“Oge Awa nke Ikpe” Abịawo
MKPUGHE, bụ́ akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, na-eme ka anyị mata na otu mmụọ ozi na-efegharị n’etiti eluigwe nwere “ozi ọma ebighị ebi ịkpọsa dị ka ozi obi ụtọ.” O ji olu dara ụda na-ekwu, sị: “Na-atụnụ Chineke egwu, na-enyekwa ya otuto, n’ihi na oge awa nke ikpe sitere n’aka ya abịawo.” (Mkpughe 14:6, 7) “Oge awa nke ikpe” ahụ na-agụnye ma nkwupụta ma mmezu nke ihe Chineke kpere n’ikpe. Otu “awa” bụ oge dị mkpirikpi. Mmezu nke ihe e kpere n’ikpe ga-amalite ná ngwụsị “ụbọchị ikpeazụ,” bụ́ oge anyị bi na ya ugbu a.—2 Timoti 3:1.
“Oge awa nke ikpe” ahụ bụ ozi ọma nye ndị hụrụ ezi omume n’anya. Ọ bụ mgbe Chineke ga-eme ka ndị ohu ya nwere onwe ha, bụ́ ndị hụjuworo anya n’aka usoro ihe a na-eme ihe ike, nke na-enweghị ịhụnanya.
Ka ọ dịgodị, tupu ọgwụgwụ nke “oge awa nke ikpe” ahụ, bụ́ mgbe a ga-ebibi ajọ usoro ihe dị ugbu a, a na-agba anyị ume, sị: “Na-atụnụ Chineke egwu, na-enyekwa ya otuto.” Ị̀ na-eme nke ahụ? Nke a na-agụnye ihe karịrị ikwu, sị: “Ekwere m na Chineke.” (Matiu 7:21-23; Jems 2:19, 20) Ịtụ Chineke egwu n’ụzọ ziri ezi kwesịrị ime ka anyị na-asọpụrụ ya n’ụzọ miri emi. O kwesịrị ime ka anyị si n’ihe ọjọọ chigharịa. (Ilu 8:13) O kwesịrị inyere anyị aka ịhụ ezi ihe n’anya na ịkpọ ihe ọjọọ asị. (Emọs 5:14, 15) Ọ bụrụ na anyị na-enye Chineke nsọpụrụ, anyị ga-eji nkwanye ùgwù dị ukwuu na-ege ya ntị. Anyị agaghị emikpu nnọọ onwe anyị n’ihe ndị ọzọ nke na anyị agaghị agụchi Okwu ya, bụ́ Bible, anya. Anyị ga-eji obi anyị dum tụkwasị ya obi mgbe nile. (Abụ Ọma 62:8; Ilu 3:5, 6) Ndị na-asọpụrụ ya n’ezie na-amata na dị ka Onye Kere Eluigwe na Ala, ọ bụ Eze Eluigwe na Ala, ha na-ejikwa ịhụnanya edo onwe ha n’okpuru ya dị ka Onye o ruuru ịchịkwa ndụ ha. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na anyị kwesịrị ilebakwuru ihe ndị a anya, ka anyị mee otú ahụ n’egbughị oge.
A makwaara oge imezu ihe ahụ e kpere n’ikpe nke mmụọ ozi ahụ kwuru okwu banyere ya dị ka “ụbọchị Jehova.” “Ụbọchị” dị otú ahụ bịakwasịrị Jeruselem na 607 T.O.A. n’ihi na ndị bi na ya aṅaghị ntị n’iwu Jehova nyere site n’aka ndị amụma ya. Site n’iyigharị ụbọchị Jehova n’uche ha, ha tinyekwuru ndụ ha n’ihe ize ndụ. Jehova adịlarị mbụ dọọ ha aka ná ntị, sị: “Ọ dị nso, ọ na-emekwa ngwa nke ukwuu.” (Zefanaịa 1:14) “Ụbọchị [ọzọ nke] Jehova” bịakwasịrị Babilọn oge ochie na 539 T.O.A. (Aịsaịa 13:1, 6) N’ịbụ ndị nwere obi ike n’ihe nchebe nakwa na chi ha dị iche iche, ndị Babilọn leghaara ịdọ aka ná ntị ndị amụma Jehova nyere anya. Ma n’otu abalị, ndị Midia na ndị Peasia meriri Babilọn ukwu ahụ.
Gịnị na-eche anyị ihu taa? Ọ bụ “ụbọchị [ọzọ nke] Jehova” nke ga-emetụta ọtụtụ ndị mmadụ karị. (2 Pita 3:11-14) Chineke amawo “Babilọn Ukwu ahụ” ikpe. Dị ka Mkpughe 14:8 si kwuo, otu mmụọ ozi, na-akpọsa, sị: “Babilọn Ukwu ahụ adawo.” Nke ahụ emeelarị emee. Ọ gaghịzi egbochili ndị na-efe Jehova ofufe. A gbaala akwụwaghị aka ọtọ ya na aka ọ na-etinye n’agha n’anwụ. Ugbu a, mbibi ikpeazụ ya dị nso. N’ihi nke ahụ, Bible na-agba ndị mmadụ n’ebe nile ume, sị: “Sinụ n’ime ya [Babilọn Ukwu ahụ] pụta, ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya kere òkè ná mmehie ya, nakwa ma ọ bụrụ na unu achọghị ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya. N’ihi na mmehie ya akpụkọtawo nnọọ ọnụ ruo eluigwe, Chineke echetawokwa ajọ omume ndị o mere.”—Mkpughe 18:4, 5.
Gịnị bụ Babilọn Ukwu ahụ? Ọ bụ usoro okpukpe zuru ụwa ọnụ nke yiri Babilọn oge ochie. (Mkpughe, isi 17, 18) Tụlee ụfọdụ n’ime ebe ndị ha yiritara:
• Ndị nchụàjà Babilọn oge ochie mikpuru onwe ha na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke mba ahụ. Otú ahụ ka ihe ka ọtụtụ n’okpukpe taa na-eme.
• Ọtụtụ mgbe, ndị nchụàjà Babilọn kwadoro agha ndị mba ahụ lụrụ. Ọtụtụ mgbe, okpukpe nke oge a ebutewo ụzọ n’ịgọzi ndị agha mgbe mba ha gara agha.
• Ozizi na omume Babilọn oge ochie dubara mba ahụ n’omume rụrụ nnọọ arụ. Ebe ọ bụ na ndị ndú okpukpe taa leghaara ụkpụrụ Bible ndị na-achịkwa omume ọma anya, omume rụrụ arụ jupụtara n’etiti ndị ụkọchukwu na ndị nkịtị. Ihe kwesịkwara ịrịba ama bụ na Mkpughe kọwara Babilọn Ukwu ahụ dị ka nwanyị akwụna n’ihi na ya na ụwa na usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya na-akwa iko.
• Bible kwukwara na Babilọn Ukwu ahụ na-ebi “ndụ okomoko nke enweghị ihere.” Na Babilọn oge ochie, usoro ọrụ nke ụlọ nsọ nwetara ala buru ibu, ndị nchụàjà ya ghọkwara ndị a ma ama n’ọrụ achụmnta ego. Taa, tụkwasị n’ebe dị iche iche a na-anọ efe ofufe, Babilọn Ukwu ahụ nwekwara ọtụtụ ụlọ ọrụ achụmnta ego. Ozizi ya na ememe ya dị iche iche na-emeba ma ya onwe ya ma ndị ọrụ achụmnta ego ndị ọzọ.
• Iji ihe oyiyi eme ihe, majik, na ịgba afa jupụtara na Babilọn oge ochie, dịkwa ka o jupụtara ebe nile taa. E lere ọnwụ anya dị ka ụzọ isi banye n’ụdị ndụ ọzọ. Babilọn jupụtara n’ọtụtụ ụlọ nsọ na ụlọ ekpere ndị ha rụrụ iji na-echeta chi ha dị iche iche, ma ndị Babilọn megidere ndị na-efe Jehova ofufe. E jikwa otu nkwenkwe na omume ndị ahụ mara Babilọn Ukwu ahụ.
N’oge ochie, Jehova jiri mba ndị siri ike n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịcḥ nakwa n’agha mee ihe iji nye ndị nọgidere na-eleghara ya na uche ya anya ntaramahụhụ. N’ihi ya, ndị Asiria bibiri Sameria na 740 T.O.A. Ndị Babilọn bibiri Jeruselem na 607 T.O.A. ndị Rom bibikwara ya na 70 O.A. Ndị Midia na ndị Peasia abịazie bibie Babilọn na 539 T.O.A. Bible buru amụma na n’oge anyị, ọchịchị, dị nnọọ ka anụ ọhịa, ga-awakpo “nwanyị akwụna ahụ” ma mee ka ọ gbara ọtọ, si otú ahụ kpughee ụdị onye ọ bụ n’ezie. Ha ga-ala ya n’iyi kpam kpam.—Mkpughe 17:16.
Ọchịchị ndị dị n’ụwa a hà ga-eme ihe dị otú ahụ n’ezie? Bible na-ekwu na ‘Chineke ga-etinye ya n’obi ha.’ (Mkpughe 17:17) Ọ ga-abụ ihe ga-eme na mberede, ihe ga-eju anya, ihe ga-awụ akpata oyi n’ahụ́, ọ gaghị abụ ihe a tụrụ anya ya tupu ya emee ma ọ bụ ihe ga-eme nke nta nke nta.
Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee? Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ ka na-arapagidesi ike n’okpukpe e ji ozizi na omume ndị na-egosi na ọ bụ akụkụ nke Babilọn Ukwu ahụ metọọ?’ Ọ bụrụgodị na ị nọghị na ya, ị pụrụ ịjụ onwe gị, sị: ‘M̀ kwewo ka mmụọ ya metụta m?’ Ụdị mmụọ dị aṅaa? Ọ bụ mmụọ nke ịnabata omume rụrụ arụ, ịhụ ihe onwunwe na ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya, ma ọ bụ ịkpachara anya na-eleghara Okwu Jehova anya (ọbụna n’ihe ndị yiri ka hà bụ obere ihe). Chee echiche nke ọma banyere azịza gị.
Iji nweta ihu ọma Jehova, ọ dị oké mkpa ka anyị site n’omume anyị nakwa n’ọchịchọ nke obi anyị gosi na anyị abụghị akụkụ nke Babilọn Ukwu ahụ n’ezie. Oge agwụla agwụ. N’ịdọ anyị aka ná ntị na ọgwụgwụ ahụ ga-abịa na mberede, Bible na-ekwu, sị: “A ga-eji ụzọ dị ngwa tụda obodo ukwu ahụ bụ́ Babilọn, ọ dịghịkwa mgbe a ga-ahụ ya ọzọ.”—Mkpughe 18:21.
Ma, e nwere ihe ndị ọzọ ga-emenụ. N’akụkụ ọzọ nke “oge awa nke ikpe” ahụ, Jehova Chineke ga-eji Alaeze eluigwe ya nke dị n’aka Jizọs Kraịst kpee usoro ọchịchị nke ụwa a, ndị isi ya, na ndị nile na-akwadoghị ọchịchị ruuru Ya ikpe. (Mkpughe 13:1, 2; 19:19-21) Ọhụụ amụma nke e dekọrọ na Daniel 2:20-45 na-egosi ịchịisi ndọrọ ndọrọ ọchịchị, malite n’oge Babilọn oge ochie ruo n’oge a, dị ka nnukwute onyinyo e ji ọlaedo, ọlaọcha, ọla kọpa, ígwè, na ụrọ kpụọ. Banyere ụbọchị anyị, amụma ahụ kwuru, sị: “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi.” Banyekwara ihe Alaeze ahụ ka ga-eme ‘n’oge awa nke ikpe’ Jehova, Bible na-ekwu, sị: “Ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile [nke mmadụ] mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.
Bible na-adọ ndị na-efe ezi ofufe aka ná ntị banyere ịhụ “ihe ndị dị n’ụwa” n’anya—ụzọ ndụ nke ụwa nke a kewapụrụ onwe ya n’ebe ezi Chineke ahụ nọ na-akwalite. (1 Jọn 2:15-17) Mkpebi gị na omume gị hà na-egosi na ị dịnyeere Alaeze Chineke kpam kpam? Ị̀ na-edebe ya n’ezie n’ọnọdụ mbụ ná ndụ gị?—Matiu 6:33; Jọn 17:16, 17.
[Igbe nke dị na peeji nke 14]
Olee Mgbe Ọgwụgwụ Ga-abịa?
“N’awa unu na-echeghị na ọ gaje ịbụ ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.”—Matiu 24:44.
“Nọrọnụ na nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị ma ọ bụ awa ọ ga-abụ.”—Matiu 25:13.
“Ọ gaghị anọ ọdụ.”—Habakuk 2:3.
[Igbe nke dị na peeji nke 14]
Ọ̀ Dị Ihe Ọ Ga-agbanwe Ma A Sị na Ị Ma?
Ọ bụrụ na i jiri n’aka na mmezu na-abịanụ nke ihe Chineke kpere n’ikpe agaghị abịa n’afọ ole na ole n’ihu, nke ahụ ọ̀ ga-agbanwe otú i si eji ndụ gị eme ihe? Ọ bụrụ na ọgwụgwụ nke usoro ihe a anọteworị aka karịa otú i chere, ì kwewo ka nke a mee ka i selata aka n’ozi ị na-ejere Jehova?—Ndị Hibru 10:36-38.
Ịbụ ndị na-amaghị kpọmkwem oge ọ ga-abịa na-enye anyị ohere igosipụta na anyị ji ezi nzube obi na-ejere Chineke ozi. Ndị maara Jehova maara na igosipụta ịnụ ọkụ n’obi mgbe oge gwụrụla agwụ agaghị adọrọ mmasị Chineke, bụ́ onye na-ahụ ihe dị n’obi.—Jeremaịa 17:10; Ndị Hibru 4:13.
Nye ndị hụrụ Jehova n’anya n’ezie, ọ na-anọ n’ọnọdụ mbụ mgbe nile. Dị ka ndị ọzọ, ezi Ndị Kraịst pụrụ ịrụ ọrụ ego. Otú ọ dị, nzube ha abụghị ịba ọgaranya, kama ọ bụ inweta ihe ga-ezuru ha nakwa inwetakwu ihe ha ga-ekenye ndị ọzọ. (Ndị Efesọs 4:28; 1 Timoti 6:7-12) Ha na-enwekwa ntụrụndụ na-ewuli elu ma na-agbanwetụ ihe ndị ha na-eme mgbe dum, ma ọchịchọ ha bụ inweta ume ọhụrụ, ọ bụghị nnọọ ịdị ka ibe ha. (Mak 6:31; Ndị Rom 12:2) Dị ka Jizọs Kraịst, ha na-enwe obi ụtọ n’ime uche Chineke.—Abụ Ọma 37:4; 40:8.
Ezi Ndị Kraịst chọrọ ịdị ndụ ma na-ejere Jehova ozi ruo mgbe ebighị ebi. Na ha aghaghị icheretụkwu karịa ka ụfọdụ ndị pụrụ ịtụwo anya ime iji nweta ngọzi ụfọdụ adịghị ebelata ịdị oké ọnụ ahịa nke atụmanya ahụ.
[Igbe na Ihe Osise dị na peeji nke 15]
Ihe Iseokwu Banyere Ọbụbụeze
Iji ghọta ihe mere Chineke ji kwere ka oké nhụjuanya dịrị, ọ dị anyị mkpa ịghọta ihe iseokwu ahụ metụtara ọbụbụeze. Gịnị bụ ọbụbụeze? Ọ bụ inwe ike ọchịchị kasịnụ.
N’ihi na Jehova bụ Onye Okike, o ruuru ya ịchị ụwa na ndị nile bi n’ime ya. Otú ọ dị, Bible na-akọwa na a mara ọbụbụeze Jehova aka ná mmalite akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Setan bụ́ Ekwensu kwuru na iwu Jehova adịghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́, na Ọ ghaara nne na nna anyị mbụ ụgha banyere ihe ga-eme ma ọ bụrụ na ha eleghara iwu Chineke anya ma mee ihe otú o si masị ha, nakwa na ọ ga-akara ha mma n’ezie ma ha chịwa onwe ha n’adabereghị na Chineke.—Jenesis, isi 2, 3.
Ọ bụrụ na Chineke bibiri ndị nnupụisi ahụ ozugbo, nke ahụ gaara egosipụta ike ya, ma ọ garaghị edozi ihe iseokwu ahụ e welitere. Kama ibibi ndị nnupụisi ahụ ozugbo, Jehova ekwewo ka ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi hụ ihe nnupụisi na-akpata. Ọ bụ ezie na nke a akpatawo nhụjuanya, o nyewokwa ohere ka a mụọ anyị.
Ọzọkwa, Jehova jiri ịhụnanya mee ndokwa, nke furu ya ihe dị ukwuu, ka ndị ga-erubere ya isi ma nwee okwukwe n’àjà mgbapụta nke Ọkpara ya nwee ike inwere onwe ha pụọ ná mmehie na ihe ndị ọ kpatara ma bie na Paradaịs. Ọ bụrụ na ọ daba otú ahụ, a pụrụ ime nke a site ná mbilite n’ọnwụ.
Inye oge maka idozi ihe iseokwu a enyewokwa ndị ohu Chineke ohere igosipụta na ha pụrụ ịzaghachi nke ọma n’ịhụnanya Chineke na iguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova n’okpuru ọnọdụ ọ bụla. Idozi ihe iseokwu banyere ọbụbụeze Chineke, tinyere ihe iseokwu banyere iguzosi ike n’ezi ihe nke mmadụ bụ́ nke ya na ya nwere njikọ, dị oké mkpa iji hụ na e nwere ùgwù kwesịrị ekwesị maka iwu n’eluigwe na ala. Ọ bụrụ na e meghị otú ahụ, a pụghị inwe ezi udo ma ọlị.a
[Ntụaka ala peeji]
a A tụlere ihe iseokwu ndị a na ihe ndị ha pụtara n’ụzọ sara mbara karị n’akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Ihe Osise]
Usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị zuru ụwa ọnụ ga-abịa ná njedebe