Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 10/15 p. 1-4
  • Masada—N’ihi Gịnị Ka O ji Mee?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Masada—N’ihi Gịnị Ka O ji Mee?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Ogbu Mmadụ nke Masada
  • Masada—Ọ̀ Bụ Ihe Na-egosi na Mesaịa Abịawo?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ihe Ndekọ Akụkọ Ndị Na-akpali Mmasị nke Josephus
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • À Ga-azọpụta Gị Mgbe Chineke Mere Ihe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Olileanya Ka Mma Maka Mkpụrụ Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 10/15 p. 1-4

Masada​—N’ihi Gịnị Ka O ji Mee?

“NDỊ enyi m bụ ndị dike, eri ogologo oge anyị ekpebisiwo ike na anyị agaghị ejere ndị Rom ma ọ bụ ndị ọ bụla ọzọ ozi ma e wezụga nanị Chineke . . . Bịanụ, mgbe aka anyị ka nwere ike ijide mma agha... Ka anyị nwụọ tupu anyị aghọọ ndị ohu n’okpuru ndị iro anyị, ka anyị wee hapụkọọ ndụ nke a n’otu dị ka ndị nweere onwe ha, anyị na ụmụ anyị na ndị nwunye anyị!”

A kọrọ na ọ bụ Eleazar, nwa Jair, (ma ọ bụ Ben Ya’ir), gwara ndị na-echebe Masada okwu agbamume nke a n’oge a na-amakwaghị ihe a ga-eme. Ọ bụ onye ode akụkọ ihe mere eme nke narị afọ mbụ ahụ bụ Josephus dekọrọ ya n’akwụkwọ ya bụ The Jewish War. N’ihi gịnị ka onye ndú ndị Juu ahụ ji gbaa ndị ya na ha so ume igbukpọ onwe ha, n’ìgwè n’ụzọ megidere iwu Chineke? (Ọpụpụ 20:13) Nke ka mkpa, olee ụzọ inwe ihe ọmụma banyere ọnọdụ metụtara ihe omume ahụ pụrụ isi nyere gị aka ịgabiga ụwa nke oge a nke jupụtara n’ime ihe ike?

Ndị Ogbu Mmadụ nke Masada

Tupu ntiwapụ nke nnupụisi ndị Juu ahụ n’afọ 66 O.A., e nwere otu òtù ndị agha Rom nọ na Masada, bụ́ ebe e wusiri ike nke dị n’elu ugwu, nke dị nso Osimiri Nnú ahụ. Ọ bụ ezie na Masada dị n’ebe dịpụrụ adịpụ, Herọd Onye Ukwu ahụ wuru otu obíeze mara mma nke oge oyi n’ebe ahụ. O mere ka e wuo otu usoro inweta mmiri nke mere ka o kwe omume ọbụna inweta mmiri ọkụ e ji asa ahụ. Ma, nke ka mkpa, mgbe ndị Rom na-achị ebe ahụ, e chebere ngwá agha dị ukwuu n’ebe ahụ e wusiri ike. Mgbe okwu rịrị elu megide ndị Rom ahụ bichiri na Palestine, e nwere ihe ize ndụ nke na ngwá agha ndị ahụ ga-adaba n’aka ndị Juu na-achọ mgbanwe ọchịchị. Otu n’ime òtù ndị dị otú ahụ bụ ndị Sicarii, nke pụtara “ndị ogbu mmadụ,” bụ ndị e hotara na Bible dị ka ndị tinyere aka n’ịkpata ọgba aghara.—Ọrụ 21:38.

Na 66 O.A., ndị ogbu mmadụ ahụ weghaara Masada. N’iji ngwá agha ha butere ọhụrụ mee ihe, ha zọọrọ ije gaa Jerusalem ịkwado nnupụisi ahụ a na-enupụ megide ọchịchị ndị Rom. Mgbukpọ ndị Juu ahụ na-achọ mgbanwe ọchịchị gbukpọrọ òtù ndị agha Rom nọ na Masada nakwa na Jerusalem wetaara ụmụ amaala ha oké ọnụma nke Alaeze Rom. Tupu afọ 66 O.A. agwụsịa, òtù Legion nke Iri na Abụọ nke ndị agha Rom nke nọ n’okpuru nduzi Cestius Gallus zọọrọ ije banye na Judia wee maa ụlọikwuu ha n’ebe dị ná mpụga Jerusalem. Ndị Rom wakwasịrị obodo ahụ site n’akụkụ nile wee garuo n’ókè nke igwudasị ntọala ebe ugwu nke ụlọ nsọ ahụ. Na mberede, Gallus kpọọrọ usuu ndị agha ya laghachi azụ, n’enweghịkwa ihe a hụrụ anya kpatara ya, ha hapụrụ Judia. Onye ji anya ya hụ ihe merenụ, bụ́ Josephus, dere, sị, “A sị nnọọ na ọ nọgidekwuru ná nnọchibido ahụ ruo nwa oge nta n’ihu, ọ gaara enweta Obodo ahụ ozugbo ahụ.”

Ma ndị Rom emechabeghị ihe ha na-achọ ime. Mgbe afọ anọ gasịrị, ọchịagha ndị Rom bụ Titus kpọọrọ legion ndị agha anọ wee zọrọ ije gaa Jerusalem.a N’oge nke a, e bibiri obodo ahụ dum, e mekwara ka Judia banyeghachi n’okpuru ọchịchị aka ike nke Rom. E nwetara ebe nile ma e wezụgakwa Masada.

N’ikpebisi ike ịkụtu obere nguzogide ikpeazụ nke a, ndị Rom ahụ ji mgbidi e ji nkume wuo gbaa ebe ahụ e wusiri ike gburugburu, tinyekwara ọmụma ụlọikwuu asatọ e ji nkume wuo mgbidi gburugburu ha. Ha mesịrị kpokọta ájá iji wuo ụzọ a ga-esi garuo n’elu ugwu ahụ—bụ́ ebe e wuliri elu nke mmadụ mere nke ruru 645 amaụkwụ [197 mita] n’ogologo nakwa 180 amaụkwụ [55 mita] n’ịdị elu! N’elu ya, ha wukwasịrị otu ụlọ elu, debekwa ihe e ji etipu mgbidi iji wee tipuo mgbidi nke Masada. Ọ bụ nanị oge ka a na-echerezi ka usuu ndị agha Rom wụbata wee weghara ebe ikpeazụ nke a e wusiri ike nke ndị Judia.

Taa, akara ndị ahụ pụtara ìhè nke na-egosi ebe ọmụma ụlọikwuu ndị Rom ahụ dịbu, mgbidi nchebido ahụ gara gburugburu, na nnukwute ebe ahụ e kpoliri ájá elu bụ ihe ndị na-agba àmà nke otú nnupụisi ndị Juu ahụ si bịarute ná njedebe. A rụsịrị oké ọrụ ngwupụta iji chọta ihe mgbe ochie na Masada na 1965. N’ikwu okwu banyere ihe ndị a chọtara n’ebe ahụ, akwụkwọ The New Encyclopcedia Britannica (1987) na-asị: “A na-ahụta na nkọwa nke onye ọkọ akụkọ ndị Rom na ndị Juu ahụ bụ Josephus, nke bụ nanị nkọwa zuru ezu e nwere ruo mgbe ahụ banyere akụkọ ihe mere na Masada, ziri nnọọ ezi nke ukwuu.”

Ma, ebe ndị Rom na-achọ itiwa mgbidi ahụ, olee otú ndị ogbu mmadụ ahụ si meghachi omume n’okwu mkpali igbu onwe onye nke Eleazar, nwa Jair? Josephus dekọrọ, sị: “Nke ọ bụla n’ime ha bu ụzọ gbusịa ezinụlọ ha; . . . mgbe ahụ, mgbe e jiworo ife nzà họpụta mmadụ iri ịbụ ndị ga-egbusị ndị ọzọ, onye ọ bụla dinara n’akụkụ nwunye ya na ụmụ ya, mgbe ahụ, n’ifegharị aka ha gburugburu, ha mepere akpịrị ha nye ndị ahụ gaje ịrụ ọrụ nke a na-akpata ihe mgbu.b Ndị ahụ gbusịrị ha nile n’alaghị azụ ọ bụla, wee sikwa otu aka ahụ mesorịta ibe ha, . . . ma otu agadi nwanyị, ya na otu nwanyị ọzọ . . . gbapụrụ . . . Ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ n’ebe ahụ bụ narị mmadụ itoolu na iri isii, gụnyere ndị inyom na ụmụntakịrị.”

N’ihi gịnị ka nnupụisi ndị Juu ji bịaruo ná njedebe n’ụzọ ọdachi dị otú a? È nwere ihe ọ bụla jikọrọ ya na ndụ na ọnwụ nke Jisọs onye Nazaret?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Na Masada, ndị ọkà n’igwupụta ihe mgbe ochie e liri n’ala chọtara ọtụtụ narị mkpụrụ ego ndị e dekwasịrị okwu Hibru ndị na-enye nnupụisi ahụ otuto, dị ka “Maka Nnwere Onwe nke Zaiọn” na “Jerusalem Dị Nso.” Dr. Yigael Yadin kọwara n’akwụkwọ ya bụ Masada, sị: “Ego shekel ndị ahụ anyị chọtara nọchiri anya afọ nile nke nnupụisi ahụ, malite n’afọ nke mbụ ruokwa n’afọ oké ihe omume ahụ bụ nke ise, bụ́ afọ nke ikpeazụ a kpụpụtara shekel ahụ, bụ́ nke kwekọrọ n’afọ 70 AD mgbe e bibiri Ulọ Nsọ nke Jerusalem.” Lee mkpụrụ ego ahụ dị n’elu.

b N’otu ebe dịpụtara adịpụta nke dị nso otu n’ime ọnụ ụzọ ama ndị dị na Masada, a chọtara ibé ụrọ iri na otu, nke e dekwasịrị otu utu aha Hibru n’elu nke ọ bụla n’ime ha. ọtụtụ ndị mmụta na-atụ aro na ndị a pụrụ ịbụ nzà ahụ Josephus zoro aka na ha. E dekwasịrị n’elu otu n’ime ha “Ben Ya’ir,” nke pụtara “nwa Jaịrọs.” Louis Feldman kwuru n’akwụkwọ bụ Josephus and Modern Scholarship, sị, “Nchọpụta Yadin chọpụtara nzà, gụnyere otu nke nwere aha Ben Jair n’elu ya, bụ nkwado dị egwu nke ihe ndekọ Josephus.”

[Ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche A]

Masada​—Ọ̀ Bụ Ihe Na-egosi na Mesaịa Abịawo?

[Foto dị na peeji nke 4]

Mkpụrụ ego ndị Juu nke 67 O.A., nke kpọtụrụ “Afọ nke 2” nke agha ha na ndị Rom ahụ aha

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya