Nkebi nke 25
Ndụmọdụ E Nyere Banyere Okwukwe, Àgwà na Ịhụnanya
Jems, Pita, Jọn, na Jud dere akwụkwọ ozi ndị ha ji gbaa Ndị Kraịst ibe ha ume
Ọ BỤ otu nne mụrụ Jems, Jud, na Jizọs. Pita na Jọn so ná ndịozi iri na abụọ Jizọs. Jems, Jud, Pịta na Jọn dere akwụkwọ ozi asaa ndị so n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. A kpọrọ akwụkwọ ozi nke ọ bụla aha onye dere ya. Ihe mere e ji si n’ike mmụọ nsọ nye ndụmọdụ ndị dị n’akwụkwọ ozi ndị ahụ bụ ka e nyere Ndị Kraịst aka ịnọgide na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova ma na-akwado Alaeze ya.
Ndị Kraịst kwesịrị igosi na ha nwere okwukwe. Ọ bụghị mmadụ ikwu na ya nwere okwukwe bụ ebe o biri. Ezigbo okwukwe na-eme ka mmadụ rụọ ọrụ. Jems dere, sị: “N’ezie, . . . okwukwe nke na-enweghị ọrụ bụ ihe nwụrụ anwụ.” (Jems 2:26) Mgbe a na-anwa anyị, ọ bụrụ na omume anyị na-egosi na anyị nwere okwukwe, anyị ga na-enwekwu ntachi obi. Iji tachie obi, Onye Kraịst kwesịrị ịrịọ Chineke ka o nye ya amamihe, obi esie ya ike na Chineke ga-enye ya amamihe ahụ. Chineke na-agọzi ndị na-atachi obi. (Jems 1:2-5, 12) Ọ bụrụ na onye na-efe Chineke e jiri okwukwe nọgide na-eme ihe ziri ezi, Jehova Chineke ga-anọnyere ya. Jems kwuru, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jems 4:8.
Onye Kraịst kwesịrị inwe okwukwe siri ike, nke ga-enyere ya aka imeri ọnwụnwa ma zere omume rụrụ arụ. Ọ bụ n’ihi omume rụrụ arụ jupụtara ebe niile ka Jud ji gbaa ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha “lụsie ọgụ ike maka okwukwe ahụ.”—Jud 3.
Ndị Kraịst kwesịrị ịna-akpa àgwà ọma. Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya dị nsọ, ya bụ, ka ha dị ọcha n’ihe niile. Pita dere, sị: ‘Bụrụnụ ndị dị nsọ n’omume unu niile, n’ihi na e dere, sị: “Unu ga-adị nsọ, n’ihi na m [Jehova] dị nsọ.’” (1 Pita 1:15, 16) Ndị Kraịst nwere onye ha kwesịrị iṅomi. Pita kwuru, sị: “Kraịst tara ahụhụ n’ihi unu, wee hapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.” (1 Pita 2:21) N’agbanyeghị na Ndị Kraịst nwere ike ịta ahụhụ n’ihi ime ihe Chineke kwuru, ha na-enwe “ezi akọ na uche.” (1 Pita 3:16, 17) Pita gbara Ndị Kraịst ume ka ha nwee àgwà dị nsọ na omume ịsọpụrụ Chineke ka ha na-eche ụbọchị ikpe Chineke na ụwa ọhụrụ o kwere ná nkwa, bụ́ ebe ‘ezi omume ga-ebi.’—2 Pita 3:11-13.
Ndị Kraịst kwesịrị inwe ịhụnanya. Jọn dere, sị: “Chineke bụ ịhụnanya.” Onyeozi ahụ kwuru na Chineke gosiri na ya hụrụ anyị n’anya nke ukwuu ma zite Jizọs ka ọ bụrụ ‘àjà maka mmehie anyị.’ Gịnị ka Ndị Kraịst kwesịrị ime? Jọn kwuru, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ọ bụrụ otú a ka Chineke si hụ anyị n’anya, anyị onwe anyị ji ụgwọ ịhụrịta ibe anyị n’anya.” (1 Jọn 4:8-11) Otu ụzọ anyị si egosi na anyị nwere ụdị ịhụnanya ahụ bụ ile ndị kwere ekwe ibe anyị ọbịa.—3 Jọn 5-8.
Ma, olee otú ndị na-efe Jehova nwere ike isi gosi na ha hụrụ ya n’anya? Jọn zara ajụjụ ahụ. Ọ sịrị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu; ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.” (1 Jọn 5:3; 2 Jọn 6) N’ihi ya, ndị na-erubere Chineke isi nwere obi ike na ọ ga-anọgide na-ahụ ha n’anya, ‘nke ga-eduga ha ná ndụ ebighị ebi.’—Jud 21.
—O si na Jems; Pita nke Mbụ na nke Abụọ; Jọn nke Mbụ, nke Abụọ na nke Atọ nakwa Jud.
◼ Olee otú Onye Kraịst ga-esi egosi na ya nwere okwukwe?
◼ Olee ụdị àgwà Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya na-akpa?
◼ Olee otú mmadụ si egosi na ya hụrụ Chineke n’anya n’ezie?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 29]
“Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jems 4:8
Chaatị dị na peeji nke 29]
Jenesis
Ọpụpụ
Levitikọs
Ọnụ Ọgụgụ
Diuterọnọmi
Jọshụa
Ndị Ikpe
Rut
1 Samuel
2 Samuel
1 Ndị Eze
2 Ndị Eze
1 Ihe E Mere
2 Ihe E Mere
Ezra
Nehemaya
Esta
Job
Abụ Ọma
Ilu
Ekliziastis
Abụ Sọlọmọn
Aịzaya
Jeremaya
Abụ Ákwá
Ezikiel
Daniel
Zekaraya
Malakaị
Matiu
Mak
Luk
Jọn
Ọrụ Ndịozi
Ndị Rom
1 Ndị Kọrịnt
2 Ndị Kọrịnt
Ndị Galeshia
Ndị Efesọs
Ndị Filipaị
Ndị Kọlọsi
1 Ndị Tesalonaịka
2 Ndị Tesalonaịka
1 Timoti
2 Timoti
Taịtọs
Faịlimọn
Ndị Hibru
Jems ●
1 Pita ●
2 Pita ●
1 Jọn ●
2 Jọn ●
3 Jọn ●
Jud ●
Mkpughe