Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 39 p. 96
  • Eze Mbụ Chịrị Izrel

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Eze Mbụ Chịrị Izrel
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Sọl​—⁠Eze Mbụ nke Izrel
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • “Irube Isi Dị Mma Karịa Àjà”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ọ Tachiri Obi n’Agbanyeghị na Ihe Agaghị Otú Ọ Tụrụ Anya Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ọ Tachiri Obi n’Agbanyeghị na Ihe Agaghị Otú Ọ Tụrụ Anya Ya
    Ṅomie Okwukwe Ha
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 39 p. 96
Ebe Eze Sọl jidere ala ala uwe elu Samuel, uwe ya adọkapụ

ISI NKE 39

Eze Mbụ Chịrị Izrel

Jehova nyere ndị Izrel ndị ikpe ka ha na-edu ha, ma ndị Izrel chọrọ eze ga na-achị ha. Ha gwara Samuel, sị: ‘Mba ndị dị anyị nso nwechara ndị eze. Anyị chọkwara inwe eze ga na-achị anyị.’ Samuel ma na ihe a ha kwuru adịghị mma, n’ihi ya, o kpere ekpere gwa Jehova maka ya. Jehova gwara ya, sị: ‘Ọ bụghị gị ka ha jụrụ. Ọ bụ mụnwa ka ha jụrụ. Gwa ha na ha ga-enweta eze, ma e nwere ọtụtụ ihe eze ahụ ga-agwa ha ka ha na-emere ya.’ N’agbanyeghị ihe a a gwara ha, ha sịrị: ‘Anyị achọghị ịma. Ihe anyị chọrọ bụ eze.’

Jehova gwara Samuel na otu nwoke aha ya bụ Sọl ga-abụ eze mbụ ha. Mgbe Sọl gara Rema ka ọ hụ Samuel, ọ wụrụ Sọl mmanụ n’isi, si otú ahụ họpụta ya ka ọ bụrụ eze.

Samuel mechara kpọkọta ndị Izrel ka o gosi ha eze ọhụrụ ha. Ma ha chọrọ Sọl, ha ahụghị ya. Ị̀ ma ihe kpatara ya? Ọ bụ maka na ọ gara zoo n’ebe a kwasara ngwongwo. Mgbe ha mechara hụ ya, ha kpọpụtara ya ma gwa ya ka o guzoro n’etiti ha. Sọl kacha ndị niile nọ ebe ahụ ogologo, maakwa ezigbo mma. Samuel sịrị ha: ‘Leenụ onye Jehova họọrọ.’ Ndị Izrel gwara eze, sị: “Eze, ị ga-adị ogologo ndụ!”

Mgbe Eze Sọl malitere ịchị, ọ na-ege Samuel ntị, na-erubekwara Jehova isi. Ma, o mechara gbanwee. Dị ka ihe atụ, eze ekwesịghị ịchụrụ Jehova àjà. Otu ụbọchị, Samuel gwara Sọl ka o chere ka ọ bịa, ma Samuel abịaghị ozugbo. N’ihi ya, Sọl ji aka ya chụọ àjà ahụ. Gịnị ka Samuel mere? Ọ gwara Sọl, sị: ‘I kwesịghị inupụrụ Jehova isi.’ Sọl ọ̀ mụtara ihe n’ihe a o mere?

Mgbe Sọl mechara gaa ịlụso ndị Amalek agha, Samuel gwara ya ka o gbuo ha niile. Ma, Sọl egbughị Eze Egag. Jehova gwara Samuel, sị: ‘Sọl ahapụla m, ọ naghịzi ege m ntị.’ Ihe a were Samuel iwe, ya agwa Sọl, sị: ‘Ebe ọ bụ na ị kwụsịla irubere Jehova isi, ọ ga-ahọrọ onye ọzọ ka ọ bụrụ eze.’ Mgbe Samuel chọrọ ịla, Sọl jidere ya n’ala ala uwe elu ya, uwe ahụ adọkapụ. Samuel gwaziri Sọl, sị: ‘Jehova anapụla gị alaeze otú a i si dọkapụ uwe a.’ Jehova ga-enye onye ga-ahụ ya n’anya ma na-erubere ya isi alaeze ahụ.

“Ọ ka mma irube isi karịa ịchụ àjà.”​—1 Samuel 15:22

Ajụjụ: Olee ihe ndị Izrel rịọrọ Samuel? Gịnị mere Jehova ji jụ Sọl ịbụ eze?

1 Samuel 8:1-22; 9:1, 2, 15-17; 10:8, 20-24; 13:1-14; 15:1-35

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya