Inye Jehova Ihe Ruuru Ya
DỊ KA TIMOLEON VASILIOU SI KỌỌ
E jidere m n’ihi ịkụzi Bible n’obodo nta bụ́ Aidhonochori. Ndị uwe ojii yipụrụ akpụkpọ ụkwụ m ma malite iti m ihe n’ọbọ ụkwụ. Ka ha nọgidere na-eti m ihe ahụ, ụkwụ m kụnwụrụ, ihe ha na-eti m afụghịzikwa m ụfụ. Tupu m kọwaa ihe dugara ná mmeso ọjọọ a, bụ́ nke a na-ahụkarị na Gris n’oge ahụ, ka m kọọ otú m si ghọọ onye na-akụzi Bible.
N’OGE na-adịghị anya mgbe a mụsịrị m na 1921, ezinụlọ anyị kwagara n’obodo Rodholívos, n’ebe ugwu Gris. N’oge m bụ onye ntorobịa, ebiri m ndụ isi ike. Mgbe m dị afọ 11, amalitere m ise siga. E mesịa, aghọrọ m onye aṅụrụma na onye na-agba chaa chaa, ana m agakwa oriri ndị a na-achịkwaghị achịkwa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ abalị nile. Enwere m nkà egwú, ya mere esonyeere m otu òtù egwú n’ógbè anyị. N’ihe dị ka otu afọ, apụrụ m ịkụ ihe ka ọtụtụ ná ngwá egwú nke òtù egwú ahụ. Ma, n’otu oge ahụ, ana m amụsi ihe ike, hụkwa ikpe ziri ezi n’anya.
Ná mmalite afọ 1940, ka Agha Ụwa nke Abụọ nọ na-akpọtụ, a kpọrọ òtù egwú anyị òkù ịbịa tie egwú n’olili nke otu nwatakịrị nwanyị. Ndị ikwu na ndị enyi ya ji oké iru újú na-akwa ákwá n’akụkụ ili ahụ. Oké enweghị olileanya ha metụrụ m n’ahụ n’ụzọ miri emi. Amalitere m iche, sị, ‘Gịnị mere anyị ji anwụ anwụ? Ọ̀ dị ihe ọzọ dị ná ndụ karịa anyị ịdị ndụ nwa mkpirikpi oge? Olee ebe m pụrụ inweta azịza ha?’
Ụbọchị ole na ole mgbe e mesịrị, ahụrụ m otu Agba Ọhụrụ na shelf dị n’ụlọ m. Eweturu m ya ma malite ịgụ ya. Mgbe m gụrụ okwu Jisọs dị na Matiu 24:7 banyere ịlụ agha n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu ịbụ akụkụ nke ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya, o doro m anya na okwu ya aghaghị ịbụ maka oge anyị. N’izu ndị sochirinụ, agụrụ m Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst a ọtụtụ ugboro.
Mgbe e mesịrị, na December 1940, eletara m otu ezinụlọ bidewere anyị nso—otu nwanyị di ya nwụrụ na ụmụ ya ise. N’ime ọtụtụ akwụkwọ a kwajuru n’uko ha, ahụrụ m otu nke aha ya bụ A Desirable Government, nke Watch Tower Bible and Tract Society bipụtara. Anọ m n’uko ụlọ ebe ahụ gụchapụ akwụkwọ nta ahụ. Ekwenyesiri m ike site n’ihe m gụrụ na anyị na-ebi n’ezie n’ihe Bible na-akpọ “mgbe ikpeazụ” nakwa na Jehova Chineke ga-eweta usoro ihe a ná njedebe n’oge na-adịghị anya ma were ụwa ọhụrụ nke ezi omume dochie ya.—2 Timoti 3:1-5; 2 Pita 3:13.
Ihe masịrị m karịsịa bụ ihe àmà ahụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ na ndị kwesịrị ntụkwasị obi ga-adị ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs elu ala nakwa na nhụjuanya na ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ n’ụwa ọhụrụ ahụ Alaeze Chineke ga-achị. (Abụ Ọma 37:9-11, 29; Mkpughe 21:3, 4) Ka m na-agụ ya, ekelere m Chineke n’ekpere maka ihe ndị a, arịọkwara m ya ka o gosi m ihe ndị ọ chọrọ. Ọ bịara doo m anya na Jehova Chineke chọrọ ofufe m sitere ná mkpụrụ obi dum.—Matiu 22:37.
Ime Ihe M Mụtara
Site n’oge ahụ gaa n’ihu, akwụsịrị m ise siga, kwụsị aṅụrụma, kwụsịkwa ịgba chaa chaa. Akpọkọtara m ụmụ ise nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ na ụmụnne m ndị nwanyị abụọ na otu nwoke bụ́ ndị m tọrọ, akọwakwaara m ha ihe m mụtaworo site n’akwụkwọ nta ahụ. N’oge na-adịghị anya anyị nile malitere ikwusa ntakịrị nke anyị maara. A bịara mara anyị n’ógbè ahụ dị ka Ndịàmà Jehova, ọ bụ ezie na anyị ezutebeghị Ndịàmà ọ bụla. Site nnọọ ná mmalite, etinyere m ihe karịrị otu narị awa kwa ọnwa n’ịgwa ndị ọzọ ihe ndị dị ebube m mụtaworo.
Otu n’ime ndị ụkọchukwu nke chọọchị Ọtọdọks nke Gris gakwuuru onyeisi obodo iji mee mkpesa banyere anyị. Ma anyị amaghị na n’ụbọchị ole na ole ndị bu ụzọ, otu Onyeàmà na-eto eto hụrụ otu ịnyịnya furu efu ma kpụgara ya ndị nwe ya. N’ihi ịkwụwa aka ọtọ dị otú ahụ, onyeisi obodo ahụ na-akwanyere Ndịàmà ùgwù, ọ jụkwara ige ụkọchukwu ahụ ntị.
Otu ụbọchị n’ihe dị ka October 1941, mgbe m na-agba àmà n’ọmà ahịa, otu onye kwuru banyere Onyeàmà Jehova nke bi n’obodo dị nso. Ọ bụbu onye uwe ojii nke aha ya bụ Christos Triantafillou. Agara m ịhụ ya ma mata na ọ bụwo Onyeàmà kemgbe 1932. Lee obi ụtọ m nwere mgbe o nyere m ọtụtụ akwụkwọ ndị katụ ochie nke Watch Tower bipụtara! Ha nyeere m aka n’ezie inwe ọganihu ime mmụọ.
Na 1943, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Chineke site na baptism ime mmiri. N’oge ahụ, m na-eduzi ọmụmụ Bible n’obodo nta atọ dị nso—Dhravískos, Palaeokomi, na Mavrolofos. Eji m akwụkwọ bụ́ The Harp of God mee ihe dị ka akwụkwọ ọmụmụ Bible anyị. N’ikpeazụ, enwere m ihe ùgwù nke ịhụ ka e guzobere ọgbakọ anọ nke Ndịàmà Jehova n’ógbè a.
Ime Nkwusa n’Agbanyeghị Ihe Mgbochi
Na 1944, ndị Germany si n’ebe ha bichiri na Gris pụọ, oge ụfọdụ mgbe e mesịkwara, anyị malitere iso alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society dị n’Atens na-enwe nkwurịta okwu. Alaka ụlọ ọrụ ahụ kpọrọ m òkù ikere òkè n’ime nkwusa n’ókèala ebe ọ na-adịbeghị onye ọ bụla nụrụ ozi Alaeze ahụ. Mgbe m kwagasịrị n’ebe ahụ, arụrụ m ọrụ n’ugbo ruo ọnwa atọ ma tinyezie oge ndị fọdụrụnụ n’afọ ahụ n’ozi.
N’afọ ahụ, enwetara m ngọzi nke ịhụ ka e mere nne m baptism, nakwa nwanyị ahụ di ya nwụrụ na ụmụ ya, ma e wezụga nwa ya nwanyị nke kasị obere, bụ́ Marianthi, bụ́ onye e mere baptism na 1943, ya aghọọkwa nwunye m m hụrụ n’anya na November nke afọ ahụ. Afọ 30 mgbe e mesịrị, na 1974, nna m ghọkwara Onyeàmà e mere baptism.
Ná mmalite nke 1945, anyị nwetara Ụlọ Nche mbụ nke e ji ígwè mimeograph wepụta site n’alaka ụlọ ọrụ ahụ. Isiokwu bụ́ isi e dere na ya bụ “Gaanụ, Mee Mba Nile Ndị Na-eso Ụzọ.” (Matiu 28:19, The Emphatic Diaglott) Mụ na Marianthi hapụrụ ebe obibi anyị ozugbo iji rụọ ọrụ n’ókèala ndị dị anya n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Strymon. Ndịàmà ọzọ mesịrị sonyere anyị.
Anyị na-agba ụkwụ ọtọ aga ije mgbe mgbe iji ruo otu obodo nta, na-aga ọtụtụ kilomita gafee ọtụtụ ndagwurugwu na ugwu. Anyị mere nke a iji chekwaa akpụkpọ ụkwụ anyị n’ihi na ha mebie, anyị enweghị ọzọ iji dochie ha. Site n’afọ 1946 ruo 1949, agha obodo nọ na-akpọtụ na Gris, ọ dịkwa nnọọ ize ndụ ime njem. Ọ bụghị ihe a na-adịghị ahụkebe bụ́ ịhụ ka ozu tọgbọcha n’okporo ụzọ.
Kama ịbụ ndị ihe isi ike ndị ahụ kụdara aka, anyị nọgidere jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi. Ọtụtụ ugboro enwere m mmetụta nke ọbụ abụ ahụ bụ́ onye dere, sị: “Ọzọ, a sị na ejee m ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwụ, m gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọ bụla; n’ihi na Gị onwe gị nọnyeere m: ndele Gị na mkpanaka Gị, ha onwe ha na-akasi m obi.” (Abụ Ọma 23:4) N’oge a, anyị na-anọkarị ebe ọzọ ruo ọtụtụ izu, mgbe ụfọdụ kwa, ana m etinye awa 250 kwa ọnwa n’ozi.
Ozi Anyị n’Aidhonochori
Otu n’ime obodo nta ndị anyị letara na 1946 bụ Aidhonochori, nke dị n’elu elu otu ugwu. N’ebe ahụ, anyị zutere otu nwoke bụ́ onye gwara anyị na e nwere ndị ikom abụọ nọ n’obodo nta ahụ bụ́ ndị chọrọ ịnụ ozi Bible. Otú ọ dị, n’ihi ịtụ ndị agbata obi ya egwu, nwoke ahụ achọghị ịkpọga anyị n’ebe ha nọ. Otú ọ dị, anyị chọtara ebe obibi ha, ha nabatakwara anyị nke ọma. N’ezie, mgbe minit ole na ole gasịrị, ndị mmadụ jupụtara na palọ ha! Ha bụ ndị ikwu ma ọ bụ ndị enyi ha. O juru m nnọọ anya ịhụ na ha nọdụrụ ala ma gee anyị ntị nke ọma. N’oge na-adịghị anya anyị nụrụ na ha ejiwo ọchịchọ dị ukwuu na-echere mgbe ha ga-ezute Ndịàmà Jehova, ma n’oge ndị Germany bichiri obodo ha, e nweghị Onyeàmà ọ bụla nọ n’ógbè ahụ. Gịnị kpaliworo mmasị ha?
Ndị isi ezinụlọ abụọ ahụ abụwo ndị a ma ama n’òtù ọchịchị Kọmunist dị n’ógbè ahụ, ha enyewokwa ndị mmadụ echiche nke ọchịchị Kọmunist. Ma mgbe e mesịrị, ha hụrụ otu akwụkwọ bụ́ Government, nke Watch Tower Society bipụtara. Site n’ịgụ ya, ha kwenyesiri ike na nanị olileanya e nwere maka ọchịchị zuru okè nke ezi omume bụ Alaeze Chineke.
Anyị nọgidere ọdụ na-agwa ndị ikom a na ndị enyi ha okwu ruo etiti abalị. Ha nwere nnọọ afọ ojuju n’azịza ndị dabeere na Bible e nyere ajụjụ ha. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, ndị òtù Kọmunist nọ n’obodo nta ahụ gbara izu igbu m n’ihi na ha lere m anya dị ka onye tọghatara ndị bụbu ndị ndú ha. Ọ dabara na n’ime ndị nọ ya n’abalị mbụ ahụ bụ nwoke ahụ gwara m banyere ndị ahụ nwere mmasị n’obodo nta ahụ. N’ikpeazụ, o nwere ọganihu n’ihe ọmụma Bible, bụrụ onye e mere baptism, ma mesịa ghọọ onye Kraịst bụ́ okenye.
Mkpagbu Obi Ọjọọ
N’oge na-adịghị anya anyị zutesịrị ndị a bụbu ndị òtù Kọmunist, ndị uwe ojii abụọ mabatara n’otu ụlọ ebe anyị nọ na-enwe nzukọ. Ha jidere anyị anọ site n’ịtụdo anyị egbe ma kpụrụ anyị gaa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. N’ebe ahụ, onye uwe ojii nọ n’ọkwá lieutenant, bụ́ onye ya na ụkọchukwu Ọtọdọks nke Gris na-enwe mmekọrịta chiri anya, gwakasịrị anyị okwu ahụ. N’ikpeazụ, ọ jụrụ, sị, “Gịnị ka m gaje ime unu?”
“Ka anyị kụpụ ha mkpụrụ ọkwụrụ n’anya!” ka ndị uwe ojii ndị ọzọ guzo anyị n’azụ tipụrụ n’otu mgbe.
N’oge ahụ chi ejimiela. Ndị uwe ojii ahụ kpọchiri anyị n’ọnụ ụlọ nke dị n’okpuru ala ma gaa n’ụlọ mmanya dị n’ọnụ ụzọ nke ọzọ. Mgbe ha ṅụjuchara isi, ha bịaghachiri ma kpọrọ m gaa n’ọnụ ụlọ nke dị n’elu.
N’ịhụ ọnọdụ ha nọ na ya, aghọtara m na ha nwere ike igbu m mgbe ọ bụla. Ya mere ekpegaara m Chineke ekpere ka o nye m ume iji die ahụhụ ọ bụla m nwere ike ịta. Ha weere mkpọ ma malite iti m ihe n’ọbọ ụkwụ, dị ka m kọrọ ná mmalite. Mgbe nke ahụ gasịrị, ha tiri m ihe n’ahụ nile, e mesịa ha kpụghachikwara m n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’okpuru ala. Mgbe nke ahụ gasịrị, ha kpọpụtara onye ọzọ ma malite iti ya ihe.
Ka ọ dịgodị, eji m ohere ahụ kwadebe Ndịàmà abụọ ndị ọzọ na-eto eto iji nagide ule dị n’ihu. Ma ndị uwe ojii ahụ họọrọ ịkpọgotaghachi m n’ụlọ nke dị n’elu. Ha yipụrụ uwe m, ha ise tikwara m ihe ruo ihe dị ka otu awa, jiri buutu ndị agha ha na-azọ m n’isi. E mesịa, ha kwadara m na stepụ, bụ́ ebe m tọgbọrọ n’amaghị onwe m ruo awa 12.
Mgbe a tọhapụrụ anyị n’ikpeazụ, otu ezinụlọ dị n’obodo nta ahụ kpọbatara anyị ka anyị hie n’ụlọ ha ma lekọta anyị anya. N’echi ya, anyị malitere njem ụla. Ike gwụkasịrị anyị ahụ site n’iti ihe ndị ahụ nke na njem ahụ, bụ́ nke na-adị ewe ije ije awa abụọ, were anyị awa asatọ. Ahụ m zara nke ukwuu n’ihi iti ihe ndị ahụ nke na o siiri Marianthi ike ịmata m.
Mmụba n’Agbanyeghị Mmegide
Na 1949, ka agha obodo ahụ ka na-aga n’ihu, anyị kwagara Tesalọnaịka. E kenyere m ije ozi dị ka onye na-enyere ohu ọgbakọ aka n’otu n’ime ọgbakọ anọ dị n’obodo ahụ. Mgbe otu afọ gasịrị, ọgbakọ ahụ mụbara ruo n’ókè nke na anyị guzobere ọzọ, e kenyekwara m ịbụ ohu ọgbakọ ahụ, ma ọ bụ onyeisi oche ndị nlekọta. Otu afọ mgbe e mesịrị, ọgbakọ ọhụrụ ahụ fọrọ nke nta ka ọ mụbaa okpukpu abụọ, e guzobekwara ọgbakọ ọzọ!
Iwe malitere iwe ndị mmegide n’ihi mmụba Ndịàmà Jehova na-enwe na Tesalọnaịka. Otu ụbọchị na 1952, mgbe m si ọrụ lọta, ahụrụ m na ọkụ erekpọọla ụlọ anyị. Ọ fọrọ nke nta ka o rie isi Marianthi. Ná nzukọ n’uhuruchi ahụ, anyị kọwara ihe mere anyị ji yiri uwe ruru unyi bịa nzukọ—ihe nile anyị ji biri efunahụwo anyị. Ụmụnna anyị ndị Kraịst nwere nnọọ ọmịiko ma nye nnọọ nkwado.
Na 1961, e kenyere m ọrụ njegharị, ileta ọgbakọ dị iche iche kwa izu iji wusie ụmụnna ike n’ụzọ ime mmụọ. Ruo afọ 27 sochirinụ, mụ na Marianthi letara sekit na distrikti ndị dị na Masedonia, Thrace, na Thessaly. Ọ bụ ezie na Marianthi m hụrụ n’anya adịghị ahụchazi ụzọ kemgbe 1948, o ji obi ike soro m na-eje ozi, na-atachi obi n’ọtụtụ ule nke okwukwe. E jidekwara ya onwe ya, kpee ya ikpe, ma tụọ ya mkpọrọ ọtụtụ ugboro. Mgbe e mesịrị, ahụ ike ya malitere ịdị njọ, ọ nwụkwara n’afọ 1988 mgbe ogologo oge nke ịgbaso ọrịa cancer mgba gasịrị.
N’otu afọ ahụ, e kenyere m ije ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche na Tesalọnaịka. Ugbu a, mgbe ihe karịrị afọ 56 nke ijere Jehova ozi gasịrị, m ka pụrụ ịrụsi ọrụ ike ma kere òkè n’akụkụ nile nke ozi ahụ. Mgbe ụfọdụ, eduziworo m ihe ruru ndị nwere mmasị 20 ọmụmụ Bible kwa izu.
Aghọtawo m na anyị nọ n’ezie ná mmalite nke ọrụ nkụzi dị ukwuu nke ga-adịgide baa n’ụwa ọhụrụ Jehova ma dịgide ruo otu puku afọ. Ma, echere m na ugbu a abụghị oge iselata aka, iyigharị ihe, ma ọ bụ iji oge anyị na-emeju ọchịchọ anụ ahụ. Ana m ekele Chineke maka inyere m aka imezu nkwa m kwere ná mmalite n’ihi na o ruuru Jehova ịnara ofufe na ije ozi anyị sitere ná mkpụrụ obi dum.
[Foto dị na peeji nke 24]
Mgbe m na-ekwu okwu n’oge a machibidoro ọrụ nkwusa anyị iwu
[Foto dị na peeji nke 25]
Mụ na nwunye m, bụ́ Marianthi