Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • hf nkebi 1 p. 3-5
  • Chineke Ga-enyere Unu Aka Ịna-ebi n’Udo

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Ga-enyere Unu Aka Ịna-ebi n’Udo
  • Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • 1 NA-ARỤ ỌRỤ JEHOVA NYERE GỊ
  • 2 EMELA YA IHE GA-EWUTE YA
  • 3 NWEENỤ OTU OBI
  • Na-akwanyere Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Ùgwù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Agbala n’Èzí
    Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
  • Otú Gị na Ndị Ọgọ Gị ma Ọ Bụ Ndị Be Di Gị Ga-esi Na-adị n’Udo
    Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
  • Ihe Ga-akwụsị Mkpesa Ndị A Na-emekarị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
hf nkebi 1 p. 3-5
Foto otu di na nwunye n’ụbọchị ha gbara akwụkwọ

ISIOKWU NKE 1

Chineke Ga-enyere Unu Aka Ịna-ebi n’Udo

“Onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwaanyị.”—Matiu 19:4

Ọ bụ Jehovaa Chineke malitere alụmdi na nwunye. Baịbụl gwara anyị na mgbe Chineke kere Iv, ọ kpọọrọ ya kpọtara Adam. Obi tọrọ Adam ezigbo ụtọ, o wee sị: “Ehee! Onye a bụ ọkpụkpụ nke si n’ọkpụkpụ m.” (Jenesis 2:22, 23) Jehova chọkwara ka ndị bụ́ di na nwunye taa na-enwe obi ụtọ.

Mmadụ lụọ di ma ọ bụ nwunye, o nwere ike iche na ha agaghị na-ese okwu. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na e nweghị di na nwunye na-anaghị ese okwu n’agbanyeghị na ha hụrụ ibe ha n’anya. (1 Ndị Kọrịnt 7:28) N’akwụkwọ a, ị ga-ahụ ihe ndị Baịbụl kwuru ga-enyere unu aka ịna-ebi n’udo n’ezinụlọ unu ma unu na-eme ha.—Abụ Ọma 19:8-11.

1 NA-ARỤ ỌRỤ JEHOVA NYERE GỊ

IHE BAỊBỤL KWURU: Di bụ onyeisi ezinụlọ.—Ndị Efesọs 5:23.

Ọ bụrụ na ị lụọla nwaanyị, Jehova chọrọ ka ị na-elekọta ya nke ọma. (1 Pita 3:7) Chineke mere ya ka ọ bụrụ onye ga na-enyere gị aka. Ọ chọkwara ka ị na-akwanyere ya ùgwù, hụkwa ya n’anya. (Jenesis 2:18) I kwesịrị ịhụ nwunye gị n’anya ruo n’ókè na ị ga na-ebute ọdịmma ya ụzọ.—Ndị Efesọs 5:25-29.

Ọ bụrụ na ị bụ nwaanyị nọ na di, Jehova chọrọ ka ị na-akwanyere di gị ùgwù nke ukwuu. Ọ chọkwara ka ị na-enyere ya aka ịrụ ọrụ ya nke ọma. (1 Ndị Kọrịnt 11:3; Ndị Efesọs 5:33) Di gị kpebie ihe unu ga-eme, kwado ya. (Ndị Kọlọsi 3:18) Ọ bụrụ na ị na-asọpụrụ di gị, ọ ga-ahụ gị n’anya, Jehova ga-ahụkwa gị n’anya.—1 Pita 3:1-6.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Jụọ di gị ma ọ bụ nwunye gị ihe ị ga-eme ka ị bụrụkwuo ezigbo mmadụ. Gee ntị n’ihe ọ ga-agwa gị, gbaakwa mbọ ka i mee ihe ọ gwara gị

  • Nwee ndidi. Ọ bụ nwayọọ nwayọọ ka unu ga-eji mụtacha otú unu ga-esi na-ebi n’udo

2 EMELA YA IHE GA-EWUTE YA

IHE BAỊBỤL KWURU: I kwesịrị ịna-eme ihe ga-adị di gị ma ọ bụ nwunye gị mma. (Ndị Filipaị 2:3, 4) Cheta na Jehova achọghị ka anyị na-emesi ndị ọzọ ike, n’ihi ya, ejila di gị ma ọ bụ nwunye gị egwu egwu. Kama, jiri obiọma na-emeso ya ihe. (2 Timoti 2:24) Baịbụl kwuru na okwu e kwuru “n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ, ma ire ndị maara ihe na-agwọ ọrịa.” N’ihi ya, na-ata okwu gị ezé. (Ilu 12:18) Mmụọ nsọ ga-enyere gị aka ka ị na-agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị okwu ọma nke ga-egosi na ị hụrụ ya n’anya.—Ndị Galeshia 5:22, 23; Ndị Kọlọsi 4:6.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Rịọ Chineke ka o nyere gị aka ka obi ruo gị ala ma gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwuwe ihe dị mkpa unu chọrọ ime nakwa ka ị ghara ịbụ ekwe ekwe

  • Chebara ihe ị ga-ekwu na otú ị ga-esi ekwu ya echiche

3 NWEENỤ OTU OBI

IHE BAỊBỤL KWURU: Baịbụl kwuru na mmadụ lụọ di ma ọ bụ nwunye, “ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́.” (Matiu 19:5) N’agbanyeghị na unu abụọ bụ otu anụ ahụ́, unu ka bụkwa mmadụ abụọ. Ọ bụghị mgbe niile ka ihe masịrị gị ga-amasị di gị ma ọ bụ nwunye gị. N’ihi ya, gbalịanụ ka obi unu bụrụ otu. (Ndị Filipaị 2:2) O kwesịghị ịbụ unu na-akpa ihe dị mkpa unu ga-eme, onye nke a na-ekwu n’elu, onye nke ọzọ ana-ekwu n’ala. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị: “A na-eji ndụmọdụ eme ka atụmatụ guzosie ike.” (Ilu 20:18) N’ihi ya, mgbe ọ bụla unu na-ekpebi ihe unu ga-eme, kwenụ ka ihe Baịbụl kwuru nyere unu aka.—Ilu 8:32, 33.

Ebe otu di na nwunye na-emekọ ihe ọnụ. Ha abụọ so na-asa ákwà ma na-asakwa efere

IHE I NWERE IKE IME:

  • Na-agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị otú obi dị gị, ọ bụghị naanị ihe ndị i chere unu ga-eme ma ọ bụ ihe ị chọrọ ka o mee

  • Tupu i kweta imere mmadụ ihe, buru ụzọ gwa di gị ma ọ bụ nwunye gị

a Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

ECHELA NA Ọ GA-EMETACHA IHE NIILE, ADAKWALA MBÀ

Echela na gịnwa ma ọ bụ di gị ma ọ bụ nwunye gị ga na-emetacha ihe niile. (Abụ Ọma 103:14; Jems 3:2) Lekwasị anya n’àgwà ọma ndị di gị ma ọ bụ nwunye gị nwere. Obi sie gị ike na ọ bụrụ na unu enwee ndidi, ihe ndị unu mụtara na Baịbụl ga-enyere unu aka ịna-ebi n’udo. (2 Timoti 3:16) Jehova ga-agọzi unu ma unu gbalịa na-eme ihe o kwuru, unu ga na-ebikwa n’udo.—Ndị Galeshia 6:9.

JỤỌ ONWE GỊ AJỤJỤ NDỊ A . . .

  • Di m ma ọ bụ nwunye m ọ̀ ga-ekwu na m na-eleta ya anya nke ọma?

  • Gịnị ka m mere taa na-egosi na m hụrụ di m ma ọ bụ nwunye m n’anya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya