NKEBI NKE MBỤ
“Bịa Hụrụ” Kraịst
Jizọs dịrị ndụ dị ka mmadụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga. Ma, anyị ka nwere ike ‘ịbịa hụrụ’ Ọkpara Chineke taa. (Jọn 1:46) Matiu, Mak, Luk na Jọn kọwara ụdị onye ọ bụ, àgwà ya, na ụzọ ya, nke ọma. Nkebi nke a ga-atụletụ àgwà Jizọs ndị kasị pụta ìhè.