Ịghọta Ihe Mere O Ji Bụrụ na Mesaịa Ahụ Ga-abịa
“Anyị ahụwo Mesaịa anyị”—JỌN 1:41.
1. Ịma ọkwa dị aṅaa nke na-akpali akpali ka e mere ihe ndekọ ya na Bible, ọ̀ bụkwa òle mgbe ka a mara ọkwa ahụ?
OTU onye Juu aha ya bụ Andru maara nwanne ya nwoke ọkwa nke a na-akpali akpali ihe karịrị 1,950 afọ gara aga. Ị̀ pụrụ iji anya nke uche gị hụ mkpali dị n’okwu ndị ahụ o kwuru, bụ́ nke onyeozi Kraịst bụ Jọn mere ihe ndekọ ya? Afọ ahụ a na-apụghị ichefu echefu bụ nke onye Kraịst bụ ọkọ akụkọ ihe mere eme, bụ́ Luk, zoro aka na ya dị ka “afọ nke iri na ise n’ọchịchị nke Taịbiriọs Siza.” Afọ nke 15 nke Taịbiriọs malite n’oge e kwupụtara na ọ bụ onye ọchịchị alaeze Rom, malitere na September 28 O.A. ma gwụsịa na September 29 O.A.—Luk 3:1-3, 21, 22; Jọn 1:32-35, 41.
2. Olee ụzọ amụma Daniel si lekwasị anya n’afọ ahụ bụ 29 O.A.?
2 E buwo amụma n’ụzọ na-ehieghị ụzọ banyere kpọmkwem afọ Mesaịa ahụ ga-apụta. Kpọmkwem 483 afọ agabigawo kemgbe eze Peasia bụ Ataksakses nyere iwu ka e wughachi Jerusalem, ebe e mere nke ahụ n’afọ nke 20 nke ọchịchị ya, bụ́ 455 T.O.A.a (Nehemaịa 2:1-8) Daniel onye amụma buru amụma “na site ná mpụta okwu ahụ iwughachi na iwuzi Jerusalem ruo mgbe onye e tere mmanụ, bụ́ onyendú, ga-adị izu asaa: na [iri izu isii na abụọ].” (Daniel 9:25) Otú a, ogologo oge nke 7 + 62 = 69 IZU nke amụma ga-adị n’etiti ihe omume abụọ ndị a dị mkpa. Izu iri isii na itoolu nkịtị pụtara 483 ụbọchị. Dị ka ụkpụrụ amụma ahụ bụ “otu ụbọchị n’ọnọdụ otu afọ” si dị, Mesaịa ahụ ga-apụta mgbe 483 afọ gasịrị, ya bụ, n’afọ 29 O.A.—Ezikiel 4:6.
3. (a) Gịnị ka utu aha ahụ bụ “Mesaịa” pụtara? (b) Amụma dịgasi aṅaa ka Mesaịa ahụ na-aghaghị imezu?
3 N’ụzọ kwesịrị nnọọ ekwesị, n’afọ 29 O.A., “ndị Juu nọ na-ele anya” Mesaịa ahụ. (Luk 3:1, 15) Utu aha ahụ bụ “Mesaịa” pụtara otu ihe ahụ dị ka “Kraịst” n’asụsụ Grik; ha abụọ pụtara “Onye E Tere Mmanụ.” (Jọn 1:41) Ajụjụ kpụ ọkụ n’ọnụ n’etiti ọtụtụ ndị Juu bụ, ‘Ònye ka Jehova Chineke ga-ete mmanụ dị ka eze ịchị, ọ bụghị nanị Israel, kama ihe nile a kpọrọ mmadụ?’ Site n’amụma e buru ebu, e mewo ka ebe a ga-esi họpụta onye ahụ bụrụ nanị n’etiti ndị si n’usoro ọmụmụ nwa nwa Abraham bụ Juda. Ọzọkwa, Mesaịa ahụ gaje ịbụ onye ga-eketa ocheeze nke eze Judia bụ Devid, a gajekwa ịmụ ya n’obodo Devid, bụ́ Betlehem.—Jenesis 17:5, 6; 49:10; Abụ Ọma 132:11; Daniel 7:13, 14; Maịka 5:2; Jọn 7:42.
Ihe E Ji Amata Ya nke A Na-adịghị Enyo Enyo
4, 5. (a) Gịnị mere n’afọ ahụ dị oké mkpa bụ 29 O.A.? (b) N’ụzo dị aṅaa nke a na-adịghị enyo enyo ka e si mara onye a họpụtara dị ka Mesaịa ahụ?
4 N’afọ ahụ dị oké mkpa, bụ́ 29 O.A., nke a bụ ihe merenụ: “Okwu Chineke bịakwutere Jọn nwa Zekaraịa n’ọhịa. O wee bịa n’ala nile dị Jọdan gburugburu, na-ekwusa baptism nke nchegharị ka e wee gbaghara mmehie.” (Luk 3: 2, 3) Ije ozi Jọn kwadebere ndị Juu nwere nchegharị ịnara ọbịbịa dị nso nke Mesaịa ahụ. Ọzọkwa, Jehova nyere Jọn ihe àmà. Ọ ga-elepụ anya ịhụ onye “[ọ] ga-ahụ mmụọ nsọ ka ọ na-efedakwasị ya, na-anọgidekwa n’ahụ ya.”—Jọn 1:33.
5 Mgbe o mesịrị Jisọs onye Nazaret baptism, Jọn hụrụ otite mmanụ nke a a na-adịghị enyo enyo. Ọ bụghị mmanụ nkịtị ka e ji tee Jisọs, dị ka ọ dịrị n’ihe banyere nna ya ochie bụ Devid, kama ọ bụ mmụọ nsọ Jehova ka e ji tee ya mmanụ. (1 Samuel 16:13; Ọrụ 10:38) N’otu mgbe ahụ, olu Chineke n’onwe ya sịrị: “Onye a bụ Ọkpara m m hụrụ n’anya, onye ihe ya dị m ezi mma.” (Matiu 3:16, 17) Dị ka Jọn mesịrị gbaa akaebe ya: “Ekiriwo m mmụọ nsọ ka o si n’eluigwe na-efeda ka nduru; o wee nọgide n’ahụ ya. Mụ onwe m ahụwokwa, gbaakwa àmà na onye a bụ Ọkpara Chineke.”—Jọn 1: 32, 34.
6. Ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka Andru na Jọn setịpụụrụ anyị?
6 Jọn Onye na-eme baptism ji ikwesị ntụkwasị obi jiri okwu dị otú ahụ mee ka ndị na-eso ụzọ ya mara Jisọs, na-akpọkwa ya “Nwa Atụrụ Chineke, nke na-ebupụ mmehie nke ụwa.” (Jọn 1:29) Abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya zaghachiri ngwa ngwa. Mgbe ha na Jisọs nọsịrị otu ụbọchị, o doro ha nnọọ anya nke ọma. Aha nke otu n’ime ha bụ Andru, onye ji ịnụ ọkụ n’obi chọta nwanne ya nwoke, bụ́ Saịmọn Pita. A na-aghọta na onye na-eso ụzọ nke ọzọ ahụ bụ Jọn nwa Zebedi, onye ghọrọ onyeozi nke Jisọs hụrụ n’anya. Mgbe ọ gbasịrị àmà banyere Mesaịa ahụ ruo ihe forọ nke nta ka ọ bụrụ 70 afọ, a kpaliri Jọn nke a ide ihe ahụ dị n’elu maka abamuru anyị. Ihe nlereanya ya na nke Andru hà na-emetụ gị n’obi? Ì nwere ịnụ ọkụ n’obi dị ka ha, nakwa dị ka ‘ndị ozi ndị ọzọ nke Nwa Atụrụ ahụ’ ịkpọsa eziokwu ndị na-akpali akpali banyere Mesaịa ahụ?—Mkpughe 1:9; 21:14; Jọn 1:35-41; Ọrụ 5:40-42.
Onye E Tere Mmanụ dị ka Eze na Onyeisi Nchụaja
7. N’ihi gịnị ka Jisọs na-apụghị ije ozi dị ka onye nchụaja n’ụlọ nsọ nke dị na Jerusalem?
7 Ebe a mụrụ ya banye ná mba ndị Juu, Jisọs ‘banyere n’okpuru iwu.’ (Ndị Galetia 4:4) Ya mere, ebe o sitere n’agbụrụ Juda, ọ pụghị ije ozi dị ka onye nchụaja n’ụlọ nsọ nkịtị nke Jehova, nke ndị nchụaja ya bụ ndị sitere n’usoro ọmụmụ Erọn nke agbụrụ Livaị. Pọl onyeozi chetaara ndị Kraịst ibe ya, sị, “Ọ pụtawo ìhè na Onyenwe anyị esiwo na Juda pupụta; bụ́ ebo nke Mosis na-ekwughị ihe ọ bụla banyere ndị nchụaja nye ya.”—Ndị Hibru 7:14.
8. Gịnị ka ụlọ nsọ Jehova nke dị n’elu ala sere onyinyo ya?
8 Jọn onyeozi dere, sị: “Ezi ìhè ahụ nke na-enye ụdị mmadụ ọ bụla ìhè gaje ịbata n’ime ụwa.” (Jọn 1:6-9, NW) Mgbe e mesịrị Jisọs baptism, o yiri ka à ga-asị na e guzobere otu nnukwute ụlọ nsọ nke ime mmụọ, ebe e nweworo onyeisi nchụaja ime mmụọ onye pụrụ ịzọpụta ihe a kpọrọ mmadụ site n’agbụ nke ụwa Setan nke nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ.—Ndị Hibru 8:1-5; 9:24.‘
9, 10. (a) Gịnị ka okwu Jisọs ahụ pụtara, bụ́, “Àjà na ihe e chere n’ihu gị, ị chọghị ha” na, “Ahụ ka ị kwadebere nye m”? (b) Gịnị ka Jisọs chere banyere nke a n’onwe ya?
9 Jisọs nọ na-ekpe ekpere n’oge baptism ya. Bible mere ihe ndekọ nke ụfọdụ n’ime okwu ya ndị gbara ọkpụrụkpụ, dị ka Pọl onyeozi mesịrị hota ha, sị: “Àjà na ihe e chere n’ihụ gị, ị chọghị ha, ma ahụ ka ị kwadebere nye m; àjà nsuresị ọkụ na àjà a chụrụ banyere mmehie, ha abụghị ihe dị gị ezi mma: mgbe ahụ ka m sịrị, Lee, abịawo m (n’akwụkwọ mpịakọta ka e deworo ihe banyere m) ime ihe ị na-achọ, Chineke.”—Ndị Hibru 10:5-7; Luk 3:21.
10 Otú a, Jisọs ji amụma ahụ dị n’Abụ ọma 40:6-8 mee ihe banyere onwe ya, bụ́ nke buru amụma banyere nzube Jehova iweta àjà ụmụ anụmanụ ndị ndị nchụaja si n’usoro Erọn na-achụ n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem, ná njedebe. Àjà ndị a ‘adịghị atọ Jehova ụtọ,’ n’ihi na ha bụ nanị ihe atụ, ha apụkwaghị ikpuchi mmehie nke mmadụ kpam kpam. Ya mere, Jehova kwadebeere Jisọs ahụ mmadụ zuru okè iji chụọ àjà. Chineke bufere ndụ nke Ọkpara ya nọ n’eluigwe gaa n’akpa nwa nke nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ onye Juu. E si otú a mụọ Jisọs n’enweghị ntụpọ ọ bụla sitere ná mmehie nke Adam. Ọ bụ mmadụ zuru okè nke bụ Ọkpara Chineke, onye a pụrụ iji ndụ ya kpuchie mmehie nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Luk 1:30-35) Dị ka Abụ Ọma 40:8 buru amụma ya, ọ bụ ọchịchọ obi Jisọs ime ihe Nna ya na-achọ. “Ọ bụkwa n’ọchịchọ a ka e doworo anyị nsọ site n’iche ahụ Jisọs Kraịst n’ihu Chineke dị ka àjà nanị otu mgbe.”—Ndị Hibru 10:10, 11.
11. Amụma dị aṅaa ka onwụ Mesaịa ahụ mezuru, ò sikwa aṅaa mee ka ‘ịchụ àjà kwụsị?
11 Ojiji e jiri ndụ mmadụ Jisọs chụọ àjà nanị otu mgbe kachapụrụ mkpa ọ dị ịnọgide na-achụ àjà ndị ọzọ n’ụlọ nsọ ihe atụ ahụ dị na Jerusalem. Ọzọkwa, ọnwụ ya weere ọnọdụ n’Ụbọchị Ememe Ngabiga nke 33 O.A. Nke ahụ bụ ihe dị ka afọ atọ na ọkara e mesịrị ya baptism. Afọ atọ na ọkara ahụ ga-aha ka ọkara nke otu izu nke amụma. (Ọnụ Ọgụgụ 14:34) Ya mere, ihe mere nnọọ kpọmkwem dị ka Daniel buru amụma ya banyere mbipụ nke Mesaịa ahụ: “Ọ bụkwa ná nkere izu ahụ ka ọ ga-eme ka àjà na onyinye ịnata ihu ọma kwụsị.” (Daniel 9: 26, 27) Ọ bụ ezie na usoro ndị nchụaja ihe atụ nke nọ na Jerusalem nọgidere na-arụ ọrụ ruo mgbe e bibiri ụlọ nsọ abụ n’afọ 70 O.A., àjà ndị nchụaja chụrụ n’afọ ndị ahụ abaghị uru ọ bụla, ebe e dochiworo anya ha site n’àjà ka mma nke Jisọs.—Matiu 23:37, 38.
12. Olee otú ịbụ onye nchụaja nke Jisọs si dị elu karịa nke Erọn?
12 Erọn bụ nke mbụ n’ogologo ahịrị nke ndị isi nchụaja bụ ndị Israel. Mgbe e jisịrị mmanụ dị nsọ tee ya, ọ dịrị mkpa ka o chere n’ime ụlọ ikwuu ahụ ruo ụbọchị asaa tupu e nye ya ike ije ozi dị ka onyeisi nchụaja. (Levitikọs 8: 12, 33) N’otu aka ahụ, Jisọs nwere ogologo oge nke nchere tupu e nye ya ike ikwuchite ọnụ ihe a kpọrọ mmadụ. Nke ahụ bụ malite n’oge e tere ya mmanụ dị ka Onyeisi Nchụaja ruo n’oge mbilite n’ọnwụ ya. N’adịghị ka Erọn, Ọkpara Chineke ahụ nke na-adịghị anwụ anwụ enweghị mkpa nke inwe ndị ga-anọchi ya, ọ na-ejekwa ozi dị ka ma Onye Nchụaja ma Eze “dị ka usoro Melkizedek si dị.”—Abụ Ọma 110:1-4; Jenesis 14:18-20; Ndị Hibru 6:20; 7:1-3, 11-17, 23-25.
13. (a) Oké ibu ọrụ dị aṅaa dịkwasịrị n’ubu ndị isi nchụaja nke Israel? (b) Olee ụzọ Jisọs Kraịst siworo buo ibu ọrụ dị ukwuu ọbụna karị?
13 N’Israel oge ochie, ibu ọrụ bụ isi banyere ozizi ihe nke okpukpe n’ụzọ ziri ezi dịkwasịrị n’ubu onyeisi nchụaja. (Levitikọs 10:8-11; Malakaị 2:7) N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, Jisọs mere ka a mara ihe ezi omume Jehova chọrọ n’aka ndị nile chọrọ iketa Alaeze ahụ na ndụ ebighị ebi. (Matiu 6:9, 10, 33; 7:28, 29; 11:12; 25:34, 46) Mgbe ọ nọ n’otu ụlọ nzukọ dị na Nazaret, Jisọs gụrụ, jirikwa mee ihe n’ihe banyere onwe ya, amụma ahụ bụ: ‘Mmụọ Jehova dị n’ahụ m n’ihi na o tere m mmanụ izisa ozi ọma.’ Mgbe ahụ, mgbe ọ nọsịrị ogologo oge ụfọdụ na Kapanaum, ọ sịrị: “Aghaghị m izikwa obodo nile ọzọ ozi ọma alaeze Chineke: n’ihi na e zitere m ime nke a.” (Luk 4:18, 19, 43; Aịsaịa 61:1, 2) Jisọs nyekwara 70 ndị na-eso ụzọ ya ọzụzụ ịgbasa ọrụ nkwusa Alaeze nke a, o bukwara amụma na ha ga-arụ ọrụ ndị dị ukwuu karịa ndị ya onwe ya rụrụ. (Luk 10:1-9; Jọn 14:12) Nke a tọrọ ntọala ọrụ nkụzi Bible zuru ụwa ọnụ nke Jisọs ga-eduzi site n’aka ‘ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi,’ nke ihe mejupụtara ya bụ ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ.—Matiu 24: 45-47; 28:19, 20.
Onye Bụ Isi n’Ịkwado Ịbụ Ọkaaka nke Jehova
14. (a) N’ihi gịnị ka onyeisi nchụaja Israel na-eji abanye n’ime Ebe Kachasị Nso n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie ahụ a na-enwe kwa afo? (b) Gịnị ka ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ sere onyinyo ya?
14 Ihe kasị mkpa mere Ọkpara Chineke ji bịa n’elu ala abụghị ịzọpụta ihe a kpọrọ mmadụ. Kama nke ahụ, ọ bụ idozi okwu nkwutọ ndị ahụ Setan welitere n’ihe banyere ịbụ ọkaaka nke Jehova. Anyị pụrụ inweta nghọta banyere nke a site n’ịtụgharị uche n’ihe banyere Ụbọchị Mkpuchi Mmehie ahụ Israel na-enwe otu ugbo n’afọ, bụ́ mgbe onyeisi nchụaja ihe atụ ahụ na-abanye n’Ebe Kachasị Nsọ ọtụtu ugbo. Ọ na-eji ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ abanye nke mbụ, bụ́ nke a na-awụkwasị n’elu ihe e ji esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke na-enwu ọkụ. (Levitikọs 16:12-16) Nke a bụ ezi ihe nnọchianya nke ihe Onyeisi Nchụaja ahụ e sere onyinyo ya gaje ime n’elu ala tupu ọ rịgoo n’eluigwe iguzo n’ihu Jehova, na-eji uru nke àjà mmadụ ya.b (Ndị Hibru 9:24) Dị ka e gosiri site n’ojiji e ji ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ mee ihe, ụzọ ikwesị ntụkwasị obi nke Jisọs jupụtara n’ekpere sitere n’ala ala obi, oké ịnụ ọkụ n’obi maka ofufe dị ọcha, na ịhụnanya dị omimi maka Jehova. (Abụ Ọma 141:2; Mak 1:35; Jọn 2:13-17; 12:27, 28; 14:30, 31; Ndị Hibru 5:7) Jisọs nwere ihe ịga nke ọma n’ịnọgide ná nguzosi ike ya n’ezi ihe n’ụzọ na-enweghị ntụpọ ọ bụla n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịara n’ụzọ aghụghọ, ịkwa emo, na mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ ndị e bokwasịrị ya site n’aka Setan na ndị nnọchianya ya dị iche iche.—Ilu 27:11; Matiu 22:15-18; Mak 14:60-65; 15:16-32; Luk 4:13, 29; Jọn 8:44, 59.
15. Olee ụzọ anyị pụrụ isi gosi obi ekele anyị nye Jehova maka iwepụta onyeisi nchụaja dị otú a nke na-enweghị atụ? (Ndị Hibru 10:21-26)
15 N’ihi ịkwado ịbụ ọkaaka nke Jehova, e nyere Jisọs ụgwọ ọrụ site n’ịkpọlite ya n’ọnwụ gaa ná ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe. Lee ka anyị kwesịrị isi nwee obi ekele nye Jehova maka inye anyị Onyeisi Nchụaja dị otú a nke na-enweghị atụ! “Ya mere ebe anyị nwere onyeisi nchụaja dị ukwuu, onye gabigaworo eluigwe nile, bụ́ Jisọs Ọkpara Chineke, ka anyị jidesie nkwupụta anyị ike.” (Ndị Hibru 4:14) Ì nwere ọchịchọ siri ike ịgbaso ihe nlereanya Jisọs nke iguzosi ike n’ezi ihe n’agbanyeghị ihe Ekwensu pụrụ ime? Ya bụrụ otú ahụ, ị pụrụ ijide n’aka na ị ga-enweta enyemaka, ị pụkwara inwe ihe ịga nke ọma. Nke a bụ n’ihi na enyemaka kachasị mma dị adị. “N’ihi na anyị enweghị onyeisi nchụaja onye na-apụghị iji obi soo anyị hụkọọ ahụhụ n’adịghị ike anyị; kama anyị nwere onye a nwaworo n’ihe nile n’otu ụzọ ahụ a na-anwa anyị, ma o mehieghị. Ya mere ka anyị were nkwuwa okwu bịaruo ocheeze amara, ka e wee meere anyị ebere, ka anyị wee hụkwa amara inyere anyị aka n’oge mkpa.”—Ndị Hibru 4:15, 16; 5:7-10; Ndị Filipaị 4:13; l Jọn 2:1, 2.
Mkpa Ọ Dị Ime Mgbanwe
16. Olileanya dịgasị aṅaa ka ndị mbụ na-eso ụzọ Mesaịa ahụ nwere n’ihe banyere ọchịchi Alaeze ya?
16 Andru na Jọn mere ngwa ngwa n’ịmata ezi Mesaịa ahụ, ma ha na ndị ọzọ ndị malitere ịbụ ndị na-eso ụzọ ka nwere ọtụtụ ihe ha ga-amụta. (Jọn 16:12, 13) Dị ka ọtụtụ ndị Juu na-ekpe okpukpe n’oge ahụ, ha nwere olileanya na Alaeze Mesaịa ahụ ga-amalite ịchị achị laa azụ n’oge ahụ, na ọ gajekwa ịnapụta mba Israel na isi obodo ya, bụ́ Jerusalem, site n’ọchịchị ndị Jentaịl. (Luk 2:38; 3:15; 19:11; 23:51; 24:21) Ma, abamuru dị aṅaa nke na-adịgide adịgide ka nke ahụ gaara ewetawororịị ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie?
17, 18. N’ihi gịnị ka Jisos ji tụọ ilu ahụ banyere “otu nwoke a mazuru aha ya”?
17 Iji wepụ mmehie na ọnwụ site n’ahụ ndị Alaeze ahụ gaje ịchị n’ọdịnihu, ọ dị oké mkpa ka e buru ụzọ bipụ Mesaịa ahụ dị ka nwa atụrụ e ji achụ àjà. (Jọn 1:29; Aịsaịa 53:7, 12) Mgbe Jisọs buru amụma otụ́ nke a ga-esi wee mee na otụ́ a ga-esikwa kpọlite ya site n’ọnwụ, Pita zaghachiri, sị: “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị; ihe nke a agaghị abịakwasị gị ma ọlị.” (Matiu 16:21, 22, NW) Otú ọ dị, Jịsọs matara na ndị na-eso ụzọ ya “aghọtaghị okwu ahụ.”—Mak 9:31, 32; tụlee Matiu 17:22, 23.
18 Na mgbe ikpeazụ o jere Jerusalem, Jisọs kwuru okwu hoo haa ọbụna karị. (Matiu 20:18, 19) O gosikwara oké abamuru ọnwụ ya gaje iweta, na-asị: “Nwa nke mmadụ [bịara] . . . ka o werekwa ndụ ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) Olileanya ndị na-ezighị ezi gbochiri ndị na-eso ụzọ ya ịghọta nke a. Luk dekọrọ, sị: “Ọ nọ Jerusalem nso, na n’ihi na ha na-eche na alaeze Chineke gaje ịpụta ìhè ngwa ngwa.” Iji wee dozie echiche ha, Jisos tụrụ ilu nke o gosiri onwe ya n’ime ya dị ka “otu nwoke a mazuru aha ya,” onye ọ dị mkpa na ọ ga-ebu ụzọ ‘gaa ala dị anya, ịnara alaeze nye onwe ya.’ (Luk 19:11, 12) “Ala” ahụ na-ezo aka n’ebe eluigwe dị, bụ́ ebe Jisọs lagoro mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya gasịrị.
19. (a) Olileanya dị aṅaa nke na-ezighị ezi ka ndị na-eso ụzọ Jisọs gosipụtara mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ? (b) Mgbanwe di anaa ná mmekọrịta Chineke na ụmụ mmadụ weere ọnọdu na Pentikọst nke 33 O.A.? (Ndị Hibru 8:7-9, 13)
19 Otú ọ dị, nwa mgbe nta tupu nlagoro Jisọs, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya, sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ n’oge a ka ị na-enyeghachi Israel alaeze?” (Ọrụ 1:6) Jịsọs ọ gbakụtara ha azụ n’ihi ịjụ ajụjụ nke a? Ee e, ọ kọwaara ha na oge ya erubeghị, na ha kwesịkwara itinyegodị onwe ha n’ọrụ ahụ dị mkpa nke ịgba àmà banyere ezi Mesaịa ahụ. (Ọrụ 1:7, 8) N’oge na-adịghị anya, mmekọrịta ọgbụgba ndụ dị n’etiti Chineke na Israel anụ ahụ gaje ịbịa ná njedebe. Ya mere, a gajeghị iweghachi Alaeze Mesaịa ahụ nke ga-abịa n’ọdịnihu ná mba elu ala ahụ nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi. Jisọs gwara ndị Juu na-emegide ya, sị: “A ga-anara unu alaeze Chineke, wee nye mba ọzọ nke na-amị mkpụrụ ya.” (Matiu 21:43) Ụbọchị iri mgbe Jisọs lagosịrị n’eluigwe, a mụpụtara mba ahụ. A wụkwasịrị mmụọ nsọ n’isi 120 ndị na-eso ụzọ Jisọs, e wee si otú a tee ha mmanụ ịbụ “ndị nsọ” nke Chineke na “ndị ha na Kraịst na-ekekọ” n’Alaeze Mesaịa ahụ nke na-abịanụ.—Daniel 7:13, 14, 18; Ndị Rom 1:7; 8:1, 16, 17; Ọrụ 2:1-4; Ndị Galetia 6:15, 16.
20. N’agbanyeghị inwe olileanya ụfọdu ndị na-ezighị ezi, gịni ka ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi na narị afọ mbụ ahụ mere?
20 Ọbụna mgbe e tesịrị ha mmanụ, ndị Kraịst nke narị afọ mbụ ka nwekwara olileanya ndị na-ezighị ezi. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:1, 2) Ma kama ịbụ ndị iwe were ha wee laghachi azụ, ha jiri obi dị umeala nakwere mgbazi. N’ịbụ ndị mmụọ nsọ Chineke nyere ike, ha ji ọṅụ nakwere ọrụ nke ịgba àmà na ‘ime ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.’—Matiu 28:19, 20; Ọrụ 1:8; Ndị Kọlọsi 1:23.
21. Ajụjụ dịgasị anaa ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
21 Gịnị banyere narị afọ nke iri abụọ anyị a? Ndị ohu Jehova nke oge a hà mụ anya n’ihe banyere nguzobe nke Alaeze Mesaịa nke Chineke? Dịkwa ka ndị nọ n’ọnọdụ ha na narị afọ mbụ ahụ, ọ dị ha mkpa ime mgbanwe n’ihe ndị ha tụrụ anya ha n’ụzọ ụfọdụ?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ma akwukwọ The Encyclopedia Americana ma nke Great Soviet Encyclopedia kwekọrọ na ọchịchị Ataksakses gwusịrị na 424 T.O.A. Olee mgbe ọ malitere? Ọ bụ na 474 T.O.A. N’ịkwado nke a, otu ihe odide mgbe ochie e gwupụtara n’ala bụ nke e kwuru na mgbe e dere ya bụ n’afọ nke 50 nke Ataksakses; ihe odide ọzọ gosiri na onye ọzọ nọchiri ọnọdu ya n’afọ nke 51 ya. N’ịgụla azụ 50 afọ zuru ezu site n’afọ 424 T.O.A., anyị na-abịarute n’afọ ahụ bụ 474 T.O.A. dị ka mmalite nke ọchịchị ya. Ya mere, afọ nke 20 nke Ataksakses, mgbe e nyere iwu ahụ, ga-abụ afọ 19 zuru ezu n’ime ọchịchị ya, ya bụ, 455 T.O.A. Iji nweta nkọwa ndị ọzọ, lee akwụkwọ Insight on the Scriptures, Mpịakọta 2, peji 616, nke ndị Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Lee Ụlọ Nche nke August 15, 1975, peji 499.
Ị Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ Gịnị ka utu aha ahụ bụ “Mesaịa” pụtara?
◻ Ihe omume dị aṅaa nke dị mkpa weere ọnọdụ n’afọ 29 O.A.?
◻ Olee ụzọ Mesaịa sị ‘mee ka ịchụ àjà kwụsị ná nkera nke izu ahụ’?
◻ Eri mgbe e tere ya mmanụ, ibu ọrụ dị aṅaa ka Jisọs buworo?
◻ Gịnị bụ nzube bụ isi nke ọbịbịa mbụ nke Mesaịa, oleekwa ụzọ nke a kwesịrị isi metụta anyị?
[Foto dị na peeji nke 13]
Mbanye mbụ onyeisi nchụaja na-abanye n’Ebe Kachasị Nsọ sere onyinyo ihe dị mkpa karị nzọpụta nke ihe a kpọrọ mmadụ