Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 9/15 p. 29-31
  • Timoti—“Ezi Nwa M n’Okwukwe”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Timoti—“Ezi Nwa M n’Okwukwe”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Pọl Ahọrọ Ya
  • Timoti Kwalitere Ọdịmma Alaeze
  • Ihe Ọmụma Banyere Ụdị Onye Timoti Bụ
  • Wepụta Onwe Gị!
  • “Nwa M M Hụrụ n’Anya nke Kwesịrị Ntụkwasị Obi n’Ime Onyenwe Anyị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Timoti—Dị Njikere, Nweekwa Mmasị Ije Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Pọl na Timoti
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Timoti Chọrọ Inyere Ndị Mmadụ Aka
    Kụziere Ụmụ Gị Ihe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 9/15 p. 29-31

Timoti—“Ezi Nwa M n’Okwukwe”

TIMOTI ka bụtụ nwata mgbe onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi họọrọ ya dị ka onye ya na ya ga-eso na-eme njegharị. Nke a malitere mmekọrịta nke ga-adịgide ruo ihe dị ka afọ 15. Mmekọrịta nke ndị ikom abụọ ahụ nwere ruru n’ókè nke na Pọl pụrụ ịkpọ Timoti “nwa m n’ime Onyenwe anyị, bụrụkwa onye m hụrụ n’anya, onye kwesịrị ntụkwasị obi” na “ezi nwa m n’okwukwe.”—1 Ndị Kọrint 4:17; 1 Timoti 1:2.

Gịnị n’àgwà Timoti mere ihe ya ji masị nnọọ Pọl? Olee otú Timoti si bịa bụrụ enyi bara uru otú ahụ? Ihe ndị dị aṅaa bara uru ka anyị pụkwara ịmụta site n’ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ banyere ihe ndị Timoti mere?

Pọl Ahọrọ Ya

Pọl hụrụ nwa okoro ahụ bụ́ Timoti mgbe onyeozi ahụ letara Listra (nke dị na Turkey nke oge a) na njem ozi ala ọzọ nke abụọ ya n’ihe dị ka 50 O.A. Ma eleghị anya, ná ngwụsị nke afọ iri na ụma ya ma ọ bụ ná mmalite afọ ndị nke 20 ya, ndị Kraịst nọ na Listra na Aịkọniọm kwuru okwu ọma banyere Timoti. (Ọrụ 16:1-3) O biri ndụ dị ka aha ya si dị, bụ́ nke pụtara “Onye Na-asọpụrụ Chineke.” Site n’oge Timoti bụ nwata, nne ya ochie bụ́ Lọịs na nne ya bụ́ Yunaịsị akụziworo ya ihe sitere n’Akwụkwọ Nsọ. (2 Timoti 1:5; 3:14, 15) Ma eleghị anya ha nabatara Iso Ụzọ Kraịst n’oge Pọl letara obodo ha na nke mbụ ya n’afọ ole na ole bu ụzọ. Ugbu a, site n’ọrụ nke mmụọ nsọ, otu amụma gosiri ihe ga-abụ ọdịnihu Timoti. (1 Timoti 1:18) N’ikwekọ ná nduzi ahụ, Pọl na ndị okenye nke ọgbakọ ahụ bikwasịrị nwa okoro ahụ aka n’isi, si otú ahụ na-ewepụta ya iche maka otu ozi kpọmkwem, onyeozi ahụ họkwaara ya ịbụ onye ya na ya ga na-ejekọ ozi ala ọzọ.—1 Timoti 4:14; 2 Timoti 1:6.

Ebe ọ bụ na nna ya bụ onye Gris na-ekweghị ekwe, e bighị Timoti úgwù. N’ezie, nke a abụghị ihe a chọrọ n’aka onye Kraịst. Otú ọ dị, iji wepụrụ ndị Juu ha ga-eleta ihe mkpọbi ụkwụ, Timoti kwenyere n’ihe omume a na-egbu mgbu.—Ọrụ 16:3.

È webuuru Timoti dị ka onye Juu? Ndị ọkà mmụta ụfọdụ na-arụ ụka na dị ka iwu ndị rabaị si dị, “ọ bụ nne, ọ bụghị nna, na-ekpebi ọnọdụ nke nwa nke di na nwunye sitere ná mba dịgasị iche mụtara.” Ya bụ́, “nwanyị bụ́ onye Juu na-amụ ụmụ bụ́ ndị Juu.” Ma, onye edemede bụ́ Shaye Cohen na-enwe obi abụọ ma “iwu ndị rabaị [dị otú ahụ] banyere ndị mmadụ ọ̀ dịrịla na narị afọ mbụ O.A.” nakwa ma ndị Juu nọ n’Asia Minor hà rubeere ya isi. Mgbe ọ tụlesịrị ihe àmà ndị e nwere n’akụkọ ihe mere eme, o kwubiri na mgbe ndị ikom Jentaịl lụrụ ndị inyom Israel, “a na-ewere ụmụ a mụtara n’alụmdi na nwunye ahụ dị ka ndị Israel nanị ma ọ bụrụ na ezinụlọ ahụ bi n’etiti ndị Israel. A na-agụ ikwu ala na nne ma ọ bụrụ na e bi ná mba nke nne. Mgbe nwanyị bụ́ onye Israel kwagara ná mba ọzọ iji lakwuru di ya bụ́ onye Jentaịl, a na-ewere ụmụ ya dị ka ndị Jentaịl.” Otú o sina dị, nne na nna Timoti isi ná mba dịgasị iche aghaghị ịbawo uru n’ọrụ nkwusa ahụ. Ọ gaghị enwewo nsogbu ọ bụla n’iso ndị Juu ma ọ bụ ndị Jentaịl mekọọ ihe, ikekwe na-eme ka o nwee ike imeri esemokwu ndị dị n’etiti ha.

Nleta Pọl letara Listra bụ oge oké mgbanwe ná ndụ Timoti. Ịdị njikere nwa okoro ahụ dị ịgbaso nduzi nke mmụọ nsọ na iji obi umeala kwenyere ndị okenye bụ́ ndị Kraịst dugara ná ngọzi na ihe ùgwù ije ozi ndị dị ukwuu. Ma ọ̀ ghọtara ya n’oge ahụ ma ọ bụ na ọ ghọtaghị ya, n’okpuru nduzi Pọl, a ga-eji Timoti rụọ ọrụ ọchịchị Chineke ndị dị mkpa, nke ga-eduga ya n’ebe dịpụrụ nnọọ adịpụ site n’ebe obibi ya dị ka na Rom, bụ́ isi obodo nke alaeze ukwu ahụ.

Timoti Kwalitere Ọdịmma Alaeze

Ọ bụ nanị ihe ndekọ na-ezughị ezu banyere ihe ndị Timoti mere ka anyị nwere, ma o mere njem n’ụzọ sara mbara iji kwalite ọdịmma Alaeze. Njem mbụ Timoti so Pọl na Saịlas mee na 50 O.A. kpọgara ya n’Asia Minor ma banye na Europe. N’ebe ahụ, o keere òkè n’ime nkwusa na Filipaị, Tesalọnaịka, nakwa na Beria. Mgbe mmegide mesịrị ka Pọl gawa Atens, ọ hapụrụ Timoti na Saịlas n’ime Beria ka ha lekọta ìgwè ndị na-eso ụzọ e guzobeworo n’ebe ahụ. (Ọrụ 16:6–17:14) Mgbe e mesịrị, Pọl zipụrụ Timoti gaa Tesalọnaịka iwusi ọgbakọ ọhụrụ dị n’ebe ahụ ike. Mgbe Timoti zutere Pọl na Kọrint, o wetaara ya akụkọ ọma banyere ọganihu ọgbakọ ahụ na-enwe.—Ọrụ 18:5; 1 Ndị Tesalọnaịka 3:1-7.

Akwụkwọ Nsọ ekwughị otú oge Timoti nọnyeere ndị Kọrint haruru. (2 Ndị Kọrint 1:19) Otú ọ dị, ma eleghị anya n’ihe dị ka 55 O.A., Pọl tụlere izighachiri ha ya n’ihi na ọ nụwo akụkọ na-enye nsogbu n’obi banyere ọnọdụ ha. (1 Ndị Kọrint 4:17; 16:10) Mgbe e mesịrị, e zigara Timoti na Erastọs site n’Efesọs gaa Masedonia. Mgbe Pọl sikwa na Kọrint degara ndị Rom akwụkwọ, ya na Timoti nọ ọzọ.—Ọrụ 19:22; Ndị Rom 16:21.

Timoti na ndị ọzọ so Pọl hapụ Kọrint mgbe Pọl gawara Jerusalem, ha sonyekwaara onyeozi ahụ ruo ma ọ dịkarịa ala na Troas. A maghị ma Timoti ọ̀ gara n’ihu ruo Jerusalem. Ma a kpọtụrụ ya aha ná mmeghe nke akwụkwọ ozi atọ Pọl dere n’ụlọ mkpọrọ dị na Rom n’ihe dị ka 60-61 O.A.a (Ọrụ 20:4; Ndị Filipaị 1:1; Ndị Kọlọsi 1:1; Faịlimọn 1) Pọl nọ na-eme atụmatụ isi na Rom ziga Timoti na Filipaị. (Ndị Filipaị 2:19) Mgbe a tọhapụsịkwara Pọl ná mkpọrọ, Timoti nọgidere n’Efesọs ná ntụziaka nke onyeozi ahụ.—1 Timoti 1:3.

Ebe ọ bụ na ime njem na narị afọ mbụ adịghị mfe, ọ dịghịkwa ntụsara ahụ, njikere Timoti dị ime ọtụtụ njem maka ọdịmma nke ọgbakọ ndị ahụ bụ n’ezie nke kwesịrị ịja mma. (Lee Ụlọ Nche, August 15, 1996, peji nke 29, igbe.) Tụlee nanị otu n’ime njem ndị ọ gaje ime na ihe nke a na-agwa anyị banyere Timoti.

Ihe Ọmụma Banyere Ụdị Onye Timoti Bụ

Timoti na Pọl nọ na Rom mgbe onyeozi ahụ a tụrụ mkpọrọ degaara ndị Kraịst a na-akpagbu na Filipaị akwụkwọ ma sị: “Ana m ele anya n’ime Onyenwe anyị Jisọs na m ga-ezigara unu Timoti ọsọ ọsọ, ka mụ onwe m wee nweekwa obi ụtọ, mgbe m maara ọnọdụ unu. N’ihi na enweghị m onye ọ bụla nke mkpụrụ obi ya yiri nke ya, bụ́ onye ga-echegbu onwe ya banyere ọnọdụ unu n’ezie. N’ihi na ha nile na-achọ ihe nke aka ha, ọ bụghị ihe nke Jisọs Kraịst. Ma unu maara ọnwụnwa ya, na, dị ka nwa na-eso nna ya, otú a ka o sooro m bụrụ ohu n’izisa ozi ọma.”—Ndị Filipaị 1:1, 13, 28-30; 2:19-22.

Okwu ndị ahụ na-eme ka nchegbu Timoti nwere banyere ndị kwere ekwe ibe ya pụta ìhè. Ọ gwụla ma o ji ụgbọ mmiri gaa, njem dị otú ahụ chọrọ iji ụkwụ mee njem ụbọchị 40 site Rom gaa Filipaị, na ịgafe Osimiri Adriatic, e mesịakwa, ịga njem ụbọchị 40 ọzọ iji lọghachite Rom. Timoti dị njikere ime ihe ahụ nile iji jeere ụmụnna ya ndị nwoke na ndị nwanyị ozi.

Ọ bụ ezie na Timoti mere njem n’ụzọ sara mbara, mgbe ụfọdụ ahụ esighị ya ike. Ihe àmà na-egosi na o nwere nsogbu afọ ma nweekwa “nrịanrịa . . . ọtụtụ mgbe.” (1 Timoti 5:23) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dọgburu onwe ya n’ọrụ n’ihi ozi ọma ahụ. Ka a sịkwa ihe mere ya na Pọl ji nwee mkpakọrịta chiri anya otú ahụ!

N’okpuru nduzi nke onyeozi ahụ nakwa site n’ahụmahụ ha nwekọrọ ọnụ, ihe àmà na-egosi na Timoti bịara nwee àgwà Pọl. Ọ bụ ya mere Pọl ji nwee ike ịgwa ya, sị: “Gị onwe gị soro ozizi m, omume m, ihe m zubere, okwukwe m, ogologo ntachi obi m, ịhụnanya m, ntachi obi m, nsogbu m nile, ahụhụ m nile; aha ihe dakwasịrị m n’Antiọk, n’Aikọniọm, na Listra; aha nsogbu m nagidere.” Timoti so Pọl gbaa anya mmiri, soro n’ekpere ya, jeekwa ozi n’akụkụ ya iji kwalite ọdịmma Alaeze.—2 Timoti 1:3, 4; 3:10, 11.

Pọl gbara Timoti ume ka ọ ‘ghara ikwe ka onye ọ bụla lelịa nwata ọ bụ anya.’ Nke a pụrụ igosi na Timoti na-emetụ ihere, na-alatụ azụ n’igosipụta ikike ya. (1 Timoti 4:12; 1 Ndị Kọrint 16:10, 11) Otú ọ dị, ọ pụrụ ije ozi nanị ya, Pọl jikwa obi ike ziga ya n’ozi ndị ibu ọrụ dị na ha. (1 Ndị Tesalọnaịka 3:1, 2) Mgbe Pọl ghọtara mkpa e nwere maka nlekọta ọchịchị Chineke siri ike n’ọgbakọ dị n’Efesọs, ọ gbara Timoti ume ịnọgide n’ebe ahụ iji “nye mmadụ ụfọdụ iwu ka ha ghara izi ihe dị iche.” (1 Timoti 1:3, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Otú ọ dị, ọ bụ ezie na e nyefere ya ọtụtụ ibu ọrụ, Timoti dị obi umeala. N’agbanyeghịkwa ihere ọ bụla ọ pụrụ imewo, o nwere obi ike. Dị ka ihe atụ, ọ gara Rom iji nyere Pọl aka, bụ́ onye a na-ekpe ikpe n’ihi okwukwe ya. N’eziokwu, a tụkwara Timoti n’onwe ya mkpọrọ n’otu oge, ma eleghị anya n’ihi otu ihe ahụ.—Ndị Hibru 13:23.

N’ụzọ obi abụọ na-adịghị na ya, Timoti mụtara ihe dị ukwuu n’aka Pọl. Eziokwu ahụ bụ́ na onyeozi ahụ degaara ya akwụkwọ ozi abụọ sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke nke a na-achọta n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na-egosi na onyeozi ahụ ji onye ya na ya na-arụkọ ọrụ kpọrọ oké ihe. N’ihe dị ka 65 O.A., mgbe Pọl ghọtara na mgbe a ga-egbu ya n’ihi okwukwe ya adịwo nso, ọ kpọrọ Timoti òkù ọzọ. (2 Timoti 4:6, 9) Akwụkwọ Nsọ ekpugheghị ma Timoti ò mesịrị nwee ike ịhụ Pọl tupu e gbuo onyeozi ahụ.

Wepụta Onwe Gị!

A pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’ezi ihe nlereanya Timoti. O ritere uru nke ukwuu site n’iso Pọl kpakọrịta, site na ntorobịa na-eme ihere topụta ghọọ onye nlekọta. Ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst bụ́ ndị ikom na ndị inyom pụrụ irite uru dị ukwuu site ná mkpakọrịta yiri nke ahụ taa. Ọ bụrụkwa na ha emee ka ozi Jehova bụrụ ọrụ ha, ha ga-enwe ọrụ dị ukwuu bara uru ha ga-arụ. (1 Ndị Kọrint 15:58) Ha pụrụ ịghọ ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ndị nkwusa oge nile, n’ọgbakọ ha, ma ọ bụ ha pụrụ inwe ike ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị mkpọsa Alaeze. N’ime ọtụtụ ohere ndị pụrụ imeghere ha bụ ọrụ ozi ala ọzọ ma ọ bụ ije ozi n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Watch Tower Society ma ọ bụ n’otu n’ime alaka ya. N’ezie, ndị Kraịst nile pụkwara igosipụta otu mmụọ ahụ Timoti gosipụtara, site n’iji mkpụrụ obi dum na-ejere Jehova ozi.

Ì nwere ọchịchọ ịnọgide na-eto eto n’ụzọ ime mmụọ, ịbara nzukọ Jehova uru n’ọnọdụ ọ bụla ọ pụrụ ile anya dị ka nke kwesịrị ekwesị? Mgbe ahụ mee dị ka Timoti mere. Ruo ókè o kwere mee, wepụta onwe gị. Ònye maara ihe ùgwù ije ozi ndị pụrụ imeghepụrụ gị n’ọdịnihu?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a A kpọtụkwara Timoti aha n’akwụkwọ ozi anọ ndị ọzọ nke Pọl.—Ndị Rom 16:21; 2 Ndị Kọrint 1:1; 1 Ndị Tesalọnaịka 1:1; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:1.

[Foto dị na peeji nke 31]

“Enweghị m onye ọ bụla nke mkpụrụ obi ya yiri nke ya”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya