ISI NKE 98
E Zisara Ozi Ọma n’Ọtụtụ Mba
Ndịozi Jizọs rubere isi n’iwu o nyere ha ka ha zisaa ozi ọma n’ụwa niile. N’afọ 47, ụmụnna nọ n’Antiọk zipụrụ Pọl na Banabas ka ha gaa zie ozi ọma n’ebe dị iche iche. Ụmụnna abụọ a gara n’obodo niile dị n’Eshia Maịnọ zie ozi ọma, dị ka Dabe, Listra, na Aịkoniọm.
Pọl na Banabas ziri ụdị mmadụ niile ozi ọma, ma ogbenye ma ọgaranya, ma nwata ma okenye. Ọtụtụ ndị nabatara ozi ọma e ziri ha gbasara Kraịst. Mgbe Pọl na Banabas na-ezi Sajiọs Pọlọs bụ́ gọvanọ Saịprọs ozi ọma, otu dibịa afa gbalịrị ime ka ha ghara izi ya ozi ọma. Pọl gwara ya, sị: ‘Jehova ga-eme gị ihe.’ Ozugbo ahụ, dibịa afa ahụ kpuru ìsì. Mgbe Gọvanọ Pọlọs hụrụ ihe a merenụ, ya ekwere na Jizọs.
Pọl na Banabas ziri ozi ọma ebe niile, ma n’ụlọ n’ụlọ ma n’ahịa ma n’okporo ụzọ ma n’ụlọ nzukọ. Mgbe ha gwọrọ otu onye ngwọrọ na Listra, ndị bi ebe ahụ chere na ha bụ chi, ha achọwa ife ha. Ma, Pọl na Banabas ekweghị ka ha fee ha. Ha sịrị ha: ‘Ọ bụ naanị Chineke ka unu kwesịrị ife. Anyị bụ mmadụ ibe unu.’ Ka ihe a na-eme, ụfọdụ ndị Juu bịara mee ka ìgwè mmadụ ahụ mesiwe Pọl ike. Ha tụrụ ya nkume, kpụrụ ya gaa n’azụ obodo, chee na ọ nwụọla. Ma, Pọl anwụbeghị. Ụmụnna ndị bi n’obodo ahụ bịara ozugbo nyere ya aka ma kpọrọ ya banyeghachi n’obodo ahụ. Mgbe e mechara, Pọl laghachiri Antiọk.
N’afọ 49, Pọl gakwara zie ozi ọma nke ugboro abụọ ya n’obodo dị iche iche. Ọ gaghachiri n’ebe ndị o ziburu ozi ọma n’Eshia Maịnọ ka ọ mata otú ụmụnna nọ n’ebe ndị ahụ na-eme. Mgbe ọ hụchara ha, ọ gawara izi ozi ọma n’obodo ndị dị na Yurop. Ọ gara Atens, Efesọs, Filipaị, Tesalonaịka, na obodo ndị ọzọ. Saịlas, Luk, na nwa okorobịa aha ya bụ Timoti so Pọl gaa ebe ndị ahụ. Ha hiwere ọgbakọ dị iche iche, meekwa ka okwukwe ndị nọ n’ọgbakọ ndị ahụ sie ike. Pọl nọrọ na Kọrịnt otu afọ na ọnwa isii, na-eme ka okwukwe ụmụnna ndị nọ n’ebe ahụ sikwuo ike. O ziri ndị mmadụ ozi ọma, kụziere ha ihe ma degara ọtụtụ ọgbakọ akwụkwọ ozi. Ọ nọkwa na-arụ ọrụ. Aka ọrụ ya bụ ịkpa ákwà ụlọikwuu. Ma Pọl mechara laghachi Antiọk.
N’afọ 52, Pọl gakwara zie ozi ọma nke ugboro atọ ya n’obodo dị iche iche. Ọ malitere n’Eshia Maịnọ. Ọ nọ na-aga ruo Filipaị, ruokwa Kọrịnt. Pọl nọrọ ọtụtụ afọ n’Efesọs na-akụziri ndị mmadụ ihe, na-agwọ ndị ọrịa, na-enyekwara ọgbakọ dị n’ebe ahụ aka. Kwa ụbọchị, ọ na-agwakwa ndị mmadụ okwu Chineke n’ụlọ ezumezu dị n’ụlọ akwụkwọ dị ebe ahụ. Ọtụtụ ndị gere ya ntị ma kwụsị ihe ọjọọ ha na-eme. Mgbe Pọl zichara ozi ọma n’ọtụtụ obodo, ọ gara Jeruselem.
“N’ihi ya, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—Matiu 28:19