Ndezụ Na-Abịanụ Nke “Akwụkwọ Agha Dị Iche Iche Nke Jehova”
“A na-asị n’akwụkwọ agha dị iche iche nke Jehova.”—ỌNỤ ỌGỤGỤ 2:14.
1, 2. N’ihe omume mgbe ochie dị aṅaa ka Jehova gosipụtaara ndị Ijipt na ya bụ Chineke nke na-ebu agba, ò sikwa aṅaa mee ya?
NDỊ nke oge a adịghị aghọtacha nke ọma na Chineke nke Bible, bụ́ Jehova, bụ onyeagha, onye bụ dike n’ibu agha. E mere ka eziokwu nke a pụta ìhè mgbe ọ napụtara ndị ya nke oge ochie site ná mmegbu a na-emegbu ha n’Ijipt. Onyeiro a na-adịghị ahụ anya nke ndị ahụ, Setan bụ́ Ekwensu, kpaliri Fero ịgbalị ime ka ha rụgbuo onwe ha n’ọrụ. Ugbu a, n’ịghọta ihe na-efunarị ya site n’ikwe ka ndị Israel ahụ laara onwe ha, Fero na usuu ndị agha ya chụsoro ha.
2 Otú ọ dị, Fero aghọtaghị na Chineke nke ụmụ Israel pụrụ ịghọ Chineke nke na-ebu agha ka o wee napụta ndị Ya. Ka usuu ndị agha Ijipt ahụ nọ na-enubaju n’ala kpọrọ nkụ nke dị n’ala Osimiri Uhie ahụ ná nchụso nke ịbọ ọ̀bọ̀, Chineke nke ụmụ Israel ahụ ndị nọ n’ihe ize ndụ mere ihe wee mee ka mmiri rikpuo ndị nọ n’ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya, na-eme ka mmiri ahụ e nukọbara enukọba sọdata n’ike wee rikpuo ụzọ mgbapụ ahụ nke e meghewooro ụmụ Israel n’ụzọ ọrụ ebube. —Ọpụpụ 14:14, 24-28.
3. N’abụ mmeri ha, ụmụ Israel ahụ gosipụtara Jehova ịbụ ụdị Chineke dị aṅaa, oleekwa eziokwu nke mba nile nke oge a na-elefuru anya?
3 Mgbe ha pụworo n’ihe ize ndụ wee nọọ n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Uhie ahụ, ụmụ Israel ahụ ọṅụ jupụtara obi bụrụ otu abụ mmeri, na-enye Onye Mgbapụta ha nke bi n’eluigwe otuto, sị: “Ka m bụkuo Jehova abụ, n’ihi na o biliwo elu nke ukwuu: ịnyịnya na onye ọ na-ebu, ọ tụbawo ha n’oké osimiri. Ike m na abụ ọma m ka Jaa bụ, o wee ghọọrọ m nzọpụta: Onye a bụ Chineke m, m ga-emekwa ya ka ọ dị elu; Chineke nke nna m, m ga-ewelikwa ya elu. Jehova bụ onyeagha: Jehova bụ aha ya. Ụgbọ ala Fero nile na usuu ndị agha ya ka ọ tụfuworo n’oké osimiri: ndị isi agha ya a họpụtara ahọpụta, ha emikpuwo emikpu n’Oké Osimiri Uhie.” (Ọpụpụ 15:1-4) N’ebe ahụ, n’Osimiri Uhie ahụ, Jehova gosipụtara onwe ya ịbụ onyeagha nke nwere ike ịrụ ọrụ ndị kwesịrị ịrịba ama. Mba nile nke ụwa lefuuru eziokwu nke a anya.
4, 5. Nna ochie dị aṅaa ka ebo iri na abụọ nke Israel ahụ na-enwe ọṅụ sitere na ya, ọ̀ bụkwa enyi onye ka onye a ghọrọ n’ihi àgwà dị aṅaa?
4 Moses onye amụma, bụ́ onye duziri ịbụ abụ ahụ nke sitere n’ike mmụọ Chineke, kwuru banyere Jehova dị ka “Chineke nke nna m.” Onye Hibru ahụ bụ Abraham bụ nna ochie pụtara ìhè nke mba Israel. Site na ya, sitekwa n’Aịsak na Jekọb, ụmụ iri na abụọ nke Jekọb, ka e si nweta ebo iri na abụọ nke Israel. Abraham gosipụtara onwe ya ịbụ ezi ihe nlereanya nke onye na-efe Jehova Chineke ofufe. Ọ bụ nwoke nwere okwukwe siri ike nke na mgbe Jehova kpọrọ ya òkù ka ọ hapụ obodo ya dị na Ua nke ndị Kaldea, ọ laghị azụ ọ bụla n’ịhapụ wee jewe ala ahụ nke Jehova gaje igosi ya, na-enwe obi ike na Chineke ga-emezu nkwa Ya inye ya na ụmụ ya ala ahụ.
5 N’ihi okwukwe Abraham nke na-enweghị atụ, Jehova kwere nkwa inye Abraham otu “mkpụrụ” ma ọ bụ nwa, nke ezinụlọ nile nke ụwa, gụnyere ezinụlọ ndị dị adị taa, ga-esite na ya gọzie onwe ha. (Jenesis 12:2, 3; 22: 17, 18) Abraham na Chineke ya nwere mmekọrịta chiri anya nke ukwuu nke na a maara ya dị ka “enyi nke Jehova,” Chineke n’onwe ya kpọkwara nna ochie ahụ nwere okwukwe “enyi m.”—Jemes 2:23, NW; Aịsaịa 41:8, NW.
6. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye udo nke na-eme njegharị n’Ala Nkwa ahụ, Abraham si aṅaa gosipụta onwe ya ịbụ onye na-alụ ọgụ nke tụkwasịrị Jehova obi?
6 Ọ bụ ezie na ọ na-ejegharị dị ka onye ọbịa n’Ala Nkwa ahụ, Abraham gosipụtara na ya pụrụ ime ihe dị ka onye na-alụ ọgụ, bụ́ onyeagha. N’otu oge, ndị eze anọ si n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ wakwasịrị Ala Nkwa ahụ wee dọkpụrụ nwa nwanne Abraham bụ Lọt na ezinụlọ Lọt laa. Abraham n’ịbụ onye nkekọ ezinụlọ siri ike kpaliri, nyere 318 ndị ohu ya ndị ikom ihe agha, tinyekwara enyemaka o nwetara n’aka ndị enyi ya atọ bi n’obodo ahụ, bụ́ Ana, Eshkọl, na Mamre, ọ chụsoro usuu ndị ahụ na-apụnara mmadụ ihe. Site n’ịwakwasị ha na mberede n’anyasị, Abraham na ndị òtù ya meriri usuu ndị agha mmegide ahụ, ọ bụ ezie na ndị a dị nnọọ ike nke ukwuu karị. E nwere “ogbugbu ndị eze.” (Ndị Hibru 7:1; Jenesis 14:13-17) Abraham napụtara Lọt na ezinụlọ ya wee nwetaghachi ihe nile e zuuru n’ohi.
7-9. (a) Onye nchụaja dị aṅaa ka Abraham jekwuuru, ngọzi dịkwa aṅaa ka ọ natara? (b) Olee ụzọ Abraham si gosi na ya chọrọ ka ọ bụrụ nanị Chineke Onye Kasị Elu mere ya ọgaranya? (ch) Dị ka Melkizedek kwadoro, ònye nyere Abraham mmeri n’agha ahụ?
7 Abraham ghọtara na obubuagha ya ahụ nwere ihe ịga nke ọma nanị site n’enyemaka nke Jehova Chineke, mgbe ọ nọkwa na njem mmeri na-alaghachi, o nwere ike ikwupụta eziokwu nke a n’ihu ọha. Ọ maara na ya ga-achọta onye nchụaja nke Chineke ya kwadoro n’obodo Selem. Ya mere, ọ zọọrọ ije gaa n’obodo ahụ. Akụkụ ikpeazụ nke Jenesis isi 14 na-akọrọ anyị ihe merenụ:
8 “Melkizedek, bụ́ eze Selem, wee bupụta achịcha na mmanya vine: onye ahụ bụkwa onye nchụaja dịịrị Chineke Nke kachasị ihe nile elu. O wee gọzie ya, sị, Onye a gọziri agọzi ka Abram bụ site n’aka Chineke Nke kachasị ihe nile elu, bụ́ Onyenwe eluigwe na ụwa: ọ bụkwa onye a gọziri agọzi ka Chineke Nke kachasị ihe nile elu bụ, onye rawooro ndị na-akpagbu gị nye n’aka gị. O wee nye ya otu ụzọ n’ụzọ iri n’ime ihe nile. Eze Sọdọm wee sị Abram, Nye m nanị nke bụ mmadụ, ma were akụ n’onwe gị. Abram wee sị eze Sọdọm, Ewe̱liwo m aka m nye Jehova, bụ́ Chineke Nke kachasị ihe nile elu, Onyenwe eluigwe na ụwa, na m gaghị ewere ihe ma ọlị n’ime ihe ọ bụla nke i nwere, site n’ogho wee ruo n’eriri akpụkpọ ụkwụ, ka i wee ghara ịsị, Mụ onwe m emewo Abram ka ọ bụrụ ọgaranya. Ka ihe ọ bụla ghara ịdịri m: nanị ihe nke ụmụ okorobịa ndị a riri, na òkè nke ndị ikom ahụ mụ na ha yịkọrọ jee: Ana, na Eshkọl, na Mamre, ka ha onwe ha were òkè ha.”—Jenesis 14: 18-24.
9 Dị ka amaokwu ndị a na-egosi, Melkizedek, bụ́ onye nchụaja na eze nke obodo Selem, kwadoro nkwenye Abraham kwenyere na ọ bụ Chineke Onye kachasị ihe nile elu lụwooro ya na usuu ndị agha ya ọgụ, nyekwa ya mmeri. Eze ahụ bụ Onye nchụaja, bụ́ Melkizedek ewepụghị ihe ọ bụla n’òkè Jehova keere n’okwu ahụ.
Akwụkwọ Agha Dị Iche Iche nke Jehova
10. Gịnị bụ nke mbụ a kpọtụrụ obubuagha aha n’ime Bible, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka nke a ji bụrụ nanị mmalite nke agha ndị Jehova ga-enwe mmeri na ha?
10 Nkọwa ahụ e nwere na Jenesis 14 nke mwakwasị a wakwasịrị Ala Nkwa ahụ na nke Abraham imeri ndị agha mwabata ahụ bụ nke mbụ a kpọtụrụ obubuagha aha n’ime Akwụkwọ Nsọ. Otú a, ihe karịrị narị afọ anọ tupu oké ihe omume ahụ o mere n’Osimiri Uhie, Jehova gosipụtara onwe ya dị ka onyeagha, ‘onye bụ dike n’ibu agha.’ Ma, nke ahụ bụ nanị mmalite. Mmeri ndị ka ukwuu, ndị a ga-anụkwa anụ karị, ga-esochi, gụnyere nke ikpeazụ ahụ nke ga-adị n’ime ‘ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a.’—Matiu 24:3.
11. Gịnị bụ “akwụkwọ agha dị iche iche nke Jehova,” ma olee ebe ọzọ e nwere ịba ụba nke ihe ndekọ nke mmeri ndị o nwere n’agha?
11 Dị ka ihe e kwuru n’Ọnụ Ọgụgụ 21:14 si dị, e dere “akwụkwọ agha dị iche iche nke Jehova.” Ma eleghị anya, ihe ndekọ nke a nke a pụrụ ịdabere na ya, ma ọ bụ akụkọ ihe mere eme, nke agha dị iche iche Chineke lụwooro ndị ya, nwere mmalite ya n’agha nke a o buuru Abraham ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. Moses maara ihe banyere akwụkwọ nke a, ma ọ kọghịrị anyị ihe ọ bụla ọzọ banyere ya. Ya mere, a kọghịrị anyị ụzọ nile Jehova siri gosipụta onwe ya ịbụ onyeagha n’oge dum nke akwụkwọ ahụ nke Agha dị iche iche nke Jehova metụtara. Otú ọ dị, eri mgbe a kpọtụrụ akwụkwọ ahụ aha, e dewo akụkụ ka ukwuu nke Bible Nsọ, nke a na-akọkwara anyị ọtụtụ akụkọ banyere mmeri ndị Jehova nweworo n’agha.
Melkizedek ahụ Ka Ukwuu—Onyeagha
12. Melkizedek sere onyinyo Onyeagha dị aṅaa nke ka ukwuu nke Chineke Onye Kasị Elu, oleekwa abụ ọma Devid dere nke a bụkuru onye nke a dị ka onye nchụaja nakwa onyeagha?
12 Mgbe Abraham merisịrị Kedoalaoma na ndị eze ndị ahụ sonyeere ya, Melkizedek gọziri ya. N’ụzọ amụma, Eze ahụ bụkwa Onye nchụaja, bụ́ Melkizedek sere onyinyo Onye nke gaje ịbụ Onyeisi Ncbụaja nke Chineke onye kasị elu, bụrụkwa onye bụ dike n’ibu agha nke Chineke ahụ Kasị Elu na-akwado. Ọ bụ onye nke a ka Melkizedek onye Selem ukwuu ka a gwara okwu ahụ dị n’Abụ Ọma 110, bụ́ nke onyeagha ahụ bụkwa eze, bụ́ Devid, dere n’okpuru nduzi nke mmụọ Chineke, mgbe ọ sịrị: “Mkpanaka nke ike gị ka Jehova ga-esi na Zaiọn zipụta: Gị nwee ike n’ahụ mmadụ n’etiti ndị iro gị. Jehova aṅụwo iyi, ọ gaghị echegharịkwa uche ya, gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro Melkizedek si dị. [Jehova, NW] n’aka nri gị amapuwo ndị eze n’ụbọchị iwe ya.”—Abụ Ọma 110:2, 4, 5.
13. Ná Ndị Hibru isi 7 na 8, ònye ka e gosipụtara na Onye ahụ karịrị Melkizedek oge ochie ukwuu bụ, oleekwa ebe dị elu Onye nke a banyere, na-ejikwa ụdị àjà dị aṅaa?
13 Onye ahụ dere akwụkwọ Ndị Hibru n’okpuru nduzi mmụọ nsọ gosipụtara Onye a gwara okwu ndị ahụ n’ezie mgbe ọ sịrị: “Jisọs batara n’ihi anyị dị ka onye na-ebu ụzọ gbaa ọsọ, ebe e mere ya ka ọ bụrụ onyeisi nchụaja ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro nke Melkizedek si dị.” (Ndị Hibru 6:20) N’isiakwụkwọ na-esochinụ nke akwụkwọ Ndị Hibru, a kọwara ịdị ukwuu nke Melkizedek nke oge ochie. Otú o sina dị, ịdị ukwuu ya dị ka onye nchụaja bụ nke dị ala ma e jiri ya tụnyere nke Onye ahụ o sere onyinyo ya, bụ́ Jisọs Kraịst ahụ e meworo ka o si n’ọnwụ bilie, meekwa ka ọ dị ebube, bụ́ onye banyere n’ebe dị nsọ n’ihu Jehova n’onwe ya, na-eji uru nke àjà nke dị ukwuu hie nne karịa ihe ọ bụla Eze ahụ bụ Onye ncbụaja, bụ́ Melkizedek onye Selem, pụrụ ịchụworị n’àjà mgbe ọ bụla.—Ndị Hibru 7:1-8:2.
14. Melkizedek ahụ Ka Ukwuu ò nyewo ndị ụkọchukwu Krisendọm ikike ikere òkè n’obubuagha nke mba ndị a na-akpọ nke ndị Kristian?
14 Eze onye nchụaja ahụ bụ Melkizedek gọziri onyeagha, bụ́ Abraham ahụ nwere mmeri. Ma gịnị banyere Melkizedek ahụ Ka Ukwuu, bụ́ onye guzobere ezi Iso Ụzọ Kraịst? Ndị ụkọchukwu Krisendọm na-ekwu na ha na-anọchite anya Jisọs Kraịst n’ịgọzi usuu ndị agha nke mba ndị a sị na ha bụ nke ndị Kristian, na-ekpekwara ha ekpere. Ma, Onyeisi nchụaja nke Jehova, nke nọ n’eluigwe, ọ̀ kwadowo ndị ụkọchukwu Krisendọm n’ime nke a? Ò siwo otú a nakwere na ọ bụ ya ka ụta dịịrị maka mwụfu ọbara nile e meworo n’ime ihe a kpọrọ ọgbọ nke ndị Kristian, gụnyere ọbara ahụ a wụfuru n’ime Agha Ụwa Mbụ na nke Abụọ? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla o kwere ka ezi ndị na-eso ụzọ ya mee onwe ha ịbụ akụkụ nke ụwa nke a, sonyekwara usuu ndị agha ya nke na-awụfu ọbara.
Chineke ahụ nke Bụ Onyeagha Emeere Onwe Ya Aha Mara Mma
15, 16. Gịnị ka Jehova meere onwe ya mgbe ọ lụụrụ ndị ya ọgụ ịnapụta ha site n’Ijipt?
15 Nehemaịa 9:10 na-ezo aka ná nnapụta Jehova napụtara ebo iri na abụọ nke Israel site n’Ijipt, na-asị: “I wee tinye ihe ịrịba ama na ihe ebube n’ahụ Fero, na n’ahụ ndị ohu ya nile, na n’ahụ ndị nile nke ala ya; n’ihi na ị maara na ha weere nganga megide ha [ụmụ Israel]; i wee meere onwe gị aha, dị ka o si dị taa.”—Tụlee Ọpụpụ 14:18.
16 Aịsaịa onye amụma na-ezo aka n’ọdịdị nke aha nke a mgbe o kwuru okwu banyere Jehova dị ka “nke na-eme ka ógwè aka ya mara mma jee ije n’aka nri Moses; nke na-ekewa mmiri n’ihu ha, imere onwe ya aha ebighị ebi.” N’ịgwakwa Jehova okwu, ọ sịrị: “Otú a ka i duru ndị gị, imere onwe gị aha mara mma.” (Aịsaịa 63:12-14) N’ịrịọkwa Jehova ka o meekwa ihe ọzọ n’ihi ndị ya, Daniel gwara ya okwu dị ka “onye wereworo aka dị ike mee ka ndị gị si n’ala Ijipt pụta, i wee meere onwe gị aha, dị ka o si dị taa.”—Daniel 9:15; Jeremaịa 32:20.
17. Ònye ka Jehova ga-ezipụ ịlụ agha n’aha ya, gịnịkwa ka ọ ga-esi otú a gosi mba nile nke oge a?
17 Mgbe oge ya ruru, Jehova Chineke ga-ezipụ Jisọs Kraịst, bụ́ Melkizedek ahụ Ka Ukwuu, dị ka onye bụ dike n’ibu agha. Site na ya, Jehova ga-emere onwe ya aha nke karịrị ihe ọ bụla e nweworo n’oge gara aga dị ka a kọwara ya n’akwụkwọ ahụ nke Agha dị iche iche nke Jehova ma ọ bụ n’ime Akwụkwọ nsọ ndị Hibru nke dị n’ime Bible Nsọ. N’ime isiakwụkwọ ikpeazụ nke akwụkwọ na-esote nke ikpeazụ n’Akwụkwọ Nsọ ndị Hibru, e buru amụma banyere mbuso agha nke njikọ mba dị iche iche ga-ebuso Jerusalem. Mgbe ahụ, dị ka Zekaraịa 14:3 si kwuo, “Jehova ga-apụkwa, buso mba ahụ nile agha, dị ka n’ụbọchị o buru agha n’ụbọchị ịlụ ọgụ.” N’ụzọ dị otu a, Chineke nke Bible ga-egosi mba nile dị ugbu a na ya ka bụkwa Chineke ahụ onye na-ebu agha nke ọ bụ n’oge Israel oge ochie.
18, 19. Olee Jerusalem nke mba nile ga-ebuso agha zuru ezu?
18 Nke a bụ olileanya nke ka na-echere anyị n’ọdịnihu. Ma, olee Jerusalem nke a ga-ebuso agha zuru ezu otú ahụ? Amụma ahụ emezughị n’ahụ Jerusalem nke dị n’oge Zekaraịa. Ndị agha Rom bibiri obodo ahụ n’afọ 70 O.A. Otú ọ dị, e wughachiri Jerusalem, ma Krisendọm ma mba Israel nke anụ ahụ na-elekwa ya anya taa dị ka ihe dị nsọ. N’agha ụbọchị isii ahụ a lụrụ na 1967, Israel anụ ahụ weghaara Jerusalem dum ahụ e wughachiri ewughachi n’elu ala. Otú ọ dị, e nweghị ihe àmà ọ bụla gosiri na Jehova Chineke keere òkè ọ bụla n’agha a lụrụ mgbe ahụ. Eze Ya nke nọkwasịworo n’ocheeze, bụ́ Jisọs Kraịst, anaghị achị achị na Jerusalem elu ala, ọ bụghịzikwa “obodo nke Eze ukwu ahụ,” ya bụ, nke Jehova.—Matiu 5:35.
19 Ee e, isi obodo nke a nke mba ndị Juu ahụ so n’òtù Mba Ndị Dị n’Otu (United Nations) abụghị Jerusalem ahụ a kpọtụrụ aha n’amụma Zekaraịa. Kama nke ahụ, Zekaraịa na-ezo aka na Jerusalem ahụ nke anyị na-agụ banyere ya n’akwụkwọ Ndị Hibru. N’ebe ahụ, Pọl na-agwa ndị Kraịst e tere mmanụ okwu, na-asị: “Unu abịaruwo ugwu Zaiọn, na obodo nke Chineke dị ndụ, bụ́ Jerusalem nke dị n’eluigwe, na ọtụtụ ndị [mmụọ ozi, NW] a na-apụghị ịgụta ọnụ.” (Ndị Hibru 12:22) Jerusalem nke a dị n’eluigwe abụghị nke ọ bụla ọzọ ma e wezụga Alaeze Mesaịa nke Chineke, nke ìgwè nta nke ndị Kraịst e tere mmanụ na-anọchite anya ya n’elu ala taa, bụ́ ndị nwere olileanya nke ịbụ ndị ga-eso Jisọs Kraịst chịa achịa n’Alaeze ahụ. Ọ bụ ndị a ka a ga-ebuso agha ahụ e buru n’amụma.
20. Okwu dị aṅaa ka Eze Hezekaịa gwara ndị ya e yiri egwu iji mesie ha obi ike, ọ̀ bụkwa n’okwu nke Eze dị aṅaa nke ka Hezekaịa ukwuu ka Ndịàmà Jehova na-emesi onwe ha obi ike taa?
20 Otú ọ dị, ma ndị a, ma oké ìgwè mmadụ nke ndị Kraịst ndị nwere olileanya elu ala, bụ́ ndị siworo ná mba nile pụta isonyere ha n’ofufe dị ọcha ekwesịghị ịtụ egwu ihe ga-esi ná mbuso agha nke a pụta. Mgbe usuu ndị agha na-eyi egwu nke Senakerib, bụ́ eze Asiria, bịara megide Jerusalem n’oge Eze Hezekaịa na-achị achị, e mere ka ndị Israel ahụ nọ n’ihe ize ndụ lee okwu ahụ anya n’ụzọ na-adajụ obi mgbe Eze Hezekaịa gwara ha, sị: “Nke nọnyeere ya bụ ògwè aka nke anụ ahụ; ma nke nọnyeere anyị bụ Jehova, Chineke anyị, inyere anyị aka na ibu agha nile anyị.” Ihe si na nke a pụta bụ na “ndị Juda wee dabere onwe ha n’elu okwu nile nke Hezekaịa, bụ́ eze Juda.” (2 Ihe Emere 32:8) Taa, mgbe usuu ndị agha nke mba dị iche iche nke usoro ihe elu ụwa dị ugbu a yiri Ndịàmà Jehova egwu, ha pụrụ imesi onwe ha obi ike site n’okwu ndị yiri nke ahụ nke si n’ọnụ eze nke ka Hezekaịa ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst.
21. (a) N’ihi gịnị ka a ga-eji cheta okwu Jahaziel n’oge agha na-abịanụ nke a gaje ibuso Jerusalem nke dị n’eluigwe? (b) Gịnị ga-esi n’agha ahụ nke a gaje ibu pụta?
21 N’oge ahụ, a ga-echeta okwu ndị ahụ na-ewusi okwukwe ike nke Jahaziel onye Livaị kwuru, sị: “Ọ bụghị unu ga-enwe ibu agha n’agha nke a: guzoonụ onwe unu, guzoo, hụ nzọpụta Jehova n’etiti unu, Juda na Jerusalem: unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ: echi pụkwurunụ ha; Jehova nọnyekwara unu.” (2 Ihe Emere 20:17) Ee, n’ime oge ihe ize ndụ ahụ nile, Jehova ga-anọnyere ndị ya. Nchebe ha na nzọpụta ha ga-adabere na ya ịlụrụ ha ọgụ. Ọ ga-alụkwa ọgụ, site n’aka Eze onyeagha ya, bụ́ Jisọs Kraịst! Gịnị ga-esi na nke a pụta? Ọ bụ mkpochapụ kpam kpam nke nzukọ Ekwensu a na-ahụ anya n’elu ala.—Mkpughe 19:11-21.
22. (a) Gịnị ga-abụ ndezu mmeri nke akwụkwọ Agha dị iche iche nke Jehova, gịnịkwa ka Jehova ga-esi otú ahụ meere onwe ya? (b) Gịnị ka mmeri nke Jehova ga-akpali ndị nile hụrụ aha ya n’anya ime?
22 Lee nnọọ aha mara mma Chineke ga-emere onwe ya site ná mmeri dị ebube ọ ga-emeri ‘n’agha nke a nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe nile’ na Ha-Magedọn! (Mkpughe 16:14, 16) Dị ka a pụrụ ikwu ya, a ga-edenye isiakwụkwọ ọhụrụ n’akwụkwọ Agha dị iche iche nke Jehova. Ọ ga-abụ mmechi nke ọṅụ mmeri, oké ọgwụgwụ n’ihe banyere usoro ihe nke a. Dị ka a pụrụ ikwu ya, akwụkwọ ahụ, n’ozuzu ya, ga-egosi na ọ dịbeghị mgbe ọ bụla e meriri Chineke Onye pụrụ ime ihe nile n’agha. Lee nnọọ ka ndị hụrụ aha Jehova n’anya ga-esi jiri ọṅụ nye ya otuto mgbe nke a gasịrị! Mgbe ahụ, n’ezie, a ga-emezu amaokwu ikpeazụ dị n’akwụkwọ Abụ Ọma n’ụzọ dị ebube: “Ka ihe ọ bụla nke na-eku ume too Jaa. Toonụ Jaa.”—Abụ Ọma 150:6.
Ajụjụ maka Ntụleghachi
◻ Gịnị ka ndị nke oge a na-adịghị aghotacha banyere Chineke nke Bible, bụ́ Jehova?
◻ Agha dị aṅaa ka Abraham buru, ònyekwa nyere ya mmeri?
◻ Gịnị bụ “akwukwọ agha dị iche iche nke Jehova”?
◻ Gịnị ga-abụ ndezu nke “akwukwọ agha dị iche iche nke Jehova,” gịnịkwa ga-esi na ya puta?