Ndị Na-eto Eto Ndị Na-ejere Chineke Ozi
Ị̀NA-AHỤ ya dị ka ihe a na-adịghị ahụkebe, bụ́ ọmarịcha ndị na-eto eto iji oge ha mee ihe, n’anataghị ụgwọ ọ bụla, ịbịa n’ụlọ gị ikwu okwu banyere Chineke? Ò yiri ihe na-eju anya n’ime ọgbọ nke ekweghị ekwe na-abawanye ụba n’ime ya, na ụmụntakịrị na-esonyere ndị mụrụ ha n’ịgwa ndị ọzọ okwu banyere nkwa Bible ndị dị ebube nke ọdịnihu obi ụtọ?a
N’ime ihe ka ọtụtụ n’ihe ahụ karịrị 60,000 ọgbakọ Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa, ị ga-ahụ ọtụtụ ndị na-eto eto. Ha adịghị eje nnọkọ Sunday school ma ọ bụ klasị katkism a na-enwe kwa izu. Kama nke ahụ, ndị a na-eto eto na-erite uru, ọbụna na-ekere òkè ná nzukọ ọgbakọ dị iche iche. Ndị ka dị ntakịrị pụrụ ịza ajụjụ ndị dị mfe. Ndị na-agbarubeghị afọ iri na-ekere òkè n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ọtụtụ ndị nọ n’afọ iri na ụma na-eji oge ezumike ụlọ akwụkwọ ha na-eme ihe inyere ndị agbata obi ha aka ịmụta ihe banyere Chineke na nkwa ya ndị dị ebube maka ọdịnihu.
N’ezie ọrụ dị otú a nke ndị na-eto eto na-arụ abụghị ihe ọhụrụ. Bible na-akọrọ anyị banyere ụmụ okoro na agbọghọ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, gụnyere ndị na-eto eto na obere ụmụntakịrị, ndị setịpụrụ ihe nlereanya pụrụ iche n’ijere Chineke ozi.
Akwụkwọ Bible bụ Abụ Ọma buru amụma banyere “ụmụ okorobịa,” ndị na-enye ume ọhụrụ, dịkwa ọtụtụ dị ka “igirigi,” nọ n’ozi Chineke. O kwukwara okwu banyere “ụmụ okorobịa” na “ụmụ agbọghọ” ndị na-eto aha Jehova. (Abụ Ọma 110:3; 148:12, 13) Ma eleghị anya, ụfọdụ ndị na-eto eto so ná ndị nọ ya mgbe a wụpụrụ mmụọ Chineke n’isi ndị kwere ekwe na Pentikọst nke afọ 33 O.A. N’ụbọchị ahụ, ihe dị ka 3,000 mmadụ nabatara Okwu Chineke, e wee mee ha baptism. Pita onyeozi kwuru na ihe omume nke a dị ịtụnanya bụ mmezu nke amụma Joel, bụ́: “Ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebukwa amụma, ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụụ, ndị okenye unu ga-arọkwa nrọ.”—Ọrụ 2:4-8, 16, 17, 41.
Ihe nlereanya ndị ọzọ dị na Bible nke ndị jeere Jehova Chineke ozi mgbe ha dị n’okorobịa gụnyere Samuel, Eze Devid onye ezi omume, ndị amụma ahụ a ma ama na Bible, bụ́ Jeremaịa na Daniel, gụnyekwara Timoti onye kwesịrị ntụkwasị obi. Mbipụta nke a nwere isiokwu atọ ndị metụtara ụfọdụ n’ime ihe nlereanya ndị a dị na Bible. Ị ga-ahụ site n’ihe odide ndị ahụ ihe mere ndị na-eto eto, nakwa ndị meworo okenye, na-eji ewere ijere Chineke ozi n’ihe dị mkpa nakwa ihe mere ha na-eji etinye oge dị ukwuu n’inyere ndị agbata obi ha aka ime otu ihe ahụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Otu nnyocha ndị ụlọ ọrụ Gallup mere na 1985 chọpụtara na ọ bụ nanị 12 pasenti nke ndị America a mụrụ kemgbe 1946 kwuru na ha nwere “okwukwe dị ukwuu” mgbe ha dị 16 afọ.