Isi Mbụ
Ịdị n’Otu nke Ofufe n’Oge Anyị—Gịnị Ka Ọ Pụtara?
1, 2. (a) Ihe omume dị aṅaa na-akpali akpali na-ewere ọnọdụ n’oge anyị? (b) Olee olileanya magburu onwe ya nke ndị nwere obi eziokwu nwere?
GBAA ụwa gburugburu, e nwere ihe omume na-akpali akpali na-ewere ọnọdụ nke na-eme ka e nwee ịdị n’otu nke ofufe. Ọ na-eme ka ọtụtụ nde mmadụ bụ́ ndị si ná mba, ebo, na n’asụsụ nile dị n’otu. A na-achịkọtakwa ọtụtụ ndị ọzọ kwa afọ. N’ime Bible, a kọwara ndị a dị ka “ndị àmà” Jehova, a kpọkwara ha “oké ìgwè mmadụ.” Ha na-ejere Chineke “ozi dị nsọ ehihie na abalị.” (Aịsaịa 43:10-12; Mkpughe 7:9-15) Gịnị mere ha ji na-eme nke a? N’ihi na ha abịawo mata Jehova dị ka onye nanị ya bụ ezi Chineke ahụ. Nke a na-akwali ha ime ka ndụ ha kwekọọ n’ụzọ ezi omume ya nile. Ọzọkwa, ha amụtawo na anyị na-ebi “n’ụbọchị ikpeazụ” nke ajọ ụwa a, na Chineke ga-ebibi ya n’oge na-adịghị anya, nakwa na ọ ga-eji ụwa ọhụrụ ya nke ga-abụ paradaịs dochie ya.—2 Timoti 3:1-5, 13; 2 Pita 3:10-13.
2 Okwu Chineke na-ekwe nkwa, sị: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:10, 11) “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adị ọzọ; iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.”—Mkpughe 21:4.
3. Olee otú e si enweta ezi ịdị n’otu nke ofufe?
3 Ndị ahụ bụ́ ndị a na-eme ugbu a ka ha dị n’otu n’ezi ofufe ga-aghọ ndị mbụ ga-ebi n’ime ụwa ọhụrụ ahụ. Ha amụtawo ihe bụ́ uche Chineke, ha na-emekwa ya ruo n’ókè ha nwere ike. Iji gosi mkpa nke a dị, Jizọs sịrị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Jọn onyeozi dere, sị: “Ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya, ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.
Ihe Ọ Pụtara n’Ezie
4. (a) Gịnị ka nchịkọta nke ọtụtụ ndị mmadụ ife ofufe n’ịdị n’otu n’oge anyị pụtara n’ezie? (b) Olee otú Bible si kọwaa nchịkọbata a?
4 Gịnị ka ịchịkọta ọtụtụ mmadụ ọnụ ife ofufe n’ịdị n’otu n’oge anyị pụtara n’ezie? Ọ bụ ihe àmà doro anya na anyị nọ nnọọ nso n’ọgwụgwụ nke ajọ ụwa a, ụwa ọhụrụ Chineke gajekwa ịmalite ozugbo nke ahụ gasịrị. Anyị ji anya anyị na-ahụ mmezu nke amụma Bible ndị buru ụzọ kwuo banyere nchịkọbata a dị oké mkpa. Otu n’ime amụma dị otú ahụ na-ekwu, sị: “Ọ ga-erukwa, n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a [ụbọchị ikpeazụ ndị a], na ugwu nke ụlọ Jehova [ezi ofufe ya e buliri elu] ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile [karịa ụdị ofufe ọ bụla ọzọ], . . . ndị dị iche iche ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri. Ọtụtụ mba ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova, ruokwa ụlọ Chineke nke Jekọb; Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ Ya nile.”—Maịka 4:1, 2; Abụ Ọma 37:34.
5, 6. (a) Olee otú o si bụrụ eziokwu na mba dị iche iche na-echigharịkwuru Jehova? (b) Ajụjụ dịgasị aṅaa ka anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?
5 Ọ bụ ezie na ọ dịghị otu mba dum na-enyefe onwe ha n’ụlọ ime mmụọ nke Jehova maka ofufe, ọtụtụ nde mmadụ, ndị si ná mba nile na-eme otú ahụ. Ka ha na-amata nzube ịhụnanya na àgwà magburu onwe ha nke Jehova Chineke, a na-akpali obi ha nke ukwuu. Ha ji ịdị umeala n’obi na-achọ ịmata ihe Chineke chọrọ n’aka ha. Ekpere ha yiri nke ọbụ abụ ahụ, bụ́ onye sịrị: “Zi m ime ihe dị Gị ụtọ; n’ihi na Gị onwe gị bụ Chineke m.”—Abụ Ọma 143:10.
6 Ị̀ na-ahụ onwe gị n’etiti oké ìgwè mmadụ ahụ ndị Jehova na-achịkọta ugbu a ife ofufe n’ịdị n’otu? Otú i si emeghachi omume ná ntụziaka i nwetaworo site n’Okwu ya ọ̀ na-egosi na ị matara n’ezie na ọ bụ Jehova bụ Isi Iyi ya? Ruo n’ókè ha aṅaa ka ị ga-eje ije “n’okporo ụzọ Ya nile”?
Otú O Si Ekwe Omume
7. (a) Ruo n’ókè ha aṅaa ka a ga-emesị nwee ịdị n’otu nke ofufe? (b) Gịnị mere o ji dị mkpa ka mmadụ mee ihe ngwa ngwa iji ghọọ onye na-efe Jehova ugbu a, oleekwa otú anyị pụrụ isi nyere ndị ọzọ aka ime nke ahụ?
7 Nzube Jehova bụ ka ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi dị n’otu n’ezi ofufe. Lee ka o si na-agụ anyị agụụ ịhụ oge mgbe ndị nile dị ndụ ga na-efe onye nanị ya bụ ezi Chineke ahụ! (Abụ Ọma 103:19-22) Ma tupu nke ahụ enwee ike ime, Jehova aghaghị ikpochapụ ndị nile jụrụ ime uche ya ziri ezi. O ji obi ebere na-ama ọkwa ihe ọ ga-eme tupu oge eruo, ka ndị mmadụ nọ n’ebe nile nwee ohere nke ịgbanwe omume ha. (Aịsaịa 55:6, 7) Ya mere, a na-akpọ “mba na ebo na asụsụ na ndị nile ọ bụla” n’oge anyị òkù a chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa, na-asị: “Na-atụnụ Chineke egwu, na-enyekwa ya otuto, n’ihi na oge awa nke ikpe sitere n’aka ya abịawo, n’ihi ya kwa, na-efenụ Onye ahụ nke mere eluigwe na ụwa na oké osimiri na isi mmiri dị iche iche.” (Mkpughe 14:6, 7) Ị̀ zawo òkù ahụ? Ọ bụrụ na ị zawo ya, ọ bụ ihe ùgwù i nwere ịkpọkwu ndị ọzọ òkù ka ha mara ma fee ezi Chineke ahụ ofufe.
8. Mgbe anyị mụtasịrị ozizi ndị bụ́ isi nke Bible, olee ọganihu ọzọ anyị kwesịrị ịgbalịsi ike inwe?
8 Ọ bụghị nzube Jehova ka ndị na-ekwu na ha kwere na ya ma nọgide na-achụso ọdịmma nke ha na-efe ya ofufe. Chineke chọrọ ka ndị mmadụ nwee ‘ezi ihe ọmụma nke uche ya’ ma na-egosipụta nke a ná ndụ ha. (Ndị Kọlọsi 1:9, 10) Ya mere, ndị nwere ekele, bụ́ ndị na-amụta ozizi ndị bụ́ isi nke Bible na-achọ ka ha ruo ntozu okè Ndị Kraịst. Ọchịchọ ha bụ ịmatakwu Jehova nke ọma, ime ka nghọta ha nwere banyere Okwu ya mikwuo emie, na iji ya na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu karị ná ndụ ha. Ha na-achọ ịdị na-egosipụta àgwà nke Nna anyị nke eluigwe na ile ihe anya otú o si ele ihe anya. Nke a na-akwali ha ịchọ ụzọ ha ga-esi na-ekere òkè n’ọrụ ahụ na-azọpụta ndụ nke o meworo ndokwa ka a rụọ n’ụwa n’oge anyị. Gị onwe gị kwa ì nwere ọchịchọ ahụ?—Mak 13:10; Ndị Hibru 5:12–6:3.
9. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ezi ịdị n’otu ga-esi kwe omume ugbu a?
9 Bible na-egosi na ndị na-ejere Jehova ozi aghaghị ịbụ ndị dị n’otu. (Ndị Efesọs 4:1-3) Ịdị n’otu a aghaghị iwere ọnọdụ ugbu a n’agbanyeghị na anyị bi n’ime ụwa nke kewasịrị ekewasị ma ka na-agbaso ezughị okè anyị dị iche iche mgba. Jizọs kpesiri ekpere ike ka ndị nile na-eso ụzọ ya bụrụ otu, ka ha nwee ezi ịdị n’otu. Gịnị ka nke a ga-apụta? Nke mbụ, na ha na Jehova nakwa Ọkpara ya ga-enwe mmekọrịta dị mma. Nke abụọ, na ha na ibe ha ga-adị n’otu. (Jọn 17:20, 21) Iji mezuo nke ahụ, ọgbakọ Ndị Kraịst na-eje ozi dị ka nzukọ Jehova si na ya na-ezi ndị ya ihe.
Olee Ihe Ndị Na-atụnye Ụtụ n’Ịdị n’Otu?
10. (a) Gịnị ka anyị na-azụlite mgbe anyị onwe anyị ji Bible na-atụgharị uche iji chọpụta azịza nke ajụjụ ndị metụtara anyị? (b) Nyochaa isi ihe ndị na-atụnye ụtụ n’ịdị n’otu nke Ndị Kraịst site n’ịza ajụjụ ndị e depuṭara na paragraf a.
10 E depụtara isi ihe asaa na-atụnye ụtụ n’ịdị n’otu nke ofufe n’okpuru ebe a. Ka ị na-aza ajụjụ ndị ha na ha so, chee echiche banyere otú isi ihe nke ọ bụla si emetụta mmekọrịta gị na Jehova nakwa nke gị na Ndị Kraịst ibe gị. Ichebara isi ihe ndị a echiche na ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha, bụ́ ndị a na-ehotaghị ihe ha kwuru, ga-atụnye ụtụ na gị ịzụlite amamihe Chineke, izuzu, na nghọta—àgwà ndị dị anyị nile mkpa. (Ilu 5:1, 2; Ndị Filipaị 1:9-11) Tụlee isi ihe ndị a otu otu.
(1) Anyị kwetara na Jehova ruru eru isetịpụ ụkpụrụ banyere ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezi.”—Ilu 3:5, 6.
N’ihi gịnị ka anyị ga-eji na-achọ ndụmọdụ na nduzi Jehova mgbe anyị na-eme mkpebi? (Abụ Ọma 146:3-5; Aịsaịa 48:17)
(2) Anyị nwere Okwu Chineke iduzi anyị. “Mgbe unu natara okwu Chineke, bụ́ nke unu nụrụ n’ọnụ anyị, unu nakweere ya, ọ bụghị dị ka okwu ụmụ mmadụ, kama, dị nnọọ ka ọ bụ n’eziokwu, dị ka okwu Chineke, bụ́ nke na-arụkwa ọrụ n’ime unu ndị kwere ekwe.”—1 Ndị Tesalonaịka 2:13.
Ihe ize ndụ dị aṅaa dị n’ime nanị ihe anyị “chere” na o ziri ezi? (Ilu 14:12; Jeremaịa 10:23, 24; 17:9)
Ọ bụrụ na anyị amaghị ndụmọdụ Bible na-enye n’otu okwu, gịnị ka anyị kwesịrị ime? (Ilu 2:3-5; 2 Timoti 3:16, 17)
(3) Anyị nile na-erite uru site n’otu usoro ahụ nke iri nri ime mmụọ. “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova.” (Aịsaịa 54:13) “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ghara ịdị na-ahapụ nzukọ nke anyị onwe anyị, dị ka ọ bụ omenala ụfọdụ ndị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị ka unu na-ahụ ụbọchị [mbibi] ahụ ka ọ na-eru nso.”—Ndị Hibru 10:24, 25.
Uru dịgasị aṅaa ka ndị na-eji ndokwa dị iche iche Jehova mere maka iri nri ime mmụọ eme ihe n’ụzọ zuru ezu na-enweta? (Aịsaịa 65:13, 14)
(4) Ọ bụ Jizọs Kraịst bụ Onye Ndú anyị, ọ bụghị mmadụ ọ bụla. “Unu onwe unu, ka a ghara ịkpọ unu Rabaị, n’ihi na otu onye bụ onye ozizi unu, ma unu nile bụ ụmụnna. Ọzọkwa, unu akpọla onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa, n’ihi na otu onye bụ Nna unu, bụ́ Onye nke eluigwe. Ka a gharakwa ịkpọ unu ‘ndị ndú,’ n’ihi na Onye Ndú unu bụ otu onye, bụ́ Kraịst ahụ.”—Matiu 23:8-10.
Ò kwesịrị ka onye ọ bụla n’ime anyị chee na ọ ka ndị ọzọ mma? (Ndị Rom 3:23, 24; 12:3)
(5) Anyị na-elekwasị ọchịchị Alaeze Chineke anya dị ka nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ. “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.’ Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.”—Matiu 6:9, 10, 33.
Olee otú ‘ibu ụzọ na-achọ alaeze ahụ’ si enye aka na-echebe ịdị n’otu anyị? (Maịka 4:3; 1 Jọn 3:10-12)
(6) Mmụọ nsọ na-arụpụta n’ime ndị na-efe Jehova ofufe, àgwà ndị dị mkpa maka ịdị n’otu Ndị Kraịst. “Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.”—Ndị Galeshia 5:22, 23.
Gịnị ka anyị na-aghaghị ime ka mmụọ Chineke wee mịa mkpụrụ ya n’ime anyị? (Ọrụ 5:32)
Olee otú inwe mmụọ Chineke si enwe mmetụta ná mmekọrịta nke anyị na Ndị Kraịst ibe anyị? (Jọn 13:35; 1 Jọn 4:8, 20, 21)
(7) Ndị nile na-efe Chineke ezi ofufe na-ekere òkè n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze ya. “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Matiu 24:14.
Gịnị kwesịrị ịkwali anyị ịchọ ikere òkè zuru ezu n’ọrụ ime nkwusa a? (Matiu 22:37-39; Ndị Rom 10:10)
11. Mgbe anyị na-etinye eziokwu Bible n’ọrụ ná ndụ anyị, gịnị bụ mmetụta ọ na-enwe?
11 Ife Jehova ofufe n’ịdị n’otu na-adọtakwu anyị nso n’ebe ọ nọ ma na-eme ka anyị nwee ike iso ndị kwere ekwe ibe anyị na-enwe mmekọrịta na-enye ume ọhụrụ. Abụ Ọma 133:1 na-ekwu, sị: “Lee, ka o si dị mma, ka o si dịkwa ụtọ nke ukwuu, bụ́ mbikọ nke ụmụnne, ọbụna ibikọ n’otu!” Lee ka o si enye ume ọhụrụ bụ́ iwezụga onwe onye n’ụwa nakwa n’ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị ya nile, omume rụrụ arụ, na ime ihe ike na iso ndị hụrụ Jehova n’anya n’ezie ma na-edebe iwu ya na-ezukọ!
Zere Ihe Ndị Na-akpata Nkewa
12. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị zere mmụọ nnwere onwe?
12 Iji zere imebi ịdị n’otu anyị dị oké ọnụ ahịa nke zuru ụwa ọnụ, anyị aghaghị izere ihe ndị na-eweta nkewa. Otu n’ime ha bụ mmụọ nnwere onwe pụọ n’ebe Chineke nọ na n’ebe iwu ya dị. Jehova na-enyere anyị aka izere ya site n’ime ka a mata onye malitere ya, bụ́ Setan bụ́ Ekwensu. (2 Ndị Kọrint 4:4; Mkpughe 12:9) Ọ bụ Setan mere ka Adam na Iv leghara ihe Chineke kwuru anya ma mee mkpebi megidere uche Chineke. Ọ rụpụtaara ha nakwa anyị onwe anyị ọdachi. (Jenesis 3:1-6, 17-19) Ụwa a jupụtara na mmụọ nnwere onwe pụọ n’ebe Chineke nọ na n’ebe iwu ya dị. Ya mere, ọ dị anyị mkpa igbochi mmụọ ahụ n’ime onwe anyị.
13. Gịnị ga-egosi ma anyị na-akwadebe n’eziokwu maka ịdị ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke?
13 Dị ka ihe atụ, cheedị echiche banyere nkwa na-akpali akpali Jehova kwere bụ́ iji eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ nke “ezi omume [gaje] ibi n’ime ha” dochie ajọ usoro ihe dị ugbu a. (2 Pita 3:13) Ọ̀ bụ na nke ahụ ekwesịghị ịkpali anyị ịmalite ịkwadebe maka ịdị ndụ n’oge ahụ mgbe ezi omume ga-ejupụta ebe nile? Nke a pụtara ịṅa ntị na ndụmọdụ na-adịghị mgbagwoju anya Bible na-enye: “Ahụla ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya maka Nna ahụ adịghị n’ime ya.” (1 Jọn 2:15) N’ihi ya, anyị na-ezere mmụọ nke ụwa a—mmụọ nnwere onwe ya, nchegbu gabigara ókè ọ na-enwe banyere onwe onye, omume rụrụ arụ na ime ihe ike ya. Anyị na-eme ka ọ bụrụ omume anyị ige Jehova ntị na iji obi anyị na-erubere ya isi n’agbanyeghị ihe dị iche nke pụrụ ịdị na-agụ anụ ahụ́ anyị na-ezughị okè agụụ. Ụzọ ndụ anyị dum na-enye ihe àmà na-egosi na echiche anyị na ebumnobi anyị bụ ndị e chere ihu n’ime uche Chineke.—Abụ Ọma 40:8.
14. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị jiri ohere anyị nwere ugbu a mee ihe iji mụta ụzọ Jehova na ịgbaso ha ná ndụ anyị? (b) Olee ihe akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha na paragraf a pụtara nye anyị n’onwe anyị?
14 Mgbe oge a kara aka ruru ka Jehova bibie ajọ usoro ihe a na ndị nile nwere mmasị ka ukwuu n’ụzọ ya nile, ọ gaghị egbu oge. Ọ gaghị eyigharị oge ahụ ma ọ bụ gbanwee ụkpụrụ ya iji nye ohere maka ndị ka nọ na-agbalị ịrapara n’ụwa ma n’otu mgbe ahụ ghara iji obi ha nile na-amụ ihe bụ́ uche Chineke ma na-eme ya. Ugbu a bụ oge iji mee ihe! (Luk 13:23, 24; 17:32; 21:34-36) Ya mere, lee ka o si enye obi ụtọ ịhụ oké ìgwè mmadụ ndị ji ohere a magburu onwe ya na-eme ihe, na-achọsi ntụziaka Jehova na-enye site n’Okwu ya na nzukọ ya ike, na-agakwa ije n’ịdị n’otu n’okporo ụzọ ya iji garuo ụwa ọhụrụ ahụ! Ka anyị na-amụtakwukwa banyere Jehova, otú ahụ ka anyị ga na-ahụkwu ya n’anya ma chọọ ijere ya ozi.
Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu
• Gịnị bụ nzube Jehova n’ihe banyere ofufe?
• Mgbe anyị mụtasịworo eziokwu ndị bụ́ isi nke Bible, olee ọganihu ọzọ anyị kwesịrị ịchọsi ike inwe?
• Gịnị ka anyị pụrụ ime n’otu n’otu iji soro ndị ọzọ na-efe Jehova ofufe dị n’otu?
[Foto dị na peeji nke 4]
‘Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala, ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ’