Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 4/15 p. 30-31
  • Nkume Moab Ahụ—E Bibiri Ya Ma O Fughị Efu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkume Moab Ahụ—E Bibiri Ya Ma O Fughị Efu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Aghụghọ na Enweghị Ntụkwasị Obi
  • Akụkọ Bible Apụtaghachi Ìhè Ọzọ
  • “Ụlọ Devid”—Eziokwu Ka Ọ Bụ Akụkọ Ifo?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 4/15 p. 30-31

Nkume Moab Ahụ—E Bibiri Ya Ma O Fughị Efu

NKUME Moab, ma ọ bụ Mesha, ahụ bụ nke e leziri anya tiwaa n’ime otu afọ mgbe a chọtasịrị ya na 1868. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ nọruwo 3,000 afọ. Ọ bụ ibe nkume basalt ojii e mere ka ọ na-akwọ mụrụ mụrụ, nke e mere ka elu ya gbaa gburugburu, ọ dị 44 inch [112 sentimita] n’ịdị elu, dịrị 28 inch [71 sentimita] n’obosara, dịrịkwa 14 inch [36 sentimita] n’ibu ya. Oge ụfọdụ mgbe e tiwasịrị ya, a chọtara ibe abụọ ndị buru ibu na ibe iri na asatọ ndị irighiri, ma otu ụzọ n’ụzọ atọ nke nkume ahụ efuwo kpam kpam.

Olee ụzọ o si bụrụ na ọ fọrọ nke nta ka ihe nkà nke a pụrụ iche bụrụ ihe furu efu ruo mgbe ebighị ebi? Ruokwa n’ókè hà aṅaa ka ọ bụ ihe bara uru nye ndị mmụta Bible?

Aghụghọ na Enweghị Ntụkwasị Obi

F. A. Klein bụ onye Europe mbụ, bụrụkwa onye ikpeazụ hụrụ nkume ahụ mgbe a na-etiwabeghị ya. Ọ tọgbọ n’etiti mkpọmkpọ ebe nke Dibon nke dị n’ebe ugwu ọwuwa anyanwu nke Osimiri Nnú ahụ. O deturu ná mkpirịkpi akụkụ ụfọdụ nke ihe odide ahụ dị 34 ahịrị nke dị n’akụkụ ya ebe bilitere elu, mgbe ọ laghachikwara Jerusalem, ọ kọọrọ onyeisi ya bụ́ onye Prussia banyere ihe ahụ ọ hụrụ. A chọpụtara ozugbo ahụ na ihe odide ahụ bụ n’asụsụ Finisia, matakwa ịdị mkpa ya. Ụlọ ndebe ihe mgbe ochịe bụ̀ Royal Museum nke Berlin wepụtara ego iji zụta nkume ahụ, ma n’oge na-adịghị anya ndị ọzọ nwere mmasị malitere ikwe ya ọnụ. N’ịbụ ndị e mere ka ha mata abamuru nke ihe onwunwe ha, ndị eze obodo ahụ zoro ya wee welie ọnụ ahịa ya gaa n’ọ̀tụ̀tụ̀ ezi uche na-adịghị na ya.

Otu onyeọkà n’igwupụta ihe mgbe ochie ndị e liri n’ala bụ onye France gbalịrị iji ibe akwụkwọ wee bichata ihe e dere na nkume ahụ, ma n’ihi na ọ ghaghị ime ihe oké ngwa ngwa iji wepụta akwụkwọ ahụ tupu ọ kọọ, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a pụghị ịgụta ihe odide ahụ agụta. Ka ọ dị mgbe ahụ, e si Damaskọs nata iwu ka ndị Bedouin nyefee ndị nnọchianya ọchịchị nkume ahụ. Kama ime ihe a gwara ha ka ha mee, ndị Bedouin kpebisiri ike ibibi ya. Ya mere ha mụnyere ọkụ gburugburu ihe ahụ dị oké ọnụ ahịa, jirikwa mmiri wụnyụọ ọkụ ahụ ọtụtụ ugbo. Mgbe nkume ahụ gbawara, e mere ngwa ngwa kesasịa iberibe ya dị iche iche n’etiti ezinụlọ ndị bị n’ebe ahụ ka ha debe ha n’ebe ha na-ekpokọba ọka, bụ̀ nke e chere na ọ ga-ewetara ihe ọkụkụ ha ngọzi. Ọ bụkwa ụzọ kasị mma ime ka ndị mmadụ n’otu n’otu nwee ike ikwubiri onwe ha ọnụ ahịa ha ga-ere iberibe ya ndị ahụ e kesasịrị.

Akụkọ Bible Apụtaghachi Ìhè Ọzọ

Site n’enyemaka nke iji plaster kpụghachi ihe nakwa iji ihe akwụkwọ bichata ihe ndị e dere ede iji mezuo iberibe ndị ahụ a zụtara azụta, e mesịrị nwetaghachi ihe e dere n’elu nkume ahụ. Mgbe e kpughere ihe odide ahụ n’ozuzu ya, ọ tụrụ ndị ọkà mmụta n’anya nke ukwuu. N’oge ahụ, a kọwara ihe mgbe ochịe ahụ dị ka “ogidi nkume kasi kwesi iriba ama a chọtaworo mgbe ọ bụla.”

Eze Mesha nke Moab guzobere Nkume Moab ahụ nye chi ya bụ Kemọsh iji mee ememe ncheta nkwụsị Mesha kwụsịrị ọchịchị ndị Israel, bụ̀ nke ọ sịrị na ọ dịruru 40 afọ, nke ọ sịkwara na Kemọsh kwere ka ọ dịrị n’ihi na ọ “na-eweso ala ya ịwe.” A na-ewekarị ya na mbili nke a ndị Moab biliri bụ nke e jikọtara ya na ihe omume ndị ahụ e dekọrọ n’isi nke atọ nke 2 Ndị Eze. N’elu ogidi nkume ahụ, Mesha na-etu ọnụ na ya bụ onye ji okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu, na ya wuru ọtụtụ obodo na otu okporo ụzọ ukwu, na ya merikwara Israel. Na nke a, ọ na-enye chi ya bụ Kemọsh otuto nile. Mmeri e meriri Mesha na àjà ahụ o jiri nwa nke ya chụọ—bụ́ nke a kọrọ akụkọ ya na Bible—bụ nke a na-edeghị n’ihe odide nke a na-enye onwe onye otuto, dị ka a pụrụ ịtụ anya ya.

Ọtụtụ ebe, ebe Mesha depụtara dị ka ebe ndị o meriri bụkwa ebe ndị e depụtara na Bible, ụfọdụ n’ime ha bụ Medeba, Atarọt, Nebo, na Jehaz. Otú a, nkume ahụ na-akwado izi ezi nke ihe ndekọ Bible. Otú ọ dị, otu ihe pụtara ìhè bụ ojiji Mesha jiri Tetragrammaton ahụ mee ihe, bụ̀ YHWH, bụ̀ aha nke Chineke nke Israel, n’ahịrị nke iri na asatọ nke ihe ndekọ ahụ. N’ebe ahụ, Mesha turu ọnụ, sị: “Esi m n’ebe ahụ [Nebo] chịkọrọ [arịa nile] nke Yahweh, na-akpụ ha n’aìa n’ihu Kemọsh.” Ma eleghị anya, nke a bụ ebe mbụ, ma e wezuga Bible, e nwere ihe ndekọ nke ojiji e jiri aha Chineke ahụ mee ihe.

Na 1873 e mezighachiri Nkume Moab ahụ, na-eji plaster na-akpụta ihe odide ndị ahụ na-efu efu, wee wepụta ya ebe ọha mmadụ ga-ekiri ya n’ụlọ ndebe ihe mgbe ochịe dị na Louvre, Paris, bụ́ ebe ọ dịworo ruo ugbu a. A pụrụ ịhụ mmepụta nke yiri ya n’ụlọ ndebe ihe mgbe ochie bụ British Museum, dị na London.

[Foto dị na peeji nke 31]

(N’elu) Ala Moab

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

(Aka ekpe) Nkume Moab ahụ nke e dozighachiri edozighachi

[Ebe E Si Nweta Foto]

Musée du Louvre, Paris

(Aka nri) Tetragrammaton ahụ dị ka o si pụta n’ihe mgbe ochie ahụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

The Bible in the British Museum

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya