Bịa Mgbakọ Distrikti ‘Asụsụ Di Ọcha’
NDỊRỊTA iche ndị e nwere n’asụsụ anọgidewo na-abụ ihe na-akpata nkewa eri oge Bebel. N’ebe ahụ, Jehova gwagburu asụsụ ụmụ mmadụ wee mebie nzube nke ndị ahụ ‘iwuru onwe ha ụlọ elu, mekwaara onwe ha aha.’ (Jenesis 11:4) A pụrụ ịhụta otú ndịrịta iche nke asụsụ pụrụ isi kpata nkewa site n’ihe mere na Belgium. N’ọtụtụ afọ gara aga, e kewara ụlọ akwụkwọ Catholic University dị na Louvain abụọ gaa n’asụsụ dị iche iche.
Asụsụ bụ nanị otu n’ime ihe ndị na-akpata nkewa n’etiti ụmụ mmadụ. Ihe ndị ọzọ bụ mba mmadụ si na ya, agbụrụ, mmụta akwụkwọ, na ọnọdụ akụ na ụba. Ma Ndịàmà Jehova arụwo ọrụ iji merie ihe ndị a nile na-akpata nkewa, ha bụkwa ndị dị n’otu n’ezie.
N’oge ọkọchị afọ gara aga, e nwere ihe ngosipụta pụtara nnọọ ìhè nke ịdị n’otu nke a n’obodo Chorzów (nke dị nso Katowice), Poznan, na Warsaw, bụ́ ndị dị na Poland. Ndịàmà, ndị na-asụ, ma ọ dịkarịa ala, 20 asụsụ dị iche iche, si na 37 mba dị iche iche bịa. Ma, ha nile gosipụtara ịdị n’otu pụtara ìhè. Gịnị kpatara nke a? Ha nile na-asụ ‘asụsụ ahụ dị ọcha’ nke eziokwu Akwụkwọ nsọ. E buru nke a n’amụma na Zefanaịa 3:9, sị: “Mgbe ahụ ka m [Jehova Chineke] ga-agbanwere ndị nile dị iche iche [asụsụ, NW] dị ọcha, ka ha nile wee kpọkuo aha Jehova, ife ya n’otu ubu.”
Ya mere, e nwere ezi ihe mere mgbakọ distrikti ndị anyị ga-enwe na 1990 ga-eji nwee isiokwu ahụ bụ ‘Asụsụ Dị Ọcha.’ N’ihi ezughị okè mmadụ, mmetụta nke ajọ ụwa Setan na ihe omume aghụghọ nile nke Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya, ịsụ ‘asụsụ ahụ dị ọcha’ anaghị abụ ihe dị mfe mgbe nile. Anyị aghaghị ịnọgide na nche megide ọchịchọ onwe onye ndị pụrụ ịkpata nkewa n’etiti anyị.
Gịnị mere Chineke jiworo nye anyị asụsụ nke a dị ọcha? Ọ bụ ka anyị wee nwee ike ife Jehova “n’otu ubu.” Nsụgharị ndị ọzọ na-egosi na nke a pụtara ife Chineke “n’okpuru otu yoke ahụ,” (The Jerusalem Bible); “n’otu nkwekọrịta” (Moffat); “n’ịdị n’otu” (An American Translation); na “imekọ ihe n’otu n’ije ozi ya.”—Byington.
Site n’okwu, ihe ngosi, ahụmahụ, usoro isiokwu, na ihe nkiri Bible dị iche iche ndị a ga-enwe ná mgbakọ ndị a, a ga-agba anyị ume, kpaliekwa anyị ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha nke ọma karị. Ha ga-akpalikwa anyị isoro ụmụnna anyị jekọọ ozi n’ụzọ dị irè, na-emekọrịtakwa ihe karị.
Mgbakọ ndị a ga-amalite na Thursday, mgbe ọ kụsịrị elekere 1:00 nke ehihie, ma mechie n’ihe dị ka elekere 4:00 nke uhuruchi Sunday. Mee nkwadebe ugbu a ịhụ na ị nọ ya maka abụ mmeghe, bịazuokwa nnọkọ nile ruo ekpere mmechi n’uhuruchi Sunday.
Jiri Bible na akwụkwọ abụ gị bịa, dịrịkwa njikere idetu ihe ụfọdụ. Jirikwa ezi agụụ nri ime mmụọ bịa, ị ga-ahapụkwa ebe ahụ, na-abụ onye a kwadebeworo nke ọma karị ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha na ijere Jehova ozi.
Ebe Ndị A Ga-enwe Mgbakọ Distrikti na 1990
NOVEMBER 8-11, 1990
AGBOR 1 (Ịka, Kwale)
IKOT AKAN 1 (Efik)
MGBOKO UMUORIA 1 (Igbo)
OTTA 1 (Yoruba)
ULI 1 (Igbo)
NOVEMBER 15-18, 1990
AGBOR 2 (Ịka, Anịocha)
AKURE 1 (Yoruba)
CALABAR 1 (Efik)
IKOT AKAN 2 (Efik)
MGBOKO UMUORIA 2 (Igbo)
OTTA 2 (Yoruba)
OYEDE 1 (Isoko)
UBOGO 1 (Urhobo, Okpe)
ULI 2 (Igbo)
NOVEMBER 29-DECEMBER 2, 1990
AKURE 2 (Yoruba)
COTONOU, BENIN REPUBLIC (Ewe, French)
CALABAR 2 (Efik)
KADUNA (English, Yoruba)
MGBOKO UMUORIA 3 (Igbo)
OTTA 3 (English, Gun)
OYEDE 2 (Isoko)
UBOGO 2 (Urhobo)
ULI 3 (Igbo)
UYO 1 (English)
DECEMBER 6-9, 1990
AKURE 3 (Yoruba)
CALABAR 3 (English)
COTONOU, BENIN REPUBLIC (Gun, Yoruba)
IGWURUTA ALI 1 (English)
JOS (English, Hausa)
MGBOKO UMUORIA 4 (Igbo)
OTTA 4 (English)
ULI 4 (Igbo)
UBOGO 3 (English)
UYO 2 (Efik)
DECEMBER 13-16, 1990
BENIN CITY 1 (English)
IGWURUTA ALI 2 (English, Abua)
MGBOKO UMUORIA 5 (Igbo)
OTTA 5 (English)
UBOGO 4 (Ijaw, Itsekiri)
ULI 5 (Igbo)
UYO 3 (Efik)
IKOT EKPENE 1 (Efik)
DECEMBER 20-23, 1990
BENIN CITY 2 (English, Owan)
IBADAN 1 (Yoruba)
IGWURUTA ALI 3 (Ikwerre, Ogoni)
IKOT EKPENE 2 (Efik)
ILESHA 1 (Yoruba)
OTTA 6 (Yoruba)
MGBOKO UMUORIA 6 (Igbo)
ULI 6 (Igbo)
UYO 4 (Efik)
JANUARY 3-6, 1991
BENIN CITY 3 (Edo, Ishan)
IBADAN 2 (Yoruba)
IKOT EKPENE 3 (Efik)
ILESHA 2 (Yoruba)
MGBOKO UMUORIA 7 (Igbo)
OKITIPUPA 1 (Yoruba)
OTTA 7 (Yoruba)
ULI 7 (English)
JANUARY 10-13, 1991
IBADAN 3 (English)
ILESHA 3 (Yoruba)
KATSINA ALA (English, Tiv)
MGBOKO UMUORIA 8 (English)
OKITIPUPA 2 (Yoruba)
OTTA 8 (Yoruba)