Igbe Ajụjụ
◼ Olee otú anyị pụrụ isi hụ na e ji oge eme ihe nke ọma ná nzukọ ọgbakọ?
Oge na-agba oké ọsọ mgbe anyị na ezi ndị enyi anyị na-ekerịta ezi ihe. N’ihi nke a, ọ pụrụ ịbụ ihe ịma aka ime ihe omume dị iche iche nke nzukọ n’ime oge e wepụtara maka ha. Olee ihe ndị pụrụ inyere anyị aka ime otú ahụ?
Malite n’oge. Mgbe ọgbakọ zukọtara, ọ pụrụ ịbụ ihe enyemaka ịgwa ndị na-ege ntị ka ha nọdụ ala n’oche ha mgbe ọ fọrọ otu minit ma ọ bụ abụọ ka oge zuo, ka nzukọ ahụ wee nwee ike ịmalite n’oge a kara aka nakwa n’ụzọ dị n’usoro. (Ekli. 3:1) Ná nzukọ ndị dị nta, dị ka nzukọ maka ozi ubi, e kwesịghị igbu oge iji chere ndị pụrụ ịbịa n’azụ oge.
Kwadebe nke ọma. Otu isi ihe na-eduga n’idebe oge bụ ibu ụzọ mee nkwadebe. Buru nzube nke ihe omume ahụ n’uche nke ọma. Chọpụta isi ihe ndị a na-ekwu na ya ma mesie ha ike. Ekwela ka ihe ndị na-adịchaghị mkpa dọrọ uche gị. Mee ka ihe omume ahụ dị mfe. Ọ bụrụ na ihe omume ahụ gụnyere ihe ngosi na ajụjụ ọnụ, buru ụzọ mụgharịa ha. Ruo n’ókè o kwere mee, hụ na ị gafeghị oge i kwesịrị iji mee ihe omume gị mgbe ị na-amụgharị ya n’olu dara ụda.
Kee ihe omume gị eke. Ma ihe omume gị ọ̀ bụ okwu ma ọ bụ mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya, ọ pụrụ ịbụrụ gị ihe enyemaka ikegasị ihe omume ahụ ná nkebi ná nkebi. Kpebie oge ị ga-eji kwuo okwu ná nkebi nke ọ bụla, ma denye ya n’ohere dị n’akụkụ ihe ndepụta gị. Mgbe ahụ, hụ na ị gafeghị oge i wepụtara maka nkebi nke ọ bụla mgbe ị na-eme ihe omume ahụ. Ná mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya, zere ọnyà nke ịnabata ọtụtụ azịza ná mmalite nke ihe omume ahụ nke na ị ga-ejizi ọsọ gbafere ihe ndị bụ́ isi dị ná ngwụsị nke ihe omume ahụ. Ndị na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche kwesịrị ịhapụ oge zuru ezu iji tụlee igbe ntụleghachi nke dị ná ngwụsị. Ha kwesịkwara ilezi anya ka ha ghara iri oge e wepụtara maka abụ na ekpere mmechi.
Mechie n’oge. Ọ bụrụ na otu nzukọ enwee ọtụtụ ihe omume, dị ka ọ na-adị ná Nzukọ Ije Ozi, ọkà okwu nke ọ bụla kwesịrị iburu n’uche mgbe ihe omume ya kwesịrị ịmalite na mgbe o kwesịrị ịkwụsị. Gịnị ka a pụrụ ime ma ọ bụrụ na e riwe oge ná nzukọ? Otu nwanna ma ọ bụ karịa pụrụ ibelata oge nke ha site n’ikwu isi ihe ndị dị n’ihe omume ha ma hapụ ihe ụfọdụ. Inwe ike ime nke a bụ otu ihe e ji amata onye ozizi nwere nkà.
Dị ka ndị na-ege ntị, anyị pụrụ inyere nwanna na-eduzi ihe aka site n’ime ka azịza anyị dị nkenke ma gaa kpọmkwem n’isi ihe. Ya mere, anyị nile pụrụ ịtụnye ụtụ ná nzukọ nke na-ewere ọnọdụ “n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa dị ka ndokwa si dị.”—1 Kọr. 14:40.