Olee Ebe Ndụ Gị Na-eche Ihu?
• Ọtụtụ ndị na-emikpu nnọọ onwe ha n’ihe ndị a na-eme ná ndụ kwa ụbọchị nke na ha adịghị eche echiche banyere ebe ndụ ha na-eche ihu.
• Bible na-eme ka anyị mata na ihe ndị dị ebube ga-eme n’ọdịnihu. Ọ na-adọkwa aka ná ntị banyere ọgba aghara zuru ụwa ọnụ nke ga-emetụta òtù dị iche iche nke ụmụ mmadụ. Iji rite uru ma zere ọdachi, ọ dị anyị mkpa ime ihe doro anya ozugbo.
• Ọ dị ụfọdụ ndị maara ihe Bible na-ekwu ma na-agbalị itinye ya n’ọrụ, ma ha na-ekwe ka nchegbu nke ndụ a dọpụ uche ha.
• Ì nwere obi ụtọ n’ebe ndụ gị na-eche ihu? Mgbe ị na-eme atụmatụ ihe ụfọdụ ị ga-eme, ị̀ na-atụle otú ihe ndị ahụ pụrụ isi metụta ihe mgbaru ọsọ gị ndị ga-adịte aka?
[Igbe na Ihe Osise Ndị dị na peeji nke 9]
Olee Ihe Kasị Gị Mkpa?
Olee ọnọdụ ị ga-edebe ihe ndị na-esonụ? Nye ha nọmba.
Ọtụtụ n’ime ha nwere ọnọdụ kwesịrị ekwesị ná ndụ, ma ọ bụrụ na ị ga-emerịrị nhọrọ, olee ihe ị ga-edebe n’ọnọdụ mbụ? n’ọnọdụ nke abụọ? na n’ọnọdụ ndị ọzọ?
․․․ Ntụrụndụ
․․․ Ọrụ m
․․․ Ahụ́ ike m
․․․ Obi ụtọ m
․․․ Di ma ọ bụ nwunye m
․․․ Ndị mụrụ m
․․․ Ụmụ m
․․․ Ezigbo ụlọ, ọmarịcha uwe
․․․ Ịbụ ọkasị mma n’ihe ọ bụla m na-eme
․․․ Ofufe Chineke
[Igbe nke dị na peeji nke 10]
Nhọrọ Ndị Ị Na-eme Hà Na-eduga Gị n’Ebe Ị Chọrọ Ịga n’Ezie?
TỤLEE AJỤJỤ NDỊ A
NTỤRỤNDỤ: Ntụrụndụ m na-ahọrọ ọ̀ na-enye m ume ọhụrụ? Ọ̀ na-agụnye ihe omume ndị na-akpali akpali bụ́ ndị pụrụ itinye ahụ́ ike m n’ihe ize ndụ ma ọ bụ ọbụna mee ka m nwee nkwarụ ná ndụ m nile? Ọ̀ bụ ụdị “mkpori ndụ” nke na-eme ka e nwee mkpali ruo ma eleghị anya awa ole na ole ma bụrụ nke pụrụ ịkpata ihe mgbu na-adịte aka? Ọ bụrụgodị na ntụrụndụ m na-ahọrọ dị mma, m̀ na-etinye oge dị ukwuu na ya nke na ọ na-ewekọrọ oge m ga-eji mee ihe ndị ka mkpa?
ỌRỤ M: Ọ̀ bụ ihe m ji elekọta onwe m, ka m̀ bụ ohu ya n’ezie? Ọ̀ na-achọ ka m na-eme ihe ndị na-emebi ahụ́ ike m? M̀ ga-ahọrọ ịrụkwu ọrụ mgbe a gbasara ọrụ ka m̀ ga-ahọrọ iwepụta oge iji nọnyere di ma ọ bụ nwunye m ma ọ bụ ụmụ m? Ọ bụrụ na onye were m n’ọrụ agwa m ka m rụọ ọrụ akọ na uche m na-anabataghị ma ọ bụ nke na-egbochikarị ihe ime mmụọ, m̀ ga-arụ ya ka e wee ghara ịchụ m n’ọrụ?
AHỤ́ IKE M: M̀ na-eji ya egwuri egwu, ka m na-echebe ya mgbe nile? Ọ̀ bụ ya bụ isi ihe m na-ekwu banyere ya ná mkparịta ụka m? Ụzọ m si elebara ya anya ọ̀ na-egosi na m na-eche banyere ezinụlọ m?
OBI ỤTỌ M: Nke a ọ̀ bụ ihe mbụ m na-echebara echiche? M̀ na-edebe ya n’ọnọdụ mbụ karịa obi ụtọ nke di ma ọ bụ nwunye m ma ọ bụ ezinụlọ m? Ụzọ m na-esi achọ ya ò kwesịrị onye na-efe ezi Chineke ahụ?
DI MA Ọ BỤ NWUNYE M: M̀ na-ele di ma ọ bụ nwunye m anya dị ka eny m nanị mgbe ọ ga-abara m uru? M̀ na-eji nsọpụrụ emeso di ma ọ bụ nwunye m ihe dị ka onye kwesịrị ka a kwanyere ya ùgwù? Ikwere na Chineke ọ̀ na-emetụta otú m si ele di ma ọ bụ nwunye m anya?
NDỊ MỤRỤ M: Ọ bụrụ na m ka bụ nwata, àna m erubere ndị mụrụ m isi—na-eji nkwanye ùgwù azaghachi ha okwu, na-arụ ọrụ e kenyere m, na-alọta n’oge ọ bụla ha kwuru ka m na-alọta, na-ezere mkpakọrịta na ihe omume ndị ha dọrọ m aka ná ntị megide? Ọ bụrụ na etoruwo m ogo mmadụ, àna m eji nkwanye ùgwù ege ndị mụrụ m ntị, na-enyere ha aka n’ụzọ kwesịrị ekwesị mgbe ọ dị mkpa? Ọ̀ bụ ihe masịrị m ka ọ bụ ndụmọdụ dị n’Okwu Chineke na-ekpebi ụzọ m si emeso ha?
ỤMỤ M: M̀ na-ele ya anya dị ka ibu ọrụ m ịkụziri ụmụ m ụkpụrụ omume ndị kwesịrị ekwesị, ka m̀ na-atụ anya ka ụlọ akwụkwọ mee nke ahụ? M̀ na-ewepụta oge iji nọnyere ụmụ m, ka m̀ na-atụ anya ka ihe e ji egwuri egwu, TV, ma ọ bụ kọmputa na-adọrọ uche ha? M̀ na-enye ụmụ m ahụhụ mgbe ọ bụla ha leghaara ihe ncheta Chineke anya, ka m̀ na-eme ya nanị mgbe iwe were m?
EZIGBO ỤLỌ, ỌMARỊCHA UWE: Gịnị na-ekpebi otú m si elebara ọdịdị m na ihe onwunwe m anya—ọ̀ bụ ihe m chọrọ ka ndị agbata obi m na-eche banyere m? ọdịmma nke ezinụlọ m? ọbụbụ m bụ onye na-efe Chineke?
ỊBỤ ỌKASỊ MMA N’IHE Ọ BỤLA M NA-EME: M̀ na-eche na ọ dị mkpa imezi ihe emezi? M̀ na-agbalị ịbụ ọkasị mma? M̀ na-enwe mwute mgbe onye ọzọ mere ihe nke ọma karịa m?
OFUFE CHINEKE: Inweta ihu ọma Chineke ọ̀ dị m mkpa karịa inweta ihu ọma nke di ma ọ bụ nwunye m, nke ụmụ m, nke ndị mụrụ m, ma ọ bụ nke onye were m n’ọrụ? M̀ ga-ekweta idebe ozi m na-ejere Chineke n’ọnọdụ nke abụọ iji nọgide na-ebi ndụ ntụsara ahụ́?
JIRI NLEZIANYA TỤLEE NDỤMỌDỤ BIBLE
Olee ọnọdụ ị na-edebe Chineke ná ndụ gị?
Eklisiastis 12:13: “Tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.”
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: Ụzọ ndụ m ọ̀ na-egosi na m na-ele ihe anya otú ahụ? Irubere iwu Chineke isi ọ̀ na-ekpebi otú m si ebu ibu ọrụ m n’ụlọ, n’ebe ọrụ, ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ? Ka ihe ndị ọzọ ma ọ bụ nsogbu nke ndụ hà na-ekpebi ma m̀ ga-ewepụta oge iji jeere Chineke ozi ka ọ̀ bụ na m gaghị eme otú ahụ?
Olee ụdị mmekọrịta gị na Chineke nwere?
Ilu 3:5, 6: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala [ná] nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.”
Matiu 4:10: “Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa nanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.”
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: M̀ na-enwe mmetụta dị otú ahụ banyere Chineke? Ihe ndị m na-eme kwa ụbọchị nakwa ụzọ m si eme ihe n’ọnọdụ ndị siri ike, hà na-egosipụta ntụkwasị obi na nraranye dị otú ahụ?
Olee ókè ịgụ na ịmụ Bible dịruru gị mkpa?
Jọn 17:3: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: Ọnọdụ m na-edebe ịgụ Okwu Chineke na ịtụgharị uche na ya ọ̀ na-egosi na m kwenyere na nke a n’ezie?
Olee ókè ịga nzukọ ọgbakọ Ndị Kraịst dịruru gị mkpa?
Ndị Hibru 10:24, 25: “Ka anyị na-echebara ibe anyị echiche iji kpalie inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ghara ịdị na-ahapụ nzukọ nke anyị onwe anyị, . . . na-emekwa otú ahụ karị ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.”
Abụ Ọma 122:1: “Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha na-asị m, Ka anyị jee n’ụlọ Jehova.”
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: Ụzọ ndụ m ọ̀ na-egosi na m nwere ekele maka ntụziaka a dị n’Okwu Chineke? N’ọnwa gara aga, m̀ ghara nzukọ Ndị Kraịst ọ bụla n’ihi na m kwere ka ihe ọzọ were ọnọdụ ya?
Ị̀ na-eji ịnụ ọkụ n’obi ekere òkè n’ịgwa ndị ọzọ banyere Chineke na nzube ya?
Matiu 24:14: ‘A ga-ekwusa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà, mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.’
Matiu 28:19, 20: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.”
Abụ Ọma 96:2, 3: “Bụkuonụ Jehova abụ, gọzienụ aha Ya; na-ezisanụ ozi nzọpụta Ya site n’otu ụbọchị ruo ụbọchị ọzọ.”
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: Ọrụ a ọ̀ nọ n’ọnọdụ kwesịrị ya n’ezie ná ndụ m? Òkè m na-ekere na ya ọ̀ na-egosi na m kwenyere n’ezie na oge a anyị bi na ya dị oké mkpa?