Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • od isi 17 p. 169-178
  • Na-anọ Nzukọ Jehova Nso

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-anọ Nzukọ Jehova Nso
  • Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE ỌTỤTỤ ỌNWỤNWA JI ABỊARA ANYỊ
  • NA-ATACHI OBI
  • OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-ATACHI OBI N’ỌNWỤNWA
  • ANYỊ KPEBISIRI IKE ỊNA-EFE JEHOVA
  • “Ka Ntachi Obi Rụzuo Ọrụ Ya”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ntachi Obi—Dị Ndị Kraịst Oké Mkpa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Chesie Echiche Ike Banyere Onye Ahụ nke Tachiri Obi
    ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • Ntachi Obi nke Na-eweta Mmeri
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
od isi 17 p. 169-178

ISI NKE 17

Na-anọ Nzukọ Jehova Nso

JEMS onye na-eso ụzọ Jizọs gwara anyị, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Ihe a Jems kwuru gosiri na Jehova ebulighị onwe ya elu, ọ nọghịkwa n’ebe dị anya nke na ọ gaghị anụ ekpere anyị, ọ bụ eziokwu na anyị ezughị okè. (Ọrụ 17:27) Ma, olee otú anyị nwere ike isi bịaruo Chineke nso? Otú anyị nwere ike isi mee ya bụ anyị na ya ịdị ná mma. Otu ụzọ anyị na ya ga-esi adị ná mma bụ isi n’ala ala obi anyị na-ekpesi ekpere ike. (Ọma 39:12) Ihe ọzọ bụ ịna-amụchi Okwu ya anya. Nke a ga-eme ka anyị mara Jehova Chineke nke ọma, marakwa nzube ya na ihe ọ chọrọ imere anyị. (2 Tim. 3:​16, 17) Anyị ga-esi otú a mụta ịhụ ya n’anya na ịna-atụ egwu imejọ ya.​—Ọma 25:14.

2 Ma, ọ bụ naanị n’aka Ọkpara Jehova, bụ́ Jizọs, ka anyị ga-esi bịaruo Jehova nso. (Jọn 17:3; Rom 5:10) E nweghị mmadụ ọ bụla nwere ike ime ka anyị mata uche Jehova karịa Jizọs. Ọ maruru Nna ya ala nke na o kwuru, sị: “Ọ dịghịkwa onye maara onye Ọkpara ahụ bụ ma e wezụga Nna ya; ọ dịghịkwa onye maara onye Nna ahụ bụ ma e wezụga Ọkpara ya nakwa onye Ọkpara ya chọrọ ikpughere ya.” (Luk 10:22) N’ihi ya, mgbe anyị na-amụ ihe Matiu, Mak, Luk, na Jọn kwuru banyere otú Jizọs si eche echiche na otú obi na-adị ya, ihe ọ pụtara bụ na anyị na-amụ banyere otú Jehova si eche echiche na otú obi na-adị ya. Nke a ga-eme ka anyị bịarukwuo ya nso.

3 Ebe ọ bụ na Ọkpara Chineke bụ onyeisi anyị, anyị kwesịrị ịgba mbọ mee ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma. Otú anyị ga-esi eme ya bụ iso nzukọ ya na-aga ụkwụ na ụkwụ. Ọ bụ nzukọ a ka o ji akụziri anyị otú anyị ga-esi na-eme uche ya. Baịbụl kwuru na Matiu 24:​45-47 na Jizọs Kraịst, bụ́ Nna ukwu “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” họpụtara ohu a ka ọ na-enye ezinụlọ ya ‘nri n’oge kwesịrị ekwesị.’ Taa, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-enyeju anyị nri afọ. Jehova na-esi n’aka ohu a agwa anyị ka anyị na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-agachi ọmụmụ ihe anya, na-ekwusakwa ‘ozi ọma Alaeze Chineke.’ (Mat. 24:14; 28:​19, 20; Jọsh. 1:8; Ọma 1:​1-3) Anyị ekwesịghị ileda ohu a anya. Kama, anyị kwesịrị iso nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ ma na-eme ihe nzukọ a na-agwa anyị. Nke a ga-echebe anyị, mee ka anyị bịarukwuo Chineke anyị bụ́ Jehova nso, meekwa ka okwukwe anyị sikwuo ike n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị nwere ike ịbịara anyị.

IHE MERE ỌTỤTỤ ỌNWỤNWA JI ABỊARA ANYỊ

4 O nwere ike ịbụ na ị nọọla ọtụtụ afọ n’ọgbakọ. Ya bụrụ otú ahụ, e nweela ọnwụnwa ndị i meririla. Ọ bụrụgodị na ị ka batara ọhụrụ n’ọgbakọ, ị ma na Setan bụ́ Ekwensu achọghị iji anya ahụ onye ọ bụla na-efe Jehova. (2 Tim. 3:12) N’agbanyeghị ugboro ole i meririla ọnwụnwa, atụla ụjọ, adakwala mbà n’obi. Jehova kwere nkwa na ya ga-enyere gị aka, napụta gị, ma nye gị ndụ ebighị ebi.​—Hib. 13:​5, 6; Mkpu. 2:10.

5 Tupu Jehova ebibie ụwa Setan a, ọnwụnwa dị iche iche ka nwere ike ịbịara anyị niile. Kemgbe Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914, e kwebeghị Setan gaa n’eluigwe ebe Jehova bi. E si n’eluigwe chụda ya na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa. Kemgbe ahụ, ezigbo iwe ji Setan. Ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji atagbu onwe ha n’ahụhụ. Ọ bụkwa ya mere e ji akpagbu ndị na-efe Jehova mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. Ihe ndị a niile na-egosi na n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-akwụsị ọchịchị ọjọọ Setan na-achị ndị mmadụ.​—Mkpu. 12:​1-12.

6 Nchụda a chụdara Setan n’ụwa na-ewe ya oké iwe. Ọ makwa na oge ya agwụla agwụ. Ya na ndị mmụọ ọjọọ ya na-agbasi mbọ ike ka ha kwụsị anyị ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ha na-agbasikwa mbọ ike ka ha mee ka anyị gharazie ịdị n’otu. Nke a pụtara na anyị nọ n’agha ma ọ bụ “mgba, ọ bụghị megide ọbara na anụ ahụ́, kama megide ọchịchị, megide ikike, megide ndị na-achị ụwa nke ọchịchịrị a, megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.” Ọ bụrụ na anyị chọrọ imeri n’agha a anyị nọ n’akụkụ Jehova na-alụ, anyị agaghị akwụsị ịlụ ya. Anyị ga-ahụrịrị na anyị yi ekike agha zuru ezu nke si n’aka Chineke. Anyị kwesịrị “iguzosi ike megide atụmatụ aghụghọ” nke Ekwensu. (Efe. 6:​10-17) Nke a chọrọ ka anyị na-atachi obi.

NA-ATACHI OBI

7 A sị na mmadụ na-atachi obi, ihe ọ pụtara bụ na onye ahụ na-edi ihe isi ike ma ọ bụ nsogbu ndị na-abịara ya. Ọ pụtakwara mmadụ ịnọgide na-eme ihe ọma n’agbanyeghị ihe isi ike, mkpagbu, mmegide ma ọ bụ ihe ndị ọzọ a chọrọ iji mee ka ọ kwụsị ife Chineke. Anyị kwesịrị ịmụta ịtachi obi. Ma, ọ na-ewe oge. Ka anyị na Chineke na-adịkwu ná mma, anyị ga-amụtakwu ịna-atachi obi. Ọ bụrụ na anyị ana-edi obere ọnwụnwa ndị na-abịara anyị mgbe anyị batara ọhụrụ n’ọgbakọ, ọ ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike idi ọnwụnwa ndị tara akpụ ga-abịara anyị. (Luk 16:10) Anyị ekwesịghị ichere ka ọnwụnwa tara akpụ bịara anyị tupu anyị ekpebie na anyị ga-eguzosi ike n’okwukwe anyị. Ọ bụ ugbu a ka anyị kwesịrị ikpebi ya. Pita onyeozi kwuru na anyị kwesịrị ịmụta ịna-atachi obi, mụtakwa àgwà ndị ọzọ e ji mara ndị na-efe Chineke. O kwuru, sị: “Gosinụ otú ọ dị unu n’obi site n’itinye oké mgbalị. Tụkwasịnụ omume ọma n’okwukwe unu, n’omume ọma unu, tụkwasịnụ ihe ọmụma, n’ihe ọmụma unu, tụkwasịnụ njide onwe onye, ná njide onwe onye unu, tụkwasịnụ ntachi obi, ná ntachi obi unu, tụkwasịnụ nsọpụrụ Chineke, ná nsọpụrụ Chineke unu, tụkwasịnụ ịhụnanya ụmụnna, n’ịhụnanya ụmụnna unu, tụkwasịnụ ịhụnanya.”​—2 Pita 1:​5-7; 1 Tim. 6:11.

Ọ bụrụ na anyị ana-emeri ọnwụnwa ndị na-abịara anyị, ọ ga-eme ka anyị mụtakwuo ịna-atachi obi

8 Ihe Jems kwuru mere ka anyị mata uru ịtachi obi bara. Ọ sịrị: “Gụọnụ ya n’ihe ọṅụ, ụmụnna m, mgbe unu zutere ọnwụnwa dị iche iche, ebe unu maara na okwukwe unu nke a nwalere anwale otú a na-arụpụta ntachi obi. Ma ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya, ka unu wee zuo ezu, gbasiekwa ike n’ụzọ niile, n’enweghị ihe ọ bụla kọrọ unu.” (Jems 1:​2-4) Jems kwuru na ahụ́ ekwesịghị ịna-agbakasị Ndị Kraịst ma ọnwụnwa bịara ha, kama, ha kwesịrị ịna-aṅụrị ọṅụ n’ihi na ọ ga-enyere ha aka ịna-atachi obi. Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si ele ọnwụnwa anya? Ọ bụrụ otú ahụ, ihe a Jems kwuru gosiri na ịtachi obi n’ọnwụnwa ga-eme ka àgwà anyị kakwuo mma, meekwa ka ihe anyị na-adị Chineke mma. Ọ bụrụ na anyị ana-emeri ọnwụnwa ndị na-abịara anyị, ọ ga-eme ka anyị mụtakwuo ịna-atachi obi. Ntachi obi ga-emekwa ka anyị nwee àgwà ndị ọzọ anyị kwesịrị inwe.

9 Obi na-atọ Jehova ụtọ na anyị na-atachi obi. Ọ ga-enyekwa anyị ndụ ebighị ebi maka ya. Jems kwukwara, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye na-atachi obi n’ọnwụnwa, n’ihi na mgbe a nwapụtara ya, ọ ga-anata okpueze bụ́ ndụ, nke Jehova kwere nkwa inye ndị hụrụ ya n’anya.” (Jems 1:12) N’eziokwu, ọ bụ maka ndụ ebighị ebi ahụ Jehova ga-enye anyị mere anyị ji na-atachi obi. Ọ bụrụ na anyị anaghị atachi obi, anyị ga-akwụsị ife Chineke. Ọ bụrụkwa na ọnwụnwa abịara anyị, anyị adaa, ọ ga-eme ka anyị pụọ n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na anyị anaghị atachi obi, anyị agaghịzi enwe mmụọ nsọ Jehova. Ma anyị enweghị mmụọ nsọ, anyị agaghị na-akpa àgwà e ji mara ndị nwere mmụọ nsọ Chineke.

10 Ọ bụrụ na anyị bụ́ Ndị Kraịst ka chọrọ ịna-atachi obi n’oge a tara akpụ, anyị kwesịrị ile ahụhụ anyị na-ata anya otú kwesịrị ekwesị. Cheta na Jems sịrị: “Gụọnụ ya n’ihe ọṅụ.” Nke a nwere ike ọ gaghị adịcha mfe mgbe mmadụ na-ata ahụhụ ma ọ bụ mgbe o nwere ihe na-echegbu ya. Ma, cheta na ọ gbasara ndụ anyị ga-adị n’ọdịnihu. Ihe ndịozi mere mgbe a na-akpagbu ha ga-enyere anyị aka ịma otú anyị nwere ike isi na-aṅụrị ọṅụ mgbe anyị na-ata ahụhụ. E dere ihe ahụ ha mere n’Ọrụ Ndịozi. Ebe ahụ sịrị: “Ha kpọkwara ndịozi ahụ, pịa ha ihe, ma nye ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu n’aha Jizọs, wee hapụ ha ka ha laa. Ya mere, ha si n’ihu Sanhedrin ahụ pụọ, na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na a gụwo ha ná ndị ruru eru ịbụ ndị a ga-emenye ihere n’ihi aha ya.” (Ọrụ 5:​40, 41) Ndịozi ahụ ghọtara na ahụhụ ha na-ata gosiri na ha na-edebe iwu Jizọs nyere ha, gosikwa na ihe ha dị Jehova mma. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Pita kwuru uru ahụhụ ahụ ha tara n’ihi ezi omume bara. O kwuru ya n’akwụkwọ ozi mbụ o dere n’ike mmụọ nsọ.​—1 Pita 4:​12-16.

11 Ihe ọzọ ga-enyere anyị aka ịtachi obi bụ ihe Pọl na Saịlas mere mgbe ha na-ata ahụhụ. Mgbe ha na-eje ozi ala ọzọ na Filipaị, e jidere ha ma bo ha ebubo na ha na-enye obodo Filipaị nsogbu, na-ekwusakwa omenala ndị iwu na-akwadoghị. N’ihi ya, e tiri ha ezigbo ihe, merụọ ha ahụ́, ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ n’eteghị ha ọgwụ n’ọnyá ndị dị ha n’ahụ́. Baịbụl kwuru na mgbe ha nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ, ‘n’ihe dị ka n’etiti abalị, Pọl na Saịlas nọ na-ekpe ekpere ma jiri abụ na-eto Chineke; ndị mkpọrọ nọkwa na-anụ olu ha.’ (Ọrụ 16:​16-25) Pọl na Saịlas ghọtara na ahụhụ ha na-ata n’ihi Kraịst gosiri na ha bụ ndị ohu Chineke ma n’ihu Chineke ma n’ihu mmadụ. Ha wekwaara ya ka otú ha ga-esi zikwuo ndị chọrọ ige ntị ozi ọma. Ozi ọma a ga-eme ka a zọpụta ndị ọzọ. N’abalị ahụ, onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ na ezinụlọ ya gere ntị n’ozi ọma Pọl na Saịlas ziri ha ma ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Ọrụ 16:​26-34) Pọl na Saịlas tụkwasịrị Jehova obi. Obi sikwara ha ike na Chineke ga-enye ha ike ha ga-eji die ahụhụ ha na-ata. Chineke mekwaara ha otú ahụ.

12 N’oge anyị a kwa, Jehova enyela anyị ihe niile ga-enyere anyị aka ịtachi obi n’ọnwụnwa. Ọ chọrọ ka anyị na-atachi obi. O nyere anyị Okwu ya, nke na-enyere anyị aka ịmata nzube ya. Okwu ya a na-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Anyị na ụmụnna anyị na-akpachi anya, na-ejekwara Chineke ozi dị nsọ. Anyị na-ekpegakwara Jehova ekpere. Ekpere a na-eme ka anyị na ya dịkwuo ná mma. Ọ na-ege anyị ntị mgbe anyị na-eto ya. Ọ na-egekwa anyị ntị mgbe anyị na-arịọsi ya arịrịọ ike ka o nyere anyị aka ka anyị ghara imebi iwu ya. (Fil. 4:13) Ihe ọzọ anyị ga-eme ka anyị na-atachi obi bụ ịna-atụgharị uche n’ihe Chineke kwere anyị ná nkwa.​—Mat. 24:13; Hib. 6:18; Mkpu. 21:​1-4.

OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-ATACHI OBI N’ỌNWỤNWA

13 Ọnwụnwa ndị na-abịara anyị taa yiri ndị bịaara ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst n’oge mbụ. N’oge anyị a, ndị a gwara ihe na-abụghị eziokwu banyere anyị na-arụsa anyị arụrụala, na-emebikwa aha ọma anyị. Ndị bu okpukpe ha n’isi na-emekarị ka a na-emegide anyị. Ọ bụkwa otú ọ dị n’oge ndịozi. Ihe kpatara ya bụ na anyị na-eji Okwu Chineke agba ozizi ụgha ha na omume ọjọọ ha n’anwụ. (Ọrụ 17:​5-9, 13) Mgbe ụfọdụ, anyị na-eji iwu gọọmenti enweta ihe ndị ruuru anyị, ya emee ka a kwụsị inye anyị nsogbu. (Ọrụ 22:25; 25:11) Ma, ndị ọchịchị ụfọdụ amachibidola ozi ọma anyị na-ekwusa iwu ka anyị gharazie ikwusa ya. (Ọma 2:​1-3) Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee, anyị na-akata obi mee ka ndịozi Jizọs, bụ́ ndị sịrị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”​—Ọrụ 5:29.

14 N’ebe niile n’ụwa taa, ndị mmadụ na-ahụkwu mba ha n’anya. Nke a na-eme ka a na-enyekwu anyị nsogbu ka anyị kwụsị ikwusa ozi ọma Chineke sịrị anyị na-ekwusa. Anyị ghọtara aka ná ntị a dọrọ anyị ná Mkpughe 14:​9-12 gbasara ife “anụ ọhịa ahụ na onyinyo ya.” Anyị ghọtakwara ihe okwu a Jọn kwuru pụtara. Ọ sịrị: “Ebe a ka a chọrọ ntachi obi n’aka ndị nsọ, bụ́ ndị na-edebe ihe Chineke nyere n’iwu ma na-agbaso okwukwe Jizọs.”

15 Ihe ndị dị ka agha, mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ ma ọ bụ ndị ọchịchị ịmachibido anyị iwu nwere ike ime ka o siere gị ike ife Chineke otú ị na-esi efe ya. O nwere ike ọ gaghị adịkwa mfe ọgbakọ unu ịna-ezukọ amụ ihe. Ọgbakọ nwekwara ike ha agaghị na-enweta ozi n’aka alaka ụlọ ọrụ ma ọ bụ na-ezigara alaka ụlọ ọrụ ozi. O nwere ike ndị nlekọta sekit agaghịzi na-eleta ọgbakọ. O nwekwara ike unu agaghị na-enweta akwụkwọ ọ bụla. Ọ bụrụ na otu n’ime ihe ndị a emee, olee ihe i kwesịrị ime?

16 Ihe i kwesịrị ime bụ ịgba mbọ mee ihe ọ bụla i nwere ike imeli mgbe ahụ. I kwesịrị ịna-amụchi ihe anya. Unu nwere ike ịdị ole na ole na-enwe ọmụmụ ihe n’ụlọ ụmụnna. Unu nwekwara ike iji akwụkwọ ndị anyị mụrụla amụ na Baịbụl na-enwe ọmụmụ ihe. Echegbula onwe gị n’oge ahụ. Òtù Na-achị Isi ga-agwa ụmụnna ụfọdụ ihe ndị a ga-eme.

17 Ọ bụrụgodị na e nweghị nwanna ọ bụla gị na ya nọ, buru n’obi na Jehova na Ọkpara ya Jizọs Kraịst nọnyeere gị. Ekwela ka olileanya i nwere nyụọ ka ọkụ. Jehova ka ga na-anụ ekpere gị. Ọ ga-ejikwa mmụọ ya mee ka okwukwe gị sikwuo ike. Na-arịọ ya ka o mee ka ị mara ihe ị ga-eme. Echefula na ị bụ Onyeàmà Jehova na onye na-eso ụzọ Jizọs. N’ihi ya, na-eji ohere ọ bụla dapụtaranụ ezi ozi ọma. Jehova ga-agọzi mbọ niile ị na-agba. N’oge na-adịghị anya, ndị mmadụ nwekwara ike iso gị fewe ya.​—Ọrụ 4:​13-31; 5:​27-42; Fil. 1:​27-30; 4:​6, 7; 2 Tim. 4:​16-18.

18 Ọ bụrụkwanụ na e yiri gị egwu ọnwụ, otú ahụ e yiri ndịozi Jizọs na ndị ọzọ, tụkwasị “Chineke obi, bụ́ onye na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ” n’ọnwụ. (2 Kọr. 1:​8-10) Okwukwe i nwere na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ ga-eme ka ị tachie obi n’agbanyeghị otú ọ bụla e nwere ike isi megide gị. (Luk 21:19) Jizọs Kraịst tachiri obi mgbe a na-anwa ya. Ọ ma na ime otú ahụ ga-eme ka okwukwe ndị ọzọ sikwuo ike, ha atachiekwa obi. Ọ bụrụ na ị tachie obi, ọ ga-eme ka okwukwe ụmụnna gị sikwuo ike, ha atachiekwa obi.​—Jọn 16:33; Hib. 12:​2, 3; 1 Pita 2:21.

19 E wezụga mkpagbu a na-akpagbu anyị, e nwekwara nsogbu ndị ọzọ tara akpụ anyị kwesịkwara ịtachi obi na ha. Dị ka ihe atụ, ike ije ozi ọma na-agwụ ụfọdụ ụmụnna anyị n’ihi na ndị bi n’ókèala ha anaghị ege ntị n’ozi ọma. E nwekwara ụmụnna anyị ndị ha na ọrịa na ezughị okè na-alụ. Pọl onyeozi nwekwara nsogbu ndị ọ tachiri obi na ha. Nsogbu ndị ahụ mere ka o siere ya ike mgbe ụfọdụ ikwusa ozi ọma. (2 Kọr. 12:7) Onye ọzọ bụ Onye Kraịst si Filipaị aha ya bụ Epafrọdaịtọs. ‘Ọ dara mbà n’obi n’ihi na ndị enyi ya nụrụ na ọ dara ọrịa.’ (Fil. 2:​25-27) Ezughị okè anyị ma ọ bụ nke ndị ọzọ nwere ike ịkpatara anyị nsogbu ga-eme ka o siere anyị ike ịtachi obi. Anyị na ụmụnna anyị ma ọ bụkwanụ ndị ezinụlọ anyị nwedịrị ike inwe nghọtahie n’ihi na otú ha si eme ihe dị iche n’otú anyị si eme. Ihe ga-enyere anyị aka idi ụdị ihe a bụ ime ihe Baịbụl kwuru.​—Ezik. 2:​3-5; 1 Kọr. 9:27; 13:8; Kọl. 3:​12-14; 1 Pita 4:8.

ANYỊ KPEBISIRI IKE ỊNA-EFE JEHOVA

20 Anyị kwesịrị isosi Jizọs Kraịst ike n’ihi na ọ bụ ya ka Jehova mere Onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst. (Kọl. 2:​18, 19) Anyị kwesịkwara ịna-erubere “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na ndị okenye, isi. (Hib. 13:​7, 17) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Jehova na-agwa anyị ná nzukọ ya, ma na-akwado ndị Jehova ji na-elekọta nzukọ a, anyị ga-abụ ndị a haziri ime uche Jehova. Anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere mgbe niile. Cheta na ịnọ n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ ịkpọchi anyị n’ebe mmadụ na-anọghị agaghị emeli ka Nna anyị nke eluigwe ghara ịnụ ekpere anyị, ọ gaghịkwa eme ka anyị na ụmụnna anyị ghara ịdị n’otu.

21 Ka anyị kpebisie ike ịna-atachi obi na ịna-eme ihe niile anyị nwere ike ime iji kwusaa ozi ọma Jizọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ ka ha na-ekwusa. Ọ sịrị ha: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.” (Mat. 28:​19, 20) Dị ka Jizọs, ka anyị gbalịa na-atachi obi ma na-echeta ihe ọma Alaeze Chineke ga-emere anyị na olileanya anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi. (Hib. 12:2) Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst merela baptizim, anyị na-emezu amụma a Jizọs buru banyere “ọgwụgwụ usoro ihe a.” Ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Mat. 24:​3, 14) Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-ekwusa ozi ọma a n’oge a, anyị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Jehova kwere anyị ná nkwa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya