IHE ỌMỤMỤ NKE 51
E Debere Oge, E Kebiri Ya Otú Kwesịrị Ekwesị
Ọ BỤ ezie na i kwesịrị itinye uche karị n’ọdịdị nke ihe ị na-ezi, i kwesịkwara ichebara idebe oge mgbe ị na-ekwu okwu gị echiche. E nwere oge a kapịrị ọnụ e dokwara nzukọ anyị na-eji amalite ma na-emechi. A na-achọ nkwado nke onye ọ bụla nwere ihe omume iji mezuo nke a.
N’oge Bible, otú ndị mmadụ si were ndụ dị iche n’otú e si were ya taa n’ọtụtụ ebe. A na-eji okwu ndị a na-akapịghị ọnụ dị ka “n’ihe dị ka n’awa nke atọ” ma ọ bụ “ihe dị ka awa nke iri” akọwa oge. (Mat. 20:3-6; Jọn 1:39) A dịghị enwekebe ihe mere a ga-eji na-enwe nchegbu banyere inwe oge a kapịrị ọnụ maka ihe omume ndị a na-eme kwa ụbọchị. Taa, n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, e sikwa otú ahụ ele oge anya.
Otú ọ dị, ọ bụ ezie na omenala obodo ma ọ bụ ihe na-aka amasị mmadụ pụrụ ime ka ndị mmadụ ghara ịdị na-edebecha oge, anyị pụrụ irite uru site n’ịmụta ichebara ya echiche otú kwesịrị ekwesị. Mgbe ọtụtụ ndị nwere ihe omume, e kwesịrị ichebara oge e kenyere akụkụ nke ọ bụla echiche. A pụkwara iji ụkpụrụ bụ́ “ka ihe nile were ọnọdụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa dị ka ndokwa si dị” mee nnọọ ihe n’ihe banyere oge e nyere maka ihe omume ndị anyị na-enwe ná nzukọ.—1 Kọr. 14:40.
Ụzọ Isi Na-edebe Oge. Ime nkwadebe bụ ụzọ isi mee ya. Dị ka ọ na-adịkarị, ndị ọkà okwu ọ na-esiri ike idebe oge adịghị akwado nke ọma. Ha pụrụ inwe obi ike gabigara ókè. Ma ọ bụ ha pụrụ nanị ịdị na-eyigharị ịkwadebe ya ruo mgbe oge gwụrụ. Idebe oge na-amalite n’iji ihe omume gị akpọrọ ihe na ịdị njikere ịkwadebe ya nke ọma.
Ihe omume gị ọ̀ bụ ịgụ ihe? Buru ụzọ tụleghachi Ihe Ọmụmụ nke 4 ruo nke 7, bụ́ ndị bụ́ banyere okwu ịga were were n’ọnụ, nkwụsịtụ, imesi echiche okwu ike, na imesi echiche ndị bụ́ isi ike. Mgbe ahụ, jiri ndụmọdụ ahụ mee ihe ka ị na-agụpụta ihe e kenyere gị ịgụ. Nye onwe gị oge. Ọ̀ dị gị mkpa ịgụkwu ya ọsọ ọsọ karị iji gụchaa ya n’ime oge e kenyere gị? Gụọ akụkụ ndị na-adịchaghị mkpa ọsọ ọsọ karị, ma nọgide na-akwụsịtụ ma belata otú i si agụ ihe ọsọ ọsọ iji mesie echiche ndị dị mkpa ike. Mụgharịa ya ugboro ugboro. Ka okwu na-agawanye gị were were n’ọnụ, ọ ga-adịrị gị mfe karị ịchịkwa oge gị.
Ị̀ ga-eji ihe e deturu edetu kwuo okwu? Ọ dịghị mkpa ime ka ihe ị ga-edetu buo nnọọ ibu—ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okwu a na-agụ agụ—iji hụ na i debere oge. Mgbe ị na-arụ ọrụ n’Ihe Ọmụmụ nke 25, ị mụtara ụzọ ka mma isi mee ya. Buru ihe ise ndị a n’uche: (1) Kwadebe ihe ọmụma dị mma, ma ya ebula ibu gabiga ókè. (2) Buru ihe ndị bụ́ isi ihe n’uche nke ọma, ma ebula ahịrịokwu dum n’isi. (3) Denye n’ihe ndepụta gị ogologo oge ị na-eme atụmatụ iji kwuo akụkụ nke ọ bụla nke okwu gị ma ọ bụ ogologo oge ga-agafeworị mgbe ị ga-eru n’ebe ụfọdụ. (4) Mgbe ị na-akwadebe, tụlee nkọwa ndị ị pụrụ ịhapụ ma ọ bụrụ na ị chọpụta na oge na-agwụnahụ gị. (5) Mụgharịa otú ị ga-esi kwuo okwu gị.
Mmụgharị ihe dị mkpa. Mgbe ị na-amụgharị ihe, na-ele anya n’oge e nyere maka nkebi nke ọ bụla nke okwu gị. Mụgharịa okwu gị ugboro ugboro ruo mgbe i nwere ike ikwu okwu gị dum n’ime oge e nyere. Anwala iwebata ihe ọmụma karịrị akarị. Nyekwuo onwe gị oge n’ihi na ọ pụrụ iwetụ oge karị mgbe ị na-ekwu okwu gị n’ihu ndị na-ege ntị karịa otú o were mgbe ị na-amụgharị ya.
Ikebisi Ya. Idebe oge na ikebisị okwu otú kwesịrị ekwesị na-agakọ nnọọ ụkwụ na ụkwụ. E kwesịrị iji ihe ka ukwuu n’oge e nyere mee ihe n’ikwu okwu ahụ kpọmkwem. Ọ bụ n’ebe ahụ ka isi ihe ndị nwere ihe mmụta dị. Okwu mmeghe kwesịrị ịdị ogologo nanị ruo n’ókè nke iji mezuo ebumnobi atọ a tụlere n’Ihe Ọmụmụ nke 38. Ụmị okwu ekwesịghị ịdị oké ogologo nke na a gaghị enwe oge zuru ezu maka ikwu okwu mmechi dị irè, n’ikwekọ n’Ihe Ọmụmụ nke 39.
Mgbalị ị na-eme idebe oge ga-eme ka okwu gị ka mma, ọ ga-egosikwa nkwanye ùgwù i nwere maka ndị ọzọ nwere ihe omume nakwa ọgbakọ dum.