Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yc ihe ọmụmụ 11 p. 24-25
  • Ha Dere Gbasara Jizọs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Dere Gbasara Jizọs
  • Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Dere Banyere Jizọs
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Jizọs Kụziiri Ya Ihe Bụ́ Ịgbaghara Mmadụ Mmehie
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ọ Mụtara Mgbaghara n’Aka Nna Ya Ukwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ndụmọdụ E Nyere Banyere Okwukwe, Àgwà na Ịhụnanya
    Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Kụziere Ụmụ Gị Ihe
yc ihe ọmụmụ 11 p. 24-25
Matiu, Mak, Luk, Jọn, Pita, Jems, Jud na Pọl so ná ndị dere gbasara Jizọs na Baịbụl

ISI NKE 11

Ha Dere Gbasara Jizọs

Ị̀ hụrụ ụmụ nwoke ndị a e sere ebe a?— Aha ha bụ Matiu, Mak, Luk, Jọn, Pita, Jems, Jud, na Pọl. Ha niile nọ ndụ n’ụwa mgbe Jizọs bịara n’ụwa. Ha dekwara ọtụtụ ihe gbasara Jizọs. Ka anyị mụọ banyere ha.

Olee ihe ị ma banyere ụmụ nwoke ndị a?

Atọ n’ime ha bụ ndịozi Jizọs. Ha sokwa ya na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ị̀ ma aha mmadụ atọ ahụ?— Ha bụ Matiu, Jọn, na Pita. Matiu na Jọn ma Jizọs nke ọma. Onye ọ bụla n’ime ha dere akwụkwọ gbasara ihe Jizọs mere mgbe ọ bịara n’ụwa. Jọn dekwara akwụkwọ a na-akpọ Mkpughe, deekwa Jọn nke Mbụ, Jọn nke Abụọ, na Jọn nke Atọ. Pita onyeozi dere akwụkwọ ozi abụọ dị na Baịbụl. A na-akpọ ha Pita nke Mbụ na Pita nke Abụọ. N’akwụkwọ ozi nke abụọ ahụ, Pita dere na e nwere mgbe Jehova si n’eluigwe kwuo otú obi dị ya banyere Jizọs. Jehova kwuru, sị: ‘Onye a bụ ọkpara m. Ahụrụ m ya n’anya, ọ na-eme ihe dị m mma.’

Ụmụ nwoke ndị ọzọ e sere ebe a dekwara banyere Jizọs. Anyị ga-amụta ihe ndị Jizọs mere ma anyị na-agụ akwụkwọ ndị ahụ ha dere. Aha otu n’ime ha bụ Mak. Ọ dị ka ọ̀ nọ ya mgbe a kpụụrụ Jizọs, ọ hụkwara ihe niile mere mgbe ahụ. Aha onye ọzọ dere banyere Jizọs bụ Luk. Ọ bụ dọkịta. Ọ dịkwa ka ọ̀ bụ mgbe Jizọs nwụchara ka ọ ghọrọ Onye Kraịst.

Mmadụ abụọ n’ime ndị a e sere ebe a bụ ụmụnne Jizọs ndị ọ tọrọ. Ha sokwa dee Baịbụl. Ị̀ ma aha ha?— Ha bụ Jems na Jud. Ha ekwetabughị n’ihe Jizọs nọ na-akụzi. O nwedịrị mgbe ha chere na isi adịghị ya mma. Ma, ha mechara kweta na Jizọs bụ Ọkpara Chineke, ha ghọzie Ndị Kraịst.

Onye ọzọ e sere n’ebe a bụ Pọl. O so dee Baịbụl. Tupu ọ bụrụ Onye Kraịst, aha ya bụ Sọl. Ọ kpọrọ Ndị Kraịst asị, mesiekwa ha ike. Ị̀ ma ihe mere o ji mechaa ghọọ Onye Kraịst?— Otu ụbọchị, mgbe ọ na-aga ihe, ọ nụrụ ka e si n’eluigwe gwa ya okwu. Ọ bụ Jizọs gwara ya okwu ahụ. Ọ jụrụ Pọl, sị: ‘Gịnị mere i ji na-emesi ndị na-eso ụzọ m ike?’ Ihe a ọ gwara Pọl mere ka ọ gbanwee, ghọọ Onye Kraịst. Pọl dere akwụkwọ iri na anọ dị na Baịbụl. Akwụkwọ ndị ahụ malitere ná Ndị Rom ruo ná Ndị Hibru.

Ọ̀ kwa anyị niile na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị?— Ọ bụrụ na anyị na-agụ ya kwa ụbọchị, anyị ga-amụta ọtụtụ ihe banyere Jizọs. Ị́ gaghị achọ ịmatakwu ọtụtụ ihe banyere Jizọs?—

GỤỌ EBE NDỊ A NA BAỊBỤL GỊ

  • 2 Pita 1:16-18

  • Mak 3:21; 14:51

  • Jud 1

  • Ọrụ Ndịozi 9:1-18

AJỤJỤ:

  • Gịnị bụ aha ndị dere ihe ndị Jizọs mere mgbe ọ bịara n’ụwa?

  • Gịnị bụ aha ụmụnne Jizọs abụọ ndị so dee Baịbụl?

  • Olee otú Pọl si ghọọ Onye Kraịst?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya