ISI NKE 38
Jehova Mere Ka Samsịn Sie Ike
Ọtụtụ ndị Izrel malitekwara ife arụsị. N’ihi ya, Jehova kwere ka ndị Filistia na-achị ha. Ma, e nwere ụfọdụ ndị Izrel ka hụrụ Jehova n’anya. Otu n’ime ha bụ Manoa. Ya na nwunye ya amụtaghị nwa. Otu ụbọchị, Jehova zitere mmụọ ozi ya ka ọ bịakwute nwunye Manoa. Mmụọ ozi ahụ gwara ya, sị: ‘Ị ga-amụta nwa nwoke. Ọ ga-azọpụta ndị Izrel n’aka ndị Filistia. Ọ ga-abụ onye Naziraịt.’ Ị̀ ma ndị bụ ndị Naziraịt? Ha bụ ndị ohu Jehova e nyere ọrụ pụrụ iche. Ha anaghị akpụ isi ha akpụ.
Ka oge na-aga, Manoa na nwunye ya mụtara nwa nwoke ma gụọ ya Samsịn. Mgbe o tolitere, Jehova mere ka o sie ezigbo ike. Samsịn ji aka nkịtị dọgbuo ọdụm. O nwere otu mgbe naanị Samsịn gburu ndị Filistia iri atọ. Ndị Filistia kpọrọ ya asị ma na-achọ ụzọ ha ga-esi egbu ya. Otu abalị ọ nọ na-ehi ụra na Gaza, ha gara chere ya n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ ka ha gbuo ya n’ụtụtụ. Ma n’etiti abalị, Samsịn biliri garuo n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, si n’ahụ́ mgbidi fopụ ọnụ ụzọ ámá ahụ. O si n’ebe ahụ buru ya n’ubu ya gbagoo n’ugwu dị nso na Hebrọn.
Ndị Filistia mechara gakwuru onye Samsịn chọrọ ịlụ aha ya bụ Delaịla, ma gwa ya, sị: ‘Anyị ga-akwụ gị ọtụtụ puku ọlaọcha ma ị chọpụtara anyị ihe mere Samsịn ji sie ezigbo ike. Anyị chọrọ ijide ya ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ.’ Delaịla kwetara ime ihe a ha gwara ya n’ihi na ọ chọrọ inweta ego ahụ. Samsịn ekwebughị agwa ya ihe mere o ji sie ezigbo ike. Ma, Delaịla nọ na-enye ya nsogbu, ya agwazie ya. Samsịn gwara ya, sị: ‘A kpụtụbeghị m isi mbụ n’ihi na abụ m onye Naziraịt. Ọ bụrụ na a kpụọ m isi, agaghịzi m esi ike.’ Samsịn ekwesịghị ịgwa Delaịla ihe a ọ gwara ya, ka ì chere na o kwesịrị?
Delaịla gwara ndị Filistia ozugbo, sị: ‘Amatala m ihe mere o ji sie ezigbo ike.’ O mere ka Samsịn nọrọ n’apata ụkwụ ya hie ụra. Mgbe ọ na-ehi ụra, Delaịla gwara mmadụ ka ọ kpụọ Samsịn isi. Mgbe a kpụchara ya isi, Delaịla kpọrọ ya, sị: “Samsịn, ndị Filistia abịala!” Samsịn biliri, ma o sighịzi ike. Ndị Filistia jidere ya, rụkpọsịa ya anya ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ.
Otu ụbọchị, ọtụtụ puku ndị Filistia zukọtara n’ụlọ chi ha a na-akpọ Degọn na-ekwu, sị: ‘Chi anyị enyefeela anyị Samsịn. Kpọpụtanụ Samsịn, ka anyị jiri ya mee ihe ọchị.’ Ha kpọpụtara ya ma gwa ya ka o guzoro n’etiti ogidi abụọ, ha ejiri ya na-eme ihe ọchị. Samsịn rịọrọ Jehova, sị: ‘Biko Jehova, nye m ike, naanị otu ugboro a.’ Tupu oge a, ntutu isi Samsịn etoola ogologo ọzọ. Samsịn ji ike ya niile kwaa ogidi ndị ji ụlọ ahụ aka. Ụlọ ahụ niile daruru ala, gbuo ma Samsịn ma ndị niile nọ n’ebe ahụ.
“N’ihe niile, onye ahụ nke na-eme ka m dị ike na-enye m ike.”—Ndị Filipaị 4:13