Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 7/1 p. 23-28
  • Idozi Ihe Iseokwu Eluigwe Na Ala Ahụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Idozi Ihe Iseokwu Eluigwe Na Ala Ahụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Gaje Ibu Agha n’Amagedọn
  • Jehova Gaje Ịmaliteghachi Obubuagha ya n’Isi Nso
  • Onye ahụ nke Na-ebu Agha Iji Wepụ Jehova n’Ụta
  • Mba Dị Iche Iche Ejikọta Onwe Ha n’Otu Imegide Jehova
  • Mmeri Dị Ebube nke Chineke ahụ Onye Na-ebu Agha
  • “Agha nke Oké Ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” nke Dị Nso
    Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Ọchịchị nke “Onyeisi Udo” ahụ n’Etiti Ndị Iro
    Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Ndezụ Na-Abịanụ Nke “Akwụkwọ Agha Dị Iche Iche Nke Jehova”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • ‘Ụkpụrụ Jehova’ Apụghị Ịda Ada
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 7/1 p. 23-28

Idozi Ihe Iseokwu Eluigwe Na Ala Ahụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi

“[Jehova, NW] n’aka nri gị amapuwo ndị eze n’ụbọchị iwe ya.”—ABỤ ỌMA 110:5.

1, 2. N’afọ 70 O.A., ihe omume dị aṅaa pụrụ itinyeworị ihe obi abụọ n’eziokwu ahụ nke bụ ma ịbụ ọkaaka nke Jehova Chineke ò zukwara eluigwe na ala dum, ma ka ọ dị mgbe ahụ, n’ebe òle ndị nọ ka e meworo ka mmasị ya chee ihu?

ỊBỤ ọkaaka eluigwe na ala nke Onye Okike eluigwe na ala bụ ihe iseokwu bụ isi nke na-eche ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi ihu. N’oge na-adịghị anya, a gaje idozi ihe iseokwu ahụ ruo mgbe ebigbị ebi, ma ruo ọtụtụ narị afọ, ndị iro Jehova amawo ịbụ ọkaaka ya aka. N’eziokwu, mbibi e bibiri obodo Jerusalem ya na ụlọ nsọ ya nke a raara nye Jehova n’afọ 70 O.A. pụrụ iwetaworịị ihe obi abụọ n’ihe banyere ma ịbụ ọkaaka nke Onye Okike ahụ ò jikọtakwara eluigwe na ala dum. Otú o sina dị, e nwere ezi ihe mere Jehova na-ejighị họrọ n’oge ahụ ịbụ Chineke onye na-eburu Israel anụ ahụ agha.

2 Gịnị bụ ihe kpatara ya? N’oge ahụ, Jehova Chineke echegharịwo mmasị ya ihu gaa n’ebe otu mba ọhụrụ dị, bụ́ Israel ime mmụọ, “Israel nke Chineke,” dị ka Pọl onyeozi kpọrọ ọgbakọ nke Jisọs Kraịst. (Ndị Galetia 6:16) Ma, ruo ugbu a, n’ime oge a nile a kpọworo Ọgbọ Ndị Kristian, ọ dịbeghị mgbe ọ bụla Jehova buuru Israel ime mmụọ agha dị ka Chineke nke na-ebu agha n’otu ụzọ ahụ o si buoro Israel anụ ahụ n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu Moses. Ọbụna na o kweere ka ndị agha Rom, ná mkpali nke ndị Juu, gbuo Jisọs Kraịst n’elu osisi ịta ahụhụ na Calvary. Nke ahụ bụ 37 afọ tupu mbibi nke abụọ e bibiri Jerusalem site n’aka ndị Rom n’afọ 70 O.A.

3, 4. Malite n’oge Moses ruo n’oge Eze Hezekaịa, olee ụzọ Chineke siworo gosi onwe ya ịbụ onyeagha, ma n’ihe banyere ụmụ Israel ime mmụọ, gịnị bụworo eziokwu n’ihe banyere obubuagha ya na obubuagha ha?

3 Malite n’oge nke Moses onye amụma gbadaa ruo n’oge ọchịchị nke Eze Hezekaịa na Jerusalem, Jehova Chineke ji ụzọ ọrụ ebube buoro mba Israel agha, ụmụ Israel jikwa ihe agha na-egbu egbu buo agha n’okpuru nduzi ya. (Deuterọnọmi 1:30; 3:22; 20:3, 4; Joshua 10:42) Ma ọ dịghị otú ahụ n’ihe banyere Israel ime mmụọ! Malite n’ọnwụ Jisọs Kraịst ná mpụga mpụga Jerusalem ruo Oge Anyị a, Chineke nke a na-ebu agha ahọrọbegbị iburu Israel nke Chineke agha anụ ahụ. N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, o nyebeghị ụmụ Israel ime mmụọ, bụ́ nke mejupụtara ọgbakọ ndị Kraịst, ikike iji ngwá agha wee buo agha. Ndị Kraịst nwere ụdị agha ọzọ ha na-ebu.

4 N’ikwekọ na nke a, otu n’ime ndị bụ isi n’iburu okwukwe ndị Kraịst agha degaara ndị Kraịst ibe ya nọ na Kọrint, Gris, akwụkwọ, sị: “Ihe agha nke ibu agha anyị abụghị nke anụ ahụ, kama ha sitere na Chineke bụ́ ihe pụrụ ịkwada ebe e wusiri ike; ebe anyị na-eweda ihe a na-atụle n’obi, na ihe nile ọ bụla dị elu nke e weliri elu imegide ọmụma Chineke, anyị na-adọtakwa ihe nile ọ bụla a na-echepụta n’agha ịṅa ntị Kraịst; anyị na-anọkwa dị ka ndị e doziworo ikpepụta aṅaghị ntị nile n’ìhè, mgbe ọ bụla a ga-emnezu ịṅa ntị unu.” (2 Ndị Kọrint 10:4-6) Tupu mngbe ahụ n’otu akwụkwọ ozi ahụ, Pọl kwuru okwu banyere “ihe agha nke ezi omume n’aka nri na aka ekpe.”—2 Ndị Kọrint 6:7; leekwa Ndị Efesọs 6:11-18.

Jehova Gaje Ibu Agha n’Amagedọn

5. N’ogige Getsemane, ọnọdụ dị aṅaa ka Jisọs weere n’ihe banyere iji ihe agha nkịtị eme ihe ná nchebe onwe onye, ihe omume dịkwa aṅaa ka ndị na-eso ụzọ ya na-agbaso?

5 Mgbe Jisọs Kraịst nọ n’elu ala, ọ dịghị mgbe ọ bụla o jiri ngwá agha na-egbu egbu mee ihe iji chebe onwe ya. N’anyasị ụbọchị ahụ a raara ya nye, mgbe ha nọ n’ogige Getsemane, onye na-eso ụzọ ya nke raara onwe ya nye, bụ́ Saimọn Pita mịpụtara mma agha ya wee bepụ ntị nke onye na-ejere onyeisi nchụaja ndị Juu ozi. Ma Jisọs ji ụzọ ọrụ ebube tinyeghachi ntị ahụ n’ọnọdụ ya wee sị: “Mmadụ nile ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha. Ma ọ̀ bụ ì na-ecbe na apụghị m ịrịọ Nna m, ọ ga-ezitekwara m ọbụna ugbu a karị legion iri na abụọ n’ime ndị mmụọ ozi? Ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ ga-esikwa aṅaa mezuo, na ọ ghaghị ime otú a?” (Matiu 26:52-54) N’agbanyeghị ihe a nile, ndị na-eṅomi Ọkpara Chineke ahụ nke jiri onwe ya chụọ àjà na-anọgide ná nnọpụiche ha ma n’ụzọ pụtara ìhè ma n’ụzọ na-apụtaghị ìhè, mgbe a bịara n’ihe banyere ibu agha nke ndị ụwa.—Jọn 17:16; 18:36.

6. N’oge agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe nile n’Amagedọn, ọnọdụ dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova ga-ewere?

6 Ya mere, anyị na-amara mba nile ọkwa n’ebe a na n’oge “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, onye pụrụ ime ihe nile” “n’ebe ahụ nke a na-akpọ n’asụsụ Hibru Ha-Magedọn,” Ndịàmà Jehova agaghị ekere òkè n’ibu agha ahu. Ha ga-ahapụrụ Chineke ahụ bụ onyeagha nke ahụ, bụ́ “Jehova nke usuu nile nke ndị agha,” ya na ọtụtụ legion ndị mmụọ ozi ya ndị no n’okpuru ọbụbụisi nke Jisọs Kraịst.—Mkpughe 16:14-16; 19:11-21; Abụ Ọma 84:12.

Jehova Gaje Ịmaliteghachi Obubuagha ya n’Isi Nso

7. Dị ka Chineke nke na-ebu agha, utu aha dị aṅaa ka a malitere iji mara Jehova, ọ̀ ka nọkwa n’ọkwá dị otú ahụ ugbu a?

7 A malitere ịmara Chineke nke Israel oge ochie dị ka, na-akpọkwa ya, Jehova tseva-’ohth’, ma ọ bụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha. (1 Samuel 1:3, 11) Ná Ndị Rom 9:29 (King James Version) onyeozi Kraịst bụ Pọl zoro aka n’Aịsaịa 1:9 wee dee, sị: “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nke Sabaoth ahapụghịrị anyị otu mkpụrụ, anyị ga-adịworị ka Sodoma, a ga-emewokwarị ka anyị yie Gomorrha.” Ọzọkwa, onye na-eso ụzọ Kraịst bụ Jemes dere, sị: “Iti mkpu nke ndị ahụ ndị were ihe ubi abawo ná ntị nke Onyenwe anyị nke sabaoth.” (Jemes 5:4, KJ; American Standard Version) Ya bụ na Pọl na Jemes doro Chineke n’ọkwá nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha n’ime narị afọ mbụ nke Oge Anyị. N’ime narị afọ iri na asatọ ndị sochirinụ, Chineke ebubeghịrị Israel ime mmụọ, bụ́ Israel nke Chineke, agha anụ ahụ n’ụzọ ahụ o meere Israel oge ochie, ma ọ ka bụkwa Jehova nke usuu nile nke ndị agha.

8-10. (a) Ònye nyere ikike maka agha ahụ e buru n’eluigwe, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka Maịkael ji bụrụ onye kasị ruo eru ibu agha ahụ? (b) Gịnị si n’agha ahụ e buru n’eluigwe pụta, ogologo oge ha aṅaa fọdụkwara tupu agha nke oké ụbọchị Jehova?

8 Mgbe a mụpụtara Alaeze Mesaịa ahụ na 1914 n’ọgwụgwụ nke “oge nke ndị Jentaịl,” agha dara n’ebe obibi Jehova Chineke nke dị n’eluigwe. (Luk 21:24, KJ) Ọ̀ bụ onye nyere ikike maka agha nke ahụ? Ọ bụ Jehova Chineke n’onwe ya. O zipụrụ Ọkpara ya nke nọkwasịworo n’ocheeze ịbanye n’ihu agha, na-eji aha ahụ bụ Maịkael, n’ihi na Onye nke a bụ onye kasị ruo eru ịza ajụjụ nke dị n’aha ahụ, ya bụ, “Ònye Dị Ka Chineke?” Maịkael malitere ime ihe ngwa ngwa dị ka onye na-ebu agha nke na-anọchite anya Jehova nke usuu nile nke ndị agha.

9 N’ihi nke a, anyị na-agụ ná Mkpughe 12: 7- 10, sị: “Agha wee pụta n’eluigwe: Maịkael na ndị mmụọ ozi ya buru agha megide dragọn ahụ; dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya wee buo agha; ha enweghịkwa ike, a hụghịkwa ọnọdụ ha ọzọ n’eluigwe. E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, chụdakwa ndị mmụọ ozi ya, ha na ya. M wee nụ oké olu ka ọ na-ada n’eluigwe, sị, Ugbu a ka ọ bịaworo, bụ́ nzọpụta ahụ, na ike ahụ, na alaeze Chineke anyị, na ịchịisi nke Kraịst ya: n’ihi na a chụdara onye ahụ nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo.”

10 Ka ọ dị ugbu a, mgbe ihe karịrị 70 afọ gasịworo eri mgbe a lụrụ agha ahụ n’eluigwe, ọ bụ “nanị nwa oge” fọdụrụ tupu agha nke oké ụbọchị ahụ nke Jehova adaa, Chineke wee gosipụtakwa onwe ya n’ụzọ pụtara ìhè dị ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha nye ọgbọ nke dị ugbu a nke ihe a kpọrọ mmadụ.—Mkpugbe 12:12; Zekaraịa 14:3.

Onye ahụ nke Na-ebu Agha Iji Wepụ Jehova n’Ụta

11. Oge dị aṅaa a kara aka ka ihe fọdụrụ n’ìgwè atụrụ nta ahụ na oké ìgwè mmadụ ahụ na-echere, gịnịkwa ka ha ga-eti mkpu ọṅụ n’ihi ya?

11 N’okpuru nduzi mmụọ nsọ, Eze onye amamihe bụ Solomọn nke Israel oge ochie dere, sị: “Ihe ọ bụla nwere oge, mgbe dịkwaara ihe ọ bụla a na-eme n’okpuru eluigwe: . . . mgbe agha, na mgbe udo.” (Eklisiastis 3:1-8) N’elu ala, ndị na-eso ụzọ Eze ahụ na-achị achị. bụ́ “onye ka Solomọn” na-echere oge ahụ mgbe Ọ ga-eduru ndị mmụọ ozi nke elu­igwe ndị na-enwe mmeri banye n’ihu agha ahụ na Ha-Magedọn. (Matiu 12:42; Mkpughe 19:11-16) N’ebe ahụ, ọ ‘ga-ewere mkpanaka nke ígwè zụọ [mba nile] dị ka atụrụ,’ ‘jirikwa mkpanakwa ígwè’ na-etipịasị ha. (Mkpughe 19:15; Abụ Ọma 2:9) Lee nnọọ ka ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-edebe udo, ndị nọkwa ná nchebe, ga-esi nwee ọṅụ ná nnapụta dị ebube ọ napụtara ha! Nke a ga-agụnye ma ihe fọdụrụ ‘n’ìgwè atụrụ nta’ nke ndị nketa alaeze ibe ya na “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ya ndị na-enwe olileanya nke iketa elu ala bụ Paradaịs n’okpuru ọchịchị udo ya nke otu puku afọ. (Luk 12:32; Mkpughe 7:9-17; Jọn 10:16) N’ọṅụ, “n’okpuru ndọ̀ nke Onye pụrụ ime ihe nile,” ha ga-eti mkpu ọṅụ n’ihi oké mmeri nke Onye ọzụzụ atụrụ ahụ bụ Eze, bụ́ Jisọs Kraịst, nweworo n’ịkwado ịbụ ọkaaka eluigwe na ala nke Jehova Chineke.—Abụ Ọma 91:1.

12. Olee ebe agha si na-abịa iche mba nile ihu, gịnịkwa ga-esi na ya pụta dị ka Abụ Ọma 68:1, 2 na-egosi?

12 N’abụghị ikwu okwu karịa otú ọ dị n’ezie, a pụrụ ikwu ya ugbu a na agha nke sitere n’ógbè na-abụghị nke ndị mmadụ, nke metụtakwara iji ngwá agha ndị na-ada kpọmkwem ebe a tụrụ ha, ndị dịkwa n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu karịa bọmbụ nuklia ya nile, na-echere mba nile nke elu ala n’ihu, ma hà nọ n’ime òtù Mba Ndị Dị n’Otu (United Nations) ma ọ bụ na ha anọghị na ya. Gee ntị: “Ka Chineke bilie, ka ndị iro ya gbasaa; ka ndị na-akpọ ya asị si n’ihu ya gbalaga. Dị ka ifufe si efesa anwụrụ ọkụ, otú a ka ị ga-efesa ha: dị ka wax si agbazepụ n’ihu ọkụ, otú a ka ndị na-emebi iwu ga-esi n’ihu Chineke laa n’iyi.”—Abụ Ọma 68:1, 2.

13. Ka nkwadebe a na-eme maka agha ahụ nọ na-aga n’ihu, ọ̀ bụ onye ka a na-agwa okwu ahụ dị n’Abụ Ọma 45:1-6 ugbu a n’ụzọ kasị kwekọọ n’oge ya?

13 A malitewo ugbu a ime nkwadebe maka agha nke kachasị agha nile. Dị ka Onyeagha bụ isi nke Chineke, a na-agwa Onye ahụ na-ebu agha maka iwepụ Jehova n’ụta okwu ndị na-esonụ, ndị otu onye so ná mba Israel dere n’okpuru nduzi mmụọ nsọ, sị: “E mewo gị ka ị maa mma karịa ụmụ mmadụ; a wụkwasịwo amara n’egbugbere ọnụ gị abụọ: n’ihi ya Chineke agọziwo gị ruo mgbe ebighị ebi. Kee mma agha gị n’ụ́kwù gị, gị dike, ebube gị na ịma mma gị. N’ịma mma gị nọkwasị n’elu ịnyịnya gaa nke ọma, n’ihi eziokwu na umeala n’obi na ezi omume: aka nri gị ga-ezikwa gị ihe dị iche iche dị egwu. Akụ́ gị nile bụ ihe dị nkọ; ndị nile dị iche iche na-ada n’okpuru gị; akụ́ gị dị n’obi ndị iro eze. Ocheeze gị, bụ́ Chineke, na-adịru mgbe nile ebighị ebi: mkpanaka eze nke izi ezi ka mkpanaka eze nke alaeze gị bụ.”—Abụ Ọma 45:1-6.

Mba Dị Iche Iche Ejikọta Onwe Ha n’Otu Imegide Jehova

14, 15. Mgbe a tọhapụsịrị ha site n’ụlọ mkpọrọ, okwu dị aṅaa nke sitere n’Abụ Ọma 2 ka ndị ozi ahụ hotara dị ka nke na-emezunụ, oleekwa arịrịọ ha rịọrọ Chineke?

14 N’oge na-adịghị anya mgbe e guzobesịrị ọgbakọ ndị Kraịst n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., ndị Kraịst e tere mmanụ ghọtara mmezu nke Abụ Ọma 2:1, 2. Akụkụ akwụkwọ nsọ nke a na-agụ, sị: “N’ihi gịnị ka mba nile meworo oké mkpọtụ? N’ihi gịnị ka ndị nile dị n’ụwa na-atụgharị ihe efu uche? Ndị eze nke ụwa na-eguzo onwe ha, ndị isi na-agbakọtakwa izu, imegide Jehova, na imegide onye ya e tere mmanụ.” Mgbe ndị ozi nke Onye Jehova Tere Mmanụ hụsịworo ahụhụ njide mbụ e jidere ha na mmeso ọjọọ ndị Juu bụ ndị iro ha mesoro ha, ha sonyeghachiiri ndị Kraịst ibe ha, wee hota okwu ndị a dị n’Abụ Ọma 2 dị ka Eze Devid si dee ya. Ọrụ Ndị Ozi 4:23-30 na-akọ ihe mere mgbe ahụ, na-asị:

15 “Ma mgbe a hapụsịrị ha, ha bịakwutere ndị nke aka ha, wee kọọrọ ha ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke ndị isi nchụaja na ndị okenye sịrị ha rịị. Ma mgbe ha nụrụ ya, ha weere otu obi welie olu ha kpọkuo Chineke, sị, Onyenwe anyị, gị onwe gị bụ onye kere eluigwe na ala na oké osimiri, na ihe nile dị ha n’ime: onye sitere n’aka mmụọ nsọ, site n’ọnụ nna anyị Devid onye na-ejere gị ozi, sị, N’ihi gịnị ka mba nile mere oké mkpọtụ, ndị nile dị n’ụwa na-atụgharịkwa ihe efu uche? Ndị eze ụwa guzoro onwe ha n’otu, ndị isi zukọkwara, imegide [Jehova, NW], na imegide Kraịst ya: n’ihi na ọ bụ ezie na n’ime obodo a Herọd na Pọntiọs Paịlat, ha na ndị mba ọzọ na ndị Israel nile, zukọrọ imegide onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi, bụ́ Jisọs, onye i tere mmanụ n’isi, ka ha mee ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke aka gị na izu gị buru ụzọ kaa aka ka ha pụta. Ugbu a, [Jehova, NW], leekwa ịba mba ha anya: nyekwa ndị ohu gị ike ka ha were nkwuwa okwu nile kwuo okwu gị, n’isetị aka gị ime ka ahụ mmadụ dị ike; ka e wee meekwa ihe ịrịba ama na ọrụ ebube site n’aha onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi, bụ́ Jisọs.”

16, 17. (a) N’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ, ọ̀ dịtụwo ihe ọ bụla merenụ a pụrụ iji tụnyere ihe malitere ime na 1914? Kọwaa. (b) Ụzọ omume dị aṅaa ka mba nile nọgidere na-agbaso, wee si otú ahụ na-eme ka ọ dị mkpa ka Jehova Chineke dee gịnị, n’ihe banyere ‘akwụkwọ nke agha ya dị iche iche’?

16 Otú ọ dị, mgbe a bịara n’ihe banyere mba ndị na-eme oké mkpọtụ, ndị eze iwerekọ ọnọdụ ha n’otu, ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị izukọta megide Jehova na Onye o Tere Mmanụ, bụ́ Jisọs Kraịst, olee ihe meworo n’akụko ihe mere eme nke mmadụ nke a pụrụ iji tụnyere ihe ahụ malitere na 76 afọ gara aga na 1914? Ọ bụghị nanị na agha ụwa mbụ nke e nwetụworo mgbe ọ bụla kemgbe mmadụ malitere ịdị adị malitere n’afọ ahụ, kama ọ bụ kpọmkwem n’afọ ahụ ka oge ndị Jentaịl, bụ́ ‘oge a kara aka nke ndị mba ọzọ,’ bịara ná njedebe! (Luk 21:24) N’ụzọ doro anya, Abụ Ọma 2 nwere mmezu ya ka ukwuu malite n’afọ ahụ.

17 N’ọgwụgwụ nke oge ndị Jentaịl na 1914, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime mba nile—ọbụna mba dị iche iche nke ihe ahụ a kpọrọ Krisendọm, bụ́ nke ọtụtụ ụmụ amaala ha na-ele onwe ha anya n’ụzọ okpukpe dị ka ndị Israel ime mmụọ—nke nwere ọchịchọ ịnabata Onye Jehova Tere Mmanụ, bụ́ Jisọs Kraịst n’ocheeze nke ịchị elu ala dum. Ugbu a kwa, 71 afọ mgbe a malitesịrị ‘ikwusa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile,’ malite na 1919 gaa n’ihu, mba ndị so na Krisendọm ma ndị na-esoghị adịghị nke ọ bụla gaje inye Eze nke Jehova ahụ a maworo ọkwa ya eri ogologo oge otuto, kwekwa nkwa inye ya nsọpụrụ ka ha na-atọgbọ ọkwá ọchịchị nke ha onwe ha n’elu ala. (Matiu 24:14) N’ụzọ megidere nke ahụ, ha emesịwo rute n’oge na n’ọnọdụ ahụ mgbe ba na-eme ka ọ dị mkpa ka Jehova dee, dị ka a pụrụ ikwu ya, oké ndezu nke “akwụkwọ agha dị iche iche nke Jehova.”—Ọnụ Ọgụgụ 21:14. ‘

Mmeri Dị Ebube nke Chineke ahụ Onye Na-ebu Agha

18. Ihe omume dị aṅaa nke Jehova ka anyị na-akwado, ònyekwa ga-anọ n’akụkụ ya, dị ka a pụrụ ikwu ya, maka mmezu nke Abụ Ọma 110?

18 Ya mere, gaanụ n’ihu, Oo Jehova nke usuu nile nke ndị agha, gị na Ọkpara gị bụ eze, bụ́ Jisọs Kraịst, n’akụkụ gị! Ọ bụ ya ka a gwara okwu amụma ahụ bụ: “Gị nwee ike n’ahụ mmadụ n’etiti ndị iro gị. [Jehova, NW] n’aka nri gị amapuwo ndị eze n’ụbọchị iwe ya. Ọ ga-ekpe ikpe n’etiti mba nile, ebe nile jupụtara n’ozu; ọ mapuwo isi mmadụ n’elu ọtụtụ ala.”—Abụ Ọma 110:2, 5, 6.

19. N’ihe banyere agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe nile nke na-abịa nso, ekpere dị aṅaa ka anyị na-ekpe n’isi oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ?

19 Oo Jehova nke usuu nile nke ndị agha, kwee ka ndị ohu gị kwesịrị ntụkwasị obi n’elu ala bụrụ ndị ga-eji ọṅụ hụrụ mmeri gị na-enweghị atụ site n’aka Eze gị bụ onyeagha, Jisọs Kraịst, n’oge a ga-ebu agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile n’ebe ahụ nke a na-akpọ n’asụsụ Hibru Ha-Magedọn! (Mkpughe 16:14) Tinyere ihe ahụ fọdụrụ n’ezi ndị Israel ime mmụọ, ka oké ìgwè mmadụ ahụ nke ndị yiri atụrụ, ndị “sakwara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ” jiri ọṅụ ‘si n’oké mkpagbu ahụ pụta’ ịbụ ndịàmà gị n’elu ala ruo mgbe nile ebighị ebi! (Mkpughe 7:14) N’okpuru nlekọta ịhụnanya gị, ka ha lanarị n’anwụghị anwụ banye n’ókèala ahụ na-agaghị enwe agha ọ bụla nke Ọkpara gị nke nwere mmeri, onye ga-achị elu ala e meworo ka ọ dị ọcha, nke a ga-emekwa ka ọ ghọọ paradaịs mara oké mma, n’ikwekọ ná nzube gị mbụ. Ka ha bụrụ ihe àmà a na-ahụ anya nye ndị nile nwụrụ anwụ, bụ́ ndị a ga-esi n’ọnwụ kpọlite, iji kwadoo ịbụ ọkaaka eluigwe na ala ahụ nke kwesịrị ịbụ nke gị! Anyị na-ekele gị na n’oge ahụ, ị ga-edoziworị ihe iseokwu eluigwe na ala ahụ kpam kpam, ee, ruo mgbe ebighị ebi!

Ị̀ Na-echeta?

◻ Gịnị bụ ihe iseokwu bụ isi nke na-eche umu mmadụ na ndị mmụọ ozi ihu?

◻ Ọdịiche dị aṅaa dị n’etiti agha Jehova Iụụrụ Israel oge ochie na nke ọ ga-alụrụ Israel ime mmụọ?

◻ N’Amagedon, ọnọdụ dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova ga-ewere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

◻ Olee mgbe Abụ Ọma 2:1,2 nwere mmezu a na-enwebeghị ihe yiri ya na mbụ?

◻ À ga-esi aṅaa dozie ihe iseokwu eluigwe na ala ahụ ruo mgbe ebighị ebi?

[Foto dị na peeji nke 24, 25]

“Oké ìgwè mmadụ” ahụ ga-eji iti mkpu ọṅụ nabata Onye Ọzụzụ Atụtụ Chineke nke bụ Eze nke na-enwe mmeri

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya