Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ypq ajụjụ 10 p. 30-31
  • Olee Otú Baịbụl Ga-esi Nyere M Aka?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Baịbụl Ga-esi Nyere M Aka?
  • Azịza Ajụjụ Iri Ndị Na-eto Eto Na-ajụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmadụ Niile Kwesịrị Ịmata Ihe Bụ́ Ihe Ọma na Ihe Ọjọọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2024
  • Olee Ihe I Chere na Baịbụl Bụ?
    Olee Ihe I Chere na Baịbụl Bụ?
  • Ihe Ga-enyekwuru Ezinụlọ Aka
    Teta!—2018
  • Ihe Ndị Ọzọ Ga-enyere Ndị Nne na Nna Aka
    Teta!—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Azịza Ajụjụ Iri Ndị Na-eto Eto Na-ajụ
ypq ajụjụ 10 p. 30-31
Ebe nwa okorobịa nọ n’èzí na-agụ Baịbụl

AJỤJỤ NKE 10

Olee Otú Baịbụl Ga-esi Nyere M Aka?

IHE MERE AJỤJỤ A JI DỊ MKPA

Baịbụl sịrị na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Timoti 3:16) Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu, Baịbụl ga-agwa gị ihe i kwesịrị ime.

GỊNỊ KA Ị GA-EME?

Chegodị banyere ihe atụ a: David ji ụgbọala na-aga ebe ọ na-agatụbeghị. Ka ọ na-aga, saịn bọọdụ na ihe ndị ọzọ ọ na-ahụ gosiri na ọ ghọtaghịzi ebe ọ nọ. Mgbe ahụ ka ọ matara na ya efuola ụzọ. Ọ ga-abụrịrị na o sila ụzọ ọ na-ekwesịghị isi.

Ọ bụrụ na ị bụ David, gịnị ka ị ga-eme?

CHEGODỊ ECHICHE

E nwere ọtụtụ ihe i nwere ike ime:

  1. Ịjụ mmadụ ajụjụ.

  2. Ile anya na map.

  3. Ịnyara ụgbọala gị na-aga, buru n’obi na ị ga-emecha chọta ụzọ.

O doro anya na ọ bụ nke CH kacha njọ.

Nke B ka nke mbụ mma n’ihi na ọ pụtara na ị gbatụ, gị elee anya na map ahụ ka ị ghara ifu ụzọ.

Baịbụl ga-enyere gị aka otú ahụ.

Ọ bụ akwụkwọ ndị mmadụ kacha azụ n’ụwa.

  • Ọ ga-enyere gị aka imeri nsogbu ndị i nwere

  • Ọ ga-eme ka ị mata ụdị onye ị bụ ma bụrụ ezigbo mmadụ

  • Ọ ga-egosi gị otú ị ga-esi bie ndụ kacha mma

OTÚ ANYỊ GA-ESI MATA AZỊZA AJỤJỤ NDỊ NA-ECHU ANYỊ ỤRA

Anyị na-amalite mgbe anyị bidoro ikwu okwu jụwa ajụjụ.

  • Oleedị otú e si kee eluigwe?

  • Gịnị mere kpakpando ji dịchaa ntakịrị ntakịrị?

Anyị na-emecha jụwa ajụjụ gbasara ihe ndị na-eme n’ụwa.

  • Olee ihe mere ihe ọjọọ ji eme?

  • Gịnị mere mmadụ ji anwụ anwụ?

Ị̀ ma na azịza ajụjụ ndị a dị na Baịbụl kemgbe?

Ọtụtụ ndị na-ekwu na ihe juru na Baịbụl bụ akụkọ ifo na akụkọ ndị mgbe ochie, na oge ya agafeela, nakwa na ọ naghị ekwe nghọta. Ma, ihe bụ́ nsogbu ọ̀ bụ ihe Baịbụl kwuru, ka ọ̀ bụ ihe ndị mmadụ nụrụ banyere Baịbụl? Ọ̀ ga-abụ na ihe a gwara ha abụghị eziokwu?

Dị ka ihe atụ, ndị mmadụ chere na Baịbụl kwuru na ọ bụ Chineke na-achị ụwa. Ma, olee otú ọ ga-esi bụrụ eziokwu ebe ihe juru n’ụwa a bụ ọgba aghara, obi mgbawa, ahụhụ, ọrịa na ọnwụ, ịda ogbenye na ọdachi? Chineke hụrụ anyị n’anya. Oleezi otú ihe ọjọọ a niile ga-esi na-eme ma ọ bụrụ ya na-achị ụwa?

Ị̀ chọrọ ịmata azịza ajụjụ ndị a? Onye Baịbụl kwuru na-achị ụwa a nwere ike iju gị anya.

Ọ ga-abụ na ị chọpụtala na ndụmọdụ ndị dị na broshọ a si na Baịbụl. Ndịàmà Jehova kwetasiri ike na ọ bụ Baịbụl ga-akụziri ndị mmadụ ihe ha kwesịrị ime. Ọ bụ n’ihi na Baịbụl ‘si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, na iji ya mee ka ihe guzozie.’ (2 Timoti 3:​16, 17) I kwesịrị ịgụ akwụkwọ a e dere n’oge ochie, nke bakwara uru taa.

CHỌPỤTA IHE NDỊ ỌZỌ

Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?

Lee vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? dị́ na www.jw.org/⁠ig.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya