Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • hf nkebi 2 p. 6-8
  • Agbala n’Èzí

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Agbala n’Èzí
  • Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • 1 EJILA DI GỊ MA Ọ BỤ NWUNYE GỊ EGWU EGWU
  • 2 CHEBE OBI GỊ
  • Chineke Ga-enyere Unu Aka Ịna-ebi n’Udo
    Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
  • Ime Ka Obi Gị Dum Dịgide n’Ebe Nwunye Gị Ma Ọ Bụ Di Gị Nọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Na-akwanyere Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Ùgwù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Otú Gị na Ndị Ọgọ Gị ma Ọ Bụ Ndị Be Di Gị Ga-esi Na-adị n’Udo
    Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
hf nkebi 2 p. 6-8
Ebe otu nwoke jideere nwunye ya nche mmiri mgbe ọ na-abanye n’ụgbọ ala

ISIOKWU NKE 2

Agbala n’Èzí

“Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—Mak 10:9

Jehova gwara ndị lụrụ di na nwunye na ha ekwesịghị ịghọ ibe ha aghụghọ. (Malakaị 2:16) Ihe a Chineke kwuru bara uru n’ihi na di na nwunye agaghị atụkwasị ibe ha obi ma ọ bụrụ na otu n’ime ha na-agba n’èzí. Oleekwanụ otú ha ga-esi ahụ ibe ha n’anya ma ọ bụrụ na ha atụkwasịghị ibe ha obi?

Taa, ọtụtụ ndị di na nwunye na-agba n’èzí. E nwere ihe abụọ i kwesịrị ime ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ghara ịbanye ná nsogbu a.

1 EJILA DI GỊ MA Ọ BỤ NWUNYE GỊ EGWU EGWU

IHE BAỊBỤL KWURU: “Chọpụta ihe ndị ka mkpa.” (Ndị Filipaị 1:10) Ezinụlọ gị so n’ihe ndị kwesịrị ịdị gị mkpa ná ndụ. Di na nwunye kwesịrị iji ibe ha kpọrọ ihe.

Jehova achọghị ka obi gị dị n’ebe nwoke ọzọ ma ọ bụ nwaanyị ọzọ nọ. Ọ chọkwara ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ‘na-ekpori ndụ.’ (Ekliziastis 9:9) Ọ chọghị ka ị na-eleghara onye ị lụrụ anya, kama ka ị gbalịa na-eme ya obi ụtọ. (1 Ndị Kọrịnt 10:24) Na-eme ihe ga-egosi di gị ma ọ bụ nwunye gị na ị hụrụ ya n’anya nakwa na i jighị ya egwu egwu.

Ebe otu nwoke na-ebunye nwunye ya tii ka ọ ṅụọ; ebe otu nwoke na-alọta hụ nwunye ya ka ọ na-esi nri

IHE I NWERE IKE IME:

  • Na-ewepụtanụ oge unu ga-eji na-anọrị, na-egenụ ibe unu ntị

  • Echezila banyere naanị onwe gị, kama, na-eche banyere di gị ma ọ bụ nwunye gị

Ebe otu di na nwunye nọ na-enweta onwe ha ebe ha gara mkpapụ

2 CHEBE OBI GỊ

IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.” (Matiu 5:28) Ọ bụrụ na ihe di ma ọ bụ nwunye na-eche mgbe niile bụ ihe rụrụ arụ, e nwere ike ikwu na ọ na-agba n’èzí.

Jehova kwuru na anyị kwesịrị ‘ichebe obi anyị.’ (Ilu 4:23; Jeremaya 17:9) Ihe ọ pụtara bụ na i kwesịghị ịna-ele ihe na-adịghị mma anya. (Matiu 5:29, 30) Ọ ga-adị mma ka i mee ka Job. Ọ sịrị na ya na anya ya gbara ndụ na ya agaghị ele nwaanyị ọzọ anya, agụụ ya ewee gụọ ya. (Job 31:1) Kpebie na ị gaghị ele ndị gba ọtọ. Kpebiekwa na ị ga-ezere ihe ọ bụla ga-eme ka obi gị dịwa n’ebe onye ọzọ na-abụghị di gị ma ọ bụ nwunye gị nọ.

Ebe otu nwoke dowere foto ya na nwunye ya n’elu tebụl dị n’ọfis ya

IHE I NWERE IKE IME:

  • Mee ka ndị mmadụ mara na ị hụrụ di gị ma ọ bụ nwunye gị n’anya

  • Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị ekwuo na otú i si aga nwoke ọzọ ma ọ bụ nwaanyị ọzọ nso adịghị ya mma, gee ya ntị

MEE IHE I KWESỊRỊ IME

Na-agwa onwe gị eziokwu, chọpụtakwa ihe ndị ị na-anaghị emetacha. (Abụ Ọma 15:2) Ihere emela gị ịgwa ndị ọzọ ka ha nyere gị aka. (Ilu 1:5) Ọ bụrụ na ị na-echekarị banyere omume rụrụ arụ, gbasie mbọ ike ka ị kwụsị ya. Adakwala mbà. (Ilu 24:16) Jehova ga-agọzi mbọ niile ị na-agba ka ị ghara ịgba n’èzí.

JỤỌ ONWE GỊ AJỤJỤ NDỊ A . . .

  • Olee otú m ga-esi wepụtakwuo oge ka mụ na di m ma ọ bụ nwunye m na-anọrị?

  • Mụ na di m ma ọ bụ nwunye m ànyị dị ná mma?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya