Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yc ihe ọmụmụ 4 p. 10-11
  • O Mere Papa Ya Obi Ụtọ, Meekwa Jehova Obi Ụtọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • O Mere Papa Ya Obi Ụtọ, Meekwa Jehova Obi Ụtọ
  • Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Enyi Ya na Chineke Hụrụ Ya n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Nkwa Jefta Kwere
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ikwesị Ntụkwasị Obi Ga-eme Ka Chineke Gọzie Anyị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Nkwa Jefta Kwere
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Kụziere Ụmụ Gị Ihe
yc ihe ọmụmụ 4 p. 10-11
Ebe Jefta na-akụziri nwa ya nwaanyị ihe mgbe ọ ka bụ obere nwa

ISI NKE 4

O Mere Papa Ya Obi Ụtọ, Meekwa Jehova Obi Ụtọ

Ebe Jefta na-ekpe ekpere mgbe ndị agha Izrel na-alụso ndị iro ha ọgụ

Olee nkwa Jefta na-ekwe Jehova?

Ebe Jefta makuru ada ya bịara izute ya mgbe o si agha na-alọta

O wutere Jefta na nwa ya, ma nwa ya mere ihe papa ya kwere Jehova ná nkwa

Ị̀ hụrụ nwatakịrị nwaanyị a e sere ebe a?— Aha papa ya bụ Jefta. Baịbụl agwaghị anyị aha nwatakịrị a, ma anyị ma na o mere papa ya obi ụtọ. O mekwara Jehova obi ụtọ. Ka anyị mụọ banyere ya na papa ya.

Jefta bụ ezigbo mmadụ, ọ kụzikwaara nwa ya banyere Jehova. Jefta siri ike, na-edukwa ndị mmadụ aga agha. N’ihi ya, ndị Izrel rịọrọ ya ka o duru ha gaa lụso ndị iro ha agha.

Jefta rịọrọ Chineke ka o nyere ya aka ka ha merie n’agha ahụ. O kwere Chineke nkwa na ọ bụrụ na ya emerie na-alọta n’ụlọ ya, na ya ga-enye Chineke onye ọ bụla bu ụzọ pụta ikele ya. Onye ahụ ga-ebi n’ụlọikwuu Chineke, na-arụ ọrụ ebe ahụ ruokwa mgbe onye ahụ ga-anwụ. Ụlọikwuu bụ ebe ndị mmadụ na-aga efe Chineke n’oge ochie. Jefta mechara merie n’agha ahụ. Ị̀ ma onye mbụ si n’ụlọ ya pụta ikele ya mgbe ọ lọtara?—

Ọ bụ nwa ya nwaanyị. Ọ bụ naanị ya ka ọ mụrụ. Ugbu a, ọ ga-ahapụ ụlọ ha. Ihe a wutere Jefta. Ma, chetakwa na o kwere Chineke nkwa. Ozugbo ahụ, nwa ya nwaanyị gwara ya, sị, ‘Papa, i kwere Jehova nkwa, i kwesịrị ime ihe i kwere ná nkwa.’

Ebe ada Jefta nọ na-achikọta nkụ e ji eme ihe n’ụlọikwuu mgbe ndị enyi ya bịara ileta ya

Ndị enyi nwa Jefta na-abịa eleta ya n’afọ ọ bụla

Obi adịghịkwa nwa Jefta mma. Maka gịnị? Maka na ọ gaa ịrụ ọrụ n’ụlọikwuu, ọ gaghị alụ di, ọ gaghịkwa amụ nwa. Ma, ọ chọrọ ime ihe papa ya kwere ná nkwa. Ọ chọkwara ime Jehova obi ụtọ. Ime ma papa ya ma Jehova obi ụtọ dị ya mkpa karịa ịlụ di na ịmụ nwa. Ọ hapụrụ ụlọ ha, gaa biri n’ụlọikwuu ruo mgbe ọ nwụrụ.

Ì chere na ihe a o mere mere ka obi dị ma papa ya ma Jehova ụtọ?— Ee, o mere ha obi ụtọ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịna-eme ka nwa Jefta, ị ga-erubere papa gị na mama gị isi, hụkwa Jehova n’anya. Ị na-eme otú ahụ, ị ga-eme papa gị na mama gị obi ụtọ, obi ga-adịkwa Jehova ụtọ.

GỤỌ EBE NDỊ A NA BAỊBỤL GỊ

  • Diuterọnọmi 6:4-6

  • Ndị Ikpe 11:30-40

  • 1 Ndị Kọrịnt 7:37, 38

AJỤJỤ:

  • Ònye bụ Jefta? Olee nkwa o kwere?

  • Gịnị mere o ji sitụrụ nwa Jefta ike ime ihe papa ya kwere ná nkwa?

  • Gịnị kacha nwa Jefta mkpa?

  • Olee otú ị ga-esi na-eme ka nwa Jefta?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya