IHE ỌMỤMỤ NKE 33
E Gosipụtara Akọ Ma Guzosie Ike
AKỌ bụ gị na ndị ọzọ inwe ike imekọ ihe n’akpasughị ha iwe n’ụzọ na-adịghị mkpa. Ọ na-agụnye ịmata mgbe ị ga-ekwu okwu na otú ị ga-esi kwuo ya. Nke a apụtaghị ikweta ime ihe na-ezighị ezi ma ọ bụ ịgbanwe eziokwu. E kwesịghị iwere ịdị akọ dị ka ịtụ egwu mmadụ.—Ilu 29:25.
Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ihe kasị mma na-eme ka a dị akọ. Ya mere, onye ịhụnanya na-akwali adịghị achọ ịkpasu ndị ọzọ iwe; ọ na-achọ inyere ha aka. Onye nwere obiọma ma dị nwayọọ n’obi na-eji nwayọọ eme ihe. Onye udo na-achọ ụzọ isi mee ka ya na ndị ọzọ na-enwe mmekọrịta dị mma. Ọbụna mgbe ndị mmadụ nwere àgwà ọjọọ, onye nwere ogologo ntachi obi adịghị ewe iwe.—Gal. 5:22, 23.
Otú ọ dị, n’agbanyeghị otú e si zie ozi Bible, ọ ga-ewe ụfọdụ ndị iwe. N’ihi ajọ obi nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị Juu nke narị afọ mbụ, Jizọs Kraịst ghọọrọ ha “nkume ịsụ ngọngọ na oké nkume mmejọ.” (1 Pita 2:7, 8) N’ihe metụtara ọrụ ya nke ikwusa banyere Alaeze ahụ, Jizọs sịrị: “Abịara m ịmụnye ọkụ n’elu ụwa.” (Luk 12:49) Ozi banyere Alaeze Jehova, nke na-agụnye mkpa ọ dị ka ụmụ mmadụ nakwere ọbụbụeze nke Onye Okike ha, anọgidewokwa bụrụ isiokwu nke chọrọ ime ihe ngwa ngwa nke na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu. Ọtụtụ ndị na-ewe iwe banyere ozi ahụ bụ́ na Alaeze Chineke ga-ewepụ ajọ usoro ihe dị ugbu a n’isi nso. Ma, n’irubere Chineke isi, anyị nọgidere na-eme nkwusa. Otú ọ dị, ka anyị na-eme otú ahụ, anyị na-eburu n’uche ndụmọdụ Bible bụ́: “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, bụrụnụ ndị ha na mmadụ nile na-adị n’udo.”—Rom 12:18.
Ịdị Akọ Mgbe A Na-agba Àmà. Anyị na-agwa ndị ọzọ ihe ndị anyị kwere n’ọtụtụ ọnọdụ. N’ezie, anyị na-eme otú ahụ mgbe anyị nọ n’ozi ubi, ma anyị na-achọkwa ohere ndị kwesịrị ekwesị iji mee ya mgbe anyị na ndị ikwu anyị, ndị ọrụ ibe anyị, na ụmụ akwụkwọ ibe anyị nọ. N’ọnọdụ a nile, a chọrọ akọ.
Ọ bụrụ na anyị ezie ozi Alaeze ahụ n’ụzọ ga-eme ka ndị ọzọ chee na anyị na-agwa ha okwuchukwu, ha pụrụ ịjụ ya. Mgbe ha na-arịọghị enyemaka, ikekwe ha ahụghị mkpa ọ dị, ha pụrụ iwe iwe mgbe e kwuru ihe ọ bụla na-enye echiche na ọ dị mkpa ka a gbazie ha. Olee otú anyị pụrụ isi zere inye echiche na-ezighị ezi? Ịmụta otú e si enwe mkparịta ụka enyi na enyi pụrụ inye aka.
Gbalịa ịmalite mkparịta ụka site n’iwelite isiokwu na-amasị onye nke ọzọ. Ọ bụrụ na onye ahụ bụ onye ikwu gị, onye ọrụ ibe gị, ma ọ bụ nwa akwụkwọ ibe gị, ọ pụrụ ịbụ na ị maraworị ihe ndị na-amasị ya. Ọ bụrụgodị na ị hụtụbeghị onye ahụ, ị pụrụ iwelite ihe ị nụrụ n’akụkọ ụwa ma ọ bụ gụta n’akwụkwọ akụkọ. Isiokwu ndị dị otú ahụ na-abụkarị ihe ọtụtụ ndị na-eche banyere ha. Mgbe ị na-arụ ọrụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-eleru anya. Ihe ndị e ji chọọ ụlọ mma, ihe ụmụaka ji egwuri egwu bụ́ ndị tọgbọgasị gburugburu, ihe okpukpe, na ihe ndị a mapanyere n’ụgbọala a dọwara n’ụzọ mbata pụrụ igosikwu ihe ndị na-amasị onye nwe ụlọ. Mgbe onye nwe ụlọ bịara n’ọnụ ụzọ, gee ntị mgbe ọ na-ekwu okwu. Ihe o kwuru ga-akwado ma ọ bụ mee ka ị gbanwee obi gị banyere ihe ndị i chere na-amasị ya na echiche ya, ọ ga-egosikwukwa gị ihe ndị ọ dị mkpa ka i chebara echiche iji gbaa àmà.
Ka mkparịta ụka ahụ nọ na-aga n’ihu, soro ya kerịta isi ihe ndị sitere na Bible na n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible bụ́ ndị metụtara ihe unu na-ekwu. Ma ewegharala mkparịta ụka ahụ. (Ekli. 3:7) Mee ka onye nwe ụlọ na-ekere òkè ná nkwurịta okwu ahụ ma ọ bụrụ na ọ dị njikere ikere òkè. Nwee mmasị n’echiche ya. Ndị a pụrụ igosi gị ihe ndị dị gị mkpa iji dị akọ.
Tupu i kwuo okwu, tụlee otú ha ga-ada ná ntị onye nke ọzọ. Ilu 12:8 na-aja ọnụ nwere “ezi uche” mma. A na-ejikọta okwu Hibru e ji mee ihe n’ebe a na ihe ndị dị ka nghọta na inwe uche. Ya mere, ezi uche na-agụnye ịkpachara anya n’ihe anyị na-ekwu n’ihi ichebara otu okwu echiche nke ọma iji mee ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. Ilu 12 Amaokwu nke 18 nke otu isiakwụkwọ ahụ n’Ilu na-adọ aka ná ntị megide ikwu “okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha.” Anyị pụrụ ịnọgide na-akwado eziokwu Bible n’akpasughị ndị ọzọ iwe.
Nanị iji akọ na-ahọrọ okwu ị ga-eji mee ihe pụrụ inyere gị aka izere ịkpalite ihe mgbochi n’ụzọ na-enweghị isi. Ọ bụrụ na iji okwu bụ́ “Bible” eme ihe na-eme ka a ghara inwe mmasị ige ntị, ị pụrụ iji okwu dị ka “ihe odide dị nsọ” ma ọ bụ “akwụkwọ a na-ebipụta ugbu a n’ihe karịrị asụsụ 2,000” mee ihe. Ọ bụrụ na i zoo aka na Bible, ị pụrụ ịjụ onye ahụ ihe o chere banyere ya ma buruzie ihe o kwuru n’uche ka mkparịta ụka ahụ na-aga n’ihu.
Ịdị akọ na-agụnyekarị ikpebi oge kwesịrị ekwesị iji kwuo ihe ụfọdụ. (Ilu 25:11) O nwere ike ị gaghị ekweta ihe nile onye nke ọzọ kwuru, ma ọ dịghị mkpa ịgbaghawa ihe ọ bụla o kwuru nke na-ekwekọghị n’Akwụkwọ Nsọ. Agbalịla ịgwa onye nwe ụlọ ihe nile n’otu oge. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “M ka nwere ọtụtụ ihe ịgwa unu, ma unu enweghị ike ịnagide ha ugbu a.”—Jọn 16:12.
Mgbe o kwere mee, jiri obi eziokwu jaa ndị ị na-agwa okwu mma. Ọbụna mgbe onye nwe ụlọ na-arụ ụka, ị ka nwere ike ịja ya mma maka inwe otu echiche. Pọl onyeozi mere nke a mgbe ọ na-agwa ndị ọkà ihe ọmụma okwu n’Ariopagọs nke dị n’Atens. Ndị ọkà ihe ọmụma so “ya na-arụrịta ụka.” Olee otú ọ pụrụ isi mee ka isi ihe ọ na-ekwu doo anya n’akpasughị ha iwe? Tupu mgbe ahụ, ọ hụrụ ọtụtụ ebe ịchụàjà ha wuuru chi ha dị iche iche. Kama ịkatọ ndị Atens maka ikpere arụsị ha, o ji akọ jaa ha mma maka ojiji ha ji okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu. Ọ sịrị: “Ahụrụ m na n’ihe nile o yiri ka unu na-atụ chi dị iche iche egwu karịa otú ndị ọzọ na-atụ.” Ụzọ a o si malite megheere ya ụzọ izi ozi ya banyere ezi Chineke ahụ. N’ihi ya, ụfọdụ ghọrọ ndị kwere ekwe.—Ọrụ 17:18, 22, 34.
Iwe ewela gị mgbe e welitere ihe mgbochi. Wetuo obi. Were ha dị ka ohere iji ghọtakwuo ihe onye ahụ na-eche. Ị pụrụ ikele ya maka ikwupụta echiche ya. Gịnịkwanụ ma o kwuo n’ike, sị: “Enwere m okpukpe nke m”? Ị pụrụ iji akọ jụọ ya, sị: “Ị̀ bụ onye ji okpukpe kpọrọ ihe kemgbe ndụ gị?” Mgbe ọ zasịziri, kwukwasị: “Ì chere na a ga-enwe oge ihe a kpọrọ mmadụ ga na-ekpe otu okpukpe?” Nke a pụrụ imeghe ụzọ maka inwekwu mkparịta ụka.
Inwe echiche ziri ezi banyere onwe anyị pụrụ inyere anyị aka ịdị akọ. Anyị kwenyesiri ike n’izi ezi nke ụzọ Jehova nakwa n’ịbụ eziokwu nke Okwu ya. Anyị ji nkwenye na-ekwu banyere ihe ndị a. Ma ọ dịghị ihe mere anyị ga-eji bụrụ ndị ezi omume n’anya onwe anyị. (Ekli. 7:15, 16) Anyị nwere ekele na anyị maara eziokwu ahụ ma na-enweta ngọzi Jehova, ma anyị maara nke ọma na anyị inweta nnwapụta ya bụ n’ihi obiọma ya na-erughịrị anyị nakwa okwukwe anyị nwere na Kraịst, ọ bụghị n’ihi ezi omume nke anyị. (Efe. 2:8, 9) Anyị maara mkpa ọ dị ‘ịnọgide na-anwale ma anyị nọ n’okwukwe ahụ, ịnọgide na-anwapụta ihe anyị onwe anyị bụ.’ (2 Kọr. 13:5) Ya mere mgbe anyị na-agwa ndị mmadụ banyere mkpa ọ dị ime ihe Chineke na-achọ, anyị na-eji ịdị umeala n’obi na-etinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ n’onwe anyị. Ọ bụghị anyị ka ọ dịịrị ikpe mmadụ ibe anyị ikpe. Jehova ‘enyefewo ikpe ikpe nile n’aka ọkpara ya,’ anyị aghaghịkwa ịza ajụjụ maka ihe anyị na-eme n’ihu oche ikpe ya.—Jọn 5:22; 2 Kọr. 5:10.
Mgbe Anyị na Ndị Ezinụlọ na Ndị Kraịst Ibe Anyị Nọ. Anyị iji akọ eme ihe ekwesịghị ịbụ nanị n’ozi ubi. Ebe ịdị akọ bụ ngosipụta nke mkpụrụ nke mmụọ Chineke, anyị kwesịkwara ịdị akọ n’ụlọ mgbe anyị na-emeso ndị òtù ezinụlọ anyị ihe. Ịhụnanya ga-akpali anyị ichebara mmetụta nke ndị ọzọ echiche. Di Eze Nwanyị Esta abụghị onye na-efe Jehova, ma Esta kwanyeere ya ùgwù ma gosi nnukwute ezi uche mgbe ọ na-akọrọ ya ihe metụtara ndị ohu Jehova. (Esta, isi 3-8) N’ọnọdụ ụfọdụ, iji akọ na-emeso ndị òtù ezinụlọ na-abụghị Ndịàmà pụrụ ịchọ ka anyị kwe ka àgwà anyị, kama ịbụ nkọwa nke ihe ndị anyị kwere, mee ka ha nwee mmasị n’ụzọ nke eziokwu.—1 Pita 3:1, 2.
N’otu aka ahụ, eziokwu ahụ bụ́ na anyị maara ndị òtù ọgbakọ nke ọma apụtaghị na anyị pụrụ imeso ha ihe n’ejighị akọ ma ọ bụ n’obi ọjọọ. Anyị ekwesịghị iche na ha kwesịrị ịnagideli ya n’ihi na ha tozuru okè. Anyị ekwesịghịkwa ịgọpụ onwe anyị site n’ikwu, sị: “Ọ bụ otú m na-eme.” Ọ bụrụ na anyị achọpụta na otú anyị si ekwu okwu na-akpasu ndị ọzọ iwe, anyị kwesịrị ikpebisi ike ịgbanwe. ‘Ịhụnanya siri ike anyị nwere maka ibe anyị’ kwesịrị ịkpali anyị ‘ime ihe ọma n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.’—1 Pita 4:8, 15; Gal. 6:10.
Mgbe A Na-agwa Ndị Na-ege Ntị Okwu. Ọ dịkwa ndị na-ekwu okwu n’elu ikpo okwu mkpa ịdị akọ. Ihe na-emejupụta ndị na-ege ntị bụ ndị si n’ọnọdụ dị iche iche. Ha nile ahaghị nhata n’otú ha toruru n’ụzọ ime mmụọ. Ọ pụrụ ịbụ nke mbụ ụfọdụ na-abịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ndị ọzọ pụrụ ịdị na-enwe ihe isi ike nke ọkà okwu na-amaghị. Gịnị pụrụ inyere ọkà okwu aka izere ịkpasu ndị na-ege ya ntị iwe?
N’ikwekọ na ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere Taịtọs, mee ya ihe mgbaru ọsọ gị ‘ịghara ikwu okwu ọjọọ banyere onye ọ bụla, na-enwe ezi uche, na-egosi ịdị nwayọọ nile n’ebe mmadụ nile nọ.’ (Taị. 3:2) Zere iṅomi ụwa n’ojiji ọ na-eji okwu ndị na-eweda ndị si n’agbụrụ ọzọ, asụsụ ọzọ, ma ọ bụ mba ọzọ, ala, eme ihe. (Mkpu. 7:9, 10) Kwuo ihe nile Jehova chọrọ n’ezoghị ọnụ, gosikwa amamihe dị n’itinye ha n’ọrụ; ma zere ikwu okwu mweda n’ala banyere ndị na-amalitebeghị ịga ije n’ụzọ zuru ezu n’ụzọ Jehova. Kama nke ahụ, gbaa mmadụ nile ume ịghọta ihe bụ́ uche Chineke na ime ihe na-atọ ya ụtọ. Jiri ịja mma na-ekpo ọkụ, nke e ji obi eziokwu nye, melata ịdị ike nke ndụmọdụ gị. Site n’otú i si ekwu okwu na ụda olu gị, gosi ịhụnanya ụmụnna ahụ nke anyị nile kwesịrị inwe n’ebe ibe anyị nọ.—1 Tesa. 4:1-12; 1 Pita 3:8.