IHE ỌMỤMỤ NKE 38
Okwu Mmeghe nke Na-akpasu Mmasị
OKWU mmeghe bụ akụkụ dị mkpa n’okwu ọ bụla. Ọ bụrụ na ị kpasuo mmasị nke ndị na-ege gị ntị n’ezie, ha ga-aṅa ntị nke ọma karị n’ihe ga-esochinụ. N’ozi ubi, ọ bụrụ na okwu mmeghe gị akpasulighị mmasị, o nwere ike ị gaghị enwe ike ịga n’ihu n’izi ozi gị. Mgbe ị na-ekwu okwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ndị na-ege ntị agaghị ebili pụọ, ma ndị mmadụ n’otu n’otu nwere ike ịmalite iche echiche banyere ihe ndị ọzọ ma ọ bụrụ na ị dọtabeghị mmasị ha.
Mgbe ị na-akwadebe okwu mmeghe gị, buru n’uche imezu ihe ndị na-esonụ: (1) ịdọta mmasị ndị ga-ege gị ntị, (2) ime ka a mata isiokwu gị n’ụzọ doro anya, na (3) igosi ihe isiokwu ahụ ji dị ndị ga-ege gị ntị mkpa. Mgbe ụfọdụ, a pụrụ imezu ebumnobi atọ a ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’otu oge ahụ. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, a pụrụ ilebara ha anya iche iche, a pụkwara ibute nke ọ bụla ụzọ.
Ụzọ Isi Dọta Mmasị nke Ndị Na-ege Gị Ntị. Eziokwu ahụ bụ́ na ndị mmadụ ezukọtawo ịnụrụ okwu apụtaghị na ha dị njikere itinye uche ha nile n’isiokwu ahụ. N’ihi gịnị? E nwere ọtụtụ ihe chọrọ ka e lebara ha anya ná ndụ ha. Ha pụrụ ịdị na-echegbu onwe ha banyere otu nsogbu dị n’ụlọ ma ọ bụ otu nchegbu nke ndụ. Ihe ịma aka na-eche gị ihu dị ka ọkà okwu bụ ịdọta mmasị nke ndị na-ege ntị na ịhụ na ha nọgidere na-ege ntị. E nwere ihe karịrị otu ụzọ ị pụrụ isi mee ya.
Otu n’ime okwu a ma ama karịsịa e kwutụworo bụ Ozizi Elu Ugwu ahụ. Olee otú o si malite? Dị ka ihe ndekọ Luk na-ekwu, Jizọs sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị unu ndị ogbenye, . . . obi ụtọ na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a, . . . obi ụtọ na-adịrị unu ndị na-akwa ákwá ugbu a, . . . obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ọ bụla ndị mmadụ na-akpọ unu asị.” (Luk 6:20-22) Gịnị mere nke ahụ ji kpalie mmasị? N’okwu ole na ole, Jizọs gosiri na ọ maara ụfọdụ n’ime nnukwute nsogbu ndị na-ege ya ntị na-aghaghị iche ihu. Mgbe ahụ, kama ịtụlewe nsogbu ndị ahụ n’ụzọ sara mbara, o gosiri na ndị nwere ụdị nsogbu ndị ahụ ka pụrụ inwe obi ụtọ, o mekwara ya n’ụzọ mere ka ndị na-ege ya ntị chọkwuo ịnụ ihe ọ na-ekwu.
A pụrụ iji ajụjụ mee ihe n’ụzọ dị irè iji kpasuo mmasị, ma ha aghaghị ịbụ ajụjụ ndị kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na ajụjụ gị egosi na ọ bụ nanị ihe ndị na-ege ntị nụworo ka ị na-aga ikwu maka ha, mmasị ha pụrụ ibelata ngwa ngwa. Ajụla ajụjụ ndị ga-emenye ndị na-ege gị ntị ihere ma ọ bụ mee ka e lee ha anya n’ụzọ na-adịghị mma. Kama nke ahụ, gbalịa ịjụ ajụjụ gị n’ụzọ ga-akpali iche echiche. Cheretụ mgbe ị jụsịrị ajụjụ nke ọ bụla ka ndị na-ege gị ntị wee nwee ohere ichepụta azịza ya n’uche ha. Mgbe ọ dị ha ka gị na ha ùnu ji uche na-enwe mkparịta ụka, ha ga na-ege gị ntị.
Ịkọ ahụmahụ ndị mere eme bụ ụzọ ọzọ dị mma nke isi dọta mmasị. Ma nanị ịkọ otu akụkọ nwere ike ọ gaghị emezu ebumnobi gị ma ọ bụrụ na ọ dị onye na-ege ntị ahụmahụ ahụ ga-emenye ihere. Ọ bụrụ na e cheta akụkọ gị ma chefuo ihe mmụta dị na ya, i mezughị ebumnobi gị. Mgbe e ji ahụmahụ mee ihe n’okwu mmeghe, o kwesịrị ịtọ ntọala maka otu akụkụ dị mkpa n’okwu gị. Ọ bụ ezie na nkọwa ụfọdụ sara mbara pụrụ ịdị mkpa iji mee ka akụkọ na-akpali akpali, lezie anya ka ị ghara ime ka ahụmahụ ahụ too ogologo otú na-adịghị mkpa.
Ndị ọkà okwu ụfọdụ na-eji otu akụkọ dị ọhụrụ, ihe e kwuru n’otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’ógbè, ma ọ bụ ihe onye ọchịchị a ma ama kwuru, amalite okwu ha. Ndị a kwa pụrụ ịdị irè ma ọ bụrụ na ha dabara adaba n’ezie n’isiokwu ahụ ma kwesị ekwesị maka ndị na-ege ntị.
Ọ bụrụ na okwu gị so n’usoro isiokwu ọtụtụ ndị ga-ekwu ma ọ bụ ihe omume Nzukọ Ije Ozi, mgbe ahụ ọ na-akakarịsị mma ime ka okwu mmeghe gị dị nkenke ma gaa n’ihe a chọrọ. Ọ bụrụ na ị na-ekwu okwu ihu ọha, agafela oge e nyere maka okwu mmeghe. Ọ bụ ụmị okwu ahụ ga-enye ihe ọmụma ga-akasị baara ndị na-ege gị ntị uru.
Mgbe ụfọdụ ị pụrụ ịdị na-agwa ndị na-arụ ụka ma ọ bụ ọbụna ndị na-emegide emegide okwu. Olee otú ị pụrụ isi mee ka ha gee gị ntị? A kpụụrụ Stivin n’ike, bụ́ Onye Kraịst nke oge mbụ a kọwara dị ka onye “jupụtara na mmụọ nsọ na amamihe,” gaa n’ihu Sanhedrin ndị Juu. N’ebe ahụ, o ji nkwuwa okwu gbachitere Iso Ụzọ Kraịst. Olee otú o si malite? N’ụzọ nkwanye ùgwù nakwa site n’izo aka n’ihe ya na ha kwenyekọtara. “Ụmụnna m na ndị bụ́ nna m, nụrụnụ. Chineke nke ebube pụtara ìhè nye nna nna anyị bụ́ Ebreham.” (Ọrụ 6:3; 7:2) N’Ariopagọs dị n’Atens, Pọl onyeozi mere ka okwu mmeghe ya kwesị ụdị ndị na-ege ntị dị iche, na-asị: “Ndị ikom Atens, ahụrụ m na n’ihe nile o yiri ka unu na-atụ chi dị iche iche egwu karịa otú ndị ọzọ na-atụ.” (Ọrụ 17:22) N’ihi okwu mmeghe dị irè, ìgwè abụọ ahụ dị njikere igekwu ntị.
Mgbe ị nọ n’ozi ubi, ọ dịkwa mkpa ka ị dọta mmasị ndị mmadụ. Ọ bụrụ na i bughị ụzọ mee ndokwa maka nleta gị, onyenwe ụlọ pụrụ iji ọrụ ndị ọzọ n’aka. N’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, a na-atụ anya ka ndị ọbịa a na-akpọghị akpọ kwuo ihe mere ha ji bịa n’egbughị oge. N’ebe ndị ọzọ, omenala bụ na a ga-ebu ụzọ mechaa ihe ụfọdụ tupu i kwuo ihe mere i ji bịa.—Luk 10:5.
Na nke ọ bụla, inwe omume enyi n’ezie pụrụ ime ka e nwee ọnọdụ ga-adị mma maka inwe mkparịta ụka. Ọ na-abakarị uru iji ihe metụtara ihe dị onye ahụ n’uche kpọmkwem malite. Olee otú i nwere ike isi mata ihe ị ga-ekwu? Mgbe ị gakwuuru onye ahụ, ọ̀ dị ihe ọ na-eme? Ikekwe ọ nọ na-akọ ugbo, na-elekọta gburugburu ụlọ ya, na-edozi ụgbọala, na-esi nri, na-asa ákwà, ma ọ bụ na-elekọta ụmụaka. Ọ̀ dị ihe ọ na-ele—akwụkwọ akụkọ ma ọ bụ ihe na-eme n’okporo ámá? Gburugburu ụlọ ya ọ̀ na-egosi na o nwere mmasị pụrụ iche n’ịkụ azụ̀, egwuregwu, egwú, ime njem, kọmputa, ma ọ bụ ihe ọzọ? Ndị mmadụ na-enwekarị nchegbu banyere ihe ha nụrụ n’oge na-adịbeghị anya na redio ma ọ bụ hụ na telivishọn. Ajụjụ ma ọ bụ okwu dị mkpirikpi banyere nke ọ bụla n’ime ihe ndị dị otú ahụ pụrụ iduga ná mkparịta ụka enyi na enyi.
Oge Jizọs sooro nwanyị Sameria nwee nkwurịta okwu n’olulu mmiri dịdewere Saịka bụ ihe atụ dị ịrịba ama nke ụzọ isi malite mkparịta ụka n’ebumnobi nke ịgba àmà.—Jọn 4:5-26.
Ọ dị mkpa ka i jiri nlezianya kwadebe okwu mmeghe gị, karịsịa ma ọ bụrụ na ọgbakọ unu na-arụzu ókèala ya ọtụtụ ugboro. Ma ọ bụghị ya, ọ pụrụ ịbụ na ị gaghị enwe ike ịgba àmà.
Kwuo Kpọmkwem Ihe Bụ́ Isiokwu Gị. N’ọgbakọ Ndị Kraịst, dị ka ọ na-adịkarị, onyeisi oche ma ọ bụ onye bu gị ụzọ ga-akpọpụta isiokwu gị, kpọpụtakwa gị. Otú ọ dị, ọ pụrụ ịba uru ka i chetara ndị na-ege gị ntị isiokwu gị mgbe ị na-ekwu okwu mmeghe gị. Nke a pụrụ ịbụ ikwu isiokwu gị dị ka e si dee ya, ma ọ bụghị iwu na ọ ga-abụrịrị ya. Ka o sina dị, isiokwu ahụ kwesịrị iji nke nta nke nta doo anya ka okwu ahụ na-aga n’ihu. N’ụzọ ụfọdụ, i kwesịrị ịdọrọ uche gaa n’isiokwu gị mgbe ị na-ekwu okwu mmeghe gị.
Mgbe ọ na-ezipụ ndị na-eso ụzọ ya ịga mee nkwusa, Jizọs gwara ha n’ụzọ doro anya ozi ha gaje izisa. “Ka unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, ‘Alaeze nke eluigwe eruwo nso.’” (Mat. 10:7) Banyere oge anyị, Jizọs sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze.” (Mat. 24:14) A na-agba anyị ume ‘ikwusa okwu ahụ,’ ya bụ, ịraparasi ike na Bible mgbe anyị na-agba àmà. (2 Tim. 4:2) Otú ọ dị, tupu anyị asapee Bible ma ọ bụ dọrọ uche gaa n’Alaeze ahụ, ọ na-adịkarị mkpa ikwu banyere okwu a kpụ n’ọnụ nke na-echegbu ndị mmadụ. Ị pụrụ ikwu okwu banyere mpụ, enweghị ọrụ, ikpe na-ezighị ezi, agha, ụzọ isi nyere ndị na-eto eto aka, ọrịa, ma ọ bụ ọnwụ. Ma ekwutela okwu aka banyere ihe ndị na-adịghị mma; ozi gị bụ ozi na-ewuli elu. Gbalịa iche mkparịta ụka ahụ ihu n’Okwu Chineke nakwa n’olileanya Alaeze ahụ.
Gosi Ihe Mere Isiokwu ahụ Ji Dị Ndị Na-ege Gị Ntị Mkpa. Ọ bụrụ na ọ bụ n’ọgbakọ ka ị ga-ekwu okwu gị, ruo n’ókè ezi uche dị na ya, ị pụrụ ijide n’aka na ndị ga-ege gị ntị ga-enwe mmasị n’ozuzu ha n’ihe ị ga-ekwu. Ma hà ga-ege ntị otú mmadụ ga-esi ege ntị mgbe ọ na-anụ ihe gbasara ya n’ezie? Hà ga-aṅa ntị n’ihi na ha ghọtara na ihe ha na-anụ kwekọrọ n’ọnọdụ ha ná ndụ nakwa n’ihi na ị na-akpali ha inwe ọchịchọ ime ihe banyere ya? Ọ ga-adị otú ahụ nanị ma ọ bụrụ na i ji nlezianya chebara ndị ga-ege gị ntị echiche—ọnọdụ ha, nchegbu ha, àgwà ha—mgbe ị na-akwadebe okwu gị. Ọ bụrụ na i mere otú ahụ, mgbe ahụ kwuo ihe ga-egosi ya n’okwu mmeghe gị.
Ma ị nọ n’elu ikpo okwu na-ekwu okwu ma ọ bụ na-agbara otu onye àmà, otu n’ime ụzọ ndị kasị mma isi kpalie mmasị n’otu isiokwu bụ ime ka ndị na-ege gị ntị na-esonye. Gosi ihe jikọrọ isiokwu ị na-atụle na nsogbu ha, mkpa ha, ma ọ bụ ajụjụ ndị dị ha n’uche. Ọ bụrụ na i mee ka o doo anya na e wezụga ikwu okwu banyere isiokwu ahụ n’ozuzu ya na ị gaje ikwu banyere akụkụ ya ụfọdụ kpọmkwem, ha ga-ege ntị ọbụna karị. Iji mezuo ya, ị ghaghị ịkwadebe nke ọma.
Ụzọ Ị Ga-esi Kwuo Ya. Ihe ị ga-ekwu n’okwu mmeghe gị dị oké mkpa, ma otú ị ga-esi kwuo ya pụkwara ịkpali mmasị. N’ihi nke a, nkwadebe gị kwesịrị ịgụnye ọ bụghị nanị ihe ị gaje ikwu kamakwa otú ị ga-esi kwuo ya.
Mkpụrụ okwu ị họọrọ iji mee ihe dị mkpa iji mezuo ebumnobi gị, ya mere ị pụrụ ịhụ na ọ bara uru iji nnọọ nlezianya kwadebe ahịrịokwu abụọ ma ọ bụ atọ ndị mbụ. Ahịrịokwu ndị dị mkpirikpi, ndị dị mfe, na-akakarị mma. Maka okwu a ga-ekwu n’ọgbakọ, ị pụrụ ịchọ idepụta ha n’ihe ndepụta gị, ma ọ bụ i nwere ike ikpebi iburu ha n’isi ka okwu mmeghe gị wee nwee mmetụta nile o kwesịrị inwe. Ikwu okwu mmeghe dị irè n’ekwughị ya ọsọ ọsọ pụrụ inyere gị aka inwe ahụ́ iru ala a chọrọ iji kwutọpụ okwu gị.
Mgbe A Ga-akwadebe Ya. E nwere echiche dịgasị iche iche na nke a. Ndị ọkà okwu ụfọdụ nwere ahụmahụ kwenyere na e kwesịrị ịmalite n’okwu mmeghe wee kwadebe okwu. Ndị ọzọ, bụ́ ndị mụrụ ihe banyere ikwu okwu n’ihu ọha na-eche na e kwesịrị ịkwadebe okwu mmeghe mgbe a kwadosịworo ụmị okwu ahụ.
Ọ dị mkpa n’ezie ka ị mara isiokwu gị nakwa isi ihe ndị ị na-eme atụmatụ ịkọwapụta tupu i nwee ike ịkwadebe okwu mmeghe kwesịrị ekwesị. Ma gịnị ma ọ bụrụ na i ji ihe ndepụta e biri ebi na-akwadebe okwu gị? Mgbe ị gụsịrị ihe ndepụta ahụ, ọ bụrụ na ọ dị ihe i chetara ị ga-eji mee ihe n’okwu mmeghe gị, ọ dịghị njọ ma ọlị idetu ya edetu. Chetakwa na ka okwu mmeghe gị wee dị irè, ị ghaghị iburu ndị ga-ege gị ntị n’uche nakwa ihe dị n’ihe ndepụta ahụ.