ISI NKE 100
Pọl na Timoti
E nwere otu nwa okorobịa nọ n’ọgbakọ dị na Listra aha ya bụ Timoti. Nna ya bụ onye Grik, ma nne ya bụ onye Juu. Aha nne ya bụ Yunis, aha nne nne ya abụrụ Lọịs. Yunis na Lọịs malitere mgbe Timoti dị obere kụziwere ya gbasara Jehova.
Na nke ugboro abụọ Pọl gara kwusaa ozi ọma n’obodo dị iche iche, ọ gara Listra. Ọ chọpụtara na Timoti hụrụ ụmụnna nọ na Listra n’anya, na-agbalịsikwa ike inyere ha aka. Pọl gwara Timoti ka o soro ya gaa kwusawa ozi ọma. Pọl ji nwayọọ nwayọọ kụziere Timoti otú e si ezi ozi ọma na otú e si akụzi okwu Chineke.
Mmụọ nsọ nyeere Pọl na Timoti aka n’ebe niile ha gara zie ozi ọma. N’otu abalị, Pọl hụrụ ọhụụ ebe otu nwoke gwara ya ka ọ bịa Masedonia nyere ha aka. N’ihi ya, Pọl, Timoti, Saịlas, na Luk gawara ebe ahụ ikwusa ozi ọma na ihiwe ọgbakọ dị iche iche.
Ọtụtụ ndị ghọrọ Ndị Kraịst n’obodo aha ya bụ Tesalonaịka, nke dị na Masedonia. Ma, ọtụtụ ndị Juu malitere imere Pọl na ndị ya na ha so anyaụfụ. Ha kpọkọtara ìgwè mmadụ, ìgwè mmadụ ahụ akpụrụ ụmụnna ụfọdụ kpụgara ndị na-achị obodo. Ha nọ na-eti mkpu, sị: ‘Ndị a na-enupụrụ ọchịchị ndị Rom isi.’ Ihe a nwere ike ime ka e gbuo Pọl na Timoti. N’ihi ya, ha ji abalị gbaga Beria.
Ndị Beria chọsiri ike ịnụ ozi ọma. Ndị Grik na ndị Juu nọ ebe ahụ ghọrọ Ndị Kraịst mgbe e ziri ha ozi ọma. Ma mgbe ụfọdụ ndị Juu si Tesalonaịka bịa mere ka e bido inye ụmụnna nsogbu, Pọl hapụrụ Beria gawa Atens. Timoti na Saịlas nọgidere na Beria, na-eme ka okwukwe ụmụnna sikwuo ike. Pọl mechara zighachi Timoti na Tesalonaịka ka o nyere ụmụnna nọ ebe ahụ aka idi nsogbu kpụ ọkụ n’ọnụ a na-enye ha. Pọl mechakwara ziga Timoti n’ọgbakọ ndị ọzọ ka ọ gbaa ha ume.
Pọl gwara Timoti, sị: ‘A ga-akpagbu ndị niile chọrọ ife Jehova.’ A kpagburu Timoti, tụọkwa ya mkpọrọ maka na ọ na-efe Jehova. Ma, obi dị ya ụtọ na o ji ohere ahụ gosi na o jisiri Jehova aka ike.
Pọl gwara ndị Filipaị, sị: ‘Ana m ezitere unu Timoti. Ọ ga-akụziri unu otú unu ga-esi na-efe Jehova nakwa otú unu ga-esi na-ezi ozi ọma.’ Pọl ma na Timoti ga-arụ ọrụ a nke ọma. Ha abụọ bụ enyi, ha rụkọkwara ọrụ ọnụ ruo ọtụtụ afọ.
“Enweghị m onye ọzọ nwere ụdị obi o nwere, onye ga-eji obi ya niile lebara mkpa unu anya. N’ihi na ndị ọzọ niile na-achọ ihe ga-adị ha mma, ọ bụghị ihe ga-adị Jizọs Kraịst mma.”—Ndị Filipaị 2:20, 21