-amụ ma gwa ya ka ọ kọọrọ gị ihe ọ na-ahụ. Ọ dị mma ịrịba ama na mgbe e mere ka Emọs onye amụma hụ ọhụụ ụfọdụ, Jehova jụrụ ya, sị: “Gịnị ka gị onwe gị na-ahụ, Emọs?” (Emọs 7:7, 8; 8:1, 2) Ị pụrụ ịjụ ajụjụ ndị yiri ya ka ị na-adọrọ uche ndị mmadụ aga n’ihe osise ndị e zubere ka ha bụrụ ihe ndị a na-ahụ anya e ji akụzi ihe.

Ọ bụrụ na i depụta usoro mgbakọ na mwepụ ma ọ bụ jiri usoro ngụkọ oge bụ́ nke na-egosi usoro ihe ndị dị mkpa ji mee, na-eme ihe, nke a pụrụ inyere ndị mmadụ aka ịghọta ngwa ngwa karị, amụma ndị dị ka “oge asaa” nke dị na Daniel 4:16 na ‘iri izu asaa’ nke dị na Daniel 9:24. Ihe ndị dị otú ahụ a na-ahụ anya dị n’ọtụtụ akwụkwọ anyị ji amụ ihe.

N’ọmụmụ Bible ezinụlọ unu, a pụrụ ime ka ntụle nke ihe ndị dị ka ụlọikwuu, ụlọ nsọ dị na Jeruselem, na ụlọ nsọ ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ dịkwuo mfe nghọta ma ọ bụrụ na unu ejiri ihe osise mee ihe. A pụrụ ịchọta ha n’Insight on the Scriptures, ihe odide ntụkwasị nke New World Translation of the Holy Scriptures—With References, na mbipụta Ụlọ Nche dị iche iche.

Mgbe gị na ezinụlọ gị na-agụ Bible, jiri map mee ihe nke ọma. Chọpụta ụzọ Ebreham si gaa mgbe o si Ua gaa Heran, gbadaakwa Betel. Nyochaa ụzọ ndị Izrel si gaa mgbe mba ahụ hapụrụ Ijipt gawa Ala Nkwa ahụ. Chọpụta ebe e kenyere ebo nke ọ bụla n’Izrel dị ka ihe nketa. Lee otú ógbè Solomọn chịrị bururu n’ibu. Chọpụta ụzọ Ịlaịja si mgbe o si Jezreel gbaga n’ọzara gafere Bia-sheba mgbe Jezebel yisịrị ya egwu. (1 Eze 18:46–19:4) Chọpụta obodo dịgasị iche iche Jizọs mere nkwusa na ha. Chọpụta ụzọ Pọl si mee njem, dị ka a kọwara n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi.

Ihe ndị a na-ahụ anya na-aba uru mgbe a na-eme ka ndị a na-amụrụ Bible mata otú ọgbakọ si arụ ọrụ. Ị pụrụ igosi onye ị na-amụrụ ihe otu usoro ihe omume e biri ebi ma kọwaa ụdị ihe ọmụma anyị na-atụle ná mgbakọ dị iche iche. Ọtụtụ ndị enwewo mmasị ná nleta ha mere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova. Nke a pụrụ ịbụ ụzọ dị irè isi wepụ echiche ndị na-ezighị ezi e nwere banyere ọrụ anyị na nzube ya. Mgbe ị na-edugharị mmadụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, kọọrọ ya otú o si dị iche n’ebe ndị ọzọ a na-anọ efe ofufe. Mesie ya ike na ọ bụ ebe e wuru n’ụzọ na-adịghị okomoko nke a na-anọ amụ ihe. Kọwapụta ihe dị iche iche a haziri karịsịa maka ozi anyị na-ejere ọha—ebe ndị anyị na-ekesa akwụkwọ, map ókèala, na igbe onyinye (n’abụghị efere e ji anakọta ụtụ).

N’ebe e nwere vidio ndị a kwadebere n’okpuru ntụziaka nke Òtù Na-achị Isi, jiri ha mee ka e nwee obi ike na Bible, mee ka ndị a na-amụrụ ihe mata banyere ọrụ Ndịàmà Jehova, ma gbaa ndị na-ekiri ha ume ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible.

Iji Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Eme Ihe Maka Ìgwè Ndị Buru Ibu Karị. Mgbe a kwadebere ma gosi ha n’ụzọ dị mma, ihe ndị a na-ahụ anya pụrụ ịbụ ụzọ dị irè isi zie ìgwè buru ibu karị ihe. Òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche na-ewepụta ihe ndị dị otú ahụ a na-ahụ anya n’ụdị dị iche iche.

Isiokwu ndị dịịrị ọmụmụ n’Ụlọ Nche na-enwekarị ihe ndị a na-ahụ anya n’ụdị ihe osise ndị onye nduzi pụrụ iji mesie isi ihe ndị dị mkpa ike. Otú ahụ ka ọ dịkwa akwụkwọ ndị a na-eji eme ihe n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ.

Ihe ndepụta ụfọdụ maka okwu ihu ọha nwere ike ịbụ ndị a pụrụ iji ihe ndị a na-ahụ anya mee ihe na ha iji kọwaa isi ihe ụfọdụ. Otú ọ dị, a na-arụpụtakarị ihe bara uru karị site n’ilekwasị anya n’ihe dị n’ime Bible, bụ́ nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị na-ege ntị na-eji n’aka. Ọ bụrụ na n’otu oge, ọ dị mkpa ka e jiri otu ihe osise ma ọ bụ ndepụta nke ihe ndị bụ́ isi ihe mee ihe iji wepụta otu isi ihe ma ọ bụ ọtụtụ isi ihe dị n’okwu, buru ụzọ mee nchọpụta iji jide n’aka na a pụrụ ịnọ n’azụ azụ nke ebe e zukọrọ hụ ya nke ọma (ma ọ bụ gụta ya). E kwesịrị iselata aka n’otú e si eji ihe ndị dị otú ahụ eme ihe.

Nzube anyị na-eji eji ihe ndị a na-ahụ anya eme ihe mgbe anyị na-ekwu okwu ma ọ bụ na-ezi ihe abụghị iji mee ihe ọchị. Mgbe e ji ihe a na-ahụ anya ùgwù dị na ya mee ihe, o kwesịrị ime ka echiche ndị e kwesịrị imesi ike n’ụzọ pụrụ iche pụta ìhè site n’ịhụ ha anya. Ihe ndị dị otú ahụ na-aba uru mgbe ha na-enye aka ime ka ihe e kwuru n’ọnụ dokwuo anya, na-eme ka ọ dịkwuo mfe nghọta, ma ọ bụ mgbe ha na-enye ihe àmà gbara ọkpụrụkpụ na ihe e kwuru bụ eziokwu. Mgbe e ji ya mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ihe a na-ahụ anya nke dabara adaba pụrụ inwe mmetụta dị ike nke na a ga na-echeta ma ihe ahụ a na-ahụ anya ma ihe e ji ya kụzie ruo ọtụtụ afọ.

Ikike ịnụ ihe na ịhụ ụzọ na-arụcha ọrụ dị mkpa n’ịmụta ihe. Cheta otú Ndị Ozizi kasị ukwuu siworo jiri ikike ndị a mee ihe, gbalịakwa iṅomi ha ná mgbalị ị na-eme iji ruo n’obi ndị ọzọ.

IHE NDỊ A NA-AHỤ ANYA DỊ IRÈ . . .

  • Kwesịrị ime ka ihe ndị e kwesịrị imesi ike n’ụzọ pụrụ iche pụta ìhè ma ọ bụ dokwuo anya.

  • Kwesịrị ka ọ bụrụ izi ihe bụ nzube ha bụ́ isi.

  • Kwesịrị ịbụ nke ndị nile na-ege ntị na-ahụ nke ọma ma ọ bụrụ na e ji ha na-eme ihe n’elu ikpo okwu.

IHE OMUME: Depụta n’okpuru ebe a ihe ndị a na-ahụ anya ị pụrụ iji mee ihe . . .

Iji mee ka e nwee ekele maka nzukọ Jehova

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

Iji kụziere nwatakịrị eziokwu ụfọdụ sitere na Bible

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya