Ozi Ọma nye Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ!
“M WEE hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efe n’etiti eluigwe, na-enwe ozi ọma ebighị ebi izisara ndị na-anọdụ n’elu ụwa, bụ́ mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla.” (Mkpughe 14:6) Jọn onye ozi ahụ meworo agadi ji okwu ndị a kọwaa ọhụụ amụma ya nke sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ ọhụụ nke a na-emezu n’oge anyị a. Lee ka o si bụrụ ihe obi iru ala ịmara na e nwere ozi ọma n’ime ọgbọ nke a nke e nwere mmụba nke imempụ, imetọ ikuku na mmiri, iyi ọha egwu, agha, na ọnọdụ akụ na ụba nke a na-ejighị n’aka nke zuru ebe nile! Ma olee ụdị ozi pụrụ ịdị mma ruo n’ókè na ọ dị mkpa ka mmụọ ozi na-akpọsa ya? Olee ozi nke pụrụ ịbụ ihe obi ụtọ nke na o ruru eru ịbụ nke a kpọsara nye mba nile na ebo nile na asụsụ nile na ndị nile?
Anyị pụrụ ịza nke ahụ ma ọ bụrụ na anyị echee echiche laghachi azụ n’oge ọzọ mgbe otu mmụọ ozi mara ọkwa ozi ọma n’onwe ya. Nke a bụ mgbe narị afọ nke mbụ T.O.A. na-agwụsị, ihe dị ka otu narị afọ tupu Jọn enweta ọhụụ ya. Ndị na-azụ atụrụ na ìgwè atụrụ ha nọ n’ime ọhịa n’akụkụ Betlehem, otu mmụọ ozi pụtakwara ịma ọkwa banyere ọmụmụ Jisọs, na-asị: “Lee, ana m ezi unu ozi ọma nke oké ọṅụ nke ga-adịrị [ndị nile, NW]: n’ihi na taa n’obodo Devid ka a mụrụ nye unu Onye nzọpụta, nke bụ Kraịst Onyenwe anyị.”—Luk 2:10, 11.
N’ezie, ọmụmụ Jisọs bụ “ozi ọma nke oké ọṅụ.” O tolitere wee ghọọ Kraịst na Onye nzọpụta ahụ e kwere ná nkwa, bụ́ onye nyere ndụ mmadụ ya zuru okè ka ndị kwere ekwe nwere ezi obi wee nwee ike ịdị ndụ. Karịa nke ahụ, ọ gaje ịbụ Eze nke Alaeze Chineke, “Onyeisi Udo,” onye ikpe ziri ezi na udo ga-emesịa bịara ihe nile a kpọrọ mmadụ n’okpuru ọchịchị ya. (Aịsaịa 9:6; Luk 1:33) N’eziokwu, ọmụmụ ya bụ ozi ọma nke ruru eru ịbụ nke mmụọ ozi mara ọkwa ya!
Jisọs Bụ Eze
Laa azụ na narị afọ mbụ ahụ, Jisọs mezuru ọtụtụ n’ime nzube ndị Chineke nwere maka ya, ma e dokwasịghị ya n’ocheeze dị ka Eze nke Alaeze Chineke n’oge ahụ. Dị ka magazin nke a meworo ka ọ pụta ìhè mgbe mgbe, nke ahụ emeghị ruokwa 1914. Dị ka mmezu amụma na-egosi n’ụzọ pụtara ìhè, n’afọ ahụ, e guzobere Alaeze Chineke n’eluigwe. (Mkpughe 12:10, 12) Ọ bụ ezie na e nwere ozi jọgburu onwe ya na 1914—ntiwapụ nke Agha Ụwa nke Mbụ—ọmụmụ nke Alaeze Chineke bụ ozi kachasị ozi nile mma. Ọ bụ n’ihi ya ka Jisọs ji buo amụma banyere oge anyị, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.”—Matiu 24:14.
È mezuwo amụma Jisọs ahụ? Azịza ya bụ ee! E mezuwokwa ọhụụ amụma ahụ Jọn hụrụ. N’eziokwu, anyị apụghị ịhụ mmụọ ozi ahụ a na-adịghị ahụ anya nke Jọn hụrụ. Ma Ndịàmà Jehova abụwo nnọọ ndị a na-ahụ anya ka ha nọ na-ekwusa ozi ọma nke mmụọ ozi ahụ nye “mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla.” N’ime 212 ala na agwaetiti dị iche iche nke oké osimiri, a nụwo olu ha. Ọtụtụ ìgwè mmadụ na-azaghachikwa. Ahụmahụ nke ụfọdụ n’ime ndị a ga-egosipụta nnọọ otú ozi banyere Alaeze Chineke dịruru mma n’ezie.