“Ụlọ Devid”—Eziokwu Ka Ọ Bụ Akụkọ Ifo?
DEVID—nwa okorobịa ahụ na-azụ atụrụ bụ́ onye ghọrọ onye na-akụ egwu, onye na-ede uri, onye soja, onye amụma, na eze—pụtara ìhè n’ime Bible n’ịbụ onye a ma ama nke ukwuu. A kpọrọ aha ya ugboro 1,138; okwu ahụ bụ́ “Ụlọ Devid”—nke na-ezokarị aka n’usoro ndị ọchịchị Devid—bụ nke e ji mee ihe ugboro 25. (1 Samuel 20:16) Eze Devid na usoro ndị ọchịchị ya hà bụ nanị akụkọ ifo? Gịnị ka nkà mmụta ihe ochie ndị e gwupụtara n’ala na-ekpughe? A kọrọ na nchọpụta dị ịrịba ama e mere ná nso nso a n’ebe e gwupụtara ihe ndị mgbe ochie na Tel Dan n’ebe ugwu Galili na-akwado ịbụ eziokwu nke akụkọ Devid na usoro ndị ọchịchị ya.
N’oge okpomọkụ nke 1993, ìgwè ndị ọkà n’ihe ochie ndị e gwupụtara n’ala, nke Prọfesọ Avraham Biran bụ onye ndú ha, sụchapụrụ ebe dị n’èzí nke ọnụ ụzọ ámá mpụga nke Dan oge ochie. Ha chọpụtara ala mbara a wụrụ awụ. N’ụzọ dị mfe e wepụrụ nkume basalt ojii nke si n’ala selite isi. Mgbe e chere nkume ahụ ihu n’anyanwụ ehihie, mkpụrụ akwụkwọ ya gbara nke ọma. “Oo, Chineke m, o nwere ihe e dere ya!” ka Prọfesọ Biran tiri ná mkpu.
Prọfesọ Biran na onye òtù ya, Prọfesọ Joseph Naveh nke Mahadum Hibru dị na Jerusalem, dere akụkọ sayensị banyere ihe odide ahụ ngwa ngwa. Dabere n’akụkọ a, otu isiokwu dị na magazin bụ́ Biblical Archaeology Review, March/April 1994, na-agụ, sị: “Ọ bụghị mgbe nile ka nchọpụta nkà mmụta ihe ochie ndị e gwupụtara n’ala bụ nke a na-eji emere isi akụkọ na New York Times (ya fọdụziekwa magazin Time). Ma nke ahụ bụ ihe mere n’oge okpomọkụ gara aga banyere nchọpụta e mere na Tel Dan, mkputamkpu mara mma n’ebe ugwu Galili, n’ala ala nke Ugwu Heamọn n’akụkụ otu n’ime isi mmiri nke Osimiri Jodan.
“N’ebe ahụ Avraham Biran na ìgwè ndị ọkà ya nke ihe ochie ndị e gwupụtara n’ala chọpụtara ihe odide dị ịrịba ama e dere na narị afọ nke itoolu T.O.A. nke na-ezo aka na ma ‘Ụlọ Devid’ ma ‘Eze Israel.’ Nke a bụ nke mbụ a chọtaworo aha Devid n’ihe odide oge ochie na-abụghị Bible. Na ihe odide ahụ na-ezo aka ọ bụghị nanị na ‘Devid’ kama n’Ụlọ Devid, usoro ndị ọchịchị ndị eze nke eze ukwu nke Israel, ọbụna dị ịrịba ama karị.
“‘Eze Israel’ bụ okwu a na-ahụkarị na Bible, karịsịa n’Akwụkwọ Ndị Eze. Otú ọ dị, nke a pụrụ ịbụ izo aka ntụkwasị kasị ochie nke Bible n’ebe Israel dị n’ihe odide ndị Semite. Ọ bụrụ na ihe a e dere ede na-anwapụta ihe ọ bụla, ọ na-egosi na ma Israel ma Juda, n’ịdị iche ná nzọrọ nke ụfọdụ ndị nkatọ Bible, bụcha alaeze ndị dị mkpa n’oge a.”
Akara ụbọchị e nyere ya dabeere n’ọdịdị nke mkpụrụ okwu ndị ahụ, nnyocha nke arịa ụrọ a chọtara ná nso iberibe nkume ahụ, na ihe ihe odide ahụ na-ekwu. Ụzọ atọ ndị ahụ nile na-arụtụ aka n’otu oge ahụ, narị afọ nke itoolu T.O.A., ihe gafetụrụ otu narị afọ mgbe Eze Devid nwụsịrị. Ndị ọkà mmụta na-ekwenye na ihe odide ahụ bụ akụkụ nke ihe ncheta mmeri nke onye Aram bụ́ onye iro nke ma “Eze Israel” ma “[Eze nke] Ụlọ Devid” wuru na Dan. Ndị Aram, bụ́ ndị fere chi oké ifufe a ma ama, bụ́ Hadad, biri n’ọwụwa anyanwụ.
N’oge okpomọkụ nke 1994, a chọpụtakwuru iberibe abụọ ọzọ nke nkume a. Prọfesọ Biran na-akọ, sị: “N’iberibe nkume abụọ ndị a ka e dere aha nke chi ndị Aram bụ́ Hadad, nakwa aka e zoro n’ọgụ dị n’etiti ndị Israel na ndị Aram.”
Iberibe bụ isi a chọtara na 1993 nwere akara 13 pụtatụrụ ìhè nke e dere na mkpụrụ akwụkwọ Hibru ochie. N’oge ahụ, e jiri iso kpọm mee ihe dị ka ihe na-ekebi okwu iji kewapụ okwu n’ihe odide. Otú ọ dị, e dere “Ụlọ Devid” dị ka otu okwu na-enwe mkpụrụ akwụkwọ bụ “bytdwd” (nke a sụgharịrị gaa na mkpụrụ akwụkwọ roman) kama ịbụ “byt” (ụlọ), kpọm, na mgbe ahụ “dwd” (Devid). N’ụzọ kwere nghọta, a jụwo ajụjụ banyere nkọwa nke “bytdwd.”
Onye ọkà mmụta asụsụ bụ́ Prọfesọ Anson Rainey na-akọwa, sị: “Joseph Naveh na Avraham Biran akọwaghị ihe odide ahụ n’ụzọ sara mbara, ikekwe n’ihi na ha weere ya na ndị na-agụ ya ga-ama na a na-ahapụkarị itinye ihe na-ekebi okwu n’etiti akụkụ abụọ n’ụdị ide ihe dị otú ahụ, karịsịa ọ bụrụ na njikọ ahụ bụ aha aka a maara nke ọma. ‘Ụlọ Devid’ n’ezie bụ ụdị aha aka ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke ọdịdị mbara ala dị otú ahụ n’etiti narị afọ nke itoolu T.O.A.”
Akaebe Ọzọ nke Nkà Mmụta Ihe Ochie E Gwupụtara n’Ala
Mgbe e mesịrị nchọpụta ahụ, otu onye ọkà ná nkume Mesha (nke a na-akpọkwa Nkume Moab), bụ́ Prọfesọ André Lemaire, kọrọ na ọ na-ezokwa aka ‘n’Ụlọ Devid.’a Nkume Mesha, nke a chọpụtara na 1868, nwere ọtụtụ ihe ndị yiri nkume Tel Dan. Ha abụọ nwechara akara ụbọchị laa azụ na narị afọ nke itoolu T.O.A., bụrụ nke e ji otu ihe mee, hara nhata, bụrụkwa nke e ji mkpụrụ akwụkwọ ndị Semite fọrọ nke nta ka ha yie ibe ha dee.
Banyere ndegharị ọhụrụ nke ahịrị mebiri emebi dị na nkume Mesha, Prọfesọ Lemaire dere, sị: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ abụọ tupu nchọpụta nke iberibe Tel Dan ahụ, m kwubiri na nkume Mesha nwere aka e zoro ‘n’Ụlọ Devid.’ . . . Ihe mere na a rịbabeghị aka a e zoro ‘n’Ụlọ Devid’ àmà pụrụ ịbụ n’ihi na nkume Mesha enwetụbeghị editio princeps [mbipụta mbụ] kwesịrị ekwesị. Ọ bụ ya ka m na-akwadebe, afọ 125 mgbe nchọpụta nke nkume Mesha gasịrị.”
Ụdị ihe ọmụma ahụ nke nkà ihe ochie ndị e gwupụtara n’ala na-adọrọ mmasị n’ihi na otu mmụọ ozi, Jisọs n’onwe ya, ndị na-eso ụzọ ya, na ndị mmadụ n’ozuzu ha gbara akaebe n’ịbụ eziokwu nke akụkọ Devid. (Matiu 1:1; 12:3; 21:9; Luk 1:32; Ọrụ 2:29) Ihe àmà na-egosi na nchọpụta nkà ihe ochie ndị e gwupụtara n’ala na-ekweta na ya na usoro ndị ọchịchị ya, “Ụlọ Devid,” bụ eziokwu, ọ bụghị akụkọ ifo.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ndị na-agụ akwụkwọ Watch Tower Society maara nkume Mesha. (Lee Ụlọ Nche, April 15, 1990, peji nke 30-31.) E gosipụtara ya na Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie na Louvre, Paris.
[Foto dị na peeji nke 31]
Iberibe nke Tel Dan,* nke a chọpụtara na 1993 n’obodo ukwu bụ́ Dan, n’ebe ugwu Galili
* Ihe osise dabeere na foto pụtara n’Israel Exploration Journal.