ISI NKE 16
Anyị Dị n’Otu n’Ụwa Niile
RUO ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ ise, Jehova Chineke mesoro mba Izrel ihe ka ndị nke ya. Ma, Jehova mechara “chee ihu ya n’ebe ndị mba ọzọ nọ na nke mbụ ya, isi n’etiti ha wepụtara aha ya otu ndị.” (Ọrụ 15:14) Ndị ahụ Jehova wepụtaara aha ya ga-abụ ndị àmà ya. Otú ha si eche echiche na otú ha si eme ihe ga-abụ otu n’agbanyeghị ebe ha bi n’ụwa. Ọ bụ ọrụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ga-eme ka ha dị n’otu maka aha Chineke. Ọ sịrị ha: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.”—Mat. 28:19, 20.
I sorola n’ụmụnna ndị dị n’otu n’ụwa niile, ndị na-anaghị ekwe ka mba ha si, agbụrụ ha si, ma ọ bụ otú ihe si dịrị ha kewaa ha
2 Ugbu a i nyeferela Jehova onwe gị, e meekwa gị baptizim, ị ghọọla onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. I sorola n’ụmụnna ndị dị n’otu n’ụwa niile, ndị na-anaghị ekwe ka mba ha si, agbụrụ ha si, ma ọ bụ otú ihe si dịrị ha kewaa ha. (Ọma 133:1) N’ihi ya, ị hụrụ ụmụnna gị na ha nọ n’ọgbakọ n’anya, na-akwanyekwara ha ùgwù. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha si n’agbụrụ ọzọ ma ọ bụ ná mba ọzọ. O nwekwara ike ịbụ na ebe ha gụruru akwụkwọ dị iche n’ebe gịnwa gụruru. Ọ ga-abụkwa ihe ndị a mere na ị nabughị achọ ka gị na ha na-akpa. Ma ugbu a, ị hụrụ ụmụnna gị ndị a n’anya. Ọ bụ ịhụnanya a jikọrọ unu niile. O siri ike karịa ihe ọ bụla nwere ike ijikọ mmadụ na ibe ya, dị ka ọkwá, okpukpe, ma ọ bụ ezinụlọ.—Mak 10:29, 30; Kọl. 3:14; 1 Pita 1:22.
ỊGBANWE OTÚ ANYỊ SI WERE NDỊ ỌZỌ
3 Ọ bụrụ na ọ na-esiri ụfọdụ n’ime anyị ike ịkwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị n’ihi agbụrụ ha si, mba ha si, ọkwá ha nọ na ya, ma ọ bụ n’ihi ihe ndị ọzọ, ha kwesịrị ịmụta ihe n’aka Ndị Kraịst oge mbụ bụ́ ndị Juu. Ndị Kraịst a kwụsịrị iso ndị Juu ibe ha na-akpọ ndị obodo ọzọ asị. Mgbe Jehova gwara Pita ka ọ gaa n’ụlọ ọchịagha ndị Rom bụ́ Kọnịliọs, o mere ka obi ruo ya ala ịga na nke ya.—Ọrụ Ndịozi isi 10.
4 Chineke gwara Pita n’ọhụụ ka o gbuo ma rie ụdị anụmanụ ụfọdụ ndị Juu weere na ha adịghị ọcha. Pita jụrụ ime ihe a a gwara ya. N’ihi ya, otu olu si n’eluigwe gwa ya, sị: “Kwụsị ịkpọ ihe Chineke mere ka ha dị ọcha ihe rụrụ arụ.” (Ọrụ 10:15) Ọ bụ ihe a Chineke gwara Pita mere o ji kweta gaa na nke Kọnịliọs mgbe Chineke mechara gwa ya gaa. Mgbe Pita ruru, ọ gwara ndị niile gbakọtara n’ụlọ Kọnịliọs, sị: “Unu maara nke ọma na iwu akwadoghị ka onye Juu na onye agbụrụ ọzọ na-akpakọrịta ma ọ bụ ka ọ bịa ya nso; n’agbanyeghị nke ahụ, Chineke gosiri m na ekwesịghị m ịkpọ mmadụ ọ bụla onye rụrụ arụ ma ọ bụ onye na-adịghị ọcha. N’ihi ya, mgbe e ziri ka a kpọọ m, m bịara n’ezie, ajụghị m ịbịa.” (Ọrụ 10:28, 29) Obere oge Pita kwuchara ihe a, o ji anya ya hụ ihe Jehova mere iji gosi na ihe Kọnịliọs na ezinụlọ ya dị ya mma.
5 Otu onye Farisii gụrụ oké akwụkwọ aha ya bụ Sọl, onye Tasọs, mechara weda onwe ya ala ma soro ndị o leburu anya ka ndị ya na ha na-ekwesịghị imekọ ihe, na-akpa. Mgbe ụfọdụ, ha gwadịrị ya ihe ọ ga-eme. (Ọrụ 4:13; Gal. 1:13-20; Fil. 3:4-11) E nwekwara ndị ọzọ mechara gbanwee otú ha sibu were ndị ọzọ mgbe ha gechara ntị n’ozi ọma e ziri ha ma ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ụfọdụ n’ime ha bụ Sajiọs Pọlọs, Dayọnisiọs, Damaris, Faịlimọn, na Onesịmọs.—Ọrụ 13:6-12; 17:22, 33, 34; Faị. 8-20.
IHE ANYỊ GA-EME KA ANYỊ NA-ADỊ N’OTU N’ỤWA NIILE
6 O doro anya na ihe mere i ji bata n’ọgbakọ ma bụrụ enyi Jehova bụ otú ụmụnna anyị nọ n’ọgbakọ unu si hụ ibe ha n’anya. Ọ bụ ya ka e ji ama ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs. Jizọs sịrị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:34, 35) Ị chọpụtara na otú ahụ ụmụnna anyị nọ n’ọgbakọ unu si hụ ibe ha n’anya bụkwa otú ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile si hụ ibe ha n’anya. Nke a mere ka ị hụkwuo Jehova n’anya, jirikwuokwa nzukọ ya kpọrọ ihe. Baịbụl buru amụma na a ga-achịkọta ndị mmadụ ọnụ n’oge ikpeazụ a ka ha na-efe Jehova n’udo na n’ịdị n’otu. I jirila anya gị hụ ka amụma a na-emezu.—Maị. 4:1-5.
7 N’ihi ọtụtụ ihe na-akpata nkewa taa, o siri ike mmadụ iche na a ga-eme ka ndị “si ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile” dịrị n’otu. (Mkpu. 7:9) Cheedị banyere ọdịiche e nwere n’etiti ndị bi n’ebe mepere emepe na ndị bi n’ime obodo. Ndị si n’otu mba nakwa n’otu agbụrụ na-egburịtadị ibe ha n’ihi na ha anaghị ekpe otu okpukpe. Otú ndị mmadụ si ahụ mba ha n’anya na-emekwa ka ha na ndị mba ọzọ ghara ịdị n’otu. I leekwa ọdịiche dị n’etiti ndị ogbenye na ndị ọgaranya, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-eme ka ndị mmadụ na ibe ha ghara ịdị n’otu, inwe ndị si ná mba dị iche iche, asụsụ dị iche iche, na ndị nọ n’ọkwá dị iche iche hụrụ ibe ha n’anya ma dịrị n’otu bụ ihe naanị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, nwere ike ime.—Zek. 4:6.
8 Ma, Chineke emeela ka e nwee ndị dị otú ahụ dị n’otu. Mgbe i nyefere Jehova onwe gị, e meekwa gị baptizim, i sozi na ha. I kwesịrị ịgba mbọ hụ na o nweghị ihe ga-etisa ịdị n’otu a, ebe ọ bụ na ọ na-abara gị uru. Ihe anyị ga-eme ka ọ ghara itisa bụ ịna-eme ihe Pọl onyeozi kwuru ná Ndị Galeshia 6:10. Ọ sịrị: “Ọ bụrụhaala na anyị nwere oge dị mma maka ya, ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ niile nọ, ma karịsịa, n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.” Ihe ọzọ anyị ga-eme ka ọ ghara itisa bụ ịna-eme ihe a Baịbụl kwuru. Baịbụl kwuru ka anyị ‘ghara ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka anyị, na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe anyị, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.’ (Fil. 2:3, 4) Ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike na-ele ụmụnna anyị anya otú Jehova si ele ha, ghara ilekwasị anya n’otú ha dị n’anya ma ọ bụ n’ebe ndị ha na-emejọ, anyị na ha ga na-adị n’udo.—Efe. 4:23, 24.
IHE BANYERE IBE ANYỊ NA-EMETỤ ANYỊ N’OBI
9 Pọl onyeozi meere anyị ihe atụ gosiri na ndị niile nọ n’ọgbakọ dị n’otu, na-echebakwara ibe ha echiche. (1 Kọr. 12:14-26) Ụfọdụ ụmụnna anyị bi n’ebe dị ezigbo anya n’ebe anyị bi, ma nke a anaghị eme ka anyị ghara ichebara ha echiche. Ọ bụrụ na a na-akpagbu ụfọdụ ụmụnna anyị, ọ na-enye anyị nsogbu n’obi. Ọ bụrụkwa na ihe na-esiri ụfọdụ ụmụnna anyị ike, ma ọ bụkwanụ na ọdachi dakwasịrị ha, ma ọ bụ na a na-alụ agha n’obodo ha, anyị na-achọ ụzọ nyere ha aka ma gbaa ha ume.—2 Kọr. 1:8-11.
10 Anyị kwesịrị ịna-etinye ụmụnna anyị n’ekpere kwa ụbọchị. E nwere ụfọdụ n’ime ha a na-anwa ọnwụnwa ka ha mee ihe ọjọọ. Ụfọdụ nwere nsogbu ndị ha na ha na-alụ nke onye ọ bụla ma. E nwekwara ụmụnna anyị ndị ọrụ ibe ha ma ọ bụ ndị ezinụlọ ha na-abụghị Ndịàmà Jehova na-echi ọnụ n’ala, ma anyị amaghị na ọ bụ ihe ha na-agabiga. (Mat. 10:35, 36; 1 Tesa. 2:14) Ihe a niile na-enye anyị nsogbu n’obi n’ihi na anyị niile bụ otu. (1 Pita 5:9) E nwere ụmụnna anyị ndị na-arụsi ọrụ ike n’ozi Jehova. Ha na-elekọta ọgbakọ, bụrụkwa ndị e ji ama atụ n’ije ozi ọma. E nwekwara ndị nke na-ahazi ozi ọma anyị na-ezi n’ụwa niile. Anyị kwesịrị ịna-etinye ha n’ekpere. Ime otú ahụ na-egosi na anyị hụrụ ha n’anya, chọọkwa ka ihe dịrị ha ná mma, ọ bụrụgodị na o nweghị ihe ọzọ anyị nwere ike imere ha.—Efe. 1:16; 1 Tesa. 1:2, 3; 5:25.
11 N’oge ikpeazụ a ụwa nọ n’ọgba aghara, anyị kwesịrị ịdị njikere ịgbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka. Mgbe ụfọdụ, ọdachi ndị dị ka ala ọma jijiji na idei mmiri mee, ụmụnna anyị nọ ebe dị iche iche n’ụwa na-atụkọta ọtụtụ ihe bugara ụmụnna anyị. Ndị Kraịst oge mbụ mekwara ụdị ihe a. Ụmụnna nọ n’Antiọk chetara ihe Jizọs kwuru, n’ihi ya, ha ji obi ụtọ zigara ụmụnna nọ na Judia onyinye ha. (Ọrụ 11:27-30; 20:35) Pọl onyeozi mechara gwa ụmụnna nọ na Kọrịnt ka ha nye onyinye nke ha. A haziri otú a ga-esi enye onyinye ahụ ahazi. (2 Kọr. 9:1-15) N’oge anyị a, ụmụnna anyị nwee ọdachi, chọọkwa enyemaka, nzukọ Jehova na ụmụnna anyị n’otu n’otu na-eme ngwa ngwa wegara ha ihe ndị dị ha mkpa.
NDỊ E WEPỤTARA ICHE KA HA NA-EME UCHE JEHOVA
12 A haziri anyị n’ụwa niile ka anyị na-eme uche Jehova. Anyị dịkwa n’otu. Ihe bụ́ uche Jehova n’oge a bụ ka e kwusaa ozi ọma Alaeze ya n’ụwa niile ka ọ bụrụ àmà nye mba niile. (Mat. 24:14) Jehova chọrọ ka anyị na-arụ ọrụ a ma na-akpa àgwà ndị ọ chọrọ ka anyị na-akpa. (1 Pita 1:14-16) Anyị kwesịrị ịnọ n’okpuru ibe anyị, na-emekwa ihe ga-eme ka ozi ọma anyị na-ekwusa na-aga n’ihu. (Efe. 5:21) Ugbu a bụ oge anyị kwesịrị ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke, ọ bụghị ịchọ ihe ndị ga-abara naanị anyị uru. (Mat. 6:33) Ọ bụrụ na anyị eburu nke a n’uche ma na-arụkọ ọrụ ọnụ ka ozi ọma na-aga aga, obi ga na-atọ anyị ụtọ ugbu a, Jehova ga-emekwa ka anyị nweta ndụ ebighị ebi.
13 Anyị bụ́ Ndịàmà Jehova dị iche n’ụwa. Anyị dị ọcha, jirikwa obi anyị niile na-ejere Chineke ozi. (Taị. 2:14) Ihe mere anyị ji dị iche bụ na anyị na-efe Jehova. Anyị na ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile na-arụkọ ọrụ. Anyị na-asụkwa otu asụsụ, ya bụ, eziokwu dị na Baịbụl, na-emekwa ihe anyị na-amụta na Baịbụl. Jehova si n’ọnụ Zefanaya kwuo, sị: “M ga-agbanwe asụsụ nke ndị dị iche iche ka ọ bụrụ asụsụ dị ọcha, ka ha niile wee na-akpọku aha Jehova, ka ha wee jiri otu obi na-efe ya ofufe.”—Zef. 3:9.
14 Jehova mekwara ka Zefanaya kọwaa otú a anyị si dịrị n’otu ma dịrị n’udo. Ọ sịrị: “Ndị fọdụrụ n’Izrel agaghị eme ajọ omume, ha agaghịkwa agha ụgha, ha agaghịkwa enwe ire aghụghọ; n’ihi na ha onwe ha ga-eriju afọ ma dinara ala, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.” (Zef. 3:13) Anyị na-arụkọ ọrụ ọnụ n’ihi na anyị ghọtara Okwu Chineke nke ọma, mee ka uche anyị dịrị ọhụrụ, ma na-akpa àgwà otú Jehova chọrọ. A bịa n’otú ọtụtụ ndị si ele ihe anya, anyị na-arụzu ihe yiri ihe na-agaghị ekwe omume. N’eziokwu, anyị dị nnọọ iche n’ụwa n’ihi na anyị bụ ndị nke Chineke, ndị na-eme ka e too ya n’ụwa niile.—Maị. 2:12.