Ihe A Hụrụ n’Ala Nkwa ahụ
Jọdan Nke Ọ Pụrụ Ịbu Na Ị Gaghị Amata
NANỊ ịkpọtụ Osimiri Jọdan aha pụrụ ichetara gị ihe ụfọdụ ị maara nke ọma: Ndị Israel ndị nọ n’okpuru nduzi Joshua ka ha na-agabiga n’ala ya nke mmiri na-adịghị n’ebe dị nso Jeriko; Neaman ka ọ na-asa ahụ ụgbọ asaa n’ime mmiri ya ka e wee gwọọ ekpenta ya; Ọtụtụ ndị Juu, nakwa Jisọs, ka ha na-abịa ka Jọn mee ha baptism n’ebe ahụ.—Joshua 3:5-17; 2 Ndị Eze 5: 10-14; Matiu 3:3-5, 13.
Ihe àmà gosiri na ihe omume ndị a nile a ma ama mere n’akụkụ Jọdan ahụ a maara nke ọma, bụ́ akụkụ nke dị n’ebe ndịda nke Osimiri Galili, gbadaakwa garuo n’Osimiri Nnú ahụ. Ma ndị na-amụsi Okwu Chineke ike pụrụ ilezu anya n’akụkụ ọzọ nke Jọdan ahụ—akụkụ ebe ugwu nke osimiri ahụ na ala nke gbara ya gburugburu. Lee maapụ ahụ anya.a Ebe ahụ dị ala n’ebe etiti bụ otu akụkụ nke Oké Ndagwurugwu ahụ, bụ́ ebe ala mibara emiba nke gbatịrị site Syria ruo Africa.
Ebe atọ bụ isi nke Osimiri Jọdan na-esi enweta mmiri bụ iyi nta ndị sitere na snow nke na-agbaze n’elu Ugwu Heamon ahụ dị elu. Iyi nta nke kasị dịrị n’ebe ọwụwa anyanwụ, (peji 17, n’elu) sitere n’otu ọgba nkume limestone nke dị n’okpuru ugwu ahụ. Ọ bụ n’ebe a ka Sizaria Filipai dịbu; cheta na Jisọs jere n’ebe ahụ nwa mgbe nta tupu e nwoghaa ya “n’ugwu dị elu.” (Matiu 16:13-17:2) Otu iyi nta ọzọ sitere n’ugwu nta nke dị n’ebe e wuru obodo Dan, bụ́ ebe ndị Israel ndị sitere n’alaeze ebo iri nke ebe ugwu guzobere otu nwa ehi. (Ndị Ikpe 18:27-31; 1 Ndị Eze 12: 25-30) Iyi nta nke atọ na-esonyere abụọ ndị a iji mejupụta Osimiri Jọdan, nke ga-asọda ihe karịrị otu puku amaụkwụ [300 mita] n’ihe dị ka maịlụ asaa [11 kilomita] site n’ebe ahụ.
Mgbe ahụ, ndagwurugwu ahụ na-agbasa wee ghọọ Ọdọ Mmiri Hula ahụ, na-eme ka mmiri nke Jọdan gbasaa, na-emekwa ka e nwee mbara ala nke ala apịtị. N’oge ochie, mmiri ahụ gbakọtara n’otu ọdọ mmiri na-adịghị omimi nke a maara dị ka Ọdọ Mmịri Hula (ma ọ bụ Huleh). Ma Ọdọ Mmiri Hula adịghịzi ebe ahụ ọzọ n’ihi na n’oge ndị na-adịghị anya gara aga, a gbatịpụrụ akụkụ ebe elu elu nke Jọdan, e gwuru ọwa mmiri dị iche iche iji mịpụsịa mmiri n’ebe ala apịtị ahụ, e mekwara ka ebe mmiri dị n’ọdọ mmiri ahụ si asọpụ dịkwuo omịmị. Ya mere, ọ bụrụ na i lee maapụ nke ebe ahụ wee hụ otu ọdọ mmiri (Hula), n’ebe ugwu nke Osimiri Galili, ị ga-amara na maapụ ahụ bụ nke ógbè ebe ahụ n’oge ochie, ọ bụghị otú ị ga-ahụ ya taa.
Ma, ọ bụrụ na i jee ebe ahụ, ị ga-ahụ otu ebe e chebere echebe nke ga-eme ka ị hụtatụ otú ebe ahụ dịrịị n’oge Bible, mgbe ọ bụ ebe a na-enweta ụdị osisi ụfọdụ ndị pụrụ iche, dị ka ìgwè osisi papyrus na amị̀ ndị na-efeghari n’ikuku.—Job 8:11.
N’ebe ahụ, a na-enwe mgbanwegharị nke ụdị nnụnụ dị iche iche. Nnụnụ heron, ụgbala, okwolo, nduru, na ụdị nnụnụ ndị ọzọ jupụtakwara, nke otu ihe kpatara ya bụ na ala apịtị na ọdọ mmiri ahụ bụ ebe mara oké mma izu ike n’ụzọ ahụ nnụnụ na-esi efefe n’etiti Europe na Africa. (Deuterọnọmi 14:18; Abụ Ọma 102:6; Jeremaịa 8:7) Ihe okike ndị ọzọ, ndị kwesịkwara ịdị n’ógbè a ga-abụworị ndị a na-ahụtachaghị nke ọma, ma ọdịdị ha dị n’ebe a ga-emeworị ka isi n’Ọdọ
Mmiri Hula ahụ gafee bụrụ ihe ize ndụ. Ndị a ga-agụnyeworị ọdụm, otobo, anụ ọhịa wolf, na ézì ọhịa. (Job 40: 15-24; Jeremaia 49:19; 50:44; Habakuk 1:8) N’otu oge, ọrịa ịba nke anwụta na-ebute jupụtara n’ebe ahụ, nke pụrụ ịbụ otu n’ime ahụ ọkụ ndị ahụ a kpọtụrụ aha n’ime Bible.
O kwere nghọta na ma ndị njem nọ nanị ha ma nnukwute ìgwè ndị njem ga-agba gburugburu iji zere ala ebe a. Ya mere, olee ebe ha ga-enwe ike isi gafee Osimiri Jọdan na ndagwurugwu ahụ nke dị n’ebe ugwu nke Osimiri Galili?
N’otu ebe katụ nso n’Osi-iri Galili, e nwere otu ntolite nke nkume basalt; ọ bụ ihe a yiri ihe mgbochi mmiri mere mmiri ji sọlaa azụ wee mepụta Odọ Mmiri Hula. Ị pụrụ ịhụ otu akụkụ nke ntolite nkume ahụ na peji 16. Ka Jọdan ahụ sọọrọ gabiga ya chee ihu n’ebe ndịda iru Osimiri Galili (nke a na-ahụ n’ebe dị anya), ọ na-asọsi ike nke ukwuu nke na ọ na-asụpụta ụfụfụ mmiri. O doro anya na ndị njem oge ochie ga-ahụ ya dị ka ihe ize ndụ ịrịda wee banye n’ime ndagwurugwu ahụ dị omimi iji wee gafee mmiri Jọdan ahụ nke na-asọ ọkụ ọkụ. E nwere otu mbara ala dị larịị nke na-etoghị ogologo n’etiti ebe ala apịtị nke Odọ Mmiri Hula ahụ na ndagwurugwu ahụ, ebe mmiri na-asọ nwayọọ nwayọọ. N’ebe a, ndị njem oge ochie pụrụ ịgafe mmiri ahụ n’enweghị ihe ize ndụ, o wee ghọọ akụkụ nke ụzọ bụ isi a na-esi agabiga Ala Nkwa ahụ.
Ugbu a, e nwere otu àkwà mmiri n’ebe ahụ, nke ka bụkwa ebe bụ isi a na-esi agafe Jọdan ahụ.
Odọ Mmiri Hula ahụ bụ ógbè ebe a na-akọ nri nke na-emepụta ihe nke ọma; e nwere ọbụna ọdọ mmiri ebe ndị a na-azụ ázụ́. Ihe a nile kwere omume n’ihi mmiri dị ukwuu nke na-erudata n’akụkụ nke a nke Osimiri Jọdan.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Tụlee maapụ nke ka ibu na foto ahụ nke dị na 1990 Calendar of Jehovah’s Witnesses.
[Map dị na peeji nke 17]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Hula
Sea of Galilee
[Ebe E Si Nweta Foto]
Based on a map copyrighted by Pictorial Archive (Near Eastern History) Est. and Survey of Israel.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 16]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Ebe E Si Nweta Foto Ndị Dị na peeji nke 17]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
Animal photos: Safari-Zoo of Ramat-Gan, Tel Aviv