Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w05 1/15 p. 30-31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Samsin Enwee Mmeri n’Ike Jehova!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Tụkwasị Jehova Obi Ka Samsịn
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Jehova Mere Ka Samsịn Sie Ike
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Nwoke Nke Kachasị Ike
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
w05 1/15 p. 30-31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee otú Samsin pụrụ isi metụ ozu ndị o gburu aka ma nọgide na-abụ onye Nazịraịt?

N’Izrel oge ochie, mmadụ pụrụ ịhọrọ ikwe nkwa ma ghọọ onye Nazịraịt ruo oge a kapịrị ọnụ.a Otu n’ime iwu ndị ji onye kwere nkwa a kwuru, sị: “Ụbọchị nile nke ọ na-ekewapụtara Jehova onwe ya ọ dịghị mmadụ nwụrụ anwụ ọ ga-abịaru nso. Ọ gaghị emerụ onwe ya banyere nna ya, ma ọ bụ banyere nne ya, ma ọ bụ banyere nwanne ya nwoke, ma ọ bụ banyere nwanne ya nwanyị, mgbe ha nwụrụ.” Gịnị ma mmadụ ‘nwụọ n’akụkụ ya ná ntabi anya, na mberede’? Imetụ onye nwụrụ anwụ aka n’ọnọdụ mberede dị otú ahụ ga-emerụ ịbụ onye Nazịraịt ya. N’ihi ya, e kwuru, sị: “Ụbọchị mbụ nile alawo n’iyi.” Ọ ga-eme ememe e ji eme ka mmadụ dị ọcha ma maliteghachi oge ịbụ onye Nazịraịt ya n’isi.—Ọnụ Ọgụgụ 6:6-12.

Otú ọ dị, Samsin bụ onye Nazịraịt n’echiche dị iche. Tupu a mụọ Samsin, mmụọ ozi Jehova gwara nne ya, sị: “Lee, ị gaje ịtụ ime, mụọ nwa nwoke: agụba agaghị aga n’elu isi ya: n’ihi na onye Naziraịt nke Chineke ka nwata ahụ ga-abụ site n’afọ: ya onwe ya ga-amalitekwa ịzọpụta Izrel n’aka ndị Filistia.” (Ndị Ikpe 13:5) Samsin ekweghị nkwa ịbụ onye Nazịraịt. Ọ bụ Chineke họpụtara ya ịbụ onye Nazịraịt, ọ ga-abụkwa onye Nazịraịt ná ndụ ya nile. Mmachibido iwu ahụ megide imetụ ozu aka apụghị imetụta ya. Ọ bụrụ na o metụtara ya, ya emetụkwa ozu aka na mberede, olee otú ọ pụrụ isi maliteghachi oge ịbụ onye Nazịraịt ya n’isi bụ́ nke malitere mgbe a mụrụ ya? Mgbe ahụ, ihe àmà na-egosi na ihe ndị a chọrọ n’aka ndị bụ́ ndị Nazịraịt ná ndụ ha nile dị iche n’ihe a chọrọ n’aka ndị ji aka ha họrọ ịbụ ndị Nazịraịt.

Tụlee iwu Jehova nyere mmadụ atọ a kpọrọ aha na Bible ndị bụ́ ndị Nazịraịt ná ndụ ha nile—Samsin, Samuel, na Jọn Onye Na-eme Baptizim. Dị ka e kwuru na mbụ, Samsin agaghị akpụ isi ya. Banyere nwa ọ ka ga-atụrụ ime ya—bụ́ Samuel—Hana kwere nkwa, sị: “M ga-enyekwa ya Jehova ụbọchị ndụ ya nile, agụba agaghị agakwa n’elu isi ya.” (1 Samuel 1:11) Na nke Jọn Onye Na-eme Baptizim, mmụọ ozi Jehova kwuru, sị: “Ọ gaghị aṅụ mmanya na ihe ọṅụṅụ ọ bụla na-egbu egbu ma ọlị.” (Luk 1:15) Ọzọkwa, “Jọn . . . yi uwe . . . e ji ajị kamel mee, yirikwa ihe okike akpụkpọ anụ n’úkwù ya; nri ya bụkwa igurube na mmanụ aṅụ ọhịa.” (Matiu 3:4) Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime mmadụ atọ a e nyere iwu ịghara ịbịaru ozu nso.

Ọ bụ ezie na ọ bụ onye Nazịraịt, Samsin so ná ndị ikpe Jehova mere ka ha bilie ịzọpụta ndị Izrel n’aka ndị na-apụnara ha ihe. (Ndị Ikpe 2:16) Ka ọ na-arụkwa ọrụ a e nyere ya, o metụrụ ozu aka. N’otu oge, Samsin tigburu ndị Filistia 30 ma yipụ ha uwe ha. Ka oge na-aga, o tigburu ndị iro ahụ “ntigbu ukwu, ogwe ụkwụ n’elu apata ụkwụ.” O jikwa ọkpụkpụ agbà ọhụrụ nke ịnyịnya ibu gbuo otu puku ndị ikom. (Ndị Ikpe 14:19; 15:8, 15) Samsin nwere ihu ọma na nkwado Jehova ka ọ na-eme ihe a nile. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu na ọ bụ nwoke nke nwere okwukwe kwesịrị nṅomi.—Ndị Hibru 11:32; 12:1.

Okwu bụ́ na Samsin dọwara ọdụm “dị ka ọ ga-adọwa nwa ewu” ọ̀ na-enye echiche na ịdọwa ụmụ ewu bụ ihe a na-emekarị n’oge ya?

Ọ dịghị ihe àmà na-egosi na n’oge Ndị Ikpe Izrel, ndị mmadụ na-adọwakarị ụmụ ewu. Ndị Ikpe 14:6 na-ekwu, sị: “Mmụọ nke Jehova wee dakwasị [Samsin] n’ike, o wee dọwaa ya [nwa ọdụm] dị ka ọ ga-adọwa nwa ewu, ma ọ dịghị ihe o ji n’aka ya.” O yiri ka okwu a ọ̀ bụ ihe atụ.

Okwu ahụ bụ́ “o wee dọwaa ya” pụrụ ịpụta ihe abụọ. Ma ọ́ bụghị na Samsin dọwara ọdụm ahụ agbà ya abụrụ na ọ dọkasịrị ya n’ụzọ ọzọ. Ọ bụrụ na ọ bụ agbà ka ọ dọwara ya, mgbe ahụ, o doro anya na mmadụ nwere ike ịdọwa nwa ewu otú ahụ. Ya bụrụ otú ahụ, myirita ahụ na-egosi na iji aka nkịtị gbuo ọdụm dịịrị Samsin mfe dị nnọọ ka ọ pụrụ ịdịrị mmadụ mfe iji aka nkịtị gbuo nwa ewu. Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na Samsin gburu ọdụm ahụ site n’ịdọkasị ya adọkasị? Mgbe ahụ, okwu ahụ aghaghị ịbụ ihe atụ. Ihe ọ ga-apụta bụ na mmụọ Jehova nyere Samsin ike ịrụ ọrụ chọrọ ike ọkpụkpụ aka pụrụ iche. N’agbanyeghị nke ọ bụ, ntụnyere ahụ e mere ná Ndị Ikpe 14:6 na-egosi na site n’enyemaka Jehova, ọdụm siri ike dị Samsin ka ihe na-adịghị ike dị nnọọ ka nwa ewu ga-adị mmadụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ ihe dịịrị onye ahụ na-ekwe nkwa ikpebi ogologo oge ọ ga-abụ onye Nazịraịt. Otú ọ dị, dị ka omenala ndị Juu si dị, oge kasị ala mmadụ pụrụ ikwe nkwa ịbụ onye Nazịraịt bụ ụbọchị 30. E chere na ihe ọ bụla na-erughị ụbọchị 30 ga-eweda nkwa ahụ ala.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya