Ọ̀ Bụ “Ntiwapụ Nke Udo”?
“NTIWAPỤ NKE UDO.” “Oo, Lee Nnọọ Ụwa Dị n’Ụdo Nke a Bụ.” “Udo Na-etiwapụ n’Ebe Nile.” Ndị a so n’isiokwu akwụkwọ akụkọ ndị bụworo ihe ịtụnanya nye ndị na-agụ akwụkwọ n’ime otu afọ ma ọ bụ abụọ gara aga. Gburugburu ụwa, mgbanwe e nwere n’akụkọ ndị a na-anụ site n’ịbụ akụkọ ndị na-akpata iru újú na enweghị olileanya gaa n’ịbụ ndị na-akpali olileanya, bụ ihe ịtụnanya. Ọ̀ bụ gịnị na-eme?
N’ụzọ pụtara nnọọ ìhè, n’oge na-adịghị anya gara aga, ọtụtụ mburịta agha ndị bụ isi bịaruchara ná njedebe ma ọ bụ belata n’ọ̀tụ̀tụ̀ ha n’ime nanị ọnwa ole na ole. N’Africa, Udo ‘tiwapụrụ’ n’Angola. N’Ebe Etiti Asia, mba Soviet Union chịpụrụ ndị agha ya n’Afghanistan. N’ebe Etiti kọntinenti America, ịlụ ọgụ kwụsịlatatụrụ n’etiti ndị gọọmenti Nicaragua na ndị nnupụisi nke òtù Contra. N’ebe Ọwuwa Anyanwụ nke Ndịda Asia, ndị Vietnam kweere ịhapụ Kampuchea. “Ntiwapụ nke udo” ahụ ruru ọbụna n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ mgbe agha ahụ nke a wụfuworo ọbara dị ukwuu na ya n’etiti Iran na Iraq mesịrị bịa ná njedebe.
Ma eleghị anya, nke kwesịrị ịrịba ama ọbụna karị bụ ọnọdụ ọhụrụ ahụ nke malitere ịdị n’etiti mba dike abụọ ahụ. Mgbe 40 afọ nke iburịta agha nzuzo gasịrị, ọ bụ ihe siri ike ikwere bụ mgbalị ndị ha na-eme iji dịghachi ná mma, okwu ndị ha na-ekwu banyere mmasị ndị ha abụọ nwekọrọ ọnụ, na mgbalị ndị a hụrụ anya iji weta udo n’etiti mba Soviet Union na United States. Karịsịa, dị ka akwụkwọ akụkọ The Economist si kwuo, ugbu a Europe akawo akara oge kasị dị ogologo ọ nọworo n’enweghị agha ọ bụla n’akụkọ ihe mere eme ya nile e dekọrọ edekọ. N’ezie, a na-anụ akụkọ udo n’ebe nile.
Gịnị ka ọ pụtara? Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị hà nọ nso iweta “udo nye oge anyị a”? N’iri afọ ise na otu gara aga, onye praịm minista Britain bụ Neville Chamberlain kwuru okwu ndị ahụ. Okwu ndị ahụ ghọrọ nnọọ ihe a na-atụghị anya ya n’ụzọ dị oké njọ mgbe agha ụwa nke abụọ tiwapụrụ n’oge na-adịghị anya mgbe o kwusịrị ha. Ugbu a, hà gaje imesị bụrụ eziokwu mgbe ogologo oge gasịworo?