Cheta Onye Kere Gị Na Mgbe Ị Dị N’okoro Ma Ọ Bụ Agbọghọ
“ONYE na-eto eto nke na-enweghị afọ ojuju: Ọnọdụ nke Bụ Eziokwu Ná Ndụ A Na-adị Ná Mba Nile.” Otú a ka ọ dị n’isi ihe dị n’akụkọ nke otu ihe odide dị na The Star nke Johannesburg, South Africa. Isiokwu nke ihe odide ahụ na-agụ, sị: “N’ihi ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị na-eto eto ndị na-eche ohere ndị dị nta ihu ugbu a, bụ́ ohere ndị a na-eme ka ha dịwanye nta site ná ndaghachi azụ zuru ụwa ọnụ n’ihe banyere akụ na ụba, enweghị afọ ojuju nke ndị na-eto eto n’obodo ndị na-ebuwanye ibu, aghọwo eziokwu pụtara ìhè nke ndụ a na-adị ná mba nile. N’ọgba aghara a na-enwe na Miami, na San Salvador, na Managua, na Teheran nakwa na Cape Town, e nwere otu akụkụ nke ha nile si yirita—n’ọnọdụ nke ọ bụla, ndị mbụ na-egbu mmadụ na ndị mbụ a na-egbu bụ ndị na-eto eto.”
E bipụtara nke ahụ ihe dị ka afọ ịrị gara aga, ọnọdụ nke e nwere adịwokwa njọ karị eri mgbe ahụ. N’ihi gịnị ka e ji nwee enweghị afọ ojuju dị otú a n’etiti ndị na-eto eto gburugburu ụwa? Ọnọdụ na-arịwanye elu nke eguzosighị ike, bụ́ nke dị n’usoro ihe dị ugbu a bụ n’ezie otu n’ime ihe ndị na-akpata ya. Ụkọ ọrụ eruwo ọ̀tụtụ̀ kasị elu. Ná ndụ ezinụlọ nke na-akawanye njọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị oké ngwa, nchebe dị aṅaa ka e nwere maka ndị na-eto eto? Ka a sịkwa ihe mere ụfọdụ n’ime ha ji eji iwe emeghachi omume n’ụwa nke gafere ihe ha nwere ike ịchịkwata. Nke ahụ ọ̀ bụghị n’ihi na ha enweghị olileanya e ji n’aka nke ha ga-eji kwado ndụ ha?
Mmadụ ga-ele anya na okpukpe dị iche iche nke ụwa ga-enye olileanya dị otú a. Ma, otu onye na-eto eto dere, sị: “Anọ m n’oké ihe mgbagwoju anya. . . . Enwere m ọtụtụ ndị enyi, ndị nọ n’ọtụtụ okpukpe dị iche iche, ma ha dị nnọọ ka m. Anọ m ná mgbagwoju anya nke ukwuu n’ezie nke na amaghị m ihe m ga-ekwere na ya ọzọ. Biko, ị̀ pụrụ ịtụrụ m aro?” Olee aro nke ị ga-atụrụ onye dị otú a ka na-eto eto?
Ndị na-eto eto, bụ́ ndị rapagidesiri ike n’Okwu Chineke na n’ọgbakọ nke ezi ndị Kraịst na-abụ ndị e chebere pụọ ná mgbagwoju anya na obi mgbu dị otú a. Ebe ọtụtụ ndị na-eto eto na-enweghị olileanya e ji n’aka maka ọdịnihu, ndị Kraịst na-eto eto tụkwasịrị obi n’ebe Jehova Chineke na Okwu nke eziokwu ya e ji n’aka dị. N’ihi nke a, ha nwere olileanya nke ịlanarị ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a ịba ná ndụ ebighị ebi. Mgbe nke ahụ gasịrị, n’ụwa nke e mere ka ọ dị ọcha pụọ n’ikpe na-ezighị ezi na mmebi iwu, ha ga-abụ akụkụ nke ntọala nke “ụwa ọhụrụ” nke “ezi omume bi n’ime” ya. (2 Pita 3:13; Jọn 17:3) Iji nweta olileanya ndị a dị ebube, a na-agba ndị na-eto eto ume ka ha ‘cheta Onye Keworo ha.’ (Eklisiastis 12:1) Aro kasịkwa mma nke a pụrụ ịtụ bụ ka ha ghọọ ma nọgide na-abụ akụkụ dị mkpa nke ọgbakọ ndị Kraịst. N’ihi gịnị ka nke a ji dị otú a?
Ihe ka ọtụtụ n’ime unu bụ ndị na-eto ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst nwere nne na nna ndị kwere ekwe, bụ́ ndị hụrụ unu n’anya ma na-enwe nchegbu banyere unu. Ọgbakọ ọ bụla nwere ndị okenye nke ya a họpụtara bụ́ ndị nwere ezi mmasị n’ọdịmma ime mmụọ unu. E kwesịghị ime ka enyemaka na nlekọta dị otú a dị ala. Eziokwu nke sitere n’Okwu Chineke, tinyere nduzi nke usoro ọchịchị Chineke, ga-enye gị nchebe, inwere onwe pụọ n’obi nkoropụ, na olileanya e ji n’aka maka ọdịnihu. Ihe ndị a nile ga-enyere unu aka ‘inwe okwukwe na ezi akọ na uche’ na ịrapara n’okwukwe nke dị ka arịlịka e ji ejide ụgbọ iji gbochie ụgbọ mmiri ikpugharị n’oké osimiri nke jupụtara n’ebili mmiri.—1 Timoti 1:18, 19; tụlee Ndị Hibru 6:19.
Zere Ihe Ndọrọ Nile nke Ụwa
N’agbanyeghị ọtụtụ ngọzi ime mmụọ unu ndị na-eto eto pụrụ inweta n’ime ọgbakọ ndị Kraịst, ihe a na-ahụkarị n’etiti ụfọdụ ndị bụ ịchụso ụzọ nke ụwa. Ọ dị ka a ga-asị na ha na-eche na ọ dị ihe dị mkpa nke na-efunahụ unu nke a pụrụ ịchọta nanị n’ụwa nke na-adịghị n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. Ma ò nwere ihe bara uru n’ezie nke ụwa na-enye?
Mgbe o tinyesịrị ihe karịrị 40 afọ n’ozi oge nile, otu n’ime ndị ohu Chineke kwuru okwu n’ụzọ dị otú a, sị: “Nanị akụkụ ndụ m nke m na-akwa ụta banyere ya bụ akụkụ ahụ nke m dịrị tupu m bata n’eziokwu. Abụ m akụkụ nke ụwa mgbe ahụ. Adịrị m ndụ nanị maka ụwa. Mgbe m ruru afọ ndụ nke 18 ma leghachi anya azụ ná ndụ m, achọpụtara m na ọ bụ ihe na-abaghị n’ihe. E nweghị ihe mgbaru ọsọ ọ bụla, e nweghị nzube ọ bụla ná ndụ m. Ihe ụtọ nke ụwa ndị m chere na m nwetara ọṅụ na ha wetaara m nanị obi nkoropụ na mwute n’ezie. Amalitere m ịchọ eziokwu ahụ. Achọtara m ya ma malite ikere òkè n’ozi oge nile otu afọ nke na-esochi ya. Enweghị m ego, ihe m nwere bụ nanị ahụmahụ otu afọ n’eziokwu ahụ na okwukwe nke na Jehova ga-akwado m. Ugbu a, mgbe m leghachiri anya azụ ná ndụ m, bụ́ nke m tinyeworo ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ site na ya n’ozi oge nile, m na-enwe obi ụtọ nke ukwuu. Ọ dịghị mgbe m ga-achọ iji ihe m nwetaworo n’ijere Jehova ozi gbanwere ihe ọ bụla ụwa nwere inye.” N’ezie, nke a bụ mmetụta nke ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova na-enwe.
Ya mere n’ihi gịnị ka ị ga-eji chọọ ihe ndị Kraịst ndị ọzọ hapụworo n’azụ? N’ihi gịnị ka a ga-eji chọọ ihe ndị dị n’ụwa nke na-eche mbibi ihu? (1 Jọn 2:15-17) Dị ka onye na-eto eto, eleghị anya ị na-eche na ijere Jehova ozi nwere ọtụtụ ihe mgbochi, na ọ ga-emekwa ka ị ghara inweta ihe ụtọ nke ụwa na-enye. Ma ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya ile ndị mụrụ gị na ndị okenye anya dị ka ndị na-etinye oké ihe mgbochi mgbe ha chọrọ inyere gị aka ime ihe na-atọ Jehova ụtọ ma nweta ndụ ebighị ebi?
Ọ bụrụ na onye bụ nne nke na-eziga nwa ya n’ụlọ ahịa e nwere n’ógbè ahụ echetara ya ka ọ kwụsị ma lee anya n’akụkụ abụọ tupu ọ gafee okporo ámá, ị̀ ga-ele ya anya dị ka onye na-etinye ihe mgbochi gabiga ókè? Kama nke ahụ, ọ̀ bụ na ọ dịghị eji ịhụnanya na-anwa ichebe nwa ya? Olee ma ọ bụrụ na nwa ahụ eleghara ịdọ aka ná ntị ahụ anya ma bụrụ onye ụgbọ ala kwọgburu? Ị ka ga-anọgide na-eche na nne ahụ na-etinye ihe mgbochi gabigara ókè? Ị hụlanụ, ị pụrụ iche na o kwesịrị imeworị ihe ka ukwuu iji chebe ndụ nke nwa ya! N’ụzọ yiri nke ahụ, ihe ncheta nke sitere n’Okwu Chineke na ná nzukọ ya bụ ndị a na-enye n’ịhụnanya, ọ bụghị dị ka ihe mgbochi, kama maka nchebe anyị.
Ịbụ onye a zụlitere n’ezinụlọ ndị Kraịst abụghị ihe zuru ezu ime ka i nwee ike iguzogide nrụgide nile nke ụwa nke a. Ọ dịkwa gị mkpa ịbụ onye e mesiri obi ya ike banyere eziokwu nke Okwu Chineke. Mmadụ imesi onwe ya obi ike otú a na ịhụnanya maka Onye Okike na-abụ ihe ndabere maka ịrara ndụ gị nye Chineke. Imesi onwe onye obi ike otú a dịkwa mkpa ka i wee nwee ike ịgọpụ okwukwe gị n’ihe ịta ụta n’ihu ndị ọzọ. (1 Pita 3:15) Ịbụ onye Okwu Chineke na-eduzi bụ ihe ndabere maka ndụ nke inwe ihe ịga nke ọma. (Joshua 1:8; Abụ Ọma 119:9) Ma ka ị wee nwee ihe ịga nke ọma ná ndụ, ọ dịkwa gị mkpa inwe ezi ọzụzụ.
Inye Ọzụzụ Kpọmkwem
N’ezie, ọ ga-amasị unu ndị Kraịst bụ nne na nna ịhụ ụmụ unu ka ha na-ewere nguzo siri ike maka eziokwu ahụ ma nọgide bụrụ ndị e jikọrọ unu na ha n’ezi ofufe. N’ụzọ bụ isi, ọ bụ ibu ọrụ nke onye bụ nna ịzụlite ụmụ “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke [Jehova, NW].” (Ndị Efesọs 6:4) Ma i pụrụ ịchọta akụkụ ụfọdụ ebe ọ dị gị mkpa imeziwanye ihe n’ịzụ ha? Ị̀ na-eji oge zuru ezu na-eme ihe ka gị na ụmụ gị nọkọọ? Ùnu na-eme ihe dị ka otu ezinụlọ? Unu na-enwekọ ntụrụndụ na-ewuli elu ọnụ?
Echefula na gị isetịpụ ezi ihe ilereanya nwere mmetụta dị ukwuu n’ebe ụmụ gị nọ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ha jiri eziokwu ahụ kpọrọ ihe, mgbe ahụ, ọ bụ otú ahụ ka i kwesịkwara ịsị lee ya anya. (3 Jọn 2-4) Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ka ha zụlite nsọpụrụ dị omimi maka nzukọ Jehova na ndị okenye, mgbe ahụ i kwesịrị inwe omume mara mma dị otú a mgbe nile.
Ọ bụ ezie na ịzụlite nwata bụ ọrụ dịịrị ndị nne na nna n’ụzọ bụ ịsị, ndị okenye nwekwara ibu ọrụ n’ebe ndị ka na-eto eto nọ n’ime ọgbakọ nọ. N’ilekọta ìgwè atụrụ Chineke, ọ dịkwa ndị nlekọta mkpa ịzụ ụmụ atụrụ ahụ. (1 Pita 5: 1-3) Lee ihe nlereanya mara mma Jehova setịpụworo n’iji ịdị nro na-elekọta ọbụna ndị dị nta! (Aịsaịa 40:11) N’ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ihe nlereanya ya, ndị Kraịst bụ ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru ga-achọkwa igosipụta mmasị na-ekpo ọkụ nke ịhụnanya n’ebe ndị na-eto eto nọ ma mee ka ha nwee mmetụta nke ịbụ akụkụ nke ọgbakọ ahụ. Ụfọdụ ndị na-eto eto egosipụtawo ọchịchọ ka ndị okenye na-agwa ha okwu mgbe mgbe karị ma nyere ha aka n’ozi ubi.
Ịzụlite onye na-eto eto pụtara ihe karịrị inye ya amamihe e bu n’ịsị nke Akwụkwọ nsọ. Site n’obi ya, ọ ghaghị inwe ịkpọasị maka ihe ọ bụla Chineke kpọrọ asị ma nwee ịhụnanya maka ihe ọ bụla Chineke hụrụ n’anya. (Emọs 5:14, 15) Ka o wee cheta Onye Keworo ya mgbe ọ dị n’okoro ma ọ bụ agbọghọ, ọ dị mkpa inye ya ọzụzụ n’ụzọ Akwụkwọ nsọ na-akwado n’ije ije n’ụzọ ezi omume nke Jehova. (Ilu 22:6; 1 Timoti 3:16) Ndị mụrụ ụmụ ekwesịghị ịla azụ n’inye ọzụzụ ahụ dị mkpa. Ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ, bụ́ ndị chọrọ ijigide ịbụenyi nke ha na nwa ha n’agbanyeghị ihe ọ bụla ọ ga-ewe, na-elegharakarị agazighị agazi nke nwa ha anya, na-eme ka ịdị njọ ya dị nta. Ha na-aghọ ndị omume ụwa nke onye ọ bụla mere otú dị ya mma metụtara. Ma nne ma ọ bụ nna na-ahụ n’anya na-ege ntị n’akụkọ ndị na-egosi na nwa ya na-eme omume na-adịghị mma, ma na-enye ọzụzụ kwesịrị ekwesị dị ka mkpa ya si dị. (Ilu 13:24) N’ezie, olee nne ma ọ bụ nna onye Kraịst nke ga-achọ ijigide ịbụenyi nke dabeere na mmadụ ime otú o si masị ya ma sị otú a mee ka nwa ya funahụ ya n’ihi enweghị ezi ọzụzụ?—Ilu 22:15.
Nwee Nzube Ná Ndụ
Jehova Chineke mere anyị ka anyị wee nweta ọṅụ na afọ ojuju kachasị ukwuu site n’ijere ya ozi. Chee echiche banyere ubi dị ukwuu unu bụ ndị na-eto eto pụrụ ịrụ ọrụ na ya. Ihe dị ka ọkara nke ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa dị 20 afọ ma ọ bụ dị ala karị. Ndị a na-eto eto nọ na-awagharị n’oké osimiri nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ebe ha na-enweghị olileanya, unu ndị Kraịst na-eto eto nwere olileanya e ji n’aka na ihe kwesịrị ekwesị isoro ha kerịta. Site n’omume ndị Kraịst unu nke dị mma na ịnụ ọkụ n’obi unu maka ozi Jehova, unu pụrụ ịdọrọ ọtụtụ n’ime ha bịa n’eziokwu ahụ. Unu pụrụ isi otú a nyere ha aka ịbịa n’ụzọ nke ndụ.
Ihe mgbaru ọsọ dị aṅaa nke kwesịrị ekwesị ka ị pụrụ inwe karị nke itinye ndụ gị n’ozi nke Jehova Chineke? I chewo echiche banyere ịrụ ọrụ nkwusa ahụ nke na-echebe ndụ n’oge nile? Ma eleghị anya ị pụrụ ikere òkè n’ikwusa ozi ọma ahụ dị ka onye ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ị pụrụ ije ozi n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society ebe a na-ebipụta akwụkwọ ọgụgụ Bible. Ọbụna ọ bụrụ na ị pụghị ime nke ahụ, í kwesịghị ime ofufe Jehova ihe bụ isi ná ndụ gị, si otú a na-echeta Onye Keworo gị? I nwere ọrụ kwesịrị ekwesị ịrụ. Ya mere, ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị a, mee mkpebi siri ike ịdị “na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè mgbe nile.”—1 Ndị Kọrịnt 15:58.
Ya mere gaanụ n’ihu, unu ndị Kraịst na-eto eto. Chetanụ Onye Keworo unu ugbu a, ọ ga-echebekwa unu mgbe ọ ga-eweta ụwa a nke na-amaghị Chineke ná ngwụsị. Ee, Jehova ga-echebe unu n’oge ahụ ma jiri ọdịnihu dị ebube nke na-adịghị agwụ agwụ gọzie unu.