Gịnị Ga-eme Ka Unu Na-enwe Obi Ụtọ n’Ụlọ Unu?
Ì chere na ọ bụ . . .
ịhụnanya?
ego?
ihe ọzọ?
GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?
“Ọ bụ ndị na-anụ okwu Chineke ma na-eme ya na-enwe obi ụtọ.”—Luk 11:28.
OLEE URU Ọ GA-ABARA GỊ?
Onye ọ bụla ga-ahụ ibe ya n’anya.—Ndị Efesọs 5:28, 29.
Onye ọ bụla ga-akwanyere ibe ya ùgwù.—Ndị Efesọs 5:33.
Onye ọ bụla ga-atụkwasị ibe ya obi.—Mak 10:6-9.
Ì KWESỊRỊ IKWERE IHE A BAỊBỤL KWURU?
Ee. Lee ihe abụọ mere anyị ji kwuo otú ahụ:
Ọ bụ Chineke malitere ezinụlọ. Baịbụl kwuru na ọ bụ Jehova “mere ka ezinụlọ niile . . . dịrị.” (Ndị Efesọs 3:14, 15) Ihe ihe a pụtara bụ na e wezụga Chineke, a garaghị enwe ezinụlọ. Olee uru ọ baara anyị ịma na ọ bụ Chineke malitere ezinụlọ?
Ka e were ya na e bunyere gị nri dị ezigbo ụtọ, gị eriwe riwe richaa, chọwazie ịma ihe e ji sie nri ahụ, ònye ka ị ga-ajụ? Ọ̀ kwa onye siri ya?
Ọ bụ otú ahụ ka ọ dịkwa n’okwu ezinụlọ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịma ihe ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ n’ụlọ anyị, anyị kwesịrị ịjụ Jehova, Onye Malitere ezinụlọ.—Jenesis 2:18-24.
Ihe banyere unu na-emetụ Chineke n’obi. Unu ga na-enwe obi ụtọ n’ụlọ unu ma unu na-eme ihe Jehova kwuru n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. Maka gịnị? Maka na “ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.” (1 Pita 5:6, 7) Jehova chọrọ ka ihe gaziere unu. Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe o kwuru, ihe ga-agaziri unu.—Ilu 3:5, 6; Aịzaya 48:17, 18.
IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE
Gịnị ka ị ga-eme ka i nwee ike ịbụ ezigbo di, ezigbo nwunye, ezigbo nne, ma ọ bụ ezigbo nna?
Ị gụọ NDỊ EFESỌS 5:1, 2 na NDỊ KỌLỌSI 3:18-21, ị ga-amata azịza ya.