Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 2/1 p. 25-26
  • Ndị Enyi Ya na Chineke Hụrụ Ya n’Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Enyi Ya na Chineke Hụrụ Ya n’Anya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • O Mere Papa Ya Obi Ụtọ, Meekwa Jehova Obi Ụtọ
    Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • Nkwa Jefta Kwere
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ikwesị Ntụkwasị Obi Ga-eme Ka Chineke Gọzie Anyị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Jefta Mezuru Nkwa O Kwere Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 2/1 p. 25-26

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Ndị Enyi Ya na Chineke Hụrụ Ya n’Anya

O NWEGHỊ onye maara aha ya taa. Naanị ihe e ji mara ya ugbu a bụ aha nna ya, bụ́ Jefta. Ka anyị leba anya na Baịbụl ma mata banyere ha abụọ. Anyị ga-achọpụta na ma ndị enyi ada Jefta ma Chineke hụrụ ya n’anya.

Anyị nwere ike ịgụ banyere Jefta na nwa ya nwaanyị na Baịbụl ná Ndị Ikpe isi 11. Ebe ọ bụ na Jefta bụ ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, o doro anya na ọ na-akọrọ nwa ya nwaanyị ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ mgbe niile.

Jefta dịrị ndụ tupu ndị Chineke, bụ́ ndị Izrel, ekwuo ka e nye ha eze bụ́ mmadụ ga na-achị ha. Jefta bụ nwoke siri ike nke maara otú e si alụ ọgụ. N’ihi ya, ndị Izrel gwara ya ka o duru ha gaa ịlụso ndị Amọn agha, bụ́ mba ha na Izrel gbara, bụ́kwa ndị na-alụso ha ọgụ.

Jefta chọrọ ka Chineke nyere ya aka imeri ndị Amọn, n’ihi ya, o kwere Chineke nkwa. Jefta kwuru na ọ bụrụ na Jehova emee ka ya merie n’agha ahụ, ya ga-enye Jehova onye mbụ si n’ụlọ ya pụta izute ya mgbe ọ lọtara. Onye ahụ ga-eji ndụ ya niile jee ozi n’ụlọikwuu Chineke, bụ́ ebe ndị Chineke na-efe ofufe n’oge ahụ. Ị̀ maara onye mbụ pụtara izute ya?—a

Ee, ọ bụ ada Jefta! O wutere nnọọ Jefta. O nwere naanị otu nwa. Ma, o kwela Jehova nkwa, ọ ga-emezurịrị ya. Ozugbo ahụ, nwa ya nwaanyị kwuru, sị: “Nna m, ọ bụrụ na i megheworo Jehova ọnụ gị, mee m ihe si n’ọnụ gị pụta.” O kwuziri ka e nye ya ọnwa abụọ ka ya gaa bee ákwá n’ugwu. Olee ihe mere ihe ahụ ji na-ewute ya? Ọ bụ n’ihi na ọ bụrụ na o mezuo nkwa ahụ nna ya kwere, ọ gaghị alụ di ma ọ bụ mụọ nwa. N’agbanyeghị nke ahụ, o cheghị na ọ bụ ọchịchọ nke ya ka mkpa. Ọ chọrọ irubere nna ya isi ma kwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ. Ì chere na o mere Jehova na nna ya obi ụtọ?—

Ya mere, Jefta hapụrụ nwa ya nwaanyị na ndị enyi ya nwaanyị ka ha jiri ọnwa abụọ nọọ n’ugwu. Mgbe ọ lọtara, nna ya mezuru nkwa ya site n’iziga ya n’ụlọikwuu Chineke dị na Shaịlo ka ọ nọrọ ebe ahụ ná ndụ ya niile. Kwa afọ, ụmụ agbọghọ Izrel na-aga Shaịlo ịgba ada Jefta ume.

Ọ̀ dị ndị na-eto eto ị maara na-erubere ndị mụrụ ha isi ma hụ Jehova n’anya?— Ọ dị mma ka ị matakwuo ụmụaka ndị ahụ ma mere ha enyi. Ọ bụrụ na i ṅomie ada Jefta ma na-erube isi, kwesịkwa ntụkwasị obi, ị ga-enwe ezi ndị enyi. Ị ga-eme ndị mụrụ gị obi ụtọ, Jehova ga-ahụkwa gị n’anya.

Gụọ ebe ndị a na Baịbụl gị

Diuterọnọmi 6:4-6

Ndị Ikpe 11:30-40

1 Ndị Kọrịnt 7:37, 38

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya