ISI NKE 15
Jehova Echefughị Josef
Mgbe Josef nọ n’ụlọ mkpọrọ, Fero, eze Ijipt, rọrọ nrọ mmadụ ọ bụla na-enweghị ike ịkọwa. Otu n’ime ndị na-ejere ya ozi gwara ya na Josef nwere ike ịkọwara ya nrọ ya. Fero ziri ozi ozugbo ka a kpọọ Josef.
Mgbe Josef ruru, Fero jụrụ ya, sị: ‘Ì nwere ike ịkọwa nrọ m rọrọ?’ Ọ gwara Fero, sị: ‘A ga-enwe afọ asaa nri ga-eju ebe niile n’Ijipt. Afọ asaa ahụ gachaa, a ga-enwe ụkọ nri afọ asaa ọzọ. Họrọ onye ma ihe ka o chekwaa nri ka agụụ ghara igbu ndị gị n’oge ahụ a ga-enwe ụkọ nri.’ Fero gwara ya, sị: ‘Ahọrọla m gị. Ị ga-abụ osote m.’ Olee otú Josef si mara ihe nrọ Fero pụtara? Ọ bụ Jehova mere ka ọ mara ya.
Josef ji afọ asaa nri juru ebe niile chekwaa nri. Mgbe afọ asaa ahụ gachara, e nwere ụkọ nri n’ụwa niile otú Josef kwuru. Ndị mmadụ si ebe niile bịa ka Josef resị ha nri. Mgbe nna ya Jekọb nụrụ na e nwere nri n’Ijipt, o ziri mmadụ iri n’ime ụmụ ya ka ha gaa ebe ahụ zụta nri.
Ụmụ Jekọb bịakwutere Josef ka o resị ha nri. Ozugbo ọ hụrụ ha, ọ matara ha. Ma ha amataghị ya. Ha kpọọrọ ya isiala otú ha mere ná nrọ ọ rọrọ mgbe ọ ka bụ nwata. Josef chọrọ ịma ma ụmụnne ya hà agbanweela àgwà ọjọọ ha. N’ihi ya, ọ gwara ha, sị: ‘Unu bụ ndị nnyopụta. Unu chọrọ ịmata ebe unu nwere ike isi bata lụso anyị agha.’ Ha sịrị ya, ‘Mba. Anyị si n’obodo Kenan. Anyị dị ụmụnne iri na abụọ. Otu anwụọla, nke ọdụdụ na nna anyị nọ.’ Josef gwaziri ha, sị: ‘Kpọtaranụ m nwanne unu nke ọdụdụ, m ga-ekweta ihe unu kwuru.’ Ha lawaziri ka ha gaa hụ nna ha.
Mgbe ezinụlọ Jekọb richara nri ha nwere, Jekọb zigara ụmụ ya Ijipt ọzọ. Na nke ugbu a, ha na Benjamin, nwanne ha nke ọdụdụ, so. Josef lere ụmụnne ya ule. Otú o si mee ya bụ na o tinyere iko ọlaọcha ya n’akpa Benjamin ma kwuo na ụmụnne ya zuuru ya. Mgbe ndị na-ejere Josef ozi hụrụ iko ahụ n’akpa Benjamin, o juru ụmụnne ya anya. Ha rịọrọ Josef ka ọ taa hanwa ahụhụ kama ịta ya Benjamin.
Ugbu a, o doola Josef anya na ụmụnne ya agbanweela. O nweghịzi ike ijide onwe ya, ya ebewe ákwá ma kwuo, sị: ‘Abụ m Josef nwanne unu. Nna m, ọ̀ ka nọ ndụ?’ Ihe a juru ụmụnne ya ezigbo anya. Ọ gwara ha, sị: ‘Obi ajọla unu njọ maka ihe unu mere m. Ọ bụ Chineke zitere m n’ebe a ka unu wee dị ndụ. Gaanụ ozugbo kpọta nna m n’ebe a.’
Ha lawara ka ha gaa kọọrọ nna ha ihe ọma merenụ nakwa ka ha kpọta ya n’Ijipt. Otú a ka Josef na nna ya si mechaa nọkọta ọnụ ọzọ mgbe ọtụtụ afọ gafere.
“Ọ bụrụ na unu anaghị agbaghara ndị mehiere unu, Nna unu agaghịkwa na-agbaghara unu mmehie unu.”—Matiu 6:15