Ị pụrụ inweta ọṅụ n’ime ụwa nke na-akpata obi ịda mbà!
MARIE bụ onye na-enwe ihu ọchị. Ọ bụ ihe siri ike ikweta na naani afọ ole na ole gara aga, nwanyị nke a gbara afọ 32 kọwara onwe ya dị ka onye nwụrụ anwụ n’ime. Marie abụwo onye ịda mbà dị oké njọ dakwasịrị. “Ọ dị ka oké ọchịchịrị nke ji nwayọọ nwayọọ na-agbasa,” ka ọ kọwara. Ee, n’ụzọ na-enye obi ụtọ, ahụ́ mesịrị dị ya mma, o nwetaghachikwara ọṅụ ya.
Kwa afọ, otu narị nde mmadụ gburugburu ụwa na-enwe oké ịda mbà n’obi! Ọrịa nke a abụghi ịnọ n’ọnọdụ obi adịghi mma nkịtị nke na-adakwasi ihe ka ọtụtụ n’ime anyị site n’oge ruo n’oge. Oké ịda mbà n’obi metụtara ịnọgide na-enwe obi ilu. Onye ahụ dara mbà n’obi na-akwụsi inwe mmasi ná ndụ, gharakwa inwe obi ụtọ n’ihe ọ bụla, na-enwekwa mmetụta nke enweghi olileanya na abaghi uru ọ bụla. N’afọ 1983 Òtù Ahụ Ike Ụwa (World Health Organization) kwupụtara, sị: “Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na n’oge a, ọrịa ịda mbà n’obi na-eme n’akụkụ nile nke ụwa.”
Ndị ji nlezianya na-amụ Bible abụghi ndị akụkọ nke a juru anya. Bible kọwara oge anyị dị ka “mgbe ikpeazụ” nke e ji “oge dị oké egwu” wee mara. (2 Timoti 3:1-5) Njikọ dị iche iche a na-enwe n’ọha mmadụ bụ́ ndị na-enyebu nkwado mgbe e nwere ihe isi ike nke mmetụta uche eretọwo. N’isiokwu ahụ bụ “Ọ̀ Bụ Ọgbọ Nkụda Mmụọ?,” Dr. Gerald Klerman kọwara na ọ bụ mgbanwe nke a kpatara mmụba ọhụrụ a na-enwe n’ịda mbà n’obi. Ọ kọwara, sị: “Usoro atọ nke ọha na eze ndị kasi pụta ìhè n’inyere ndị ọzọ aka abụwo ezinụlọ, chọọchị, na ndị agbata obi nọ nso. . . . Ọ bụ akara e ji mara oge ugbu a na usoro atọ ndị a nile ndị na-enyere mmadụ aka nọcha n’ọ̀tùtù dị iche iche nke ọgba aghara.”
Ọ bụ ndakpọ nke ezinụlọ Marie dubara ya n’ịda mbà n’obi. “Mgbe onye m ji mere nne gbapụrụ n’agwaghi m, enwere m mmetụta nke onye a raara nye n’aka ndị iro na onye a hapụrụ naani ya. Adị m afọ 12, na mberede ụwa m gwụrụ m ike,” ka Marie chetara. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, ọ hapụrụ ụlọ ha n’ihi na nna ya na-achọ ka ha nwee mmekọahụ rụrụ arụ, o kwetakwara, sị: “Enwere m mmetụta nke onye ahụ na-ezuchaghị okè ma tụfuokwa obi ike nile m nwere n’ebe mụ onwe m nọ.” Otú a ka o si malite ịda oké mbà n’obị.
N’otu ụbọchị mgbe Marie nọ n’oké ịda mbà n’obi, Ndịàmà Jehova abụọ bịara n’ụlọ ya. Ozugbo ahụ, o gosipụtara mmasị dị ukwuu n’ozi Bible ha nke na-enye obi ụtọ. “Na mbụ, naanị enweghi isi nke ndụ na ọtụtụ ajọ ihe ka m na-ahụ, ma o doro m anya ugbu a na m pụrụ ịdị ndụ n’ime ụwa ọhụrụ bụ́ ebe Chineke ga-edozi ikpe na-ezighị ezi ndị a nile. Site n’enyemaka Chineke, apụrụ m iru eru ịnata ngọzi dị otú ahụ; otú a, ndụ m ghọrọ nke nwere ezi nzube.” Ka ọ na-abịa ná nzukọ nile nke Ndịàmà, ọ chọtara ezị ịhụnanya na nkwado nke mmetụta uche. (Jọn 13:34, 35) Ezi ndụmọdụ nke ndị okenye ọgbakọ nyekwaara ya aka ịmalite ịgbanwe echiche ya nke na-adịghị mma. (Jemes 5:14) Ịda mbà ya malitere ibelata. Ọtụtụ ìgwè ndị ọzọ bụ́ ndị, dị ka Marie, dara mbà n’obi n’ihi ọnọdụ ụwa dị iche iche enwetawo “ọṅụ Jehova” site n’ịbịaru ná mmazu nke eziokwu Bible.—Nehemaịa 8:10; 1 Timoti 2:4.
Ma, ịda mbà n’obi nke Marie ọ̀ kwụsịrị n’otu ntabị anya? Ànyị kwesịrị iche na ndị Kraịst apụghị ịda mbà n’obi? Iji zaa ajụjụ ndị a, anyị aghaghị ileba anya n’ụzọ miri emi n’ọrịa nke a nakwa ihe dị mgbagwoju anya ndị na-akpata ya. Ịmara ihe ndị ọ bụ ha na-akpata ịda mbà n’obi pụrụ ime ka i nwee ihe ịga nke ọma n’ibuso ya agha n’onwe gị ma ọ bụ n’inyere onye ọ na-enye nsogbu aka.
Ihe Ndị Na-akpata Oké Ịda Mbà
N’ọnọdụ ụfọdụ ihe ndị dị anyị n’ahụ́ pụrụ ịkpata ịda mbà n’obi, dị ka ọrịa, erighị nri ndị na-edozi ahụ́, na nsogbu nke mmiri ọgwụ ndị dị n’ahụ́. Ọ pụkwara ịbụ mmeghachị omume nke ahụ́ gị n’ebe nsí, ihe ndị dị n’ikuku na mmiri, ọgwụ, na ihe ndị ahụ́ gị na-achọghị, dị.a Otú ọ dị, Bible gosipụtara na “nchegbu” nke mmadụ pụkwara ịkpata ya.—Abụ Ọma 94:19.
Ihe ka ọtụtụ ná ndị daworo mbà n’obi, dị ka Marie, enwewo ahụmahụ ole na ole na-adịghị enye obi ụtọ bụ́ ndị dị mwute ma ọ bụ ọnọdụ na-akpasu iwe. Ọtụtụ na-enwe mmetụta dị ka onye ọbụ abụ ahụ nwere: “Afọ ihe ọjọọ dị iche iche ejuwo mkpụrụ obi m . . . Ha agbawo m gburugburu n’otu. I [Jehova] mewo ka onye na-ahụ m n’anya na enyi m nọọ m n’ebe dị anya, ndị m maara nke ọma ka ọchịchịrị bụ.” (Abụ Ọma 88:3, 17, 18) Ya mere dị ka onye ọbụ abụ ahụ, ha na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị nsogbu ma ọ bụ mfu rikpuworo, ha na-elekwa ndụ ha na-adị n’ozuzu ya anya dị ka nke na-enweghị olileanya. Ha pụrụ inwe mmetụta dị ka à ga-asị na ha nọ naanị ha n’ebe gbara ọchichịrị, na ọbụna Chineke achụpụwo ha.
Gịnị mere ha ji eru ná nkwubi okwu dị otụ́ ahụ nke na-adịghị enye agbamume, wee si otú ahụ na-enwe mmụọ e tigburu etigbu? Ọ bụghị nnọọ naanị n’ịhi nsogbu efu ndị ha nwere; ọ bụkwa n’ihi inwe mmetụta ndị dị ilu ma ọ bụ echiche na-ezighị ezi banyere onwe ha. Ha na-eche na ha apụghị idozi nsogbu ahụ ma ọ bụ mfu ahụ. “E ji ihe mwute nke obi tigbuo mmụọ mmadụ,” ka Ilu 15:13 kọwara. Ụdị mwute dị otú ahụ nke obi ga-agụnye inwe mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị uru ma ọ bụ iche na ndị ọzọ na-eche otú ahụ. Ọbụna onye Kraịst bụ Epafrọdaịtọs nke narị afọ mbụ, mgbe ahụ́ dịsịrị ya mma site n’oké ọrịa ọ rịara n’oge ọ gara njem nke ọgbakọ ọ nọ na ya dokwara, ghọrọ onye ‘obị lọrọ mmiri, n’ihi na [ọgbakọ ahụ] nụrụ na ahụ́ esighị ya ịke.’—Ndị Filipaị 2:25-30.
Ebe ọ bụ na ‘mmụọ nke e tigburu etigbu na-amịkpọ ọkpụkpụ,’ ma ọ bụ na-ewetu ùgwù mmadụ ala, mmetụta nke inwe ùgwù onwe onye dị ala na-abụkarị ịhe na-akpata oké ịda mbà n’obi. (Ilu 17:22) A pụkwara inwe mwute nke obi site n’anyị ichekasị onwe anyị banyere otú ndị ọzọ si ele anyị anya, banyere izu okè n’ihe nile, mkpasu iwe ndị a na-achịkwaghị achịkwa, iwe, esemokwu anyị na ndị ọzọ a na-edozighị edozi, ma ọ bụ ikpe ọmụma (nke mere eme ma ọ bụ gabịga ókè).
Ya mere ihe ndị na-akpata oké ịda mbà n’obi dị ọtụtụ. Ma, Marie nwetara ezi ọṅụ mgbe ọ ghọrọ onye Kraịst. “Mgbe ahụ enwere m olịleanya,” ka o kwuru. Ma ọ nagidekwara ịda mbà n’obi ruo oge ụfọdụ. Olee otú ndị dị otú ahụ pụrụ isi merie ya?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Lee “Inwe Nkụda Mmụọ: Ọ̀ Bụ n’Isi Ka Ha Nile Dị?” nke dị ná mbipụta nke Teta!, March 8, 1989.