“Karịsịa Ihe Niile, Nweenụ Ịhụnanya Siri Ike n’Ebe Ibe Unu Nọ”
Ọ bụ Jehova mere ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu. (Ọma 133:1) Ọ bụ ihe mere Pita onyeozi ji kwuo, sị: “Ọgwụgwụ ihe niile adịwo nso. Ya mere, nweenụ uche zuru okè, mụrụnụ anya ka unu wee na-ekpe ekpere. Karịsịa ihe niile, nweenụ ịhụnanya siri ike n’ebe ibe unu nọ.” (1 Pita 4:7, 8) Ọ fọrọ obere ka o ruo puku afọ abụọ kemgbe o kwuru ihe a. Ụmụnna anyị na-enyere anyị aka. Ha na-ewere anyị ka ụmụ ha, ụmụnne ha ndị nwoke, na ụmụnne ha ndị nwaanyị. (Mak 10:29, 30) Ma mgbe ụfọdụ, anyị na ụmụnna anyị nwere ike inwe nghọtahie. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike na-ahụ ụmụnna anyị n’anya n’ụwa a ndị mmadụ na-ahụghị ibe ha n’anya? Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịghọta ihe mere Pita ji kwuo ihe ahụ o kwuru na 1 Pita 4:7, 8. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịma otú anyị ga-esi egosi ma ụmụnna anyị ma ndị ọzọ na-abụghị ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya.
Ihe mere anyị ji hụ ibe anyị n’anya bụ na “ịhụnanya si n’aka Chineke.” (1 Jọn 4:7) Jehova bu ụzọ hụ anyị n’anya. O zitere Ọkpara ya n’ụwa ka ọ nwụọ n’osisi ịta ahụhụ “ka anyị nwee ike inweta ndụ site n’aka ya.” (1 Jọn 4:9) Ma, olee otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe a Chineke meere anyị? Baịbụl kwuru na 1 Jọn 4:11, sị: “Ọ bụrụ otú a ka Chineke si hụ anyị n’anya, anyị onwe anyị ji ụgwọ ịhụrịta ibe anyị n’anya.” Ọ bụrụ na anyị e jiri obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya, anyị ekwesịghị ịtụ anya ka Chineke kelee anyị. Kama, anyị kwesịrị ikele Chineke n’ihi na ụmụnna anyị bụ onyinye na-enweghị atụ o nyere anyị. Ihe ọzọ bụ na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya n’ihi na anyị ma na ha nwere ike imecha bịa soro anyị fewe Jehova. Otu n’ime ụzọ ndị anyị si egosi na anyị hụrụ ha n’anya bụ izi ha “ozi ọma nke ihe ka mma.” (Aịza. 52:7) Ebe ọ bụ na ọ fọrọ obere ka e bibie ụwa a ndị bi na ya na-ahụghị ibe ha n’anya, ka anyị nọgide na-ahụ mmadụ niile n’anya, nke ka nke, ụmụnna anyị nọ n’ụwa dum.