Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • hf nkebi 8 p. 26-28
  • Mgbe Nsogbu Batara n’Ezinụlọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Nsogbu Batara n’Ezinụlọ
  • Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • 1 TỤKWASỊ JEHOVA OBI
  • 2 LEKỌTA ONWE GỊ, LEKỌTAKWA NDỊ EZINỤLỌ GỊ
  • 3 ỤMỤNNA GỊ GA-ENYERE GỊ AKA
  • Ihe Anyị Ga-eme ma Ọrịa Bịa Anyị na Mberede
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Anya Jehova Dị n’Ebe Ndị Ya Nọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ụzọ Isi Nweta Olileanya n’Oge Obi Nkoropụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
hf nkebi 8 p. 26-28
Ebe di na nwunye na-eru uju ọnwụ nwa ha

ISIOKWU NKE 8

Mgbe Nsogbu Batara n’Ezinụlọ

‘Unu na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu, ọ bụ ezie na e mewo ka unu nwee mwute site n’ọnwụnwa dị iche iche.’—1 Pita 1:6

N’agbanyeghị na ị na-agbalịsi ike ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ unu, ihe unu na-atụghị anya ya nwere ike ime ka unu ghara ịna-enwezi obi ụtọ. (Ekliziastis 9:11) Chineke na-enyere anyị aka ma nsogbu bịara anyị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị emee ihe ndị e kwuru n’isiokwu a, unu na ndị ezinụlọ unu ga-enwe ike idi ụdị nsogbu ọ bụla bịaara unu.

1 TỤKWASỊ JEHOVA OBI

IHE BAỊBỤL KWURU: ‘Tụkwasị ya nchegbu gị niile, n’ihi na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’ (1 Pita 5:7) Echefula na nsogbu ọ bụla bịaara gị esighị Chineke n’aka. (Jems 1:13) Ọ bụrụ na ị bịaruo Jehova nso, ọ ga-enyere gị aka idi nsogbu ndị ị na-enwe. (Aịzaya 41:10) Baịbụl gbara anyị ume ka anyị gwa ya ihe ọ bụla na-enye anyị nsogbu n’obi.—Abụ Ọma 62:8.

Ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị bụ ihe ọzọ ga-enyere gị aka. Jehova na-eji ihe anyị gụtara akasi “anyị obi ná mkpagbu anyị niile.” (2 Ndị Kọrịnt 1: 3, 4; Ndị Rom 15:4) O kwere anyị nkwa na ya ga-eme ka anyị nwee udo “nke karịrị echiche niile.”—Ndị Filipaị 4:6, 7, 13.

Ebe otu nwoke na-arịa ọrịa so ezinụlọ ya na-ekpe ekpere

IHE I NWERE IKE IME:

  • Rịọ Jehova ka o mee ka isi jụọ gị oyi ka i nwee ike iche echiche nke ọma

  • Ihe niile i chetara i nwere ike ime ma nsogbu bịara gị, chebara ha echiche. Si n’ime ha họrọ nke ga-akacha abara gị uru

2 LEKỌTA ONWE GỊ, LEKỌTAKWA NDỊ EZINỤLỌ GỊ

IHE BAỊBỤL KWURU: “Obi onye nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma, ntị ndị maara ihe na-achọkwa ihe ọmụma.” (Ilu 18:15) Chọpụta ihe kpatara nsogbu ahụ. Chọpụtakwa otú ị ga-esi enyere ndị ezinụlọ unu aka. Gị na ha na-ekwurịta ihe ụfọdụ, geekwa ha ntị ma ha kwuwe otú obi dị ha.—Ilu 20:5.

Gịnị ka ị ga-eme ma onye nke gị nwụọ? Echekwala na iru uju adịghị mma. Cheta na e nwere mgbe “anya mmiri gbara Jizọs.” (Jọn 11:35; Ekliziastis 3:4) Mgbe ọ bụla nsogbu bịaara anyị, izu ike na ihi ụra nke ọma ga-enyere anyị aka. (Ekliziastis 3:6) Ime otú a ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe idi nsogbu bịara anyị.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Tupu nsogbu abịa, gbaa mbọ ka gị na ndị ezinụlọ gị na-ekwurịta okwu mgbe niile. Nsogbu bịazie, ọ gaghị esiri onye ọ bụla ike ịgwa ibe ya okwu

  • Gakwuru ndị nwetụrụla ụdị nsogbu ahụ ka ha nyere gị aka

3 ỤMỤNNA GỊ GA-ENYERE GỊ AKA

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.” (Ilu 17:17) Ndị enyi gị nwere ike chọọ inyere gị aka ma ha agaghị ama ihe ha ga-eme. N’ihi ya, mee ka ha mara ihe bụ́ mkpa gị. (Ilu 12:25) Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ ịgakwuru ndị ma Baịbụl nke ọma ka ha nyere gị aka. Ihe ha ga-agwa gị nwere ike inyere gị aka idi nsogbu gị.—Jems 5:14.

Ọ bụrụ na gị na ndị nwere okwukwe na Chineke na ndị tụkwasịrị obi ná nkwa ya niile ana-akpa, ha ga-enyere gị aka mgbe nsogbu ọ bụla bịaara gị. Ọ bụrụkwa na ị na-enyere ndị ọzọ nọ ná nsogbu aka ma na-agwa ha banyere nkwa dị iche iche Jehova kwere, ọ ga-eme ka obi sikwuo gị ike, meekwa ka obi ruo gị ala. Anọkwala nkịtị, na-enyere ndị ọzọ nọ ná mkpa aka. Nọrọkwa ndị hụrụ gị n’anya nso.—Ilu 18:1; 1 Ndị Kọrịnt 15:58.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Gwa ezigbo enyi gị ihe gị na ya na-alụ ka o nyere gị aka

  • Kpọọrọ ya okwu aha. Ezorola ya ihe ọ bụla ezo

NKE DỊ N’IHU KA

Ọ bụrụgodị na nsogbu ezuo gị ahụ́, nwee nchekwube na Chineke ga-eme ka ihe dị mma. Cheta ihe Job kwuru mgbe ya na nsogbu ụwa na-alụ. Ọ sịrị: “Ka aha Jehova bụrụ ihe a gọziri agọzi.” (Job 1:21, 22) Bute aha Chineke na ime uche ya ụzọ otú ahụ Job mere. Ọ bụrụ na ihe agaghị otú ị tụrụ anya ya, echela na okwu agwụla. Tụkwasị Chineke obi gị niile. Ka ihe o kwuru na Jeremaya 29:11 kasie gị obi. Ebe ahụ sịrị: ‘M maara nke ọma ihe m na-echere unu, echiche udo, ọ bụghị nke ọdachi, ime ka unu nwee ọdịnihu na olileanya.’

JỤỌ ONWE GỊ AJỤJỤ NDỊ A . . .

  • M̀ nwere okwukwe na Jehova ga-emere anyị ihe niile o kwere anyị ná nkwa?

  • Gịnị na gịnị ka Jehova merela m nke ga-eme ka m na-ekele ya kwa ụbọchị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya