Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jl ihe ọmụmụ 14
  • Olee Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ Na-agagasị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ Na-agagasị?
  • Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú E Si Azụ Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
  • Ụlọ Akwụkwọ Gilied Na-azụ Ndị Si Ebe Dị Iche Iche n’Ụwa
    Ihe Ndị E Ji Onyinye I Nyere Eme
  • Ụlọ Akwụkwọ Gilead—Afọ 50 Ma Na-esiwanye Ike!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Iji Obi Ụtọ Na-anabata Nduzi Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
jl ihe ọmụmụ 14

ISI NKE 14

Olee Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ Na-agagasị?

Ndị ọsụ ụzọ oge niile nọ ozi ọma

Amerịka

Ndị nọ n’ụlọ akwụkwọ Gilied
Ndị na-akwado ịga ozi ala ọzọ

Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ọ dị na Patasịn, Niu Yọk

Di na nwunye a bụ ndị ozi ala ọzọ. Ha na-ezi ozi ọma na Panama

Panama

Ihe e ji mara Ndịàmà Jehova kemgbe ụwa bụ na a na-azụ ha ka ha nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma nke ọma. E nwere ụfọdụ ụlọ akwụkwọ pụrụ iche ndị ọsụ ụzọ na-aga ka ha nwee ike ‘jezuo ozi ha.’​—⁠2 Timoti 4:⁠5.

Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ. Ọ na-abụ o ruo otu afọ mmadụ malitere ịsụ ụzọ oge niile, ya agaa ụlọ akwụkwọ a n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị ya nso. Abalị isii ka a na-aga ụlọ akwụkwọ a. Ọ na-enyere ọsụ ụzọ aka ịbịarukwu Jehova nso, ịmata otú ọ ga-esi na-ezi ozi ọma nke ọma nakwa ịnọgidesi ike n’ozi ya.

Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ọ bụ ndị bụterela ọsụ ụzọ aka na-aga ụlọ akwụkwọ a. Ọ bụ ọnwa abụọ ka a na-aga ya. Ha na-abụ ndị dị njikere ịhapụ obodo ha gaa ebe ọ bụla a ga-eziga ha. Ha na-ekwu ihe ahụ Aịzaya kwuru. Ọ sịrị, “Lee m! Ziga m.” Ha sikwa otú ahụ na-eṅomi Jizọs Kraịst bụ́ onye kacha zie ozi ọma n’ụwa. (Aịzaya 6:8; Jọn 7:29) Ịkwaga ebe ọzọ nwere ike ịpụta na onye ahụ ga-agbanwe otú o si ebi ndụ. Omenala na nri ndị obodo ebe ọ na-aga nwekwara ike ịdị ezigbo iche na nke ha. O nwekwara ike ịbụ na ọ ga-amụ asụsụ ọhụrụ ka o nwee ike izi ndị obodo ahụ ozi ọma. Ụlọ akwụkwọ a na-enyere ndị ọsụ ụzọ aka ịmụta ihe ndị ga-abara ha uru n’ebe a ga-eziga ha, nyekwara ha aka inwe nkà ndị ga-eme ka ha baara Jehova na ọgbakọ ya uru. Ndị na-aga ya bụ ụmụnna nwoke ndị lụrụla nwaanyị na ndị nwunye ha, ụmụnna nwoke na-alụbeghị nwaanyị nakwa ụmụnna nwaanyị ndị na-alụbeghị di. Ha na-abụkwa ndị nọ n’agbata iri afọ abụọ na atọ na iri afọ isii na ise.

Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Gilied bụ okwu Hibru. A sụgharịa ya, ọ pụtara “Nnukwute Ihe Àmà.” Kemgbe a malitere ụlọ akwụkwọ a n’afọ 1943, ihe karịrị puku mmadụ asatọ gụrụla akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied agbaala nnukwute àmà “ruo nsọtụ ụwa.” Àmà ndị ha gbara rụpụtakwara ọtụtụ ihe ọma. (Ọrụ Ndịozi 13:47) O nweghị ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Peruu mgbe mbụ e zigara ndị ozi ala ọzọ ebe ahụ. Ma ugbu a, e nweela ihe karịrị otu puku ọgbakọ n’ebe ahụ. Mgbe mbụ ndị ozi ala ọzọ rutere Japan, Ndịàmà Jehova erughị mmadụ iri n’ebe ahụ. Ma ugbu a, ha akarịala narị puku abụọ. Ọnwa ise ka a na-aga ụlọ akwụkwọ a. Ndị gara ya na-eji ọnwa ise ahụ amụ Baịbụl nke ọma. Ndị na-aga ụlọ akwụkwọ a bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị na-eje ozi n’ala ọzọ, ndị na-eje ozi na Betel nakwa ndị nlekọta sekit. Ihe a na-akụziri ha n’ụlọ akwụkwọ a bụ ihe ga-enyere ha aka ime ka ọrụ ikwusa ozi ọma na-aga n’ihu.

  • Olee uru Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ bara?

  • Olee ndị na-aga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya