Ihe Ndị A Hụrụ N’ala Nkwa Ahụ
Gilead—Ókèala Maka Ndị Nwere Obi Ike
NWA mgbe nta tupu Israel agafere Osimiri Jọdan banye n’Ala Nkwa ahụ, Mosis gbara ha ume, sị: “Dịnụ ike, nweekwa ume, . . . Jehova, bụ́ Chineke gị, ya onwe ya bụ onye gị na ya na-eje.”—Deuterọnọmi 31:6.
A gụnyere ebo Reuben na Gad na ọkara ebo Manase n’agbamume Mosis. Ha ahụwo na ‘ala Gilead bụ ebe dịịrị anụ ụlọ,’ ya mere ha arịọwo ka e kenye ha ibi n’ókèala Gilead.—Ọnụ Ọgụgụ 32:1-40.
Gilead dị n’akụkụ nke ọzọ, akụkụ ọwụwa anyanwụ, nke Jọdan. N’ụzọ bụ isi, ọ bụ ya nọ n’akụkụ ọwụwa anyanwụ ahụ dum, site ná ngwụsị ebe ugwu nke Osimiri Nwụrụ Anwụ gbagoruo Osimiri Galili. Ókèala nke a si Ndagwurugwu Jọdan gbagoruo ala ndị dị larịị na ugwu ndị dị okirikiri bụ́ ndị mmiri na-ede nke ọma. Ya mere Gilead bụ ókèala dị mma maka ịkọ ọka na maka anụ ụlọ ịta nri. Foto dị n’elu na-enye gị nghọta nke ihe akụkụ Gilead dị ka ya. Ma gịnị ka e ji jikọọ ebe dị nnọọ mma otú a na obi ike?
O doro anya na ebo ndị họọrọ ibi na Gilead emeghị otú ahụ n’ihi egwu. Cheta na ha kwenyere ịgafere Jọdan iji lụso ndị iro agha n’Ala Nkwa ahụ. Mgbe ha lọghachikwara Gilead, obi ike ka ukwuu dị ha mkpa. N’ihi gịnị? Ọ dị mma, ha nọ ná nsọtụ ókèala, bụrụ ndị e kpughere nye mwakpo ndị Amọn n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ na ndị Siria n’ebe ugwu. A wakpokwara ha.—Joshua 22:9; Ndị Ikpe 10:7, 8; 1 Samuel 11:1; 2 Ndị Eze 8:28; 9:14; 10:32, 33.
Mwakpo ndị ahụ bụ oge ndị gbara ọkpụrụkpụ a chọrọ obi ike. Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova kweworo ka ndị Amọn kpagbuo Gilead, ndị Chineke chegharịrị ma chigharịa ihu maka idu ndú n’aka “dike nke bụ dimkpa,” onye aha nna ya bụkwa Gilead. Dimkpa, ma ọ bụ nwoke a nwere obi ike bụ Jefta. A maara ya nke ọma maka iyi nke gosipụtara na, n’agbanyeghị na ọ bụ onye nwere obi ike, ọ chọrọ nduzi na nkwado Chineke. Jefta kwere nkwa na ọ bụrụ na Chineke enye ya ike iweda ndị Amọn na-akpagbu ha n’ala, onye mbụ si n’ụlọ ya pụta izute ya ga-abụ onye ‘e nyefere dị ka ihe nsure ọkụ,’ ma ọ bụ chụọ n’àjà nye Chineke.a Nke ahụ ghọrọ nwa Jefta nwere nanị ya, ada ya, onye mesịrị gaa ije ozi n’ụlọ nsọ Chineke. Ee, Jefta na, n’ụzọ dị iche, ada ya, gosiri obi ike.—Ndị Ikpe 11:1, 4-40.
Ngosipụta nke obi ike, ma eleghị anya nke a na-amaghị nke ọma dị ka nke a weere ọnọdụ n’oge Sọl. Iji ghọta ọnọdụ e nwere, cheta na mgbe Sọl ghọrọ eze, ndị Amọn yiri egwu ịghụpụtasị anya aka nri nke ndị ikom Jebesh-gilead, obodo nke pụrụ ịdịwo ná ndagwurugwu ọwa mmiri nke gabigara n’etiti ugwu dị iche iche ruo Jọdan. Sọl chịkọtara ndị agha ịkwado Jebesh. (1 Samuel 11:1-11) N’iburu ọnọdụ ahụ n’uche, ka anyị gaa n’ọgwụgwụ nke ọchịchị Sọl ma hụ ụzọ e si gosipụta obi ike.
Ị pụrụ icheta na Sọl na atọ n’ime ụmụ ya nwụrụ n’oge a na-alụso ndị Filistia agha. Ndị iro ndị ahụ bepụrụ isi Sọl ma jiri ọṅụ mmeri kowe ozu Sọl na ụmụ ya n’elu mgbidi Bet-shan. (1 Samuel 31:1-10; n’aka nri, ị ga-ahụ mkputamkpu ájá nke Bet-shan.) Okwu nke a ruru Jebesh, n’ebe ugwu Gilead n’ofe Jọdan. Gịnị ka ndị Gilead pụrụ ime n’ihu ndị iro dị ike nke ukwuu nke na ha pụrụ igbufu eze Israel?
Lee anya na map ahụ. “Ndị ikom nile bụ́ dimkpa wee bilie, jee ije ogologo abalị ahụ nile, si ná mgbidi Bet-shan buru ozu Sọl na ozu ụmụ ya ndị ikom; ha wee bịaruo Jebesh, suree ha ọkụ n’ebe ahụ.” (1 Samuel 31:12) Ee, ha mere mwakpo abalị n’ime ebe siri ike nke ndị iro ahụ. Ị pụrụ ịghọta ihe mere Bible ji kpọọ ha ndị dimkpa, ma ọ bụ ndị nwere obi ike.
Mgbe oge na-aga, ebo iri kewapụrụ iguzobe alaeze ebe ugwu nke Israel, nke a gụnykwara Gilead. Mba ndị gbara ya gburugburu, nke mbụ ndị Siria, e mesịakwa ndị Asiria, malitere iweghara akụkụ dị iche iche nke ókèala ahụ n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Jọdan. Ya mere n’agbanyeghị ihe atụ ndị gara aga nke obi ike, ndị Gilead kwụrụ ụgwọ maka ịnọ ná nsọtụ ókèala.—1 Ndị Eze 22:1-3; 2 Ndị Eze 15:29.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ntụle e leziri anya mee nke ihe ndekọ ahụ na-ekwugide nzọrọ ahụ nke na Jefta ji nwa ya chụọ àjà. Lee akwụkwọ Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peji nke 27-28, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., na-ebipụta.
[[Map dị na peeji 8]
OSIMIRI GALILI
OSIMIRI NWỤRỤ ANWỤ
Osimiri Jọdan
Bet-shan
Remọt-gilead
Jebesh
GILEAD
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ọ dabeere na map Pictorial Archive (Near Eastern History) Est. na Survey of Israel setara.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 8]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 9]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.