Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 4/1 p. 26-29
  • ‘Efegoro m elu na nkù dị ka ugo’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Efegoro m elu na nkù dị ka ugo’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Wepụ Udo
  • Ịchọta Okwukwe n’Ebe Chineke Nọ
  • Mgbute Azụ Dị Ịtụnanya na Ime Baptism
  • Oge Ime Myọcha
  • Ịnagide Ule Ndị Ọzọ
  • Agha Ụwa nke Abụọ na Mgbe Ọ Gasịrị
  • 1923—Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Ihe Ùgwù nke Ikere Òkè n’Ọrụ Mgbasawanye Ihe Ka Agha Gasịrị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Onye Jehova Ziri Ihe Site na Nwata
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Inye Jehova Ihe Ruuru Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 4/1 p. 26-29

‘Efegoro m elu na nkù dị ka ugo’

Dị ka Ingeborg Berg si kọọ

A MỤRỤ m n’ihe kariri otu nari afọ gara aga, na June 5, 1889, n’ebe dị nso ụlọ Fredensborg Castle, nke dịtụ n’ebe ugwu nke Copenhagen. Mgbe ezinụlọ eze Denmark nwere ndị ọbịa, nke na-agụnye ndị eze na ndị ọchịchị si mba dị iche iche nke Europe, a na-akpọ ụmụ agbọghọ ndị sitere n’ezinụlọ ndị nnukwu mmadụ bi na Fredensborg ka ha bịa nye aka n’ilekọta ihe oriri na ije ozi di iche iche. Dị ka nwa agbọghọ nta, a na-akpọkari m na-eje, na-ekwerekwa ka m na-egwughari egwu, na-agbagharikwa n’ime ụlọ ukwu ahụ.

Ndị m na-echetakarị nke ọma bụ onyeeze bụ Czar Nicholas nke Abụọ onye Russia na ezinụlọ ya. Onyenche ya na-eguzo n’ọnụ ụzọ nke ụlọ ebe ọ na-ehi ụra, bụ́ onyeagha cossack nke mipụtara mma agha ya amipụta. Ndị cossack na-enwekarị mmasị n’ebe ụmụntakịrị nọ, n’otu mgbe, otu n’ime ha nwakwara ịmakụ m. N’ịbụ onye e yiri egwu, karịsịa n’ihi nnukwute afụ ọnụ ya, agbara m ọsọ gabiga ogologo paseji nile nke ụlọ ukwu ahụ.

N’otu mgbe, Czar Nicholas nke Abụo, Eze Wilhelm nke Abụọ onye Germany, na diọkpara Eze Nwanyị Victoria, onye mesiri ghọọ Eze Edward nke Asaa nke England, bịara ileta eze Denmark bụ Christian nke Itoolu. Mgbe ha na-akpaghari n’okporo ụzọ nile nke Fredensborg, jiri obi ọma na-akpanyere ndị mmadụ ụka, Czar Nicholas bitụrụ m aka n’isi mgbe m piajiri ikpere m wee hulata n’ihu ya. Oge ahụ bụ oge udo, ndị isi ala di iche iche adịghi atụkwa egwu maka nchebe ha dị ka ha na-eme taa.

E Wepụ Udo

Na 1912, amalitere m ịrụ ọrụ dị ka onye nọọsụ na South Jutland, na-ejere ndị ahụ na-akwado ndị Denmark ozi, bụ́ ndị bi n’akụkụ Germany nke ókèala ahụ. South Jutland anọwo n’okpuru ọchịchị ndị Germany kemgbe agha ahụ a lụrụ na 1864 n’etiti Denmark na Prussia. Enyeere m ndị nne mụrụ ụmụ ọhụrụ aka, wee matakwa ọtụtụ n’ime ndị a malitere inwe ezinụlọ ọhụrụ nke ọma.

Na 1914, mụ na otu onyenche ókèala bụ onye Denmark lụrụ di na nwunye, anyị wee jee biri n’akụkụ Denmark nke ókèala ahụ. N’oge na-adịghị anya mgbe nke a gasịrị, agha tiwapụrụ. E mesịrị kpọọ ya Agha Ukwu ahụ, mesịakwa, Agha Ụwa nke Mbụ. N’otu ụtụtụ, a gbatịrị barbed wire n’ogologo ókèala ahụ, na-egbochị onye ọ bụla inwere onwe ya ịgafe ya. Udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ahụ anyị nwere tupu mgbe ahụ adịghịkwa ọzọ.

Oké egwu na enweghị uche nke agha ahụ rutere anyị nnọọ nso mgbe anyị nụrụ na a na-akpọzi ụmụ okorobịa ndị ahụ malitere inwe ezinụlọ ọhụrụ, bụ́ ndị nọ n’ezinụlọ ndị ahụ m na-eje eleta dị ka onye nọosụ, maka ije agha. Ha nile, e wezụgakwa otu, nwurụ n’Ọgbọ Agha nke Ebe Ọdịda Anyanwụ nke dị na Marne! Ọ bụ ihe dị oké njọ iche echiche banyere ụmụ agbọghọ ndị ahụ di ha nwụrụ, ịta ahụhụ nke ịbụ ndị na-enwekwaghị di, na ụmụntakịrị ahụ ịbụ ndị na-enwekwaghị nna. Olee otú ụmụ agbọghọ ndị a ga-esi lekọta ubi ha? “Olee ebe Chineke nọ?” ka m jụrụ.

N’oge agha ahụ, ọnọdụ dị n’ókèala ahụ na-esikarị ike mgbe mgbe ka ndị na-agba ọsọ ndụ na-anwa ịgabiga. E kenyere m ọrụ inyocha ngwongwo na akpa nke ụmụ nwanyị ndị ahụ a na-eche na ha na-ebufe ihe na nzuzo. Ọ na-abụkarị ihe oriri ka ha na-anwa iji gafee, ana m elefurukarịkwa nke a anya wee kwere ka ha gafee. Agha ahụ gwusịrị na 1918, na 1920, e mere ka South Jutland na Denmark dịghachikwa n’otu.

Ịchọta Okwukwe n’Ebe Chineke Nọ

Ọ bụ ezie na okwukwe m nwere n’ebe Chineke nọ adawo mbà n’ihi ikpe na-ezighị ezi nile m hụrụ, aka m nọ na-achọ ihe bụ nzube nke ndụ. Mụ na di m, bụ́ Alfred na-eje chọọchị mgbe nile, ma a zaghị ajụjụ anyị nile.

Na 1923, anyị kwafere n’otu obodo nta ebe a na-akụ ọkụ azụ nke dị na Flensburg Fjord, Alfred malitekwara ịrụ ọrụ dị ka onye na-akụ ọkụ azụ. N’oge na-adịghị anya, anyị na otu ezinụlọ bụ ndị okpukpe Baptist matara onwe anyị. Ọ bụ ezie na anyị bụ ndị okpukpe Lutheran, otu ụbọchị anyị nakweere ọkpụkpọ òkù ha ịbịa gee ntị n’okwu dabeere na Bible n’ụlọ Ferry Inn dị na Egernsund. Tupu anyị ejee, egbunyere m ikpere n’ala wee kpee ekpere, sị: “Ọ bụrụ na e nwere Chineke dịnụ, biko, nụrụ ekpere m!”

Okwu ahụ bụ banyere nwanyị ahụ nọ n’olulu mmiri dị na Saịka, o nyekwara m ọchịchọ ịgụ Bible. Dị ka ihe si na nke a pụta, aghọrọ m, dị ka a pụrụ ikwu ya, mmadụ ọhụrụ! Edejeere m nne m akwụkwọ, sị: “Ị nọgidewo na-ekwu na m kwesịrị ịgbanwe bịa n’ebe Chineke nọ. Echere m na nke ahụ emewo ugbu a; egwu na-atụ m ịgwa gị kemgbe n’ihi na echere m na ọṅụ ahụ nke m nwere ga-efunarị m. Ma o na-anọgide!”

Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, na 1927, achọtara m otu akwukwọ nta isiokwu ya bụ Freedom for the Peoples n’ùkó ụlọ anyị. Ọ dọọrọ mmasị m, emikpukwara m onwe m n’ịgụ ya nke ukwuu nke na echefuru m oge na ebe m nọ. Ọ bụ nanị mgbe ụmụntakịrị m si ụlọ akwụkwọ lọta wee chcọ iri nri ka m dọpụtara onwe m site n’ịgụ ya.

Mgbe Alfred lọtara n’uhuruchi ụbọchị ahụ, eji m oké ịnụ ọkụ n’obi gwa ya ihe m gụtara. Agwara m ya na ọ bụrụ na ihe akwukwọ ahụ kwuru bụ eziokwu, mgbe ahụ, chọọchị ahụ abụghị ụlọ nke Chineke, na anyị kwesịkwara ide akwukwọ iji gosi na anyị esokwaghị ha ma hapụ ha ozugbo. Alfred chere na nke a bụ imebiga ihe ngwa ngwa ókè, o kwukwara otú ahụ. Ma anyị kwekọrịtara idere alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Copenhagen akwukwọ wee rịo ka ha zitekwuoro anyị akwụkwo ndị ọzọ.

Ná nzaghachi nye arịrịọ anyị, e dunyere otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, bụ Christian Romer, ịbịa leta anyị. Anyị nyere ya ọnụ ụlọ nke ụmụntakịrị ahụ, wee tinye àkwà ụmụtakịrị ahụ n’ùkó ụlọ anyị. N’ụtụtụ na n’ehihie, Nwanna Romer na-apụ ije mee nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, n’uhuruchi ọ bụla ọ na-eduzikwara anyị ọmụmụ ihe. Ọ nọrọ ụbọchị anọ, anyị nwekwara obi ụtọ nke ukwuu n’ọnụnọ ya. Mgbe ọ lara, agwakwara m Alfred okwu ọzọ banyere anyị ịhapụ chọọchị ahụ. N’oge a, o ji ịnụ ọkụ n’obi kwere.

Ya mere, Alfred ji akwụkwọ anyị ji ekwu na anyị esokwaghị ha jekwuru onye ụkọchukwu ahụ. Onye ụkọchukwu ahụ chere na Alfred bịara n’ihi na ọ kpọtara nwa a ga-eme baptism. Otú ọ dị, mgbe ọ matara ihe Alfred ji bịa, o pụghị ikwere na nke a bụ eziokwu. “Ọ̀ bụ gịnị dị njọ na chọọchị a?” ka ọ chọro ịmata. Alfred kpọtụrụ uche n’ozizi ndị dị ka Atọ n’Ime Otu, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, na ịta ahụhụ ebighị ebi. “Bible adịghị ezi ihe ndị a,” ka Alfred kwuru. Mgbe onye ụkọchukwu ahụ nyere azịza na-erijughị afo wee sị ka ọ ghara ịgwa ndị ọzọ okwu banyere nke a, bụ ndị pụrụ ichere onwe ha echiche, Alfred kwusiri ike, sị: “Anyị chọrọ ịhapụ chọọchị a!”

Mgbute Azụ Dị Ịtụnanya na Ime Baptism

A gaje inwe otu mgbakọ na Copenhagen, ma anyị enweghị ego ga-ezuru anyị ịji gaa njem ahụ. Ekpekuru m Chineke ekpere ka o gosi anyị ụzọ anyị ga-esị jee n’ebe ahụ, ebe ọ bụ na anyị chọrọ ime baptism. N’oge na-adịghị anya tupu mgbakọ ahụ, Alfred jị ụgbọ epeepe ya pụọ jee igbute azụ ná mmiri nta ahụ. O gbutere ọtụtụ azụ nke na ụgbọ ahụ jupụtara n’ọnụ, anyị wee nwee ego ga-ezuru anyị ịkwụ ụgwọ maka njem ahụ. Nke a tụrụ ndị na-akụ ọkụ azụ n’ógbè ahụ n’anya, ebe ọ bụ na e gbuteghị azụ hiri nne n’afọ ahụ ná mmiri nta ahụ. N’eziokwu, mgbe ihe karịrị 50 afọ gasịrị, ndị na-akụ ọkụ azụ n’ógbè ahụ ka na-ekwukwa okwu banyere “ọrụ ebube ahụ.” Anyị kpọrọ ya mgbute azụ nke Pita. Ya mere, n’August 28, 1928, anyị mere baptism.

Baptism ahụ dị iche n’ụzọ e si eme baptism taa. Ọdọ mmiri baptism dị n’azụ otu ákwà mgbochị. Mgbe e meghere ákwà mgbochị ahụ, Nwanna Christian, Jensen nọ n’ebe ahụ, dịrị njikere imikpu ndị mmadụ ná mmịrị. O yi kootu nwere ọdụ ogologo, na-eguzo n’etiti ọdọ mmiri ahụ nke mmiri dị na ya ruru ya n’ụ́kwù. Anyị, bụ́ ndị na-achọ ime baptism yi uwe ogologo dị ọcha. E bu ụzọ mee ndị nwoke baptism, e mesịa mee ndị nwanyị.

N’oge mgbakọ ahụ e mere na Copenhagen, anyị nọrọ n’ụlọ ndị mụrụ m. Mgbe m lọtara n’uhuruchi ụbọchị ahụ, nna m jụrụ m ebe anyị jere.

“Anyị jere nzukọ,” ka m sịrị.

“Gịnị mere n’ebe ahụ?”

“Anyị mere baptism,” ka m zara.

“Ị̀ sị na unu mere baptism?” ka o tiri mkpu kwuo. “Baptism e mere gị mgbe ị bụ nwata ó zughị ezu?”

“Ee e, Papa,” ka m zaghachiri. Mgbe ahụ, ọ mara m nnukwute ụra ná ntị, na-eti mkpu, sị: “Aga m eme gị baptism!”

Adị m 39 afọ, bụrụkwa nne nke ụmụ ise mgbe m si otú a nata ụra ikpeazụ nna m mara m, onye bụbu nnọọ ezi mmadụ nke nwere obi ọma. O kwuteghị okwu ihe a merenụ ọzọ. Ọ dabakwara nke ọma na Alfred alọtabeghị mgbe ihe a mere, ọ bụkwa nanị mgbe ọtụtụ afọ gasịrị ka m kọọrọ ya ihe merenụ.

Oge Ime Myọcha

Mgbe anyị laruru n’ụlọ anyị, ejere m leta otu onye nke m nọworo na-ele anya dị ka nwanna nwanyị, jirikwa ịnụ ọkụ n’obi kọọrọ ya banyere mgbakọ ahụ na baptism anyị mere. Ọ nọrọ nnọọ nwayọọ, wee sị: “Ewoo, ewoo, Nwanna nwanyị Berg. Ị ghaghị ịkwụsị ikwere ihe a. N’oge na-adịghị anya, otu nwanna si Flensburg ga-abịa, wee kọwaara anyị nke bụ eziokwụ.”

Nke a riri m ọnụ. O siiri m nnọọ ike ịgbara ígwè laghachi n’ụlọ m. Otu mgbịrịgba chọọchị dị nso nọ na-akụ, mgbe ọ bụla ọ kụkwara, o yiri m ka à ga-asị na ihe m nọ na-anụ bụ “ọnwụ, ọnwụ” ná ntị m. N’ime obi m, ebekuru m Jehova ákwá maka enyemaka, mgbe ahụ okwu ndị dị n’Abụ Ọma 32:8, 9 batakwara n’uche m: “M ga-eme ka i nwee uche, m ga-ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ịje n’ime ya: m ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ. Unu adịla ka ịnyịnya, ma ọ bụ dị ka ịnyịnya mule, nke ọ dịghị nghọta ha nwere: a ga-ejikwa bit na bridle, dị ka ihe ekike, ijide ha, ma emeghị otú a, ha agaghị abịaru nso gị.”

Mgbe m lọruru, eweere m Bible m wee gụọ Ekpere Onyenwe Anyị. Nke a mesiri m obi ike. Ilu ahụ banyere pearl ahụ dị oké ọnụ ahịa batara n’uche m. (Matiu 13:45, 46) Alaeze ahụ yiri pearl ahụ. Achọrọ m inye ihe nile m nwere iji nweta Alaeze ahụ. Echiche ndị a bụụrụ m ihe nkasi obi. E nwekwara ngọzi ndị ọzọ dịnụ.

Na 1930, a malitere ibipụta magazin ahụ bụ The Golden Age (nke a na-akpọ Teta! ugbu a) n’asụsụ Danish n’okpuru aha ahụ bụ The New World (Ụwa Ọhụrụ Ahụ). N’afọ na-eso ya, anyị, bụ́ Ndị Mmụta Bible nwere obi ụtọ ịnata aha ọhụrụ ahụ bụ Ndịàmà Jehova. N’oge ahụ, e nwere nanị mmadụ ole na ole n’ógbè anyị, sitekwa n’oge ruo n’oge, a na-enwe nzukọ dị iche iche n’ụlọ anyị. Ebe ọ bụ na okporo ụzọ anyị bi na ya nwere aha ahụ bụ The Staircase, a na-akpọ anyị Ọgbakọ The Staircase.

Ịnagide Ule Ndị Ọzọ

Na 1934, arịara m nnukwute ọrịa nke a wara m ahụ na ya, nke mere na ahụ kpọnwụrụ m. Edinara m n’àkwà ruo afọ abụọ na ọkara, ndị dọkịta ahụ kwukwara na m ga-anọgide n’oche ndị ngwụrọ n’oge ndụ m nile. Ọ bụụrụ m oge sirị ike nke ukwuu, ma ezịnụlọ m bụụrụ m ihe enyemaka dị ebube.

Alfred zụtaara m Bible nke nwere mkpụrụ akwukwọ okpotokpo, nwa anyị nwoke nke nta rụtakwara ebe a ga na-edokwasị ya nke mere na apụrụ m idina ala n’àkwà wee na-agụ ya. Ma achọkwara m ikwusa ozi ọma. Ya mere, Alfred debere otu ihe odide n’akụkụ ụzọ, bụ́ nke na-akpọsa magazin ndị ọhụrụ. Ndị nwere mmasị na-abata ịhụ m, m na-agwakwa ha okwu. Mmetụta nke ihe odide a bụ na ndị mmadụ bị n’ógbè ahụ na-akpọ ezinụlọ anyị Ụwa Ọhụrụ Ahụ.

Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị jiri ohere ọ bụla mee ihe ịbịa leta m. Otú a, amatara m ụmụnna ndị a tozuru okè, ndị nwewokwara ahụmahụ nke ọma, ha gbakwara m ume nke ukwuu. Ozọkwa, ejịrị m oge ahụ mee ihe ịmụ Bible, ihe ọmụma m na-enweta kwadokwara m. Enwere m mmetụta nke dị ka à ga-asị na ‘efegoro m elu na nkù dị ka ugo.’—Aịsaịa 40:31.

Mgbe a matara ndị bụ “oké ìgwè mmadụ” ahụ nke ọma na 1935, ihe ka ọtụtụ n’ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị bi n’ógbè anyị, gụnyere dịọkpara na ada anyị, kwụsịrị ikere ọ̀kè n’achịcha na mmanya ahụ n’oge Ememe Ncheta. Otú ọ dị, ole na ole n’ime anyị enweghị obi abụọ ọ bụla banyere ọkpụkpọ eluigwe anyị. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, anyị nwekwara obi ụtọ banyere nghọta ọhụrụ anyị nwere banyere nzube dị ebube nke Jehova n’ihe metụtara oké ìgwè mmadụ ahụ na nkwụghachi ụgwọ ha nke ndụ ebighị ebi n’elu ala.—Mkpughe 7:9; Abụ Ọma 37:29.

Nke nta nke nta, ahụ siwanyere m ike, nke bụ ihe dị iche n’ihe ndị dọkịta ndị ahụ tụrụ anya ya, enwekwara m ike ikere òkè zuru ezu n’ọrụ ahụ dị mkpa nke ikwusa ozi ọma na izi ihe.

Agha Ụwa nke Abụọ na Mgbe Ọ Gasịrị

N’akụkụ nke ọzọ nke osimiri nta ahụ, anyị pụrụ ịhụ Germany, anyị malitekwara inwe mmetụta nke ike ndị Nazị. Ụfọdụ n’ime ndị agbata obi anyị ghọrọ ndị Nazị, ha yikwara anyị egwu, sị: “Cherenụ ka Hitler bịa. Mgbe ahụ unu ga-ejedebe n’otu ogige ịta ahụhụ ma ọ bụ n’otu agwaetiti ihe ọ bụla na-adịghị na ya!”

Anyị chere na ọ bụ ihe kasị mma anyị ịkwapụ n’ebe ahụ. Ndị ụfọdụ bụ ndị enyi anyị nyeere anyị aka ịnweta ụlọ na Sonderborg, bụ́ otu obodo katụ ibu nke na-adịghị anya site n’ebe ahụ. Agha Ụwa nke Abụọ malitere na September 1939; anyị kwapụrụ na March 1940; n’April 9, usuu ndị agha Germany wabatara na Denmark. Ma n’ụzọ dị ịtụnanya, Ndịàmà Jehova nọ na Denmark adọrọghị mmasị ndị Germany.

Mgbe nrọ Hitler nke inwe mmeri mesịrị dakpọọ, anọ m na-eduziri ọtụtụ ndị Germany na-enwetaghị ihe ha tụrụ anya ya, bụ ndị bị na Sonderborg, ọmụmụ Bible. Lee nnọọ ihe ọṅụ ọ bụ, ọ bụghị nanị ịhụ ka ọtụtụ n’ime ndị mmụta Bible ndị a raara ndụ ha nye Jehova, kamakwa ịnwe ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụ m na ụmụ ụmụ m ịbụ ndị na-arụsi ọrụ ike n’ozi ndị Kraịst!

Di m nwụrụ na 1962, otu nwa nwa m nwụrụ na 1981, ada m nwanyị nwụkwara na 1984. Ịrụsi ọrụ ike n’ozi Jehova bụ ihe nyeere m aka n’oge ịru újú ndị a nile.

Ọ bụwo ihe dị ebube ịhụ ọganihu nke ọrụ Alaeze ahụ na Denmark site n’oge ahụ m malitere na 1928. Mgbe ahụ, anyị nwere nanị ihe dị ka 300 ndị nkwusa, ma ugbu a, anyị nwere ihe karịrị 16,000! Enwere m obi ekele na m ka nwere ike ịrụsi ọrụ ike n’ozi ahụ mgbe m dị otu narị afọ. N’ezie, enwetawo m ahụmahụ nke mmezu nke okwu ndị ahụ dị n’Aịsaịa 40:31: “Ma ndị na-ele anya Jehova ga-agbanwe ike ha; ha ga-efego elu na nkù dị ka ugo; ha ga-agba ọsọ, ike agaghị agwụkwa ha; ha ga-eje ije, ghara ịda mba.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya